Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
MEE 5-11
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 12
Ịrụsi Ọrụ Ike Bara Uru
Àgwà Dị́ Chineke Mma Nke Bara Uru Karịa Dayamọnd
O nwere ike ịna-esiri ụfọdụ ndị ohu Jehova ike ịkpata ego ga-ezuru ha igbo mkpa ha. Kama imewe ihe ha ma na ọ dịghị mma iji kpata ego, ha na-arụsi ọrụ ike. Ha na-esi otú ahụ egosi na ha ji ịkwụwa aka ọtọ na àgwà ndị ọzọ dị́ Chineke mma kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike inye ha.—Ilu 12:24; Efe. 4:28.
Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ịrụsi Ọrụ Ike Na-atọ Gị Ụtọ?
Ọ ga-adị mma ma i chebara ajụjụ nke ikpeazụ a ezigbo echiche, n’ihi na ọrụ mmadụ na-arụ ga-akacha na-atọ ya ụtọ ma ọ hụ otú o si abara ndị ọzọ uru. Jizọs sịdịrị na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) Ihe anyị na-eme na-abara ndị ahịa anyị na ndị anyị na-arụrụ ọrụ uru. Ma, ọ na-abakwara ndị ezinụlọ anyị na ndị nọ ná mkpa uru.
Ndị ezinụlọ anyị. Ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ na-agba mbọ na-akpa afọ ezinụlọ ya, o pekata mpe, e nwere ụzọ abụọ ihe ọ na-eme si abara ndị ezinụlọ ya uru. Nke mbụ bụ na ọ na-eme ka ha nweta ihe ndị dị ha mkpa, ya bụ, ihe oriri, uwe, na ebe obibi. Onye na-agba mbọ otú a na-eme ihe Chineke gwara ndị isi ezinụlọ ka ha na-eme, ya bụ, ka ha ‘na-egboro ndị nke ha mkpa ha.’ (1 Timoti 5:8) Nke abụọ bụ na onye na-agba mbọ akpa afọ ezinụlọ ya na-akụziri ụmụ ya na ịrụsi ọrụ ike bara uru. Shane, onye anyị dere ihe o kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, kwuru, sị: “E ji ịrụsi ọrụ ike mara papa m. Kemgbe ụwa ya, ọ na-arụsi ọrụ ike, na-akwụwakwa aka ya ọtọ. Ọrụ kapịnta ka ọ rụrụla karịchaa. Esi m n’aka ya mụta uru ọ bara ịrụ ọrụ aka ga-abara ndị ọzọ uru.”
Ndị nọ ná mkpa. Pọl Onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha ‘na-arụsi ọrụ ike ka ha nwee ihe ha ga-ekenye ndị nọ ná mkpa.’ (Ndị Efesọs 4:28) N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ na-akpa afọ anyị na ndị ezinụlọ anyị, anyị nwekwara ike inwe ihe anyị ga-enyetụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. (Ilu 3:27) Ihe a gosiri na ịrụsi ọrụ ike na-eme ka mmadụ nwee ihe ọ ga-enyetụ onye ọzọ, si otú ahụ nweta obi ụtọ a na-enweta n’inye ihe.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Àbụ M A Kwaa A Kwụrụ?
● Chọpụta otú nsogbu gị haruru. Mata mgbe e nwere nnukwu nsogbu na mgbe nsogbu dịnụ bụ nke obere ya. Baịbụl sịrị: “Ọ bụ onye nzuzu na-egosipụta iwe ya n’otu ụbọchị ahụ, ma onye maara ihe na-ekpuchi ihe ihere.” (Ilu 12:16) Ọ bụghị nsogbu niile ka ị ga-ekwe ka o chegbuwe gị.
Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Joanne sịrị: “N’ụlọ akwụkwọ anyị, e nwere ụmụ klas anyị ndị ọ na-abụ e nwee obere ihe merenụ, ha ana-ekwu gbasara ya ka à ga-asị na ọ bụ ihe dị oké mkpa. Ndị enyi ha n’Ịntanet gwazie ha na ihe ahụ ha kwuru dị mma, ha esiwekwuo ọnwụ gbasara ya. Ọ na-emezi ka o sikwuoro ha ike ịna-ejide onwe ha ma ha nwee nsogbu.”
MEE 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 13
Ekwela Ka “Ọkụ Ndị Ajọ Omume” Megharịa Gị Anya”
it-2 196 ¶2-3
Ọkụ
Ihe Ndị Ọzọ Ọ Nọchiri Anya Ha. E ji ihe ọ bụla mmadụ ji mere ìhè o ji ahụ ụzọ tụnyere ọkụ. Ọ bụ ụdị ihe atụ a ka akwụkwọ Ilu ji gosi ọdịiche dị n’onye ezi omume na onye ajọ omume. Ọ sịrị: “Ìhè ndị ezi omume na-enwusi ike, ma a ga-emenyụ ọkụ ndị ajọ omume.” (Ilu 13:9) Ọkụ ndị ezi omume na-enwusikwu ike mgbe niile. Ma, otú ọ sọkwara ọkụ ndị ajọ omume nwuwe, otú ọ sọkwara ihe gaziwere ha, Chineke ga-eme ka ọkụ ha bụrụzie ọchịchịrị, nke ga-eme ka ha kpọbie ụkwụ. Ọ bụkwa ụdị ihe a ga-eme onye na-akpọ nne ya na nna ya iyi.—Ilu 20:20.
‘Imenyụ ọkụ’ mmadụ pụtakwara na onye ahụ enweghịzi ọdịnihu. Ilu ọzọ kwuru, sị: “Ihe agaghị adịrị onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ mma n’ọdịnihu. A ga-emenyụ ọkụ ndị ajọ omume.”—Ilu 24:20.
Fee Chineke Nke Na-eme Ka Mmadụ Nwere Onwe Ya
3 Ebe Setan mere ka mmadụ abụọ ndị zuru okè na ndị mmụọ ozi nupụrụ Chineke isi, o nwekwara ike iduhie anyị. Ọ gbanwebeghị otú o si aghọ aghụghọ. Ọ chọrọ ime ka anyị chee na iwu Chineke bụ ibu arọ, na ọ na-eme ka anyị ghara ịna-ekpori ndụ ma ọ bụ na-enwe obi ụtọ. (1 Jọn 5:3) Ọ bụ otú ahụ ka ndị ụwa si eche echiche. Ọ bụrụ na anyị na ha na-anọ mgbe niile, anyị nwere ike ichewe echiche ka ha. Otu nwanna nwaanyị dị iri afọ abụọ na anọ kwara iko n’oge gara aga. O kwuru, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ kpataara m nsogbu, nke ka nke, n’ihi na achọghị m ịgbapụ iche ma mụ na ụmụaka ibe m nọrọ.” O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ndị enyi mmadụ nwere ike ime ka o mee ihe na-adịghị mma.
“Onye Ọ Bụla nke Nwere Ezi Uche Ji Ihe Ọmụma Arụ Ọrụ”
Onye dị akọ ma zie ezie nke na-akpa àgwà n’ụzọ na-egosi ihe ọmụma ga-enweta ngọzi. Solomọn mesiri anyị obi ike, sị: “Onye ezi omume na-eri ihe ruo mgbe afọ juru mkpụrụ obi ya: ma afọ ndị na-emebi iwu, ihe na-akọ ya.” (Ilu 13:25) Jehova maara ihe ga-abara anyị uru n’akụkụ ọ bụla nke ndụ—n’ihe banyere ezinụlọ anyị, ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ, n’ozi anyị, ma ọ bụ mgbe a na-adọ anyị aka ná ntị. Sitekwa n’iji amamihe na-etinye ndụmọdụ ndị a na-achọta n’Okwu ya n’ọrụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị ga-ebi ndụ kasị mma.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 276 ¶2
Ịhụnanya
Ịhụnanya na-ekwesịghị ekwesị. Ihe ndị a mere ka o doo anya na naanị mgbe mmadụ ga-enweli ịhụnanya kwesịrị ekwesị bụ ma onye ahụ na-agbalị ka o nwee mmụọ Chineke, na-eso nduzi ya, nweekwa amamihe si n’Okwu ya. Dị ka ihe atụ, nne ma ọ bụ nna nwere ike ịhụ nwa ya n’anya. Ma, o nwere ike ikwe ka ịhụnanya ya gafee ókè ma ọ bụ ghara ikwesị ekwesị, ya ana-emere nwa ahụ ihe niile ọ chọrọ, ghara inwe mgbe ọ ga-ajụ imere ya ihe ụfọdụ. O nwekwara ike ghara ịna-adọ nwa ahụ aka ná ntị ma ọ bụ ịna-apịa ya ihe mgbe ụfọdụ, otú nne ma ọ bụ nna kwesịrị ịna-eme. (Ilu 22:15) O nwere ike ịbụ na ihe a o chere bụ́ ịhụnanya bụ n’eziokwu iji nwa ya eme ọnụ, nke bụ́kwanụ mmadụ ịchọ ihe ga-abara naanị ya uru. Baịbụl kwuru na ọ bụghị ịhụnanya ka onye ahụ na-egosi, kama ọ bụ ịkpọ asị, n’ihi na ọ naghị eme ihe ga-azọ nwa ya ndụ.—Ilu 13:24; 23:13, 14.
MEE 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 14
Chebara Ihe Ọ Bụla Ị Chọrọ Ime Echiche Ma E Nwee Ọdachi
Jiri Ndụ Chineke Nyere Anyị Kpọrọ Ihe
10 Mgbe ụfọdụ, e nwere ihe ndị nwere ike ịta isi anyị anyị na-agaghị egbochili, dị ka ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọrịa na-efe efe, ma ọ bụkwanụ ọgba aghara. Ma, ọ bụrụ na ụdị ihe ndị a emee, e nwere ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime iji chebe onwe anyị, dị ka ime ihe ndị ọchịchị kwuru. Ha nwere ike ịgwa anyị ka anyị si ebe ahụ pụọ ma ọ bụkwanụ nye iwu ndị ọzọ. (Rom 13:1, 5-7) E nwere ụfọdụ ọdachi anyị nwere ike ịkwadebe maka ha. Anyị kwesịkwara ime ihe ndị ọchịchị gwara anyị iji kwadebe maka ọdachi ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịchọpụta na ọ ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị enwee mmiri, nri ndị na-anaghị emebi ngwa ngwa, nakwa ọgwụ ụfọdụ anyị dowere maka ihe gbata gbata.
11 Gịnị ka anyị ga-eme ma e nwee ọrịa na-efe efe n’ebe anyị bi? Anyị kwesịrị ige ndị ọchịchị ntị. Ha nwere ike ịgwa anyị ka anyị na-akwọ aka anyị, ghara ịna-anọ ndị mmadụ nso, na-ekpuchi imi na ọnụ, ma ọ bụkwanụ ka anyị na-anọpụ iche ma anyị bute ọrịa ahụ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a, anyị na-egosi na anyị ji ndụ Jehova nyere anyị kpọrọ ihe.
12 Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee, ndị enyi anyị na ndị agbata obi anyị nwere ike ịna-akọsa ihe na-abụghị eziokwu, ma ọ bụkwanụ a na-akọsa ya na tiivi na redio. Kama ikwere “ihe niile e kwuru,” anyị kwesịrị ikwere ihe ndị doro anya na ha si n’aka ndị ọchịchị nakwa ndị dọkịta. (Gụọ Ilu 14:15.) Òtù Na-achị Isi na alaka ụlọ ọrụ na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka ha mata otú ihe si aga tupu ha agwa anyị ihe anyị ga-eme gbasara ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma. (Hib. 13:17) Ọ bụrụ na anyị emee ihe ha gwara anyị, anyị nwere ike ichebe onwe anyị nakwa ndị ọzọ. Ihe a nwekwara ike ime ka a na-eto Ndịàmà Jehova n’ebe anyị bi.—1 Pita 2:12.
Na-akata Obi Ka Zedọk
11 Ọ bụrụ na a gwa anyị ka anyị nyere ụmụnna anyị aka n’oge nsogbu, olee otú anyị ga-esi kata obi ka Zedọk? (1) Soro ntụziaka e nyere. N’ụdị oge ahụ, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị dịrị n’otu. Anyị kwesịrị ịna-erube isi ná ntụziaka alaka ụlọ ọrụ nyere anyị. (Hib. 13:17) Ndị okenye kwesịrị ịna-eleba anya mgbe niile n’ihe ndị e kwuru gbasara otú a ga-esi na-akwadebe maka ọdachi nakwa ihe a ga-eme ma e nwee ọdachi. (1 Kọr. 14:33, 40) (2) Nwee obi ike ma na-akpachapụ anya. (Ilu 22:3) Na-akpa àgwà ka onye ma ihe. Kpachara anya ka ị ghara ịba ná nsogbu. (3) Tụkwasị Jehova obi. Cheta na Jehova chọrọ ka ọkọ ghara ịkọ gị na ụmụnna gị. O nwere ike ime ka i nyere ụmụnna gị aka n’enweghị ihe ga-eme gị.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 1094
Ichebara Ihe Echiche
Ma, e nwekwara ike ịkpọ onye na-echebara ihe echiche asị. Ọ ga-abụ ya bụ ihe e kwuru n’Ilu 14:17, sị: “A kpọrọ onye na-echebara ihe echiche asị.” Ọtụtụ mgbe, ndị na-anaghị echebara ihe echiche anaghị ele ndị na-echebara ihe echiche anya ọma. E nwekwara ike ikwu na a na-akpọ ndị na-etinye obi ha n’ime uche Chineke asị. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na unu abụghị nke ụwa, kama m si n’ụwa họrọ unu, ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.” (Jọn 15:19) Ma, okwu Hibru a sụgharịrị ‘ichebara ihe echiche’ n’Ilu 14:17 nwere ike ịpụta iche ihe ọjọọ n’echiche. N’ihi ya, amaokwu a nwekwara ike ịpụta na a na-akpọ onye na-eche ihe ọjọọ n’echiche asị. Ọ bụ ya mere ụfọdụ Baịbụl ji sụgharịa ya, sị: ‘Onye ọ bụla nke na-ezu nzube ọjọọ dị iche iche, a na-akpọ ya asị.’—Baibul Nsọ (Ndezighari Ọhuru), Bible Nsọ nke Union Version.
MEE 26–JUN 1
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 15
Nyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Na-enwe Obi Ụtọ
Anyị Ga-eje Ije n’Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Nke Anyị!
16 Job na-ele ọbịa. (Job 31:31, 32) Ọ bụrụgodị na anyị abaghị ọgaranya, anyị nwere ike ‘na-ele ọbịa.’ (Rom 12:13) Anyị na ndị ọzọ nwere ike iri obere nri anyị nwere ma ọ bụrụ na anyị echeta na “nri e ji naanị akwụkwọ nri sie dị mma n’ebe e nwere ịhụnanya karịa ehi mara abụba n’ebe e nwere ịkpọasị.” (Ilu 15:17) Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị ejiri ịhụnanya rikọọ nri, obi ga-adị anyị ụtọ, a ga-ewulikwa anyị elu, ya sọkwa nri ahụ ya dị obere.
Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume, Karịchaa Ugbu A
16 Ọ gaghị adị mma ma anyị chee na anyị agaghị agbali ndị ọzọ ume n’ihi na ọ naghị adịrị anyị mfe ịgwa mmadụ okwu. Ịgba ndị ọzọ ume esighị oké ike. I nwere ike mụmụọrọ mmadụ ọnụ ọchị ma i kelewe ya, ma ọ mụmụrụghị gị ọnụ ọchị, o nwere ike ịbụ na e nwere ihe na-enye ya nsogbu. Naanị ige ya ntị nwere ike ịgba ya ume.—Jems 1:19.
17 Obi jọrọ otu nwanna na-eto eto aha ya bụ Henri njọ mgbe ndị ikwu ya hapụrụ ọgbakọ. Papa ya, onye bụbu okenye a na-akwanyere ùgwù, sokwa hapụ ọgbakọ. Otu onye nlekọta sekit chọpụtara na obi adịchaghị ya mma, ya akpọrọ ya gaa n’ebe a na-ere kọfị. O gere ya ntị mgbe ọ na-akọrọ ya otú o si dịrị ya n’obi. Ihe a onye nlekọta a mere gbara ya ume. Henri bịaziri ghọta na ihe ọ ga-eme iji nyere ndị ezinụlọ ya aka ka ha lọghachi n’ọgbakọ bụ ịnọgide na-efe Jehova. Ihe ọzọ kasiri ya obi bụ ịgụ Abụ Ọma 46; Zefanaya 3:17; na Mak 10:29, 30.
18 Akụkọ Marthe na Henri na-egosi na anyị nwere ike ịgba nwanna kwesịrị ka a gbaa ya ume, ume. Eze Sọlọmọn kwuru, sị: “Leekwa nnọọ ka okwu e kwuru n’oge ya si dị mma! Ìhè nke anya na-eme ka obi ṅụrịa; akụkọ dị mma na-eme ka ọkpụkpụ maa abụba.” (Ilu 15:23, 30) Ihe ọzọ nwere ike ịgba onye dara mbà n’obi ume bụ ịgụrụ ya ihe dị n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na jw.org. Ihe Pọl kwuru gosiri na ịgụkọ abụ Alaeze ọnụ nwere ike ịgba mmadụ ume. Ọ sịrị: “Jirinụ abụ ọma na otuto a na-enye Chineke na abụ ime mmụọ na amara na-ezi ibe unu ihe, na-adụkwa ibe unu ọdụ, na-abụkunụ Jehova abụ n’ime obi unu.”—Kọl. 3:16; Ọrụ 16:25.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Onye Kraịst Ò Nwere Ike Ịga Ụlọ Ọgwụ Ma Ọ Bụ Ṅụọ Ọgwụ Ma Ọ Rịawa Ọrịa?
2. M̀ kwesịrị ịmata ihe ndị dọkịta ndị ọzọ kwuru gbasara otú a chọrọ isi agwọ m ọrịa? Inwe “ọtụtụ ndị ndụmọdụ” ga-abara gị uru, karịchaa, ma ọ bụrụ na ọrịa na-arịa gị abụghị obere ọrịa.—Ilu 15:22.
JUN 2-8
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 16
Ajụjụ Atọ Ndị Ga-enyere Anyị Aka Ịna-eme Ezigbo Mkpebi
Mee Mkpebi Ziri Ezi Ugbu A Ị Na-eto Eto
11 Ihe kacha eme anyị obi ụtọ bụ ijere Jehova ozi. (Ilu 16:20) Ọ dị ka Barọk bụ́ odeakwụkwọ Jeremaya ò chefuru ihe a. O nwere mgbe ijere Jehova ozi na-anaghịzi atọ ya ụtọ. Jehova gwara ya, sị: “Ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu. Kwụsị ịchọ ya. N’ihi na, lee, m ga-eme ka ọdachi dakwasị anụ ahụ́ niile, . . . ma m ga-enye gị mkpụrụ obi gị ka ọ bụụrụ gị ihe nkwata n’ebe niile ị ga-aga.” (Jere. 45:3, 5) Gịnị ka i chere gaara eme ka Barọk nwee obi ụtọ? Ọ̀ bụ ime ihe ọ chọrọ ma mechaa nwụọ, ka ọ̀ bụ ime ihe Jehova chọrọ ma ghara ịnwụ mgbe a ga-ebibi Jeruselem?—Jems 1:12.
12 Ramiro bụ otu n’ime ụmụnna ndị obi na-atọ ụtọ n’ihi ijere ndị ọzọ ozi. O kwuru, sị: “Anyị bi n’otu ime obodo dị n’Ugwu Andiz. Nwanne m nwoke nke tọrọ m kwuru na ya ga-edunye m mahadum. Ebe ọ bụ na ezinụlọ anyị dara ogbenye, ihe a ọ chọrọ imere m abụghị obere ihe. Ma, o tebeghị e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova. N’oge ahụkwa, otu ọsụ ụzọ gwara m ka m soro ya gaa kwusaa ozi ọma n’otu obere obodo. Eso m ya gaa, nọrọ ebe ahụ mụọ otú e si akpụ isi, mepeekwa ebe a na-akpụ isi ka m nwee ike na-enweta ego m ga-eji na-egbo mkpa m.” Ọtụtụ ndị bi ebe ahụ kwetara ka ha na ya mụwa Baịbụl. E mechara hiwe ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ebe ahụ amụ ihe. Ramiro gafeziri n’ọgbakọ ahụ. Ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile n’ọgbakọ ahụ kemgbe afọ iri. Ọ sịrị na o nweghị ọrụ ọzọ ga-eme ka o nwee ụdị obi ụtọ ọ na-enwe ugbu a ọ na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’asụsụ nke ha.
Ị̀ Gbanweela?
ANYỊ niile nwere otú anyị si eji ejiji, ụdị nri anyị na-eri, na ụdị àgwà anyị na-akpa. Ihe na-akpatakarị ya bụ otú e si zụọ anyị, ebe anyị bi, na ndị anyị na ha na-akpa.
2 Ma, e nwere ihe ndị dị mkpa karịa ụdị nri anyị na-eri na ụdị ejiji anyị na-eji. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-eto, a na-akụziri anyị na e nwere ihe ndị dị mma na ihe ndị na-adịghị mma. Ma, ihe otu onye kpọrọ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ nwere ike ịdị iche n’ihe onye ọzọ kpọrọ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Akọnuche anyị nwekwara ike ime ka anyị na-eme ihe ụfọdụ otú anyị si eme ha. Baịbụl kwuru na ọtụtụ mgbe, “ndị mba ọzọ, ndị na-enweghị iwu, . . . na-eme ihe ndị dị n’iwu.” (Rom 2:14) Ma, e nwee ihe Chineke na-enyeghị iwu ọ bụla banyere ya, ọ̀ pụtara na anyị nwere ike ime ya otú ndị ezinụlọ anyị ma ọ bụ ndị obodo anyị si eme ya?
3 Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, e nwere ihe abụọ dị mkpa mere na Ndị Kraịst ekwesịghị ime otú ahụ. Nke mbụ bụ na Baịbụl gwara anyị, sị: “E nwere ụzọ nke ziri ezi n’anya mmadụ, ma ụzọ ọnwụ ka nsọtụ ya ga-emecha bụrụ.” (Ilu 16:25) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị enweghị ike ikpebi ihe ga-abara anyị uru mgbe niile. (Ilu 28:26; Jere. 10:23) Nke abụọ bụ na Baịbụl kwuru na ọ bụ Setan bụ “chi nke usoro ihe a.” Ọ bụ ya na-ekpebi ihe a na-eme n’ụwa, ma ihe ndị ụwa na-ewere ka ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ma ihe ndị na-ewu ewu. (2 Kọr. 4:4; 1 Jọn 5:19) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova gọzie anyị ma na-ele anyị anya ọma, anyị kwesịrị ime ihe e kwuru ná Ndị Rom 12:2.—Gụọ ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 629
Ịdọ Aka ná Ntị; Ahụhụ
Ihe Na-eme ma Mmadụ Nabata Ịdọ Aka ná Ntị Ma Ọ Bụ Jụ Ya. Ndị ajọ omume, ndị nzuzu, ma ọ bụ ndị na-akpa àgwà iberiibe na-ajụ ịdọ aka ná ntị Jehova kpamkpam, si otú ahụ gosi na ha kpọrọ ịdọ aka ná ntị ya asị. (Ọma 50:16, 17; Ilu 1:7) Nsogbu ụdị nzuzu a na-akpata bụ na a na-adọkwu ha aka ná ntị, ọtụtụ mgbe, ọ na-abụzi ntaramahụhụ. Dị ka akwụkwọ Ilu kwuru, “ahụhụ ndị nzuzu na-ata bụ na ha ga na-ezuzu nzuzu.” (Ilu 16:22) Ha nwere ike ịkpatara onwe ha ịda ogbenye, mmechuihu, ọrịa, na nnwuchu ọnwụ. Akụkọ ụmụ Izrel gosiri na nsogbu ndị mmadụ na-akpatara onwe ha ma ha jụ ịdọ aka ná ntị karịrị akarị. Ndị Izrel anabataghị aka ná ntị na mgbazi si n’aka ndị amụma Chineke. Mgbe Jehova kwụsịrị ichebe ha na ịgọzi ha ka iji dọọ ha aka ná ntị, ha anabataghị ịdọ aka ná ntị ya. N’ikpeazụ, a tara ha ezigbo ahụhụ e bu ụzọ gwa ha na a ga-ata ha, nke bụ́ na a ga-emeri ha ma dọrọ ha n’agha gaa mba ọzọ.—Jere. 2:30; 5:3; 7:28; 17:23; 32:33; Hos. 7:12-16; 10:10; Zef. 3:2.
JUN 9-15
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 17
Ka Udo Dịrị n’Alụmdi na Nwunye Unu
Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịna-ebu Iwe n’Obi
Gwa onwe gị eziokwu. Baịbụl kwuru na e nwere ndị “na-ewekarị iwe.” (Ilu 29:22) Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si eme? Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ewekarị iwe? Obere ihe ọ bụla mmadụ mere ọ̀ na-ewe m iwe?’ Baịbụl kwuru na ‘onye na-ekwu banyere otu ihe mgbe niile na-ekewa ndị ha na ibe ha dị ná mma.’ (Ilu 17:9; Ekliziastis 7:9) Ụdị ihe a nwekwara ike ime n’ezinụlọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-ebukarịrị di gị ma ọ bụ nwunye gị iwe n’obi, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ nwere ike ịna-enwere ya ndidi?’—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Pita 4:8.
Idozi Nsogbu
1. Wepụtanụ oge unu ga-eji kwurịta nsogbu unu nwere. “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, . . . oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekliziastis 3:1, 7) Dị ka e gosiri n’esemokwu ahụ e kwuru banyere ya n’elu, nsogbu ụfọdụ nwere ike ịkpasu mmadụ iwe. Mgbe nke ahụ mere, jide mmụọ gị, hapụgodị okwu ahụ, ‘gbachi nkịtị,’ tupu iwe ewee gị. I nwere ike ime ka unu na-adị ná mma ma ọ bụrụ na i rube isi na ndụmọdụ a dị na Baịbụl, nke sịrị: “Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ; ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.”—Ilu 17:14.
Ma, e nwekwara “oge ikwu okwu.” Nsogbu dị ka ahịhịa, ọ na-eto ma e leghara ya anya. N’ihi ya, elegharala nsogbu ahụ anya, wee chee na ọ ga-akwụsị n’onwe ya. Ọ bụrụ na ị gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ka unu kwụsịgodị ihe unu na-ekwu banyere nsogbu ahụ, gosi na ị na-akwanyere ya ùgwù site n’ikwu mgbe na-adịghị anya unu ga-ekwurịta ya. Ikwu mgbe ọzọ unu ga-ekwurịta ya, ga-enyere unu aka itinye ndụmọdụ dị na Baịbụl n’ọrụ, nke bụ́: “Unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.” (Ndị Efesọs 4:26) I kwesịrị ime ihe i kwuru.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 790 ¶2
Anya
E ji otú mmadụ si emegharị anya ya amata ihe dị ya n’obi. Anya mmadụ nwere ike igosi na ọ na-emetara onye ọzọ ebere ma ọ bụ na ọ naghị emetara ya. (Diut. 19:13) Mmadụ nwere ike ‘ịrọ onye ọzọ anya’ ma ọ bụ ‘tabiere ya anya’ iji chịa ya ọchị ma ọ bụ iji gosi na o bu ihe ọjọọ n’obi. (Ọma 35:19; Ilu 6:13; 16:30) Ọ bụrụ na mmadụ achọghị ịhụ onye ọzọ ma ọ bụ na ọ chọghị imere onye ahụ ihe, e nwere ike ikwu na o mechiri anya ya ma ọ bụ na o mere anya ka à ga-asị na ọ hụghị onye ahụ. (Mat. 13:15; Ilu 28:27) E kwuru na anya onye nzuzu “anaghị adị otu ebe” iji gosi na echiche ya na-awagharị awagharị, ọ naghị adị ebe o kwesịrị ịdị. (Ilu 17:24) Otú anya mmadụ dị nwedịrị ike igosi ma ahụ́ ọ̀ dị ya ma ọ bụ na ọ dịghị ya, ma ike ọ̀ dị ya ma ọ bụ na ọ dịghị ya, ma obi ọ̀ dị ya mma ma ọ bụ na ọ dịghị ya. (1 Sam. 14:27-29; Diut. 34:7; Job 17:7; Ọma 6:7; 88:9) Eze Jehoshafat gwara Jehova, sị: “Anyị na-atụ anya na ị ga-enyere anyị aka.”—2 Ihe 20:12.
JUN 16-22
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 18
Na-ekwu Ihe Ga-agba Ndị Nọ n’Ọrịa Ume
Ezigbo Amamihe Na-eti Mkpu
17 Chee echiche tupu gị ekwuo okwu. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, okwu anyị nwere ike ịkpata ezigbo nsogbu. Baịbụl sịrị: “Okwu mmadụ kwuru n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, Ma okwu ndị ma ihe na-agwọ mmadụ.” (Ilu 12:18) Anyị na ndị ọzọ ga-adị ná mma ma ọ bụrụ na anyị anaghị eji ihe ndị ọzọ na-emejọ agba asịrị. (Ilu 20:19) Anyị chọọ ka okwu anyị na-agwọ ndị mmadụ kama ịna-ama ha ka mma, anyị kwesịrị ịna-amụ Okwu Chineke ma na-echebara ya echiche. (Luk 6:45) Ichebara ihe Baịbụl kwuru echiche ga-eme ka okwu anyị dịrị ka “ebe e si enweta amamihe,” nke na-akasi ndị ọzọ obi.—Ilu 18:4.
mrt igbe dị n’isiokwu nke 19
Ihe Anyị Ga-eme ma Ọrịa Bịa Anyị na Mberede
Na-ege ya ntị nke ọma. Otu n’ime ụzọ kacha mma i nwere ike isi nyere enyi gị aka bụ ige ya ntị nke ọma mgbe ọ chọrọ ikwu okwu. Echela na ị ga-etinyerịrị ọnụ n’ihe ọ bụla o kwuru. Ọtụtụ mgbe, naanị ige ya ntị ezuola. Gbalịa ka ị ghara ịma ya ikpe ma ọ bụ ịta ya ụta. Echela na ị ma otú obi dị enyi gị, karịchaa, ma ọ bụrụ na otú ọ dị n’anya egosighị na ọ na-arịa ọrịa.—Ilu 11:2.
Na-ekwu okwu ka onye nwere obi ike. O nwere ike ị gaghị ama ihe ị ga-ekwu, ma ikwutụ obere ihe iji gosi na ị ghọtara na ọ dịrịghị enyi gị mfe ga-aka akasi ya obi karịa ịgbacha ya nkịtị. Ọ bụrụ na ọnọdụ ya enyeghị gị ọnụ okwu, gbalịa kwuo obere ihe si gị n’obi, dị ka “Amaghị m ihe m ga-ekwu ekwu, mana, m chọrọ ka ị mara na ihe banyere gị na-emetụ m n’obi.” Agwala ya, sị, “Ihe ka ga-akakwu njọ” ma ọ bụ “Ma ó nweghị ọzọ, ị ka . . . . “
Ị ga-egosi na i nwere mmasị n’ebe enyi gị nọ ma ọ bụrụ na ị gbalịa ka ị mata gbasara ọrịa ọ na-arịa. O yiri ka ọ̀ ga-enwe obi ụtọ na ị gbara mbọ ka ị ghọta ihe ya na ya na-alụ, ihe ị na-agwa ya ga-akakwa eru ya n’obi. (Ilu 18:13) Ma, kpachara anya ka ị ghara ịtụrụ ya ihe ọ ga-eme.
Nyere ya ezigbo aka. Kama iche na ị ma ihe ị ga-emere ya iji nyere ya aka, jụọ ya ihe ọ ga-achọ ka i meere ya. Ma, cheta na o nwere ike enyi gị agaghị ekweta na ọ chọrọ enyemaka gị maka na ọ chọghị ịbụrụ gị ibu arọ. O mee otú ahụ, gbalịa gwa ya ihe ị ga-achọ imere ya, dị ka ịgara ya ahịa, ihichara ya ụlọ, ma ọ bụkwanụ ịrụrụ ya ọrụ ndị ọzọ.—Ndị Galeshia 6:2.
Ike agwụla gị. Ka enyi gị na-edi ọrịa ọ na-arịa, o nwere ike mgbe ụfọdụ ya akagbuo agba gị na ya yiri ma ọ bụ ghara ịchọ ka gị na ya kwuo okwu. Na-enwere ya ndidi, na-agbalịkwa ka ị ghọta ya. Akwụsịla ịgwa ya na ị chọrọ inyere ya aka.—Ilu 18:24.
Otú Ị Ga-esi Enyere Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ Aka
“Na-agụgụ ndị dara mbà.”—1 NDỊ TESALONAỊKA 5:14.
Enyi gị nwere ike ịna-echegbu onwe ya ma ọ bụ na-eche na e nweghị uru ọ bara. Ị ga-akasi ya obi ma gbaa ya ume ma ọ bụrụ na ị na-eme ka obi sie ya ike na ị hụrụ ya n’anya, ọ bụrụgodị na ị maghị kpọmkwem ihe i kwesịrị ikwu.
“Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya”—ILU 17:17.
Na-enyere ya ezigbo aka. Kama iche na ị ma otú ị ga-esi nyere ya aka, jụọ ya ihe ọ ga-achọ ka i mee. Ọ bụrụ na ọ na-esiri enyi gị ike ịkọwa ihe ndị dị ya mkpa, gbalịa tụọrọ ya aro ihe gị na ya nwere ike imekọ ọnụ, dị ka gị na ya iso kpagharịa. Ma ọ bụkwanụ i nwere ike ịgwa ya ka ị gaara ya ahịa, ka i hichaara ya ụlọ, ma ọ bụ meere ya ihe ndị ọzọ.—Ndị Galeshia 6:2.
‘Na-enwe ndidi.’—1 NDỊ TESALONAỊKA 5:14.
O nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adị enyi gị nke ikwu okwu. Mee ka obi sie ya ike na ọ ga-amasị gị ige ya ntị mgbe ọ bụla ọ chọrọ ikwu okwu. Ọrịa enyi gị na-arịa nwere ike ime ka o kwuo ma ọ bụ mee ihe ga-ewute gị. O nwere ike ịkagbu ihe gị na ya kwetaburu na unu ga-eme ma ọ bụkwanụ ahụ́ agbakasịwa ya. Mgbe ị na-agbalị inyere ya aka, na-enwere ya ndidi, na-egosikwa na ị ghọtara nsogbu ya.—Ilu 18:24.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 271-272
Ife Nza
A na-efe nza n’oge ochie ma a chọọ ikpebi ihe. Otú e si efe ya bụ na a na-awụnye ụmụ obere okwute ma ọ bụ osisi n’uwe ma ọ bụ n’apata ụkwụ mmadụ ma ọ bụ n’ite, a yọgharịa ha. A na-ahọrọzi onye okwute ya ma ọ bụ osisi ya dapụtara ma ọ bụkwanụ onye a manyere aka wepụta nke ya. E nwere ike iwere ife nza ka ikpe ekpere, otú ahụ e nwekwara ike iwere ịṅụ iyi ka ikpe ekpere. Ma, e nwekwara ike ikpe ekpere mgbe a na-efe nza. A na-arịọ Jehova enyemaka ya, tụọkwa anya na ọ ga-eme ihe. N’ebe ụfọdụ na Baịbụl, a sụgharịrị okwu Hibru bụ́ goh·ralʹ (ya bụ, nza) “òkè” ma ọ bụ ‘ihe e ketara.’—Josh. 15:1; Ọma 16:5; Aịza. 57:6.
Ihe dị iche iche e ji ya mee. Ilu 16:33 sịrị: “Mmadụ na-efe nza, ma ọ bụ Jehova na-ekpebi ihe niile a na-efeta na nza.” N’Izrel, a na-eji ife nza eme ka esemokwu bie. Baịbụl kwuru, sị: “Ife nza na-eme ka esemokwu bie, ọ na-edozikwara dike na dike okwu.” (Ilu 18:18) A naghị eji ya eme egwuregwu ma ọ bụ agba chaa chaa. E nweghị onye ya na ibe ya na-eti n’aka mgbe a na-efe nza, a naghịkwa eji ya eri mmadụ ego ma ọ bụ amata onye meririnụ ma ọ bụ onye e meriri. A naghị efe nza iji gbaa ọnyà ego n’ụlọ nsọ ma ọ bụ iji mee ka ndị nchụàjà baa ọgaranya ma ọ bụkwanụ iji nweta ego a ga-enye ndị ụwa na-atụ n’ọnụ. Ma, ihe mere ndị agha Rom ji fee nza mgbe ha na-eke uwe Jizọs, otú e buru n’amụma n’Abụ Ọma 22:18, bụ maka na onye ọ bụla n’ime ha na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru.—Mat. 27:35.
JUN 23-29
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 19
Bụrụ Ezigbo Enyi Ụmụnna Gị
Otú Anyị Ga-esi Na-ahụkwu Ụmụnna Anyị n’Anya
16 Lekwasị anya n’ihe ọma ụmụnna gị na-eme, ọ bụghị n’ihe ha na-anaghị emeta. Iji maa atụ, ka e were ya na gị na ụmụnna gara nnọkọ. Unu kporiri ndụ ná nnọkọ ahụ. Mgbe unu mechakwara, unu niile sere foto. Unu sedịrị foto abụọ ọzọ, a dịghị ama ama ya abụrụ na nke mbụ ahụ adịghị mma. Ugbu a, unu enweela foto atọ. Ma, n’otu n’ime ha, e nwere otu nwanna ihu ya gbarụrụ agbarụ. Olee ihe ị ga-eme foto ahụ? Ị ga-ewepụ ya n’ihi na ị ka nwere foto abụọ ọzọ ebe ụmụnna niile na-achị ọchị, ma nwanna ahụ.
17 Anyị nwere ike iji foto ahụ tụnyere ụdị ihe anyị na-echeta gbasara ụmụnna anyị. A na-enwekarị oge anyị na ụmụnna anyị ji nọrịa, mee ihe ndị tọrọ anyị ụtọ. Ma, ka e were ya na e nwere otu oge nwanna kwuru ma ọ bụ mee ihe na-adịghị mma. Gịnị ka anyị kwesịrị ime gbasara ya? Anyị kwesịrị ịgbalị chefuo ya n’ihi na e nwere ihe ndị ọzọ dị mma gbasara onye ahụ anyị kwesịrị ịna-echeta. (Ilu 19:11; Efe. 4:32) Anyị ga-echefuli ihe ahụ na-adịghị mma nwanna ahụ mere anyị n’ihi na e nwere oge ndị ọzọ dị mma anyị na ya nọrịrị. Ọ bụ ụdị ihe ndị a ka anyị kwesịrị ịna-echeta ma jiri ha kpọrọ ihe.
Na-ahụkwu Jehova na Ndị Ọzọ n’Anya
10 Anyịnwa na-achọkwa ụzọ ndị anyị si enyere ụmụnna anyị aka. (Hib. 13:16) Ì chetara Nwanna Nwaanyị Anna anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ? Legodị ihe o mere. Mgbe oké ifufe kpachara mkpamkpa, ya na di ya gara n’ụlọ otu nwanna chọpụta na ifufe ahụ mebiri elu ụlọ ya, nke mere ka ezinụlọ ahụ ghara inwe uwe dị ọcha. Nwanna Nwaanyị Anna sịrị: “Anyị chịịrị efe ha, saa ya, dee ya, pịa ya ma chịghachiri ha ya. Anyị lere ihe ahụ anyị mere anya ka obere ihe. Ma, o mere ka anyị na ezinụlọ ahụ dịrị n’ezigbo mma ruo taa.” Otú Nwanna Nwaanyị Anna na di ya si hụ ụmụnna ha n’anya mere ka ha nyere ha aka.—1 Jọn 3:17, 18.
11 Ọ bụrụ na anyị adịrị obiọma, na-egosikwa ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya, ha ga-amata na anyị na-agbalị ime ka Jehova. Obi nwere ike ịdị ha ụtọ maka ihe anyị meere ha karịa otú anyị chere. Obi na-adị Nwanna Nwaanyị Khanh anyị kwuburu okwu ya ụtọ ma o cheta ndị nyeere ya aka. Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ maka ihe ọma ụmụnna nwaanyị meere m kpọrọ m gaa ozi ọma. Ha na-abịa n’ụlọ m kpọrọ m, gwakwa m ka m soro ha gaa tatụ ihe ma ọ bụ rie nri ehihie. Ha na-ebulatakwa m. Ugbu a, achọpụtala m na ha gbara ezigbo mbọ iji mee ya. Ihe mere ha ji mee ya bụ na ha hụrụ m n’anya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mmadụ niile ga-ekele anyị maka ihe anyị meere ha. Mgbe Nwanna Nwaanyị Khanh na-ekwu banyere ndị nyeere ya aka, ọ sịrị: “Ọ dị m ka ya bụrụ na m ga-akwụli ndị niile nyeere m aka ụgwọ ihe ha meere m. Ma, amaghị m ebe ha niile bi. Mana, Jehova ma. M na-ekpe ekpere ka ọ kwụghachiri m onye nke ọ bụla n’ime ha.” Ihe Nwanna Nwaanyị Khanh kwuru bụ eziokwu. Jehova na-ahụ ihe anyị mere iji nyere ndị ọzọ aka ọ bụrụgodị na ihe ahụ di ezigbo obere. Ọ na-ewere ya ka àjà bara ezigbo uru anyị chụụrụ ya nakwa ka ihe anyị gbazinyere ya ọ ga-akwụghachi.—Gụọ Ilu 19:17.
Nọgidenụ Na-egosi Ibe Unu Ịhụnanya Pụrụ Iche
6 Chegodị gbasara otu onye rụrụ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ ruo ọtụtụ afọ. O nwere ike ịbụ na kemgbe ọ rụwara ọrụ ebe ahụ, ọ hụtụbeghị ndị nwe ụlọ ọrụ ahụ. O nwekwara ike ọ bụghị iwu niile e nwere n’ụlọ ọrụ ahụ dị ya mma. Ma, ihe mere o ji na-arụsi ọrụ ike bụ na ọrụ ahụ na-enye ya ego kwa ọnwa. Ọ ga-anọgidekwa na-arụ ebe ahụ ruo mgbe ọ lara ezumike nká ma ọ bụkwanụ mgbe o nwetara ebe ọzọ ka ya mma.
7 Ị̀ chọpụtara ihe dị iche n’ịhụnanya pụrụ iche na ihe mere nwoke ahụ e ji mee ihe atụ ji na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ? Ihe mere nwoke ahụ ka ji na-arụ ebe ahụ bụ na ọ bụ ebe o si enweta ego o ji egbo mkpa ya. Ma na Baịbụl, ihe mere ndị Chineke ji gosi ibe ha ịhụnanya pụrụ iche abụghị iji mezuo iwu, ma ọ bụkwanụ ka e meekwara ha otú ahụ, kama, o si ha n’obi. Legodị ihe Devid mere. O gosiri enyi ya bụ́ Jonatan ịhụnanya pụrụ iche n’ihi na o si ya n’obi n’agbanyeghị na nna Jonatan chọrọ igbu ya. Mgbe ọtụtụ afọ gachara Jonatan nwụrụ, Devid nọgidere na-egosi nwa Jonatan bụ́ Mefiboshet ịhụnanya pụrụ iche.—1 Sam. 20:9, 14, 15; 2 Sam. 4:4; 8:15; 9:1, 6, 7.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 515
Ndụmọdụ, Onye Ndụmọdụ
Ọ bụ Jehova kacha mara ihe. Ọ bụ naanị ya bụ onye ọ na-adịghị mkpa ka onye ọzọ nye ndụmọdụ. (Aịza. 40:13; Rom 11:34) Ọkpara ya ruru eru ịbụ “Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,” onye ga na-eduzi ndị ọzọ ma na-enye ha ntụziaka, n’ihi na ọ nabatara ndụmọdụ Nna ya nyere ya, mmụọ nsọ Chineke ana-eduzikwa ya. (Aịza. 9:6; 11:2; Jọn 5:19, 30) Ihe a na-egosi na ihe ga-eme ka ndụmọdụ baa uru bụ ma ọ daba n’uche Jehova. Ndụmọdụ ọ bụla nke na-agba Onye Kacha Elu ụkwụ abaghị uru. Ọ bụtụdịghị ndụmọdụ.—Ilu 19:21; 21:30.
JUN 30–JULAỊ 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 20
Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ime Ezigbo Mkpebi Mgbe Gị na Mmadụ Na-akpa Maka Ọlụlụ
Otú Unu Ga-esi Eme Ka E Too Jehova Mgbe Unu Na-akpa Maka Ọlụlụ
3 Ọ bụ eziokwu na nwoke na nwaanyị kpawa, obi na-atọgbu ha atọgbu, ma, ọ bụ ihe dị ezigbo mkpa nwere ike ime ka ha lụọ. N’ụbọchị nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ, ha na-anọ n’ihu Jehova kwe ibe ha nkwa na ha ga-ahụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù ụbọchị niile ha dị ndụ. Tupu anyị ekwe nkwa ọ bụla, anyị kwesịrị ichebara ya echiche nke ọma. (Gụọ Ilu 20:25.) Anyị kwesịrị ime otú ahụ tupu anyị ekwe mmadụ nkwa alụmdi na nwunye. Mgbe nwoke na nwaanyị na-akpa bụ oge ha na-eji amata ibe ha nke ọma ka ha nwee ike ime ezigbo mkpebi. Mgbe ụfọdụ, ha na-ekpebi ịlụ, mgbe ụfọdụ, ha ekpebie ịkwụsị ịkpa. Ha kwụsị ịkpa, ọ pụtaghị na ha mere ihe ọjọọ. Kama, ha mezuru ihe ha bu n’obi na-akpa. O nyeere ha aka ime ezigbo mkpebi.
4 Ọ dị mkpa ka ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwaanyị mata na ihe mere nwoke na nwaanyị ji akpa bụ ka ha chọpụta ma hà ga-alụ. Ọ pụtara na ha agaghị achọ ka ha na mmadụ kpawa ma ọ bụrụ na ha ebughị n’obi ịlụ onye ahụ. Ma, ọ bụghị naanị ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịna-ele nwoke na nwaanyị ịkpa anya otú kwesịrị ekwesị. Anyị niile kwesịrị ịna-eme otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-eche na nwoke na nwaanyị kpawa, na ha ga-alụrịrị. Olee nsogbu iche otú a na-akpatara Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye? Otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Melissa sịrị: “Nwanna nwoke na nwanna nwaanyị kpawa, ụmụnna na-atụ anya ka ha lụọ. Ọ na-eme ka ụfọdụ ndị ka na-akpa ebe o dokwaranụ ha anya na ọ naghị adabara ha. E nwekwara ndị na-anatụdịghị ekwe ka ha na mmadụ kpawa. Ihe a nwere ike ime ka mmadụ na-echegbu onwe ya nke ukwuu.”
Otú Ị Ga-esi Achọta Onye Ị Ga-alụ
8 Olee otú i nwere ike isi jiri akọ leruo mmadụ anya nke ọma? A gaa ọmụmụ ihe ma ọ bụ nnọkọ oriri, i nwere ike ịmata otú onye ahụ jiruru ofufe Chineke kpọrọ ihe nakwa ụdị onye ọ bụ. Olee ndị bụ́ ezigbo enyi ya? Oleekwa ihe ọ na-ekwukarị gbasara ya? (Luk 6:45) Ihe o bu n’obi ime ọ̀ dabara na nke gịnwa? I nwere ike ịjụta ndị okenye ọgbakọ ya ma ọ bụkwanụ Ndị Kraịst ndị ọzọ ma nke a na-akọ maruru ya ala. (Ilu 20:18) I nwere ike ịjụ ha gbasara ihe e ji mara ya nakwa àgwà ya. (Rut 2:11) Ka ị na-eleru onye ahụ anya, gbalịa ka ị ghara ime ihe ga-eme ka ahụ́ ghara iru ya ala. I kwesịghị ịgbalị na-anọ ya nso mgbe niile ma ọ bụ chọọ ịmatacha ihe niile gbasara ya.
Otú Unu Ga-esi Eme Ka E Too Jehova Mgbe Unu Na-akpa Maka Ọlụlụ
7 Olee otú onye nke ọ bụla ga-esi amata ibe ya nke ọma? Otú unu ga-esi eme ya bụ ịjụ ibe unu ajụjụ, ịgwa ibe unu eziokwu, nakwa ige ibe unu ntị nke ọma. (Ilu 20:5; Jems 1:19) Unu nwekwara ike ime ihe ndị ga-eme ka ọ dịrị unu mfe ikwurịta okwu, dị ka irikọ nri ọnụ, ịga ije n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, nakwa ịrụ n’ozi ọma. I nwekwara ike ịmata onye gị na ya na-akpa ma ọ bụrụ na unu na ndị ezinụlọ unu na ndị enyi unu ana-anọkọ. Ihe ọzọ bụ ịhazi ka unu mee ihe ndị ga-eme ka ị mata otú o si akpa àgwà ma ụdị ihe dị iche iche mee, nakwa ma ya na ụdị ndị dị iche iche nọrọ. Ka anyị lee ihe Nwanna Aschwin si Nedalandz gbalịrị ime. O kwuru gbasara ihe ya na Nwanna Nwaanyị Alicia mere mgbe ha na-akpa. Ọ sịrị: “Anyị chọtara ihe ndị anyị ga-eme ga-enyere anyị aka ịmatakwu ibe anyị nke ọma. Ụfọdụ n’ime ha abụghị oké ihe, dị ka isikọ nri ọnụ ma ọ bụ ịrụkọ ọrụ ụlọ ọnụ. N’oge ndị ahụ, anyị matara ebe ibe anyị na-emeta na ebe ọ na-anaghị emeta.”
8 Ihe ọzọ ga-enyere unu aka ịmata ibe unu nke ọma bụ ịmụkọ Baịbụl ọnụ. Unu lụọ, unu kwesịrị ịna-ewepụta oge unu ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ, ka ihe gbasara Chineke bụrụ ihe dị ezigbo mkpa n’alụmdi na nwunye unu. (Ekli. 4:12) N’ihi ya, ọ ga-adị ezigbo mma ma unu na-ewepụta oge unu ga-eji na-amụkọ ihe ọnụ ugbu a unu ka na-akpa. Ma, nwoke na nwaanyị kpawa, ha aghọbeghị ezinụlọ. Nke nwoke aghọbeghịkwa onyeisi nke nwaanyị. N’agbanyeghị ya, ọ bụrụ na unu ana-amụkọ Baịbụl ọnụ, unu nwere ike ịmata otú ibe unu hụruru Jehova n’anya. Nwanna Max na nwunye ya bụ́ Laysa, ndị si Amerịka, kwuru uru ọzọ ịmụkọ ihe ọnụ na-aba. Nwanna Max sịrị: “Mgbe anyị bidoro ịkpa, anyị malitere ịmụ akwụkwọ anyị ndị na-ekwu gbasara nwoke na nwaanyị ịkpa, alụmdi na nwunye, na ezinụlọ. Ịmụ akwụkwọ ndị ahụ mere ka anyị nwee ohere ikwurịta ọtụtụ ihe dị ezigbo mkpa a na-enweghị mgbe anyị gaara ekwu banyere ha.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 196 ¶7
Ọkụ
Ilu 20:27 kwuru na “ihe mmadụ na-ekwu [na Hibru, “ume mmadụ na-eku”] yiri mpanaka Jehova, nke na-eme ka a mata ihe dị n’ime ime obi mmadụ.” Ume mmadụ kupụtara ma ọ bụ ụdị okwu o kwuru, ma ọ̀ bụ okwu ọma ma ọ̀ bụ okwu ọjọọ, na-egosi ụdị mmadụ onye ahụ bụ ma ọ bụ ihe dị ya n’obi.—I nwere ike ịtụle Ọrụ 9:1.