MACH 10-16
ILU 4
Abụ nke 36 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
Ebe ndị nche na ndị na-eche ọnụ ụzọ ámá nche na-eme ihe ngwa ngwa mgbe ndị iro na-abịarute n’obodo ha
1. “Chebe Obi Gị”
(Nkeji 10)
Okwu bụ́ “obi” pụtara ihe mmadụ bụ n’ime (Ọma 51:6; w19.01 15 ¶4)
Ihe kwesịrị ịkacha anyị mkpa bụ ichebe obi anyị (Ilu 4:23a; w19.01 17 ¶10-11; 18 ¶14; lee foto)
Ọ bụ otú obi ihe atụ anyị dị ga-ekpebi ma ànyị ga-adị ndụ ka ọ̀ bụ na anyị agaghị adị (Ilu 4:23b; w12 5/1 32 ¶2)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ilu 4:18—Olee otú amaokwu a si gbasa otú Onye Kraịst si abịarukwu Jehova nso? (w21.08 8 ¶4)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ilu 4:1-18 (th ihe ọmụmụ nke 12)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye ahụ gosiri mmasị mgbe e nyere ya akwụkwọ e ji akpọ ndị mmadụ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kpọọ onye ị ma òkù ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)
6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 5) Ihe ngosi. ijwfq isiokwu nke 19—Isiokwu: Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Ista? (lmd isi nke 3 nọmba nke 4)
Abụ nke 16
7. Ihe Nzukọ Jehova Na-eme nke Ọnwa Mach
(Nkeji 10) Kpọnye VIDIO.
8. A Ga-ebido Ịkpọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na Satọdee, Mach 15
(Nkeji 5) Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-ekwu okwu a. Kwuo nhazi ọgbakọ unu mere maka ịkpọ ndị mmadụ òkù, maka okwu ihu ọha pụrụ iche, nakwa maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Gbaa ndị nkwusa niile ume ka ha gbakwuo mbọ n’ozi ọma n’ọnwa Mach na Eprel.
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr Ihe Ndị Anyị Ghọtakwuru, ajụjụ nke 1-4