Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w24 Julaị p. 14-19
  • Kpachara Anya Ka A Ghara Ịnwata Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpachara Anya Ka A Ghara Ịnwata Gị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MATA IHE NDỊ NWERE IKE ỊBỤRỤ GỊ ỌNWỤNWA
  • IHE ANYỊ GA-EME KA A GHARA ỊNWATA ANYỊ
  • AKWỤSỊLA ỊNỌ NA NCHE
  • URU ỊNỌ NA NCHE NA-ABARA ANYỊ
  • Otú Anyị Ga-esi Emeri n’Ọgụ Anyị Na-alụso Ihe Ọjọọ Na-agụ Anyị Agụụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Imeri Adịghị Ike Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Otú Ị Ga-esi Na-ezere Ọnwụnwa
    Teta!—2014
  • “Na-eso” Jizọs ma I Mechaa Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
w24 Julaị p. 14-19

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 29

ABỤ NKE 121 Anyị Kwesịrị Ịna-ejide Onwe Anyị

Kpachara Anya Ka A Ghara Ịnwata Gị

“Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile, ka a ghara ịnwata unu.”​—MAT. 26:41.

IHE A GA-AMỤ

Isiokwu a ga-echetara anyị na anyị kwesịrị ime ike anyị niile ka a ghara ịnwata anyị, chetakwara anyị na anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime ihe ndị nwere ike ime ka anyị mee mmehie dị oké njọ.

1-2. (a) Olee aka ná ntị Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya? (b) Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jizọs ji hapụ ya rie mbọmbọ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

“N’EZIOKWU, ọ na-agụ mmadụ ime ihe dị mma, ma anụ ahụ́ ya adịghị ike.”a (Mat. 26:41b) Jizọs ji okwu ndị a gosi na ọ ghọtara na anyị ezughị okè. Ma, o kwukwara ihe a ka ọ dọọ anyị aka ná ntị na anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara iche na a gaghị anwatali anyị. Tupu ya ekwuo ihe ahụ n’abalị ahụ e jidere ya, ndị na-eso ụzọ ya ji obi ike kwuo na o nweghị ihe ga-eme ka ha hapụ Nna ha ukwu. (Mat. 26:35) Ha chọrọ ime ihe dị mma, ma ha achọpụtaghị na ezigbo nsogbu bịara ha, o nwere ike ime ka ọ dịrị ha mfe ime ihe na-adịghị mma. N’ihi ya, Jizọs dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile, ka a ghara ịnwata unu.”​—Mat. 26:41a.

2 Ọ dị mwute na ndị na-eso ụzọ Jizọs anọghị na nche. Mgbe e jidere Jizọs, hà kwụsiri ike n’ebe ọ nọ, ka hà tụrụ ụjọ gbaa ọsọ? Ebe ọ bụ na ha anọghị na nche, ha mere ihe ha kwuru na ha emekataghị mee. Ha hapụrụ Jizọs rie mbọmbọ.​—Mat. 26:56.

Foto ndị na-egosi: Ebe Jizọs na ndịozi ya nọ n’ogige Getsemeni n’abalị. 1. Ebe Jizọs na-agwa ndịozi ya okwu. 2. Ebe ndịozi Jizọs na-ehi ụra. 3. Ebe ndịozi Jizọs na-agba ọsọ mgbe e jidere Jizọs.

Jizọs dụrụ ndị na-eso ụzọ ya ọdụ ka ha na-eche nche nakwa ka ha kpachara anya maka ọnwụnwa, ma ha hapụrụ ya rie mbọmbọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)


3. (a) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-erubere Jehova isi, gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na a gaghị anwatali anyị? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Anyị ekwesịghị iche na anyị siri ike nke na anyị agaghị emeli mmehie. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kpebisiri ike na anyị agaghị eme ihe ga-ewute Jehova. Ma, anyị kwesịkwara ịghọta na anyị bụ ndị na-ezughị okè nakwa na ọnwụnwa nwere ike ịbịara anyị. (Rom 5:12; 7:21-23) E nwere ike ịnwa anyị ọnwụnwa ime ihe na-adịghị mma na mberede. Ọ bụrụ na anyị chọrọ irubere Jehova na Ọkpara ya isi, anyị kwesịrị ime ihe Jizọs kwuru, ya bụ, ka anyị nọrọ na nche ka a ghara ịnwata anyị. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ime otú ahụ. Anyị ga-ebu ụzọ leba anya n’ihe ndị nwere ike ịbụrụ anyị ọnwụnwa. Anyị ga-ekwuzi otú anyị ga-esi nọrọ na nche maka ọnwụnwa. N’ikpeazụ, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi ghara ịkwụsị ịnọ na nche.

MATA IHE NDỊ NWERE IKE ỊBỤRỤ GỊ ỌNWỤNWA

4-5. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya ọ bụrụgodị n’ihe gbasara mmehie ndị na-adịghị oké njọ?

4 E nwere mmehie ndị na-abụghị mmehie dị oké njọ, mana ha nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Ha nwedịrị ike ime ka anyị mee mmehie dị oké njọ.

5 A na-anwa anyị niile ọnwụnwa ime ihe na-adịghị mma. Ma onye ọ bụla n’ime anyị nwere ebe ọ na-adịghị ike. O nwere ike ịbụ ime mmehie dị oké njọ, ime omume na-adịghị ọcha, ma ọ bụkwanụ ichewe echiche ka ndị ụwa. Dị ka ihe atụ, otu onye nwere ike na-agbalịsi ike ka ọ ghara ịkwa iko, onye ọzọ ana-agbalị ka o zere omume na-adịghị ọcha, dị ka iji aka ya egbo onwe ya agụụ mmekọahụ ma ọ bụkwanụ ile ndị gba ọtọ. O nwekwara onye nsogbu nke ya nwere ike ịbụ ịtụ egwu mmadụ, ịdị mpako, iwe iwe ọkụ ma ọ bụ ihe ọzọ. Jems kwuru na “ọ bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ na-anwa onye ahụ, nwata ya.”​—Jems 1:14.

6. Gịnị ka anyị kwesịrị ịgwa onwe anyị eziokwu gbasara ya?

6 Ị̀ ma ihe nwere ike ịkacha bụụrụ gị ọnwụnwa? Ọ gaghị abara anyị uru ọ bụla ịna-eche na e nweghị ebe anyị na-adịghị ike ma ọ bụkwanụ na-eche na anyị siri ezigbo ike nke na a gaghị anwatali anyị. (1 Jọn 1:8) A sị ka e kwuwe, Pọl onyeozi kwuru na e nwedịrị ike ịnwata “ndị mmụọ Chineke na-edu” ma ọ bụrụ na ha anọghị na nche. (Gal. 6:1) Anyị kwesịrị ịgwa onwe anyị eziokwu ma kweta na e nwere ebe anyị na-adịghị ike.​—2 Kọr. 13:5.

7. Gịnị ka anyị kwesịrị ichebe onwe anyị na ya? Mee ihe atụ.

7 Ozugbo anyị chọpụtara ihe nwere ike ịkacha bụụrụ anyị ọnwụnwa, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị lụso ọnwụnwa ahụ ọgụ. Iji maa atụ, n’oge e dere Baịbụl, ebe ndị iro na-akacha esi abata n’obodo bụ n’ọnụ ụzọ ámá ya. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ ebe a kacha eche nche. Otú ahụkwa ka anyịnwa kwesịrị isi na-agbasi mbọ ike n’ebe anyị ma e nwere ike isi nwata anyị.​—1 Kọr. 9:27.

IHE ANYỊ GA-EME KA A GHARA ỊNWATA ANYỊ

8-9. Gịnị ka nwa okorobịa ahụ a kọrọ akụkọ ya n’Ilu isi 7 gaara eme ka ọ ghara ime mmehie dị oké njọ? (Ilu 7:8, 9, 13, 14, 21)

8 Olee otú anyị nwere ike isi chebe onwe anyị ka a ghara ịnwata anyị? Ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ nwa okorobịa e kwuru okwu ya n’Ilu isi 7. Ya na nwaanyị na-eme omume rụrụ arụ kwara iko. Amaokwu nke 22 gwara anyị na nwa okorobịa ahụ sooro ya “na mberede.” Ma amaokwu ndị bu ụzọ na-egosi na e nwere ihe ndị o mere tupu nke ahụ nke mere ka o jiri nwayọọ nwayọọ mee mmehie.

9 Gịnị ka nwa okorobịa ahụ mere tupu ya emee mmehie? Nke mbụ, ná mgbede, “ọ nọ na-aga n’okporo ụzọ dị nso n’ebe nwaanyị ahụ [na-eme omume rụrụ arụ] bi.” Ihe ọzọ bụ na ọ gawara n’ụlọ nwaanyị ahụ. (Gụọ Ilu 7:8, 9.) Mgbe ọ hụrụ nwaanyị ahụ, ọ gawaghị ebe ọzọ, kama o kwere ka o susuo ya ọnụ, geekwa ya ntị mgbe ọ na-agwa ya na ya achụọla àjà udo. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji gwa ya ihe a bụ ka nwa okorobịa ahụ ghara iche na ọ bụ ajọ mmadụ. (Gụọ Ilu 7:13, 14, 21.) Ọ bụrụ na nwa okorobịa ahụ zeere ihe ndị ahụ mechara mee ka o mee mmehie, ọ gaara echebe onwe ya ka a ghara ịnwata ya nakwa ka ọ ghara ime mmehie.

10. Olee otú mmadụ nwere ike isi mee ụdị mmehie ahụ nwa okorobịa ahụ mere taa?

10 Akụkọ a na-egosi ihe nwere ike ime ohu Jehova ọ bụla. O nwere ike ime mmehie dị oké njọ ma chee na ihe niile mere “na mberede” ma ọ bụkwanụ ya asị na ọ nọkatara mee. Ma, ọ bụrụ na o chee echiche nke ọma gbasara ihe merenụ, o nwere ike ịchọpụta na e nwere ihe ụfọdụ na-adịghị mma o mere nke mere ka o mee mmehie. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha bụ iso ndị ọjọọ na-akpa, iji ihe ndị na-adịghị mma na-atụrụ ndụ, ma ọ bụ ịna-aga n’ebe Onye Kraịst na-ekwesịghị ịga ma ọ bụ n’Ịntanet ma ọ bụ n’ihu na ihu. O nwekwara ike ịbụ na ọ kwụsịla ikpe ekpere, ịgụ Baịbụl, ịga ọmụmụ ihe, ma ọ bụ ozi ọma. Dị ka nwa okorobịa ahụ a kọrọ akụkọ ya n’Ilu, o nwere ike ịbụ na o meghị mmehie ahụ “na mberede.”

11. Ọ bụrụ na anyị achọghị ime mmehie, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

11 Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ihe anyị kwesịrị ịgbara ọsọ abụghị naanị mmehie, kamakwa ihe ndị nwere ike ime ka anyị mee mmehie. Solomọn kọwara ihe a mgbe ọ kọchara banyere nwa okorobịa ahụ na nwaanyị ahụ na-akwa iko. O kwuru gbasara nwaanyị ahụ, sị: “Akpafula banye n’ụzọ ya.” (Ilu 7:25) Ọ sịkwara: “Agala nwaanyị a nso. Agala nso n’ọnụ ụzọ ụlọ ya.” (Ilu 5:3, 8) N’eziokwu, ihe ga-eme ka anyị chebe onwe anyị ka anyị ghara ime mmehie bụ ma anyị gbaara ihe ndị nwere ike ime ka anyị mee mmehie ọsọ.b Ihe ndị ahụ nwere ike ịbụ ihe ụfọdụ a na-agaghị asị na Onye Kraịst ekwesịghị ime, mana ya abụrụ ihe ndị nwere ike ime ka a nwata anyị.​—Mat. 5:29, 30.

12. Olee ihe Job kpebiri ime, oleekwa otú ọ ga-esi enyere ya aka ma ọnwụnwa bịara ya? (Job 31:1)

12 Ọ bụrụ na anyị chọrọ izere ihe ndị nwere ike ime ka anyị mee mmehie, anyị kwesịrị ikpebisi ike ịnọ na nche. Ọ bụ ihe Job mere. Ya na anya ya gbara ndụ na ọ gaghị ele nwaanyị ọzọ anya otú ga-eme ka ime omume rụrụ arụ gụwa ya agụụ. (Gụọ Job 31:1.) Ime ihe a o kpebiri ga-eme ka ọ ghara ịkwa iko. Anyịnwa kwesịkwara ikpebisi ike izere ihe ọ bụla nwere ike ime ka a nwata anyị.

13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya n’ihe ndị anyị na-eche? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

13 Anyị kwesịkwara ịkpachara anya n’ihe ndị anyị na-eche. (Ọpụ. 20:17) Ụfọdụ ndị chere na o nweghị ihe o mere ma mmadụ mụrụ anya na-arọ nrọ ebe ọ na-eme omume rụrụ arụ, ọ bụrụhaala na o meghị ya. Mana, iche otú ahụ adịghị mma. Onye na-eche ihe na-adịghị mma na-eme ka ihe na-adịghị mma na-agụsikwu ya agụụ ike. E nwere ike ikwu na onye na-eme otú a na-eme ka o siere ya ike ịgbara ọnwụnwa ọsọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere mgbe ụfọdụ echiche na-adịghị mma nwere ike ịbata anyị n’obi. Ma, ọ bụrụ na o mee, ihe dị ezigbo mkpa anyị kwesịrị ime bụ iwepụ ya n’obi anyị ozugbo ma jiri nke dị mma dochie ya. Anyị mee otú ahụ, anyị na-eme ka echiche ọjọọ ghara isi ike n’obi anyị nke ga-eme ka o siere anyị ike izere ọnwụnwa ahụ ma ọ bụkwanụ mee ka anyị mee mmehie dị oké njọ.​—Fil. 4:8; Kọl. 3:2; Jems 1:13-15.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwanna na-ele tiivi n’ime abalị. 2. Ebe o ji isi anya na-ele nwa agbọghọ bụ́ onye ọrụ ha. 3. Ebe ya na nwaanyị ahụ na-aṅụkọ mmanya n’ebe a na-ere mmanya.

Anyị kwesịrị izere ihe ọ bụla nwere ike ime ka ọnwụnwa bịara anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)


14. Olee ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ka a ghara ịnwata anyị?

14 Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ime ka a ghara ịnwata anyị? Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ga-abara anyị uru mgbe niile bụ irubere iwu Jehova isi. O nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ ime ka echiche anyị na ihe na-agụ anyị daba n’ihe dị Jehova mma. Ma, ọ bụrụ na anyị agbalịa mee ya, anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ.

15. Olee otú ime ka ihe dị mma na-agụ anyị agụụ ga-esi nyere anyị aka ka a ghara ịnwata anyị?

15 Anyị kwesịrị ịgba mbọ ka ihe ndị dị mma na-agụ anyị agụụ. Ọ bụrụ na anyị amụta ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị na ịhụ ezi ihe n’anya,’ ọ ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike ime ihe dị mma ma zere ihe ndị nwere ike ime ka anyị daba ná mmehie. (Emọs 5:15) Ihe dị mma ịna-agụ anyị agụụ ga-emekwa ka ọ dịrị anyị mfe ime ihe dị mma ma ọ bụrụ na ọnwụnwa anyị na-atụghị anya ya ma ọ bụ nke anyị na-agaghị egbochili abịara anyị.

16. Olee otú ime ihe ndị gbasara ofufe Jehova ga-esi enyere anyị aka ịna-eche nche? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

16 Olee otú anyị ga-esi eme ka ihe ndị dị mma na-agụ anyị agụụ? Anyị kwesịrị ịna-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Anyị nọrọ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ n’ozi ọma, ọ naghị adị mfe ịnwa anyị ime ihe ọjọọ. Kama, ihe anyị na-eme n’oge ahụ bụ ime ka ọ na-agụsikwu anyị agụụ ike ime ihe ga-adị Jehova mma. (Mat. 28:19, 20; Hib. 10:24, 25) Ọ bụrụ na anyị ana-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe anyị na-agụ echiche, ọ na-eme ka anyị kpebisikwuo ike ime ihe dị mma ma kpọọ ihe ọjọọ asị. (Josh. 1:8; Ọma 1:2, 3; 119:97, 101) Cheta na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile, ka a ghara ịnwata unu.” (Mat. 26:41) Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-ekpe ekpere, ọ ga-eme ka Nna anyị nke eluigwe na-enyere anyị aka ikpebisikwu ike ime ihe dị ya mma.​—Jems 4:8.

Ime ihe ndị gbasara ofufe Jehova mgbe niile ga-enyere anyị aka izere ọnwụnwa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)c


AKWỤSỊLA ỊNỌ NA NCHE

17. Olee ihe ghọọrọ Pita nsogbu ihe karịrị otu ugboro?

17 E nwere ike inwe ihe ụfọdụ anyị na-anaghị emeta anyị ga-emerili kpamkpam. Ma, e nwere ike inwe ndị nke ọzọ anyị nwere ike ịlụso ọgụ ruo ogologo oge. Ka anyị legodị ihe Pita onyeozi mere. Ọ tụrụ egwu mmadụ mgbe ọ gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ. (Mat. 26:69-75) O yiri ka Pita ọ̀ kwụsịla ịtụ egwu mmadụ mgbe o ji obi ike kwusaa gbasara Jizọs n’ihu ndị Sanhedrin. (Ọrụ 5:27-29) Ma, mgbe afọ ụfọdụ gafere, ọ kwụsịtụrụ iso Ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu eri nri n’ihi na “ọ na-atụ egwu ndị ahụ e biri úgwù.” (Gal. 2:11, 12) Pita amalitekwala ịtụ egwu mmadụ. O nwere ike ịbụ na o nweghị mgbe ọ kwụsịrị ịtụ egwu mmadụ kpamkpam.

18. Gịnị nwere ike ime ọ bụrụgodị na anyị chere na anyị emeriela àgwà ụfọdụ na-adịghị mma anyị na-akpabu?

18 Ụdị ihe ahụ nwekwara ike ime anyị. Olee otú ọ bụ? Ihe anyị chere na anyị emerichaala kpamkpam nwere ike ịghọkwara anyị ọnwụnwa ọzọ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna sịrị: “M kwụsịrị ile ndị gba ọtọ ruo afọ iri. Obi sikwara m ike na nsogbu nke ahụ agaala. Ma àgwà ọjọọ ahụ dị ka anụ ọjọọ gara zoo, na-eche mgbe ọ ga-abịa ọgụ ọzọ.” Obi dị anyị ụtọ na nwanna a akwụsịghị ịlụso ọnwụnwa a ọgụ. Ọ matara na o kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike kwa ụbọchị ka ọ ghara ile ndị gba ọtọ. O nwedịrị ike ịbụ ihe ọ ga-emegide ná ndụ ya niile n’ụwa ochie a. Nwunye ya na ndị okenye ọgbakọ nyeere ya aka ya akpacharakwuo anya ka ọ ghara ịna-ele ndị gba ọtọ.

19. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma e nwee àgwà na-adịghị mma anyị na ya ka na-alụ?

19 Gịnị ka anyị nwere ike ime ka àgwà na-adịghị mma anyị na ya na-alụ ghara ime ka anyị mee mmehie? Anyị kwesịrị ime ihe Jizọs dụrụ anyị ọdụ gbasara ọnwụnwa. Ọ sịrị: “Na-echenụ nche.” Anyị kwesịrị ịgbalị na-ezere ihe ndị nwere ike ime ka a nwata anyị ma n’oge ndị anyị chere na anyị siri ike. (1 Kọr. 10:12) Akwụsịla ime ihe ndị na-enyere gị aka imeri ọnwụnwa ahụ. Ilu 28:14 sịrị: “Onye na-akpachapụ anya mgbe niile na-enwe obi ụtọ.”​—2 Pita 3:14.

URU ỊNỌ NA NCHE NA-ABARA ANYỊ

20-21. (a) Olee uru ndị anyị ga-erite ma anyị na-akpachara anya ka a ghara ịnwata anyị? (b) Anyị mee ike anyị niile ka a ghara ịnwata anyị, gịnị ka Jehova ga-emere anyị? (2 Ndị Kọrịnt 4:7)

20 Obi kwesịrị isi anyị ike na ịkpachara anya ka a ghara ịnwata anyị bụ ihe dị mma anyị kwesịrị ịna-eme. Mmehie nwere ike ‘imetụ anyị obi ụtọ obere oge,’ ma ibi ndụ otú Jehova chọrọ ga-eme anyị obi ụtọ karịa ya. (Hib. 11:25; Ọma 19:8) Ihe kpatara ya bụ na e kere anyị ka anyị na-ebi ndụ otú Chineke chọrọ. (Jen. 1:27) Anyị bie ndụ otú dị Jehova mma, akọnuche anyị agaghị na-enye anyị nsogbu. Ọ ga-emekwa ka anyị nwee olileanya inweta ndụ ebighị ebi.​—1 Tim. 6:12; 2 Tim. 1:3; Jud 20, 21.

21 Nke bụ́ eziokwu bụ na ‘anụ ahụ́ adịghị ike.’ Mana, ọ pụtaghị na e nweghị ihe ọ bụla anyị ga-emeli gbasara ebe ndị anyị na-adịghị ike. Jehova nọ ya mgbe niile inye anyị ike anyị ga-eji emeri ọnwụnwa. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:7.) Ma, cheta na ihe Jehova na-enye anyị bụ ike karịrị ike mmadụ. Anyịnwa ga-agbagodị mbọ n’onwe anyị kwa ụbọchị ka anyị lụso ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ọgụ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe anyị kwesịrị ime, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-aza ekpere anyị ma nyekwuo anyị ike mgbe ọ dị anyị mkpa. (1 Kọr. 10:13) N’eziokwu, n’enyemaka Jehova, anyị ga-akpacharali anya ka a ghara ịnwata anyị.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee ihe ndị nwere ike ịbụrụ anyị ọnwụnwa anyị kwesịrị ịkpachara anya maka ha?

  • Olee otú anyị ga-esi chebe onwe anyị ka a ghara ịnwata anyị?

  • Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị nọrọ na nche?

ABỤ NKE 47 Na-ekpe Ekpere Kwa Ụbọchị

a NKỌWAKWU: Na Matiu 26:41, Jizọs kwuru na “ọ na-agụ mmadụ agụụ ime ihe dị mma.” Ihe ọ na-ekwu bụ na ọtụtụ mgbe, n’ime obi anyị, anyị na-achọ ime ihe dị mma. Mana, o kwukwara na ‘anụ ahụ́ adịghị ike.’ Ihe ọ na-ekwu pụtara na anyị nwere ike ịchọ ime ihe dị mma, ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, ezughị okè nwere ike ime ka anyị mee ihe Baịbụl kwuru na ọ dị njọ.

b Ọ ga-abara onye mere mmehie dị oké njọ uru ma ọ gụọ akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, isi nke 57, nọmba nke 1 ruo na nke 3 nakwa isiokwu bụ́ ‘Legide Anya n’Ihu,’ nke gbara n’Ụlọ Nche Nọvemba 2020, peeji nke 27 ruo na nke 29, paragraf nke 12 ruo na nke 17.

c NKỌWA FOTO Dị na: Ebe otu nwanna na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụtụtụ, ebe ọ na-agụ Baịbụl n’oge ezumike ehihie, nakwa ebe ọ gara ọmụmụ ihe etiti izu ná mgbede.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya