Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb25 Julaị p. 6-7
  • Julaị 21-27

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Julaị 21-27
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
mwb25 Julaị p. 6-7

JULAỊ 21-27

ILU 23

Abụ nke 97 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ezigbo Ndụmọdụ Ndị Ga-enyere Gị Aka n’Ihe Gbasara Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya

(Nkeji 10)

Ọ bụrụ na i kpebiri ịna-aṅụ mmanya na-aba n’anya, aṅụfela ya ókè (Ilu 23:20, 21; w04 12/1 19-20 ¶5-6)

Na-echeta nsogbu ịṅụfe mmanya ókè na-akpata (Ilu 23:29, 30, 33-35; it-1 656)

Ekwela ka otú mmanya na-acha mee ka i chee na o nweghị ihe ọ ga-eme gị ma ị ṅụfee ya ókè (Ilu 23:31, 32)

Ebe otu nwanna nwaanyị nọ n’oche na-ele mmanya na-aba n’anya dị n’elu tebụl.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 23:21​—Olee ihe dị iche na mmadụ iri oké nri na mmadụ ibu oké ibu? (w04 11/1 31 ¶2)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ilu 23:1-24 (th ihe ọmụmụ nke 5)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. (lmd isi nke 3 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 5) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa mmadụ ka ị mụwara ya Baịbụl, gosikwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ ya. (lmd isi nke 9 nọmba nke 5)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume ka ọ kwụsị àgwà Jehova kpọrọ asị ọ na-akpa nke na-esiri ya ike ịkwụsị. (lmd isi nke 12 nọmba nke 4)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 35

7. M̀ Ga-enye Ndị Bịaranụ Mmanya Na-aba n’Anya Ka M̀ Ga-ahapụ Inye Ha?

(Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ndị kpọrọ oriri, dị ka oriri agbamakwụkwọ, hà kwesịrị inye ndị ha kpọrọ mmanya na-aba n’anya? Onye ọ bụla ga-ekpebi ihe ọ ga-eme n’okwu a. Ma, mmadụ kwesịrị ịkpachapụ anya mgbe ọ na-eme mkpebi a ma chebara ndụmọdụ Baịbụl na ihe ndị ọzọ dị mkpa echiche.

Ebe nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ alụ na-ekwurịta ma hà ga-enye ndị ga-abịa oriri agbamakwụkwọ ha mmanya na-aba n’anya. Baịbụl a saghere asaghe dị n’elu tebụl dị ha n’ihu nakwa tablet na-egosi ụdị mmanya dị iche iche.

Kpọnye VIDIO Bụ́ M̀ Ga-enye Ndị Bịaranụ Mmanya Na-aba n’Anya? Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú ndụmọdụ dị n’amaokwu Baịbụl ndị a ga-esi enyere ndị kpọrọ oriri aka ikpebi ma hà ga-enye ndị bịaranụ mmanya na-aba n’anya ka hà ga-ahapụ inye ha?

    • Jọn 2:9​—Jizọs mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya n’oriri agbamakwụkwọ.

    • 1 Kọr. 6:10​—“Ndị aṅụrụma . . . agaghị eketa Alaeze Chineke.”

    • 1 Kọr. 10:31, 32​—“Ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe . . . , na-emenụ ihe niile otú ga-eme ka e too Chineke. Unu emela ihe ga-ewute ndị” ọzọ.

  • Olee ihe ụfọdụ i kwesịrị ichebara echiche?

  • Gịnị mere anyị ji kwesị “iji echiche” anyị ghọta otú ndụmọdụ dị iche iche dị na Baịbụl si gbasa ihe anyị chọrọ ime?​—Rom 12:1; Ekli. 7:16-18

8. Mkpa Ọgbakọ

(Nkeji 7)

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 2, okwu mmalite nkebi nke 2, na isi nke 3

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 40 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya