MEE 5-11
ILU 12
Abụ nke 101 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Ịrụsi Ọrụ Ike Bara Uru
(Nkeji 10)
Ejila oge gị na-achụ ihe na-abaghị uru (Ilu 12:11)
Na-arụsi ọrụ ike, adịkwala umengwụ (Ilu 12:24; w16.06 30 ¶6)
Ị ga-enweta ụgwọ ọrụ maka ọrụ ị na-arụsi ike (Ilu 12:14)
IHE GA-ENYERE GỊ AKA: Anyị ga-enwe obi ụtọ na anyị na-arụsi ọrụ ike ma anyị lekwasị anya n’uru ọ na-abara ndị ọzọ.—Ọrụ 20:35; w15 2/1 5 ¶4-6.
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ilu 12:16—Olee otú ihe e kwuru n’amaokwu a ga-esi nyere mmadụ aka ịbụ a kwaa a kwụrụ n’oge nsogbu? (ijwyp isiokwu nke 95 ¶10-11)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ilu 12:1-20 (th ihe ọmụmụ nke 5)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 4)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 5 nọmba nke 4)
6. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gosi onye nwere ụmụaka ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)
7. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 3) Ihe Ngosi. ijwfq isiokwu nke 3—Isiokwu: Ùnu Chere na Ọ Bụ Naanị Unu Na-ekpere Chineke Otú Ọ Chọrọ? (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)
Abụ nke 21
8. Jehova Ga-enyere Anyị Aka n’Oge Ihe Isi Ike
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ị̀ na-echegbu onwe gị na i nwetabeghị ọrụ, na a chụrụ gị n’ọrụ, na ị naghị akpali afọ gị ugbu a, ma ọ bụ na ị gaghị akpali afọ gị ma ị kaa nká? Nke bụ́ eziokwu bụ na e jighị akụnụba ụwa a n’aka. Ma, Jehova gwara anyị na ọ bụrụ na anyị ebute ofufe ya ụzọ, ọ ga-egboro anyị mkpa anyị, ọ bụrụgodị na e nwere ihe mere na mberede nke mere ka ihe siwere anyị ike.—Ọma 46:1-3; 127:2; Mat. 6:31-33.
Kpọnye VIDIO Bụ́ Jehova Akwụsịtụbeghị Inyere Anyị Aka. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị ka ị mụtara n’ihe mere Nwanna Alvarado?
Gụọ 1 Timoti 5:8. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Olee otú amaokwu a si eme ka okwukwe i nwere na Jehova ga na-egboro ndị na-efe ya mkpa ha sikwuo ike?
Legodị ihe ole na ole Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị aka ma ihe siwere gị ike:
Ebila ndụ okomoko. Selata aka n’iji ụgwọ na n’imefu ego.—Mat. 6:22
Ka mkpebi ndị ị na-eme gbasara ọrụ na agụmakwụkwọ bụrụ ndị nke ga-ekwe gị ibute ofufe Jehova ụzọ ná ndụ gị.—Fil. 1:9-11
Dịrị umeala n’obi, na-emekwa mgbanwe mgbe ọ dị mkpa. Ọ bụrụ na i nweghịzi ọrụ, dị njikere ịrụ ụdị ọrụ ọzọ, ma ọrụ ndị e weere ka ọrụ dị ala, ka i nwee ike igboro ndị ezinụlọ gị mkpa ha.—Ilu 14:23
Dị njikere inyetụ ndị ọzọ ihe, ọ bụrụgodị na ihe i nwere dị obere.—Hib. 13:16
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) w23 Febụwarị, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 9, Jiri Ndụ Chineke Nyere Anyị Kpọrọ Ihe ¶1-9