Ị̀ Maara?
Olee otú ndị nchụàjà na-achụ àjà n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem si awụfu ọbara anụmanụ ha ji chụọ àjà?
N’AFỌ ọ bụla, ndị nchụàjà n’Izrel oge ochie na-eji ọtụtụ puku anụmanụ achụ àjà n’ụlọ nsọ. Onye na-akọ ihe mere n’oge ochie aha ya bụ Josifọs kwuru na n’ụbọchị Ememme Ngabiga, a na-eji ihe karịrị narị puku atụrụ abụọ na puku iri ise (250,000) achụ àjà. Ihe a na-eme ka ọbara buru ibu na-esi n’ebe ịchụàjà na-asọ ka mmiri. (Lev. 1:10, 11; Ọnụ Ọgụ. 28:16, 19) Ebee ka ọbara ndị ahụ niile na-aga?
Ndị ọkachamara n’ihe ndị mgbe ochie egwuola gburugburu ụlọ nsọ ahụ Herọd rụrụ nke dị n’oge Jizọs. Ha hụrụ ihe yiri ọwa mmiri ọbara ahụ na-abanye ma si na ya na-asọpụ.
Ka anyị lee ihe abụọ na-eme ka ebe ịchụàjà ahụ na-adị ọcha:
Oghere dị n’okpuru ebe ịchụàjà ahụ: Akwụkwọ oge ochie e dere iwu ndị Juu na omenala ha kọwara ebe ọbara na-esi asọpụ n’ebe ịchụàjà ahụ. E dere ya mgbe afọ 200 Oge Ndị Kraịst gachara. Akwụkwọ ahụ kwuru na e nwere oghere abụọ n’otu akụkụ ebe ịchụàjà ahụ. Ọbara anụmanụ ndị e ji chụọ àjà na mmiri e ji saa ebe ịchụàjà ahụ na-esi n’oghere ndị ahụ asọba na Ndagwurugwu Kidrọn.
Ihe ndị ọkachamara n’ihe ndị mgbe ochie chọpụtara n’oge a gosiri n’eziokwu na e nwere oghere n’ebe dị nso n’ebe ịchụàjà ahụ. Otu akwụkwọ nke kọrọ banyere ndị Juu n’oge ochie kwuru na ndị ọkachamara achọpụtala na e nwere oghere dị nso n’ụlọ nsọ ahụ nakwa na ọ dị ka ọ̀ bụ n’ebe ahụ ka ọbara e ji chụọ àjà na mmiri si n’ebe ịchụàjà na-esi asọpụ.
Mmiri buru ibu: Ọ dị mkpa ka ndị nchụàjà nwee mmiri buru ibu a ga-eji na-asacha ala ebe ịchụàjà ahụ na oghere ọbara ahụ ga-esi na-asọpụ. Ndị nchụàjà na-esi n’obodo enweta mmiri. E nwere ọwa mmiri ndị mmiri na-esi na ha asọbata n’ebe ịchụàjà ahụ, nweekwa olulu mmiri. Onye ọkachamara n’ihe ndị mgbe ochie aha ya bụ Joseph Patrich kwuru na o nweghị ụlọ nsọ ọzọ n’oge ahụ nwere ebe dị mma otú a e si enweta mmiri nakwa ebe mmiri na-adịghị mma na-esi asọpụ.