ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 35
ABỤ NKE 121 Anyị Kwesịrị Ịna-ejide Onwe Anyị
Otú Anyị Ga-esi Emeri n’Ọgụ Anyị Na-alụso Ihe Ọjọọ Na-agụ Anyị Agụụ
“Unu ekwela ka mmehie bụrụ eze na-achị ahụ́ unu nke na-anwụ anwụ, unu ewee na-eme ihe ahụ́ unu chọrọ.”—ROM 6:12.
IHE A GA-AMỤ
Isiokwu a ga-enyere anyị aka (1) ka anyị ghara ịda mbà ma e nwee ihe na-adịghị mma na-agụ anyị agụụ nakwa (2) ka anyị mata otú anyị ga-esi emeri ọnwụnwa.
1. Olee nsogbu anyị niile nwere?
È NWETỤLA mgbe ọ gụsiri gị agụụ ike ime ihe Jehova kpọrọ asị? Ọ bụrụ otú ahụ, echela na ọnwụnwa nke gị kazi nke ndị ọzọ. Baịbụl sịrị: “Ọnwụnwa na-abịara unu na-abịakwara mmadụ niile.” (1 Kọr. 10:13) Ihe a pụtara na n’agbanyeghị ihe ọ bụla na-adịghị mma ị na-alụso ọgụ, e nwekwara ndị ọzọ na-alụso ya ọgụ. Ọ bụghị naanị gị ka ọ na-adị otú ahụ. N’enyemaka Jehova, ị ga-emeri.
2. Olee ụdị ọnwụnwa nwere ike ịbịara ụfọdụ Ndị Kraịst na ndị a na-amụrụ Baịbụl? (Kọwaakwa foto.)
2 Baịbụl sịkwara: “Ọ bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ na-anwa onye ahụ, nwata ya.” (Jems 1:14) Ihe nwere ike ịbụrụ otu onye ọnwụnwa nwere ike ịdị iche na nke onye ọzọ. Dị ka ihe atụ, e nwere Ndị Kraịst ọnwụnwa nke ha bụ ka ha na onye na-abụghị nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwee mmekọahụ rụrụ arụ, nke ụfọdụ ndị abụrụ ka ha na nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwee mmekọahụ. O nwere ike ịna-agụsi ndị kwụsịrịla ile ndị gba ọtọ agụụ ike ka ha bidokwa ile ya. O nwekwara ike ịna-adị ndị kwụsịrịla ịṅụ oké mmanya na ọgwụ ọjọọ otú ahụ. Ihe a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị na-agụ ụfọdụ Ndị Kraịst na ndị a na-amụrụ Baịbụl agụụ ha na-alụso ọgụ. O nwere ike ịbụ na ọ dịtụla anyị niile otú ọ dị Pọl onyeozi. Ọ sịrị: “Mgbe m chọrọ ime ihe dị mma, ihe ọjọọ na-abata m n’obi.”—Rom 7:21.
Ọnwụnwa nwere ike ịbịara anyị n’oge anyị na-atụghị anya ya, mgbe ọ bụla, nakwa n’ebe ọ bụla (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2)c
3. E nwee ihe ọjọọ na-agụkarị Onye Kraịst agụụ, olee ihe o nwere ike ime ka o chewe?
3 Ọ bụrụ na e nwere ihe ọjọọ na-agụkarị gị agụụ, i nwere ike iche na ị gaghị emerili ya. O nwekwara ike ịdị gị ka i nweghị olileanya, na Jehova agaghị ekwe ka ị dịrị ndụ ebighị ebi n’ihi ihe ahụ na-adịghị mma na-agụ gị agụụ. Mana, ka obi sie gị ike na ọ bụghị eziokwu. Iji kọwaa ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ, anyị ga-aza ajụjụ abụọ n’isiokwu a. (1) Gịnị na-eme ka anyị chee na anyị agaghị emerili ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ, nakwa na anyị enweghị olileanya? (2) Olee otú ị ga-esi merie n’ọgụ ị na-alụso ihe na-adịghị mma na-agụ gị agụụ?
IHE “AJỌ ONYE AHỤ” CHỌRỌ KA ANYỊ NA-ECHE
4. (a) Gịnị mere Ekwensu ji chee na anyị agaghị emerili ọnwụnwa? (b) Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na anyị ga-emerili ọnwụnwa?
4 Setan chọrọ ka anyị na-eche na anyị agaghị emerili ọnwụnwa na-abịara anyị. Jizọs mere ka o doo anya n’ekpere ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị ha kpee ekpere, sị: “Ekwela ka a nwata anyị, kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Mat. 6:13) Setan kwuru na ụmụ mmadụ agaghị erubere Jehova isi ma ọnwụnwa bịara ha. (Job 2:4, 5) Gịnị mere Ekwensu ji chee otú a? Ọ bụ ya bụ onye mbụ ihe ọjọọ na-agụ ya rafuru. Ọ chọghịkwa ịna-erubere Jehova isi. Ọ bụ ya mere o ji chee na anyị dị ka ya, na anyị ga-ahapụ Jehova ma ọnwụnwa bịara anyị. Setan chedịrị na Ọkpara Chineke zuru okè ga-emehie ma ọ nwaa ya ọnwụnwa. (Mat. 4:8, 9) Chegodị ihe a: Ọ̀ bụ eziokwu na anyị agaghị emerili ọnwụnwa ndị na-abịara anyị? Anyị ga-emerili ha. Anyị kwetara ihe Pọl onyeozi kwuru. O dere, sị: “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.”—Fil. 4:13.
5. Olee otú anyị si mara na obi siri Jehova ezigbo ike na anyị ga-emerili ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ime ihe ọjọọ?
5 Jehova adịghị ka Setan. Obi siri ya ezigbo ike na anyị ga-emerili ọnwụnwa. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ n’ihi na Jehova ebuola amụma na a ga-enwe oké ìgwè mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-alanahụ oké mkpagbu. Chegodị ihe ọ pụtara. Jehova bụ́ onye na-enweghị ike ịgha ụgha kwuru na oké ìgwè mmadụ, ọ bụghị mmadụ ole na ole, ga-aba n’ụwa ọhụrụ ya n’ihi na ha kwesịrị ntụkwasị obi ebe ọ bụ na “ha ejirila ọbara Nwa Atụrụ ahụ saa uwe mwụda ha, uwe mwụda ha ana-achazi ọcha.” (Mkpu. 7:9, 13, 14) O doro anya na Jehova anaghị ele anyị anya ka ndị na-agaghị emerili ọnwụnwa na-abịara anyị ime ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ.
6-7. Gịnị mere Setan ji chọọ ka anyị dịrị ka ndị na-enweghị olileanya mgbe anyị na-alụso ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ ọgụ?
6 Setan chọkwara ka anyị chee na ọ bụrụ na e nwere ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ, ọ pụtara na ihe anyị agaghị amasịli Jehova. Cheekwa ihe mere Setan ji chee otú ahụ. Ọ bụ yanwa bụ onye na-enweghị olileanya. O nweghị ihe ga-eme ka ya na Jehova dịrị ná mma ọzọ. Ọ gaghịkwa adị ndụ ebighị ebi. A ga-ebibi ya. (Jen. 3:15; Mkpu. 20:10) Ọ bụ ya mere na ọ naghị eju anyị anya na Setan chọrọ ka anyị dịrị ka ndị na-enweghị olileanya, karịchaa, ebe ọ bụ na anyịnwa nwere olileanya inweta ngọzi ndị ọ na-agaghị enweta. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na anyị adịghị ka ya ma otu. Baịbụl medịrị ka obi sie anyị ike na Jehova chọrọ inyere anyị aka, ọ bụghị ịma anyị ikpe. “O nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.”—2 Pita 3:9.
7 Ọ bụrụ na anyị echee na anyị agaghị emerili ọnwụnwa ma ọ bụkwanụ na ihe anyị agaghị adịli Jehova mma ka anyị na-agbalị imeri ọchịchọ ọjọọ anyị na ya na-alụ, anyị na-eche ihe Setan chọrọ ka anyị chee. Icheta ihe a ga-enyere anyị aka ikpebisi ike ịlụso Ekwensu ọgụ.—1 Pita 5:8, 9.
OTÚ OBI NWERE IKE ỊDỊ ANYỊ N’IHI NA ANYỊ EZUGHỊ OKÈ
8. E wepụ ime ihe ọjọọ, olee ihe ọzọ bụ mmehie? (Abụ Ọma 51:5) (Kwuokwa ihe e dere ná “Nkọwakwu.”)
8 E wepụ Setan, e nwere ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị chee na anyị agaghị emerili ọnwụnwa ma ọ bụ na ihe anyị agaghị adịli Jehova mma. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ mmehie anyị ketara n’aka nne na nna mbụ anyị.a—Job 14:4; gụọ Abụ Ọma 51:5.
9-10. (a) Olee otú mmehie si kpaa Adam na Iv aka? (Kọwaakwa foto.) (b) Oleekwa otú mmehie si akpa anyịnwa aka?
9 Chegodị otú mmehie si kpaa Adam na Iv aka. Mgbe ha nupụchaara Jehova isi, ha gara zoo ma gbalịa ikpuchi ahụ́ ha. Akwụkwọ Insight on the Scriptures kwuru gbasara ihe ahụ ha mere. Ọ sịrị: “Mmehie mere ka obi ha na-ama ha ikpe, ha ana-echegbu onwe ha, obi erughịzi ha ala, ihere ana-emekwa ha.” Adam na Iv yiri ndị a kpọchiri n’ụlọ nwere naanị ọnụ ụlọ anọ. Ọnụ ụlọ ndị ahụ bụ obi amamikpe, nchegbu, obi erughị ala, na ihere. Ha nwere ike isi n’otu ọnụ ụlọ gafere n’ọzọ. Mana ha agaghị esili n’ụlọ ahụ pụọ. Ha agaghị agbanahụli mmehie ha.
10 Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na Adam na Iv abụghị otu. Ihe mgbapụta ahụ abaraghị hanwa uru, mana ọ baara anyị uru. Ọ na-ehichapụ mmehie anyị ma mee ka anyị nwee akọnuche dị ọcha. (1 Kọr. 6:11) N’agbanyeghị ya, anyị ka bụkwa ndị mmehie. Ọ bụ ya mere anyị mee mmehie, obi na-ama anyị ikpe, anyị ana-echegbu onwe anyị, obi anaghị eru anyị ala, ihere ana-emekwa anyị. N’eziokwu, Baịbụl sịrị na mmehie na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ, ma “ndị na-emeghị ụdị mmehie Adam mere.” (Rom 5:14) Ma, anyị ekwesịghị iche na ebe ọ bụ na anyị ketara mmehie, anyị agaghị emelizi ihe dị mma ma ọ bụkwanụ nwee olileanya maka ọdịnihu. Anyị ga-akwụsịli iche otú ahụ. Olee otú anyị ga-esi eme ya?
Mmehie mere ka obi maa Adam na Iv ikpe, ha echegbuwe onwe ha, obi erughị ha ala, ihere emewekwa ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)
11. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ dị anyị ka anyị agaghị emerili ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ? N’ihi gịnị? (Ndị Rom 6:12)
11 Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka anyị agaghị emerili ọnwụnwa. O nwere ike ịdị ka è nwere olu na-agwa anyị okwu n’obi anyị na anyị agaghị emerili ọnwụnwa. Mana, anyị ekwesịghị ige olu ahụ ntị. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Baịbụl na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị ikwe ka mmehie ‘bụrụ eze na-achị ahụ́ anyị.’ (Gụọ Ndị Rom 6:12.) Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-ekpebili na anyị agaghị eme ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ. (Gal. 5:16) Obi siri Jehova ike na anyị ga-emerili ọnwụnwa, ma ọ́ bụghị ya, ọ gaaraghị agwa anyị ka anyị mee otú ahụ. (Diut. 30:11-14; Rom 6:6; 1 Tesa. 4:3) O doro anya na anyị ga-emerili n’ọgụ anyị na-alụso ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ.
12. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị chewe na anyị enweghị olileanya? Maka gịnị?
12 Mgbe ọ bụla ọ dị anyị ka anyị enweghị olileanya, anyị ana-eche na Jehova ga-ama anyị ikpe n’ihi na e nwere ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ, anyị nwekwara ike iwere ya na e nwere olu na-agwa anyị ihe ahụ. Anyị ekwesịkwaghị ige ya ntị. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Baịbụl na-akụziri anyị na Jehova ma na anyị ketara mmehie. (Ọma 103:13, 14) Ọ ma “ihe niile” gbasara anyị, ma ụzọ dị iche iche mmehie anyị ketara si eme ka ihe na-adịghị mma na-agụ anyị agụụ. (1 Jọn 3:19, 20) Ọ bụrụhaala na anyị na-alụso mmehie na-agụ anyị agụụ ọgụ ma ghara ime ya, Jehova ga-ewere anyị ka ndị dị ọcha. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ya?
13-14. Ihe ọjọọ ịna-agụ mmadụ agụụ ọ̀ pụtara na onye ahụ agaghịzi abụli enyi Jehova? Kọwaa.
13 Baịbụl gosiri na e nwere ezigbo ihe dị iche n’ihe ọjọọ ịgụ mmadụ agụụ na mmadụ ime ihe ọjọọ ahụ na-agụ ya. Ọ bụghị mgbe niile ka anyị ga-egbochili ihe ọjọọ ịgụ anyị agụụ, ma anyị nwere ike ijide onwe anyị ka anyị ghara ime ihe ọjọọ ahụ na-agụ anyị agụụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt n’oge ndịozi bụbu ndị ha na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-enwe mmekọahụ. Pọl dere, sị: “Ụfọdụ n’ime unu na-akpabu àgwà ndị a.” Ihe a ọ̀ pụtara na e nweghị mgbe ọ bụla ọzọ ọ gụrụ ha agụụ ka ha na nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwee mmekọahụ? Ọ gaghị adaba adaba ma anyị chee otú ahụ ebe ọ bụ na ime ihe ahụ riri ha ahụ́ tupu ha agbanwee. Ma, Jehova ji ha kpọrọ ihe n’ihi na ha jidere onwe ha ma hapụ ime ihe ọjọọ ahụ na-agụ ha agụụ. O weere ha ka ndị ‘a sacharala.’ (1 Kọr. 6:9-11) Ọ bụkwa otú Jehova nwere ike isi ewere gị.
14 N’agbanyeghị ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ ị na-alụso ọgụ, ị ga-emerili ya. Ọ bụrụgodị na ọ gaghị ekwe gị omume ịkwụsịcha iche gbasara ya, i nwere ike ijide onwe gị ma ghara ‘ịna-eme ihe ọ bụla na-atọ anụ ahụ́ gị ụtọ na ihe ọ bụla batara gị n’echiche.’ (Efe. 2:3) Olee otú i nwere ike isi eme ya ma merie n’ọgụ ị na-alụso ihe ọjọọ na-agụ gị?
OTÚ ANYỊ GA-ESI EMERI
15. Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri n’ọgụ anyị na-alụso ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ, gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agwa onwe anyị eziokwu?
15 Ọ bụrụ na ị chọrọ imeri n’ọgụ ị na-alụso ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ, i kwesịrị ịgwa onwe gị eziokwu ma kweta na e nwere ebe ị na-adịghị ike. Kpachara anya ka ị ghara ‘ịna-aghọgbu onwe gị.’ (Jems 1:22) Dị ka ihe atụ, onye na-aṅụ oké mmanya nwere ike ịsị na o nweghị ihe o mere n’ihi na o chere na ndị ọzọ na-aṅụ mmanya karịa ya. Onye ọnwụnwa nke ya bụ ile ndị gba ọtọ nwere ike ịtawa ndị ọzọ ụta ma sị na ọ garaghị abụrụ ya ọnwụnwa ma a sị na nwunye ya na-egosi ya ịhụnanya karịa otú o si eme. N’ihi ya, emekwala ka o yie ka ime ihe na-adịghị mma ọ̀ dị mma. Ọ bụ gịnwa ga-eji isi gị eburu ihe ọ bụla i metara.—Gal. 6:7.
16. Gịnị ka ị ga-eme ka i kpebisikwuo ike ime ihe dị mma?
16 E wepụ ịgwa onwe gị eziokwu na e nwere ebe ị na-adịghị ike, i kwesịkwara ikpebisikwu ike na ị gaghị eme ihe ahụ na-abụrụ gị ọnwụnwa. (1 Kọr. 9:26, 27; 1 Tesa. 4:4; 1 Pita 1:15, 16) Chee gbasara ihe kacha abụrụ gị ọnwụnwa nakwa mgbe ọ na-akacha abụrụ gị ọnwụnwa. O nwere ike ịbụ na e nwere otu ụdị ọnwụnwa na-abịakarịrị gị ma ọ bụkwanụ otu oge n’ụbọchị ọnwụnwa na-ejikarị abịara gị. Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-esiri gị ike imeri ọnwụnwa mgbe ike gwụrụ gị ma ọ bụ n’ime abalị? Jikere ma kpebie ihe ị ga-eme ka a ghara ịnwata gị mgbe ọ bụla ọnwụnwa bịara. Oge kacha mma ị ga-eme ihe a bụ tupu ọnwụnwa ahụ abịara gị.—Ilu 22:3.
17. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Josef mere? (Jenesis 39:7-9) (Kọwaakwa foto.)
17 Ka anyị lee ihe Josef mere mgbe nwunye Pọtịfa gbalịrị ịnwata ya. Josef jụrụ ọnwụnwa ahụ ozugbo. (Gụọ Jenesis 39:7-9.) Gịnị ka ihe a na-egosi? Josef ekpebiela n’obi ya na ya na nwunye nwoke ọzọ agaghị eme omume rụrụ arụ tupu nwunye Pọtịfa agbalịa ịnwata ya. Gịnwa nwekwara ike ijikere ejikere ma kpebie ihe ị ga-eme iji zere ọnwụnwa tupu ọnwụnwa ahụ abịa. I mee otú ahụ, ọ bụrụ na ọnwụnwa abịa, ọ ga-adịrị gị mfe ime ihe ahụ i kpebirila.
Jụ ọnwụnwa ozugbo otú ahụ Josef mere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)
‘NA-ENYOCHA ONWE GỊ’
18. Olee ihe ọzọ ị ga-eme iji merie ọnwụnwa na-abịara gị ime ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ? (2 Ndị Kọrịnt 13:5)
18 Ọ bụrụ na ị chọrọ imeri ọnwụnwa na-abịara gị ka i mee ihe ọjọọ, i kwesịrị ‘ịna-enyocha onwe gị’ mgbe niile ka ị chọpụta otú ị na-eme. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 13:5.) Ị nọtụ, gị elebagharịa anya n’otú i si eche echiche nakwa n’ihe ndị ị na-eme ma gbanwee ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụgodị na i meriri ọnwụnwa, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee oge o were m iji merie ya?’ Ị chọpụta na o gburu gị oge imeri ya, atala onwe gị ụta. Kama, chee gbasara ihe ndị ị ga-eme ka i mekwuo nke ọma n’oge ọzọ. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Ọ bụrụ na ihe ọjọọ abata m n’obi, m̀ nwere ike ịgbalị kwụsị iche ya ngwa ngwa karịa otú m na-emebu? Ihe ndị m na-eji eme onwe m obi ụtọ hà na-eme ka o siere m ike ịgbara ọnwụnwa ọsọ? M̀ na-ewepụ anya m ozugbo ma m hụ ebe a na-eme omume rụrụ arụ na tiivi ma ọ bụ n’Ịntanet? M̀ ghọtara na ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme bụ ihe kacha mma, ọ bụrụgodị na m kwesịrị ịgbalịsi ike jide onwe m iji mee ihe dị Jehova mma?’—Ọma 101:3.
19. Olee otú ime obere ihe na-adịghị mma ga-esi mee ka o sikwuoro mmadụ ike ịlụso ihe ọjọọ na-agụ ya agụụ ọgụ?
19 Achọkwala ihe ị ga-akụdo aka mee ihe ọjọọ ahụ. Baịbụl sịrị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ. O sikwara ike njite.” (Jere. 17:9) Jizọs kwuru na “echiche ọjọọ” na-esi n’obi. (Mat. 15:19) Dị ka ihe atụ, onye kwụsịrịla ile ndị gba ọtọ nwere ike iche na e nweghị ihe o mere ma o lee foto ndị na-eme ka agụụ mmekọahụ gụwa mmadụ naanị n’ihi na ndị ahụ agbaghị ọtọ. O nwekwara ike iche, sị: ‘Ọ dịghị njọ ma m mụrụ anya na-arọ nrọ ebe m na-eme omume rụrụ arụ, ọ bụrụhaala na mụ emeghị ya.’ E nwere ike ikwu na iche otú ahụ pụtara na obi onye ahụ dị aghụghọ ‘na-eche otú ọ ga-esi eme ihe na-agụ ahụ́ ya agụụ.’ (Rom 13:14) Olee otú ị ga-esi ezere ime ihe a? Mata ụmụ obere ihe na-adịghị mma ọ ga-abụ i mee, ha emee ka a nwata gị ma ọ bụ ka i mee nnukwu ihe ọzọ na-adịghị mma.b Gbaakwara “echiche ọjọọ” ọsọ, nke nwere ike ime ka e nwee ihe ị ga-akụdo aka mee ihe na-adịghị mma.
20. Gịnị ga-eme ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ n’ọdịnihu? Oleekwa otú e si enyere anyị aka ugbu a?
20 Dị ka anyị mụtarala, n’enyemaka Jehova, anyị ga-emerili ọnwụnwa. Ebere o meere anyị mere ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya. N’oge ahụ, obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ na anyị ga-efewezi Jehova n’enweghị ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ. Mana tupu oge ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na anyị ga-emerili ọnwụnwa nakwa na anyị abụghị ndị na-enweghị olileanya n’ọgụ anyị na-alụso ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ. Jehova gọzie mgbalị anyị, anyị ga-emeri.
ABỤ NKE 122 Ka Anyị Guzosie Ike, Kwụrụ Chịm
a NKỌWAKWU: Na Baịbụl, okwu bụ́ “mmehie” nwere ike ịpụta ihe mmadụ mere na-adịghị mma, dị ka izu ohi, ịkwa iko, ma ọ bụ igbu mmadụ. (Ọpụ. 20:13-15; 1 Kọr. 6:18) Mana e nwere ebe ụfọdụ na Baịbụl mmehie pụtara ezughi okè anyị ketara mgbe a mụrụ anyị ọ bụ eziokwu na e nwebeghị ihe ọ bụla dị njọ anyị mere.
b Nwa okorobịa e kwuru okwu ya n’Ilu 7:7-23 mere obere ihe ụfọdụ na-adịghị mma tupu ya emee nnukwu ihe na-adịghị mma nke bụ́ ịkwa iko.
c NKỌWA FOTO: Aka ekpe: Mgbe otu nwanna nwoke bụ́ okorobịa nọ ọdụ n’ebe a na-ere kọfị, ọ hụrụ ụmụ nwoke abụọ na-egosi ibe ha ịhụnanya. N’aka nri: Otu nwanna nwaanyị hụrụ mmadụ abụọ na-aṅụ sịga.