DISEMBA 8-14
AỊZAYA 6-8
Abụ nke 75 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. “Lee M, Ziga M”
(Nkeji 10)
Aịzaya wepụtara onwe ya n’egbughị oge ka ọ bụrụ ọnụ na-ekwuru Chineke (Aịza. 6:8; ip-1 94-95 ¶13-14)
Ọrụ a e nyere Aịzaya agaghị adị mfe (Aịza. 6:9, 10; ip-1 95-96 ¶15-16)
Otú ahụ ọtụtụ ndị na-egeghị Aịzaya ntị ka ọtụtụ ndị na-egeghịkwa Jizọs ntị (Mat. 13:13-15; ip-1 99 ¶23)
AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú m ga-esi na-emekwu ka Aịzaya n’iwepụta onwe m maka ozi Jehova?
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Aịza. 7:3, 4—Gịnị mere Jehova ji napụta eze ọjọọ bụ́ Ehaz? (w06 12/1 9 ¶4)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 8:1-13 (th ihe ọmụmụ nke 5)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 4 nọmba nke 5)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)
6. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 5) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl. (lmd isi nke 9 nọmba nke 5)
Abụ nke 83
7. E JI Ikwusa Ozi Ọma Ụlọ n’Ụlọ Mara Anyị
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
E ji ikwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ mara Ndịàmà Jehova. Otú a ha si ekwusa ya bụ otú Jizọs na Ndị Kraịst oge mbụ mere.—Luk 10:5; Ọrụ 5:42.
Ma, a kwụsịtụrụ ikwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ n’oge ọrịa koronavaịrọs. N’ihi ya, anyị lekwasịziri anya n’isi ná mkparịta ụka, idegara ndị mmadụ akwụkwọ ozi, na ịkpọ ha n’ekwentị na-ekwusara ha ozi ọma. Obi dị anyị ụtọ na anyị ji ohere ahụ mụtakwuo ụzọ ndị a magburu onwe ha e si ezisa ozi ọma. Ma, ịga n’ụlọ n’ụlọ ka bụkwa ụzọ bụ́ isi anyị si ekwusa ozi ọma. Ị̀ ga-enweli ike iso na-ekwusachi ozi ọma ụlọ n’ụlọ anya?
Olee otú ozi ụlọ n’ụlọ si enyere anyị aka ime ihe ndị a?
Izi ndị niile nọ n’ókèala anyị ozi ọma
Ịmụtakwu ịkụzi ihe nke ọma na ịmụta àgwà ndị dị ka inwe obi ike, ịghara ịna-ele ndị mmadụ anya n’ihu, na ịhapụ ihe ụfọdụ iji fee Jehova
Ịmalite iduziri ndị mmadụ Baịbụl
Kpọnye VIDIO Bụ́ Ikwusa Ozi Ọma n’Agbanyeghị Otú Ihu Eluigwe Dị. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị ka ị mụtara n’aka ụmụnna ndị a wepụtara onwe ha na-ekwusa ozi ọma na Feroo Aịlandz?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 42-43