Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb25 Julaị p. 4-5
  • Julaị 14-20

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Julaị 14-20
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
mwb25 Julaị p. 4-5

JULAỊ 14-20

ILU 22

Abụ nke 79 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ezigbo Ndụmọdụ Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịzụ Ụmụ Gị

(Nkeji 10)

Kụziere ụmụ gị ihe ndị ga-enyere ha aka imeri nsogbu ndị ga-abịara ha (Ilu 22:3; w20.10 27 ¶7)

Malite ozugbo ị mụrụ ha kụziwere ha ihe (Ilu 22:6; w19.12 26 ¶17-19)

Jiri obiọma na-adọ ha aka ná ntị (Ilu 22:15; w06 4/1 9 ¶4)

Ebe otu nna medara obi jiri Baịbụl na-akụziri nwa ya nwaanyị ihe. Tablet nwa ya nwaanyị ji n’aka na-egosi nkụzi evolushọn bụ́ na enwe ji nwayọọ nwayọọ ghọọ mmadụ.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 22:29​—Olee otú ilu a si gbasa ihe ndị anyị na-eme n’ọgbakọ? Oleekwa uru ndị anyị na-erite ma anyị mee ihe ilu a kwuru? (w21.08 22 ¶11)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ilu 22:1-19 (th ihe ọmụmụ nke 10)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 5 nọmba nke 4)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gosi onye ahụ otú ọ ga-esi gaa na jw.org chọta ihe ndị ga-enyere ndị mụrụ ụmụ aka. (lmd isi nke 1 nọmba nke 4)

6. Okwu

(Nkeji 5) ijwyp isiokwu nke 100​—Isiokwu: Gịnị Ka M Ga-eme Ma M Daa Iwu Nne na Nna M Tiri? (th ihe ọmụmụ nke 20)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 134

7. Na-enwere Ụmụ Gị Ndidi, ma Agbala Ha Nkịtị ma Ha Mee Ihe Ọjọọ

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ịzụ ụmụaka chọrọ ndidi. Ndị nne na nna kwesịrị ịna-ewepụta oge buru ibu ha na ụmụ ha ga-eji na-anọrị. (Diut. 6:6, 7) Ọ bụrụ na ndị nne na nna chọrọ ịna-amata obi ụmụ ha, ha kwesịrị ịna-ajụ ha ajụjụ ndị ga-eme ka ha kwuo uche ha, na-egekwa ha ntị nke ọma mgbe ha na-ekwu ya. (Ilu 20:5) O nwekwara ike ịbụ na ndị nne na nna ga-agwa ụmụ ha ihe ugboro ugboro tupu ha aghọta ya ma mee ya.

Ma, nne na nna ndị na-enwere ụmụ ha ndidi anaghị agbachi ha nkịtị ma ha mee ihe ọjọọ. Jehova nyere ndị nne na nna ikike ịgwa ụmụ ha ihe ha ga-eme na ihe ha na-agaghị eme nakwa ịdọ ha aka ná ntị ma ha nupụ isi.​—Ilu 6:20; 23:13.

Gụọ Ndị Efesọs 4:31. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị mere ndị nne na nna ekwesịghị iji iwe na-adọ ụmụ ha aka ná ntị?

Gụọ Ndị Galeshia 6:7. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị nne na nna kụziere ụmụ ha na ha ga-ata ahụhụ ihe ọjọọ ha mere?

Foto si na vidio bụ́ “‘Na-enwenụ Ndidi ma Na-edirinụ Ibe Unu Ihe n’Ihi na Unu Hụrụ Ha n’Anya’​—Ụmụ Gị.” Ebe Max nweere nwa ya nwaanyị bụ́ Sue ndidi, na-ege ya ntị.

Kpọnye VIDIO Bụ́ ‘Na-enwenụ Ndidi ma Na-edirinụ Ibe Unu Ihe n’Ihi na Unu Hụrụ Ha n’Anya’​—Ụmụ Gị. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Olee ihe ndị ị mụtara na vidio a?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb “Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi,” okwu mmalite nkebi nke 1, na isi nke 1

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 6 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya