Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w21 Mach p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Chetara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Okwu Mmalite
    Teta!—2017
  • Fon A Na-eji Agagharị Agagharị Ọ̀ Dị M Mkpa?
    Teta!—2002
  • Iji Internet Na-eme Ihe—Nọrọ na Nche Maka Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya!
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
w21 Mach p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere Ndị Kraịst kwesịrị iji kpachara anya n’otú ha si eji ihe ndị a na-eji ezirịta ozi n’Ịntanet ezirịta ozi?

Ụfọdụ Ndị Kraịst na-eji ihe ndị a na-eji ezirịta ozi n’Ịntanet akpọtụrụ ndị ezinụlọ ha na ndị Kraịst ibe ha. Ma, Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị iburu ihe a Baịbụl kwuru n’obi. Ọ sịrị: “Onye maara ihe nke hụrụ ọdachi agawo zoo; ndị na-amaghị ihe, bụ́ ndị nọ na-aga, atawo ahụhụ si na ya pụta.”—Ilu 27:12.

Obi dị anyị ụtọ na Jehova chọrọ ịna-echebe anyị. N’ihi ya, anyị na ndị na-akpata nkewa, ndị a chụrụ n’ọgbakọ, ma ọ bụ ndị na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu anaghị akpakọrịta. (Rom 16:17; 1 Kọr. 5:11; 2 Jọn 10, 11) Ụfọdụ ụmụnna anyị ma ọ bụ ndị na-abịa ọmụmụ ihe anyị nwere ike ghara ịna-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. (2 Tim. 2:20, 21) Anyị kwesịrị iburu ihe a n’obi mgbe anyị na-emeta ndị mmadụ enyi. Ma, o nwere ike isiri anyị ike imeta ndị ezigbo mmadụ enyi n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet.

Anyị kwesịrị ịkpachara anya karịchaa n’ebe anyị na ọtụtụ ndị nwere ike ịna-ezirịta ozi otu mgbe n’Ịntanet. Ụfọdụ ndị banyere n’ụdị ebe a akwaala mmakwaara. Olee ihe nwanna ga-eme iji chebe onwe ya n’ụdị ebe a ọtụtụ narị mmadụ na ọtụtụ puku mmadụ na-ezirịta ozi n’otu oge? Ọ gaghị ekwe omume ịmata ndị ha niile bụ n’eziokwu nakwa ịmata ma hà ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Abụ Ọma 26:4 sịrị: “Mụ na ndị ụgha adịghị anọkọ; mụ na ndị na-ezochi ihe ha bụ adịghị akpakọrịta.” Nke a pụtara na ọ ka mma ka ọ bụrụ naanị gị na ndị ị maara ga na-akparịta ụka n’Ịntanet.

Onye Kraịst kwesịkwara ịkpachara anya n’awa ole ya na ndị mmadụ na-eji ezirịta ozi n’ụdị ebe ahụ nakwa n’ihe ha na-akparịta, ọ bụrụgodị na ndị ha na ya na-ezirịta ozi ebe ahụ ebuchaghị ibu. Anyị ekwesịghị iche na anyị ga na-etinye ọnụ n’ihe ọ bụla ha na-akparịta n’agbanyeghị oge ọ ga-ewe anyị ma ọ bụkwanụ ihe ha na-ekwurịta gbasara ya. Pọl gwara Timoti ka o zere “ndị asịrị na ndị na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha.” (1 Tim. 5:13) Taa, ndị mmadụ nwekwara ike isi n’Ịntanet na-eme ụdị ihe a.

O nweghị ezigbo Onye Kraịst ga-achọ ịna-akatọ nwanna ya ma ọ bụ na-ege ntị mgbe a na-akatọ ya ma ọ bụkwanụ na-ekwu ihe ndị ọzọ na-ekwesịghị ịma gbasara nwanna ya. (Ọma 15:3; Ilu 20:19) Ọ gaghị na-agbasa ma ọ bụ na-ege akụkọ e tinyere nnu na ose ma ọ bụkwanụ akụkọ ndị ọ na-amaghị ma hà bụ eziokwu gbasara nwanna ya. (Efe. 4:25) E nwere ọtụtụ ihe ndị si na Baịbụl ga-abara anyị uru nakwa akụkọ ndị bụ́ eziokwu gbasara ụmụnna anyị dị na jw.org nakwa n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova ndị a na-ewepụta kwa ọnwa.

Ụfọdụ ụmụnna anyị na-esi n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet na-ere ahịa, na-azụ ahịa, na-akpọsa ngwá ahịa, ma ọ bụkwanụ na-ewe ndị mmadụ n’ọrụ. Ihe ndị ahụ bụ azụmahịa, ọ gbasaghị ofufe anyị na-efe Jehova. Ndị Kraịst na-achọghị ịhụ “ego” n’anya anaghị eji ụmụnna ha akpa ego.—Hib. 13:5.

Ànyị kwesịrị ịnọ n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet na-agwa ụmụnna anyị ka ha weta ego a ga-eji gbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka? N’ihi otú anyị si hụ ụmụnna anyị n’anya, anyị na-enwe mmasị inyere ha aka na ịgba ha ume. (Jems 2:15, 16) Ma, isi n’ebe anyị na ọtụtụ ndị na-anọ ezirịta ozi n’Ịntanet eme ụdị ihe a nwere ike ime ka mbọ alaka ụlọ ọrụ na-agba ma ọ bụ mbọ ndị okenye ọgbakọ na-agba ghara ịgacha nke ọma. (1 Tim. 5:3, 4, 9, 10, 16) O nweghị onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ime ihe ga-eme ka ndị ọzọ chewe na a họpụtara ya n’ụzọ pụrụ iche inyere ụmụnna anyị aka.

Anyị chọrọ ime ka e too Chineke. (1 Kọr. 10:31) N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị chọrọ iji ihe ndị e ji ezirịta ozi n’Ịntanet na-ezirịta ozi ma ọ bụ mgbe ọ bụla anyị chọrọ iji ihe ọgbara ọhụrụ ndị ọzọ eme ihe, anyị kwesịrị ịkpachara anya ma chee ihe ndị bụ́ nsogbu nwere ike isi na ya pụta.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya