Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb15 p. 120-p. 121 para. 3
  • M Ma na Alaeze Chineke Ga-abịarịrị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • M Ma na Alaeze Chineke Ga-abịarịrị
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Site n’Ịbụ Onye Na-eme Mkpọsa Maka Mgbanwe Ọchịchị gaa n’Ịbụ Onye Kraịst Nọpụrụ Iche
    Teta!—2002
  • E Lee Okwukwe Ule na Poland
    Teta!—2000
  • Ịgbasa Mkpụrụ Alaeze n’Oge Ọ Bụla
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Amụtara M Ịdabere na Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
yb15 p. 120-p. 121 para. 3

DỌMINIKAN RIPỌBLIK

M Ma na Alaeze Chineke Ga-abịarịrị

Efraín De La Cruz

  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1918

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1949

  • ONYE Ọ BỤ N’agbanyeghị na a tụọla ya mkpọrọ n’ụzọ ebe asaa, kụọkwa ya akụghị akụ, ọ kwụsịghị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

Foto dị na peeji nke 120

MỤ NA nwunye m Paula na nwa anyị nwaanyị bidoro ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova n’obodo Blanko Arịba n’afọ 1948. Anyị na-eji ụkwụ aga kilomita iri anọ uje na ụla. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwetụghị mgbe anyị hapụrụ ịga ọmụmụ ihe. E mere mụ na nwunye m baptizim n’abalị atọ n’ọnwa Jenụwarị, afọ 1949.

Mgbe ọnwa isii gachara, ndị uwe ojii jidere mụ na ụfọdụ ndị ọgbakọ anyị tụọ anyị mkpọrọ ọnwa atọ. Anyị na-ehi n’ala, a na-enyekwa anyị nri naanị otu ugboro n’ụbọchị. Ihe a na-enye anyị bụ unere na tii. Mgbe a hapụrụ anyị, ndị ọchịchị yiri anyị egwu ma chee na anyị ga-akwụsị ikwusa ozi ọma. Mgbe anyị lọtara, anyị na-ezoro ezoro aga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Ndị ọchịchị achọghị iji anya ahụ anyị ebe anyị na-amụ ihe. N’ihi ya, anyị na-amụ ihe n’ụlọ ụmụnna ma ọ bụ n’ebe a kọrọ kọfị ma ọ bụkwanụ n’ubi. Anyị anaghịkwa amụ ihe n’otu ebe. Ọ na-abụ anyị mụchaa ihe n’ebe a, anyị ekwuo ebe ọzọ anyị ga-anọ amụ ihe. Anyị gawa ozi ọma, anyị na-aga otu otu. Anyị na-eyikwa efe ọrụ anyị aga. Anyị anaghịkwa eji Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ anyị. N’agbanyeghị ya, n’agbata afọ 1949 na afọ 1959, a tụrụ m mkpọrọ ugboro asaa. Mkpọrọ nke ọ bụla were ihe dị ka ọnwa atọ ruo ọnwa isii.

M na-akpachapụ anya mgbe ọ bụla n’ihi na ụfọdụ ndị ikwu m so ná ndị na-achọghị iji anya ahụ m. N’agbanyeghị na m na-ehi n’ugwu ma ọ bụ n’ugbo ka a ghara ijide m, mgbe ụfọdụ, a na-ejide m. N’otu oge e jidere m, a kpọgara m n’ụlọ mkpọrọ dị na Kiudad Trujilo. N’ụlọ mkpọrọ a, mmadụ iri ise ruo mmadụ iri isii na-anọ n’otu ọnụ ụlọ. Mgbe anyị nọ ebe ahụ, a na-enye anyị nri ugboro abụọ n’ụbọchị. N’ụtụtụ, a na-enye anyị ọka a kwọrọ akwọ, na-enyekwa anyị obere osikapa na àgwà n’ehihie. Ndịàmà Jehova niile nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ na-ezi ndị mkpọrọ ibe ha ozi ọma. Anyị na-enwechikwa ọmụmụ ihe anya. Otú anyị si enwe ọmụmụ ihe bụ na onye ọ bụla na-ekwu ihe e dere n’amaokwu Baịbụl ndị o bu n’isi, kọọkwa ihe ndị mere mgbe o jere ozi ọma.

Na mkpọrọ ikpeazụ a tụrụ m, onye amị ji isi égbè kụọ m n’isi nakwa n’ọgịrịga. Ihe ndị ahụ ọ kụrụ m na ihe ndị ọzọ e mere m n’ụlọ mkpọrọ ka na-enye m nsogbu n’ahụ́. Ma, ha mere ka okwukwe m sikwuo ike, meekwa ka m na-enwekwu ndidi. Ha mekwara ka m kpebisie ike ịna-efe Jehova.

M dị afọ iri itoolu na isii ugbu a. M bụkwa ohu na-eje ozi n’ọgbakọ anyị. Ọ bụ eziokwu na anakwaghị m agali ebe dị anya, m na-anọ ọdụ n’ihu ụlọ m na-ezi ndị na-agafe agafe ozi ọma. M ma na Alaeze Chineke ga-abịarịrị. Eziela m ndị mmadụ ozi ọma banyere ya ihe karịrị afọ iri isii. M ka kwetasiri ike na a ga-enwe ụwa ọhụrụ otú ahụ m kwetara n’ụbọchị mbụ e ziri m ozi ọma Alaeze Chineke.a

a Nwanna Efraín De La Cruz nwụrụ mgbe a na-ede akụkọ a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya