MEE 12-18
ILU 13
Abụ nke 34 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Ekwela Ka “Ọkụ Ndị Ajọ Omume” Megharịa Gị Anya
(Nkeji 10)
Ihe agaghị adịrị ndị ajọ omume mma n’ọdịnihu (Ilu 13:9; it-2 196 ¶2-3)
Gị na ndị na-eme ka ihe ọjọọ yie ihe ọma akpakọrịtala (Ilu 13:20; w12 7/15 12 ¶3)
Jehova na-agọzi onye ezi omume (Ilu 13:25; w04 7/15 31 ¶6)
Ndị na-achụ ihe ndị na-agụ ụmụ mmadụ agụụ anaghị enwe obi ụtọ otú o yiri ka hà na-enwe. Ma, ndị na-eme uche Jehova na-enwe ezigbo obi ụtọ
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ilu 13:24—Olee ndụmọdụ amaokwu a na-enye anyị gbasara ịhụnanya na-ekwesịghị ekwesị? (it-2 276 ¶2)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ilu 13:1-17 (th ihe ọmụmụ nke 10)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Jiri okwu a kpụ n’ọnụ malite izi ya ozi ọma, gị esizie na Baịbụl gwa ya ihe ga-aka abara ya uru. (lmd isi nke 2 nọmba nke 5)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kpọọ onye ahụ ka ọ bịa ọmụmụ ihe. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)
6. Okwu
(Nkeji 5) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 9—Isiokwu: Ihe Ga-agaziri Ụmụaka Na-asọpụrụ Nne na Nna Ha ma Na-erubere Ha Isi. (th ihe ọmụmụ nke 16)
Abụ nke 77
7. “Ìhè Ndị Ezi Omume Na-enwusi Ike”
(Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Amamihe dị n’Okwu Chineke nakwa ihe ndị ọzọ a na-amụta na ya enweghị oyiri. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ọ na-eduzi anyị, ihe ga-agaziri anyị ná ndụ, anyị ga-enwekwa obi ụtọ karịa. Ụwa a enweghị ike imere anyị ya.
Kpọnye VIDIO Bụ́ Ụwa Agaghị Enyeli Gị Ihe Ọ Na-enweghị. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Olee otú ihe mere Nwanna nwaanyị Gainanshina si egosi na “ìhè ndị ezi omume” ka “ọkụ ndị ajọ omume” mma?—Ilu 13:9
Ya enwela mgbe ị ga-eji oge gị na-eche gbasara ihe ndị dị n’ụwa a ma ọ bụ na-akwa mmakwaara maka mkpebi ndị i merela bụ́ ndị nyeere gị aka ife Jehova. (1 Jọn 2:15-17) Kama ime otú ahụ, lekwasị anya n’otú ihe ndị ị mụtarala si ‘baara gị ezigbo uru.’—Fil. 3:8.
8. Mkpa Ọgbakọ
(Nkeji 7)
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) w23 Febụwarị, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 9, Jiri Ndụ Chineke Nyere Anyị Kpọrọ Ihe ¶10-18