JULAỊ 7-13
ILU 21
Abụ nke 98 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Ezigbo Ndụmọdụ Ndị Ga-eme Ka Di na Nwunye Na-enwe Obi Ụtọ
(Nkeji 10)
Ejila ọkụ ọkụ amaba n’alụmdi na nwunye (Ilu 21:5; w03 10/15 4 ¶5)
Gosi na ị dị umeala n’obi ma unu nwee nghọtahie (Ilu 21:2, 4; g 7/08 7 ¶2)
Jirinụ ndidi na obiọma na-emeso ibe unu ihe (Ilu 21:19; w06 9/15 28 ¶13)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ilu 21:31—Olee otú amaokwu a si enyere anyị aka ịghọta amụma dị ná Mkpughe 6:2? (w05 1/15 17 ¶9)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ilu 21:1-18 (th ihe ọmụmụ nke 5)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. (lmd isi nke 7 nọmba nke 3)
6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 5) Ihe Ngosi. ijwfq isiokwu nke 54—Isiokwu: Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ewere Ịgba Alụkwaghịm? (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)
Abụ nke 132
7. Na-akwanyere Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
N’ụbọchị unu lụrụ, i kwere nkwa n’ihu Jehova na ị ga-ahụ di gị ma ọ bụ nwunye gị n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. N’ihi ya, otú i si emeso di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe nwere ike ime ka gị na Jehova dịrị ná mma ma ọ bụ ghara ịdị ná mma.—Ilu 20:25; 1 Pita 3:7.
Kpọnye VIDIO Bụ́ Ihe Ga-eme Ka Di na Nwunye Na-enwe Obi Ụtọ: Na-akwanyerenụ Ibe Unu Ùgwù. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Gịnị mere o ji dị mkpa ka di na nwunye na-akwanyere ibe ha ùgwù?
Olee ihe ndị anyị nwere ike ịgbanwe ka anyị nwee ike ịna-akwanyekwuru ndị ọzọ ùgwù?
Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nwere ike inyere anyị aka?
Olee ihe ụfọdụ anyị ga na-eme iji na-akwanyere di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ùgwù?
Olee ihe anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ebe di anyị ma ọ bụ nwunye anyị nọ? Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) w23 Eprel, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 15, Gịnị Ka Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Ọrụ Ebube Ndị Jizọs Rụrụ? ¶13-18