Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb25 Septemba p. 4-5
  • Septemba 15-21

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Septemba 15-21
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
mwb25 Septemba p. 4-5

SEPTEMBA 15-21

ILU 31

Abụ nke 135 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ebe otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị nọ ọdụ n’oche na-akparịta ụka na-atọ ha ụtọ.

1. Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ndụmọdụ Nwaanyị Hụrụ Nwa Ya n’Anya Nyere Ya

(Nkeji 10)

Na-akụziri ụmụ gị otú Jehova si ele mmekọahụ na alụmdi na nwunye anya (Ilu 31:3, 10; w11 2/1 19 ¶7-8)

Na-akụziri ụmụ gị ihe ka ha nwee ike ịna-ele mmanya na-aba n’anya anya otú Jehova si ele ya (Ilu 31:4-6; ijwhf isiokwu nke 4 ¶11-13)

Na-akụziri ụmụ gị ka ha na-enyere ndị mmadụ aka otú Jehova na-eme (Ilu 31:8, 9; g17.6 9 ¶5)

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 31:10-31​—Gịnị nyeere ndị Izrel aka ibute amaokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’isi? (w92 11/1 11 ¶7-8)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ilu 31:10-31 (th ihe ọmụmụ nke 10)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kpanyere mmadụ ụka mgbe onye ahụ kwuru ihe dị mma ma ọ bụ mee ihe dị mma. (lmd isi nke 5 nọmba nke 3)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime “Eziokwu Ndị Na-amasị Anyị Ịkụziri Ndị Ọzọ” nke dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 1 nọmba nke 4)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 5) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kpọọ onye natara Ụlọ Nche Nke 1 2025 ka ọ bịa okwu ihu ọha pụrụ iche. (lmd isi nke 7 nọmba nke 4)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 121

7. Nyere Ụmụ Gị Aka Ka Ha Kpachara Anya Mgbe Ha Na-apị Ekwentị, Tablet, Ma Ọ Bụ Kọmputa

(Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ị̀ hụtụla ebe aka na-aghọ nwatakịrị nkọ mgbe ọ na-apị ekwentị ma ọ bụ tablet? O yiri ka ọ̀ na-adịrị ụmụaka ezigbo mfe ịpị. O nwere ike ịbụ na ọ naghị adịcha mkpa ka a kụziere ụmụaka otú e si apị ihe ndị a, ma ọ na-adị mkpa mgbe niile inyere ha aka ka ha kpachara anya mgbe ha na-apị ha. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, olee otú ị ga-esi azụ nwa gị ka ọ na-akpachara anya mgbe ọ na-apị ha?

Foto si na vidio bụ́ “Na-eji Oge Gị Eme Ihe Otú Kacha Mma.” Ebe Sọpụrụchi nọ n’akụkụ osimiri na-ele tablet ya, nke mere ka ọ ghara ịhụ ebe azụ̀ dọfịn nke nọ na mmiri dị nso ji bọl na-egwuri egwu.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Na-eji Oge Gị Eme Ihe Otú Kacha Mma. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere o ji dị mma ka anyị kpebie nkeji ole ma ọ bụ awa ole anyị na-ekwesịghị ịnọfe mgbe anyị na-apị ekwentị, tablet, ma ọ bụ kọmputa?

  • Olee ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị iwepụta oge anyị ga-eji na-eme ha?

Mgbe ị na-eti iwu ga na-achị ndị ezinụlọ gị, soro ntụziaka ndị dị na Baịbụl, ọ bụghị ihe ndị ọzọ mụrụ ụmụ na-eme. (Gal. 6:5) Dị ka ihe atụ, jụọ onwe gị, sị:

  • M̀ kwesịrị ịhapụ nwa m ka ọ na-apị ihe ndị a mgbe naanị ya nọ?​—1 Kọr. 9:25

  • Nkeji ole ka m na-ekwesịghị ikwe ka nwa m nọfee mgbe ọ na-apị ekwentị, tablet, ma ọ bụ kọmputa?​—Ilu 18:1

  • Olee ebe ndị m na-agaghị ekwe ka nwa m na-abanye n’Ịntanet, oleekwa ihe ndị a na-etinye n’ekwentị, tablet, ma ọ bụ na kọmputa m na-agaghị ekwe ka ọ na-aga na ha?​—Efe. 5:3-5; Fil. 4:8, 9

  • Nkeji ole ma ọ bụ awa ole ka m kwesịrị ịhapụ nwa m ka ọ na-apị ihe ndị a kwa ụbọchị, ya enweekwa ike ịna-enwe ohere eme ihe ndị ọzọ dị mkpa ga-atọ ya ụtọ?​—Ekli. 3:1

8. Mkpa Ọgbakọ

(Nkeji 7)

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 18-19

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 2 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya