ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 15
ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M
“Ịbịa Chineke Nso” Dị Anyị Mma
“Ịbịa Chineke nso dị m mma.”—ỌMA 73:28.
IHE A GA-AMỤ
Anyị ga-amụ otú anyị ga-esi na-abịarukwu Jehova nso na uru anyị ga-erite ma anyị mee otú ahụ.
1-2. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị na mmadụ bụrụ ezigbo enyi? (b) Olee ihe anyị ga-amụ n’isiokwu a?
Ì NWERE ezigbo enyi? Olee otú gị na ya si ghọọ enyi? O nwere ike ịbụ na ị na-ewepụta oge gị na ya anọọ, gị ana-amata nsogbu ndị o nwere, na-amatakwa ihe ndị na-adị ya mma na ihe ndị na-anaghị adị ya mma. Ị chọpụtara ọmarịcha àgwà ndị o nwere ị ga-achọ ịna-amụta. I si otú ahụ bịa hụ enyi gị ahụ n’anya.
2 Ị chọọ ka gị na mmadụ bụrụ enyi, i kwesịrị iwepụtara ya oge, gbaakwa mbọ. Anyị kwesịrị ime ụdị ihe ahụ n’ihe gbasara anyị na Jehova Chineke ịbụ enyi nakwa ịhụ ya n’anya. Isiokwu a ga-akọwa otú anyị ga-esi bịarukwuo Chineke anyị nso na uru ndị anyị ga-erite ma anyị mee otú ahụ. Ka anyị burugodị ụzọ mata ihe mere o ji dị mma ka anyị bịaruo Enyi anyị kachanụ bụ́ Jehova nso.
3. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-atụgharị uche n’uru ndị anyị ga-erite ma anyị bịaruo Jehova nso? Nye ihe atụ.
3 O doro anya na ị ga-ekweta na ịbịaru Jehova nso dị mma. Mana, ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche n’otú o si bụrụ ihe magburu onwe ya, o nwere ike inyere anyị aka ịna-abịarukwu ya nso. (Ọma 63:6-8) Dị ka ihe atụ, anyị ma na iri ezigbo nri, imega ahụ́, ihi ụra nke ọma, na ịṅụ mmiri nke ọma na-abara anyị ezigbote uru. N’agbanyeghị ya, ọtụtụ ndị anaghị echebara ihe ndị a ezigbo echiche. Ha anaghị eme ihe ga-eme ka ahụ́ dị ha mma. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-eche uru ndị anyị ga-erite ma anyị mee ihe ndị ga-eme ka ahụ́ dị anyị mma, o nwere ike ime ka anyị na-agbalịsi ike na-eme ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe banyere ịbịaru Jehova nso. Anyị ma na ịbịaru Chineke nso dị anyị mma. Ma, iche banyere uru ndị anyị ga-erite na ya ga-enyere anyị aka ịna-abịaru Jehova bụ́ Enyi anyị nso.—Ọma 119:27-30.
4. Gịnị ka onye dere Abụ Ọma 73:28 kwuru?
4 Gụọ Abụ Ọma 73:28. Onye dere Abụ Ọma nke 73 bụ onye Livaị a họpụtara ka ọ bụrụ onye na-akụ egwú n’ụlọ nsọ Jehova. Ọ ga-abụ na o ji obi ya niile fee Jehova ruo ọtụtụ afọ. Ma, ọ ghọtara na ya kwesịrị ịna-echetara onwe ya na ndị ọzọ na “ịbịa Chineke nso” dị ya na ha mma. Olee uru ụfọdụ anyị ga-erite ma anyị matakwuo Jehova ma mee ka anyị na ya dịrịkwuo ná mma?
“ỊBỊA CHINEKE NSO” NA-EME ANYỊ OBI ỤTỌ
5. (a) Gịnị mere ịbịarukwu Jehova nso ji eme anyị obi ụtọ? (b) N’ihi ihe e kwuru n’Ilu 2:6-16, nye ihe atụ ndị na-egosi otú amamihe Jehova nwere ike isi baara gị uru ma chebe gị.
5 Ọ bụrụ na anyị ana-abịarukwu Jehova nso, obi ga na-adịkwu anyị ụtọ. (Ọma 65:4) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-enwe obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị agụọ ihe Chineke na-agwa anyị na Baịbụl ma na-erubere ya isi, anyị ga-amara ihe. Ụdị amamihe ahụ na-echebe anyị ka anyị ghara ịba ná nsogbu, gharakwa ime ihe anyị ga-emecha kwaara mmakwaara. (Gụọ Ilu 2:6-16.) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị: “Onye nwetara amamihe na onye na-aghọta ihe na-enwe obi ụtọ.”—Ilu 3:13.
6. Gịnị mere onye dere Abụ Ọma nke 73 ji kwụsị inwe obi ụtọ?
6 Nke bụ́ eziokwu bụ na obi nwere ike ịna-ajọ ndị enyi Jehova njọ mgbe ụfọdụ. Onye dere Abụ Ọma nke 73 nwere mgbe obi jọwara ya njọ maka na o bidoro iche ihe na-adịghị mma. O bidoro iche na ndị na-eme ihe ọjọọ na-enwe obi ụtọ ná ndụ n’agbanyeghị na ha achọghị ịma ihe ọ bụla gbasara Chineke ma ọ bụ na-erubere ya isi. O mere ka iwe na-ewe ya, ya ana-enwekwara ha anyaụfụ. O chere na ndị na-eme tigbuo zọgbuo na ndị mpako na-aka aba ọgaranya, ahụ́ ana-agbasi ha ike, nakwa na ha anaghịdị ata ahụhụ. (Ọma 73:3-7, 12) Otú ihe ahụ si na-ewute ọbụ abụ ahụ ruru nke na o nwere mgbe o bidoro iche na mbọ ọ na-agba ife Jehova furu ọhịa. Obi jọrọ ya ezigbo njọ, ya asị: “N’eziokwu, mbọ m gbara mee ka obi m dị ọcha bụ n’efu. Ọ bụkwa n’efu ka m kwọrọ aka m iji gosi na aka m dị ọcha.”—Ọma 73:13.
7. Ọ bụrụ na obi na-ajọ anyị njọ, olee otú anyị ga-esi nwewe obi ụtọ? (Kọwaakwa foto.)
7 Ọbụ abụ ahụ ekweghị ka mwute ọ na-enwe mee ka ọ kwụsị ife Jehova. O mere ihe o kwesịrị ime. Ọ “batara n’ebe nsọ dị ebube nke Chineke,” ebe Jehova nọ gbazie echiche ya. (Ọma 73:17-19) Ọ bụrụ na obi ajọwa anyị njọ, Jehova, bụ́ ezigbo Enyi anyị, ma banyere ya. Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere ka Jehova duzie anyị ma kwe ka o si n’ọgbakọ ya na Okwu ya nyere anyị aka, anyị ga-enweta ike anyị ga-eji die obi ahụ na-ajọ anyị njọ. Ọ bụrụgodị na anyị na-echegbu onwe anyị, Jehova ga-akasi anyị obi ma mee ka ahụ́ ruo anyị ala.—Ọma 94:19.a
Ebe onye Livaị ahụ dere Abụ Ọma nke 73 guzo “n’ebe nsọ dị ebube nke Chineke” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)
“ỊBỊA CHINEKE NSO” NA-EME KA NDỤ ANYỊ NWEE ISI, ANYỊ ENWEEKWA OLILEANYA
8. Olee ụzọ ndị ọzọ dị mkpa ịbịaru Chineke nso si abara anyị uru?
8 E nwere ụzọ abụọ ọzọ dị mkpa ịbịaru Jehova nso si abara anyị uru. Nke mbụ, ọ na-eme ka ndụ anyị nwee isi. Nke abụọ, ọ na-eme ka anyị nwee olileanya siri ike maka ọdịnihu. (Jere. 29:11) Ka anyị lebakwuo anya n’uru ndị a.
9. Olee otú ịbịaru Jehova nso si eme ka ndụ anyị nwee isi?
9 Ịbịaru Jehova nso na-eme ka ndụ anyị nwee isi. Ọtụtụ ndị taa na-ekwu na Chineke adịghị. N’ihi ya, ha amaghị ihe mere Chineke ji kee ndị mmadụ n’ụwa a. Ha chekwara na o nwere mgbe ọ ga-eru, e nweghịzi mmadụ ọ bụla ga-afọ n’ụwa a. Ma ihe anyị mụtara n’Okwu Chineke emeela ka obi sie anyị ike na Chineke “dị adị nakwa na ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Hib. 11:6) Taa, anyị na-enwekwu obi ụtọ n’ihi na anyị na-eme ihe Chineke bu n’obi kee anyị, ya bụ, ijere Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova ozi.—Diut. 10:12, 13.
10. Gịnị ka Jehova kwere ndị tụkwasịrị ya obi ná nkwa? (Abụ Ọma 37:29)
10 Ọtụtụ ndị enweghị olileanya ọ bụla e ji n’aka maka ọdịnihu. Naanị ihe ha na-eme bụ ịrụ ọrụ, lụọ di ma ọ bụ nwaanyị, mụta ụmụ, kwadebekwa maka otú ha ga-esi lee onwe ha nká. Ha amaghị ihe ọ bụla banyere nkwa Chineke maka ọdịnihu. Ma, ndị ohu Jehova nwere olileanya n’ebe ọ nọ. (Ọma 25:3-5; 1 Tim. 6:17) Anyị tụkwasịrị Chineke, onye anyị na ya dị ná mma, obi. Obi sikwara anyị ike na ọ ga-emezu nkwa o kwere anyị. Ihe so ná nkwa ndị o kwere n’ọdịnihu bụ na anyị ga-enwe ohere ife ya ruo mgbe ebighị ebi na Paradaịs.—Gụọ Abụ Ọma 37:29.
11. Olee uru ịbịaru Jehova nso na-abara anyị, oleekwa otú ọ na-eme ka obi dị ya?
11 E nwere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ ịbịa Chineke nso si abara anyị uru. Dị ka ihe atụ, Jehova kwere nkwa ịgbaghara anyị mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị echegharịa. (Aịza. 1:18) N’ihi ya, obi ekwesịghị ịna-ama anyị ikpe maka mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga. (Ọma 32:1-5) Obi na-adịkwa anyị ụtọ ma anyị mee Jehova obi ụtọ. (Ilu 23:15) Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ uru ndị ọzọ anyị na-erite n’ihi na anyị bụ ndị enyi Jehova. Ma, olee otú ị ga-esi na-abịarukwu Jehova nso?
OTÚ Ị GA-ESI ‘NA-ABỊA CHINEKE NSO’
12. Gịnị ka i mere iji bịakwuo Chineke nso?
12 Tupu anyị emee baptizim ghọọ Ndịàmà Jehova, anyị mere ọtụtụ ihe iji bụrụ ndị enyi Jehova. Anyị mụtara ọtụtụ eziokwu banyere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst, chegharịa ná mmehie anyị, nwee okwukwe siri ike na Chineke ma na-agbalịsi ike ime uche ya. Ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke na-adịkwu ná mma, anyị ekwesịghị ịkwụsị ịna-eme ihe ndị a.—Kọl. 2:6.
13. Olee ụzọ ihe atọ ga-enyere anyị aka ịna-abịakwu Jehova nso?
13 Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-abịakwu Jehova nso? Nke mbụ, anyị ga na-agụ Baịbụl ma na-amụ ya. Ihe anyị kwesịrị ibu n’obi na-eme otú ahụ abụghị naanị ka anyị mụta ihe ụfọdụ banyere Chineke, kama, anyị kwesịrị ịgbalị na-aghọta ihe Chineke chọrọ ka anyị mee ma na-eme ihe ndị o kwuru n’Okwu ya. (Efe. 5:15-17) Nke abụọ, anyị kwesịrị ime ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-atụgharị uche n’ọtụtụ ihe gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. Nke atọ, anyị ga na-akpọ ihe Jehova kpọrọ asị asị, gharakwa imeta ndị na-eme ụdị ihe ndị ahụ enyi.—Ọma 1:1; 101:3.
14. N’ihi ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 10:31, olee ihe ụfọdụ anyị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị iji mee Jehova obi ụtọ? (Kọwaakwa foto.)
14 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:31. Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-eme ihe ndị na-adị Jehova mma. Ọ pụtaghị naanị ịna-aga ozi ọma na ịna-aga ọmụmụ ihe. Ihe ndị so n’ihe ndị ga-eme Jehova obi ụtọ bụ ihe ọma anyị na-eme kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị ana-ekwu eziokwu n’ihe niile anyị na-eme, na-emesapụrụ ndị ọzọ aka, anyị na-eme Jehova obi ụtọ. (2 Kọr. 8:21; 9:7) Ọ chọkwara ka anyị jiri ndụ o nyere anyị kpọrọ ihe. N’ihi ya, anyị na-akpachara anya n’otú anyị si eri nri na otú anyị si aṅụ mmanya. Anyị na-emekwa ihe ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ka ahụ́ na-adị anyị mma otú o kwere omume. Mbọ ọ bụla anyị gbara iji mee Jehova obi ụtọ, ọ bụrụgodị n’ihe ndị yiri obere ihe, ga-eme ka ọ na-ahụkwu anyị n’anya.—Luk 16:10.
Ịkpachara anya mgbe anyị na-akwọ ụgbọala, imega ahụ́, ịna-eri ezigbo nri, nakwa ịna-emesapụrụ ndị ọzọ aka bụ ụfọdụ ụzọ anyị si eme ihe dị Jehova mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)
15. Olee otú Jehova chọrọ ka anyị si na-emeso ndị ọzọ ihe?
15 Jehova na-emere ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume ihe ọma. (Mat. 5:45) Ọ chọkwara ka anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị ka anyị “ghara ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla, ghara ịbụ ndị okwu na ụka,” kama ka anyị “jiri obi nwayọọ na-emeso mmadụ niile ihe mgbe niile.” (Taị. 3:2) N’ihi ya, anyị anaghị eleda ndị ọzọ anya naanị n’ihi na ha abụghị Ndịàmà Jehova. (2 Tim. 2:23-25) Anyị na Jehova ga na-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na anyị ana-emere ndị ọzọ ihe ọma ma na-echebara ha echiche n’ihe niile anyị na ha na-emekọ.
ANYỊ GA-ABỊALI “CHINEKE NSO” Ọ BỤRỤGODỊ NA ANYỊ EMEJỌỌ IHE
16. Olee otú obi dị onye dere Abụ Ọma nke 73 mgbe o jeerela Jehova ozi ruo afọ ụfọdụ?
16 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị nọkata chewe na Jehova agaghị ahụli gị n’anya? Dị ka anyị kwurula, ụdị ihe ahụ mere onye dere Abụ Ọma nke 73. Ọ sirị: “Ọ fọrọ obere ka m kpafuo. Ọ fọrọ obere ka ụkwụ m mịchapụ.” (Ọma 73:2) Ihe o kwuru gosiri na ‘obi adịghị ya mma,’ na ‘ọ naghị eche echiche,’ na o “yiri anụ ọhịa na-amaghị ihe” n’ihu Jehova. (Ọma 73:21, 22) Ma, ò chere na n’ihi ihe ndị ọ na-anaghị emeta, Jehova agaghị ahụli ya n’anya nakwa na ọ gaghị agbagharali ya?
17. (a) Gịnị ka onye dere Abụ Ọma nke 73 mere mgbe obi dara ya mbà? (b) Olee ihe anyị na-amụta n’ihe o mere? (Kọwaakwa foto.)
17 Ọ bụrụ na onye dere abụ ọma ahụ chere na Jehova ahapụla ya, ọ ga-abụrịrị na o chere otú ahụ naanị obere oge. N’oge ahụ obi na-adịghị ya mma, ọ ma na o kwesịrị ịbịakwu Jehova nso. Ọ bụ ya mere o ji dee, sị: “Ma ugbu a, mụ na gị na-anọ mgbe niile. I jidela m aka n’aka nri m. I ji ndụmọdụ ị na-enye m na-edu m, ị ga-emekwara m amara n’ikpeazụ.” (Ọma 73:23, 24) Anyịnwa kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o mee ka anyị dị ike ma ọ bụrụ na ọ dị anyị ka okwukwe anyị esighịzi ike ma ọ bụ mgbe ihe ndị anyị mejọrọ mere ka anyị dawa mbà. (Ọma 73:26; 94:18) Ọ bụrụgodị na anyị mere mmehie dị oké njọ, anyị ga-alọghachikwuteli ya, obi esie anyị ike na ọ dị “njikere ịgbaghara mmehie.” (Ọma 86:5) Ọ bụrụ na obi adaa anyị mbà, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike bịakwuo Chineke anyị nso.—Ọma 103:13, 14.
Ọ bụrụ na anyị achọpụta na okwukwe anyị esighịzi ike, anyị kwesịrị ịgba mbọ bịakwuo Jehova nso. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iwepụta oge na-ekpe ekpere ma na-agachi ọmụmụ ihe anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)
“ỊBỊA CHINEKE NSO” RUO MGBE EBIGHỊ EBI
18. Gịnị mere anyị ga-eji na-abịakwu Jehova nso ruo mgbe ebighị ebi?
18 Anyị ga na-abịakwu Jehova nso ruo mgbe ebighị ebi. O nweghị mgbe anyị ga-akwụsị ịna-amụtakwu banyere ya. Baịbụl kwuru na e nweghị “onye nwere ike ịmatacha” ụzọ Jehova, amamihe ya, na ihe ndị ọ ma.—Rom 11:33.
19. Olee obi ike akwụkwọ Abụ Ọma na-eme ka anyị nwee?
19 Abụ Ọma 79:13 sịrị: “Anyị bụ́ ndị gị, ndị bụ́kwa ìgwè atụrụ ị na-enye nri, ga na-ekele gị ruo mgbe ebighị ebi. Anyị ga-etokwa gị si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.” Ka ị na-abịakwu Jehova nso, obi ga-esikwa gị ike na ị ga-enweta ngọzi ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ị ga-ejikwa obi ike kwuo, sị: “Chineke bụ oké nkume m nke na-eme ka obi sie m ike, bụrụkwa òkè m ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 73:26.
ABỤ NKE 32 Na-akwado Jehova
a Ọ bụrụ na mmadụ na-echegbukarị onwe ya, ma ọ bụ na obi na-ajọ ya njọ ruo ogologo oge, o nwere ike ịdị mkpa ka ọ gaa hụ dọkịta. Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Ụlọ Nche Nke 1, 2023.