Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 4/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-ele Onyinye nke Ndụ E Nyere Gị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ile Ndụ Anya Otú Chineke Si Ele Ya
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Bụrụ Onye Chineke Ahụ Dị Ndụ Na-eduzi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 4/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe ndị agha Sọl rikọtara anụ na ọbara ya, n’ihi gịnị ka a na-egbughị ha, ebe nke ahụ bụ ntaramahụhụ e setịpụrụ n’Iwu Chineke?

Ndị ikom ndị a mebiri iwu Chineke banyere ọbara, ma ọ pụrụ ịbụ na e meworo ha ebere n’ihi na ha nwere nkwanye ùgwù maka ọbara, ọ bụ ezie na ha kwesịrị ilezikwu anya banyere igosi nkwanye ùgwù dị otú ahụ.

Tụlee ọnọdụ ahụ. Ndị Israel n’okpuru Eze Sọl na nwa ya bụ́ Jonatan na-ebuso ndị Filistia agha. N’otu oge mgbe “a chịrị ndị ikom Israel n’ihe ike” n’agha, Sọl ṅụrụ iyi n’obi ọkụ na ndị ikom ya agaghị eri nri ruo mgbe e meriri ndị iro ahụ. (1 Samuel 14:24) Ngwa ngwa iyi ya wetara nsogbu.

Ndị ikom ya na-emeri n’agha siworo nnọọ ike, ma oké ndọlị ahụ na-akpa ike ọjọọ n’ahụ ha. Agụụ ji ha, ike gwụsịkwara ha. Gịnị ka ha mere n’ọnọdụ ahụ sibigara ike ókè? “Ndị Israel wee dakwasị ihe a kwatara n’agha, ha wee chịrị ìgwè ewu na atụrụ, na ìgwè ehi, na ụmụ ehi, gbuo ha n’ala ahụ: ndị Israel wee rie ha na ọbara.”​—⁠1 Samuel 14:32.

Nke ahụ bụ mmebi nke iwu Chineke banyere ọbara, dị ka ụfọdụ ná ndị Sọl gwara ya, na-asị: “Lee, ndị Israel na-emehie megide Jehova n’iri anụ, ya na ọbara.” (1 Samuel 14:33) Ee, Iwu ahụ sịrị na mgbe a na-egbu anụmanụ, a ga-agbapụsị ọbara ya tupu a na-eri anụ ya. Chineke achọghị ime ihe nke ịnụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè n’ịgbapụsị ọbara ahụ. Site n’ime ihe ndị ezi uche dị na ha iji gbapụsịa ya, ndị ohu ya pụrụ igosipụta nkwanye ùgwù maka ihe ọbara na-anọchite anya ya. (Deuterọnọmi 12:​15, 16, 21-⁠25) A pụrụ iji ọbara anụmanụ mee ihe n’ụzọ ịchụ àjà n’elu ebe ịchụàjà, ma a gaghị eri ya eri. Ahụhụ a ga-enye maka ịma ụma mebie iwu ahụ bụ ọnwụ, n’ihi na a gwara ndị Chineke, sị: “Unu erila ọbara anụ ahụ ọ bụla: n’ihi na ndụ nke anụ ahụ ọ bụla, ọbara ya ka ọ bụ: onye ọ bụla nke na-eri ya, a ga-ebipụ ya.”​—⁠Levitikọs 17:​10-⁠14.

Ndị agha Eze Sọl hà ma ụma na-emebi Iwu ahụ? Hà na-egosi ajọ enweghị nkwanye ùgwù maka iwu Chineke banyere ọbara?​—⁠Tụlee Ọnụ Ọgụgụ 15:30.

Ọ dịghị mkpa na anyị ga-ekwubi otú ahụ. Ihe ndekọ ahụ na-asị na ‘na-egbu anụ ndị ahụ n’ala ahụ ma na-eri ha, na ọbara ha.’ Ya mere ọ pụrụ ịbụ na ha na-eme mgbalị ụfọdụ ịgbapụ ọbara ha. (Deuterọnọmi 15:23) Ma, n’ọnọdụ ha nke oké ike ọgwụgwụ, nke ndị oké agụụ ji, ha ekoweghị anụ ndị ahụ e gburu egbu n’elu ma nye oge zuru ezu maka mgbapụ ọbara n’ókè kwesịrị ekwesị. Ha gburu atụrụ na ehi ndị ahụ “n’ala ahụ,” nke pụrụ igbochilata mgbapụ ọbara. Ha jikwa oké ọsọ ọsọ bekara anụ site n’ozu anụ ndị ahụ bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha dina n’ọbara. N’ihi ya, ọbụna ma ọ bụrụ na ha bu n’uche irubere iwu Chineke isi, ha emezughị ya n’ụzọ ndị kwesịrị ekwesị ma ọ bụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu.

Ihe si na ya pụta bụ na “ndị Israel wee rie ha na ọbara,” nke bụ ime mmehie. Sọl ghọtara nke a wee nye iwu ka a kpọretere ya otu nnukwute nkume. O nyere ndị agha ahụ iwu, sị: “Wetaranụ m nso, nwoke ọ bụla ehi ya, na nwoke ọ bụla atụrụ ya, gbuokwanụ ha n’ebe a, rie; unu emehiekwala megide Jehova n’iri anụ, ya na ọbara.” (1 Samuel 14:​33, 34) Ndị agha ahụ dara iwu rubere isi, “Sọl wee wuoro Jehova ebe ịchụàjà.”​—⁠1 Samuel 14:35.

Igbu anụmanụ n’elu nkume ma eleghị anya mere ka a gbapụsịa ọbara zuru ezu. A pụrụ ịnọ n’ebe dịpụrụ adịpụ site n’ebe e gburu anụmanụ ndị ahụ rie anụ ndị sitere n’anụ ndị ahụ. Sọl pụrụ ijiwo ụfọdụ n’ọbara gbapụtara mee ihe n’elu ebe ịchụàjà ahụ iji rịọ ebere Chineke n’isi ndị ahụ mehieworonụ. Jehova mekwaara ha ebere, ma eleghị anya n’ihi na ọ maara mgbalị ndị ndị agha meworo ọ bụ ezie na ike gwụrụ ha nke ukwuu, agụụ na-agụkwa ha. Chineke pụkwara ịtụlewo na ọ bụ iyi Sọl ṅụrụ n’obi ọkụ rụgideworo ndị ikom ya ịbanye n’ọnọdụ ahụ siri ike.

Ihe ndekọ nke a na-egosi na ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa abụghị ihe ngọpụ ọ bụla maka ileghara iwu Chineke anya. O kwesịkwara inyere anyị aka ịhụ mkpa ọ dị iji nlezianya chee echiche tupu a na-aṅụ iyi, n’ihi na iyi ọkụ ọkụ pụrụ ịkpata nsogbu nye anyị onwe anyị na nye ndị ọzọ.​—⁠Eklisiastis 5:​4-⁠6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya