Nke A Na-amụ Amụ
DISEMBA 2021
ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ MALITE: JENỤWARỊ 31 RUO FEBỤWARỊ 27, 2022
© 2021 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
A naghị ere akwụkwọ a ere. O so n’ihe e ji arụ ọrụ ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ụwa dum. E jikwa onyinye si ndị mmadụ n’obi akwado ọrụ a. Ị chọọ inye onyinye, biko gaa na donate.jw.org.
Ọ gwụkwala ma è dere aha Baịbụl ọzọ, amaokwu Baịbụl ndị e dere n’akwụkwọ a si na Baịbụl e ji asụsụ Igbo a na-ede n’oge a dee, ya bụ, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.
IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A:
E dere “Jehova bụ Onye dị nsọ” n’ihe mbadamba e ji ọlaedo rụọ na-adị n’ákwà isi nnukwu onye nchụàjà (A ga-akọwa ya n’isiokwu a na-amụ amụ nke 48, paragraf nke 6 na nke 7)