Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb15 p. 24-p. 27 para. 1
  • Nnọkọ Kacha Buo Ibu Ndịàmà Jehova Nwetụrụla

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nnọkọ Kacha Buo Ibu Ndịàmà Jehova Nwetụrụla
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndịàmà Jehova Nzukọ nke Nwe Aha Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Vidio Anyị Ga Na-egosi Ndị Mmadụ
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • “Otú A E Si Kụziere Anyị Ihe A Magburu Onwe Ya”
    Teta!—2016
  • A Kwụghachiri Obubu O Bu Ụzọ Mee Ihe Ụgwọ
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
yb15 p. 24-p. 27 para. 1
Foto dị na peeji nke 24

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Nnọkọ Kacha Buo Ibu Ndịàmà Jehova Nwetụrụla

NA Satọdee, Ọktoba 5, 2013, ụmụnna dị 257,294, bụ́ ndị si mba iri abụọ na otu, bịara nnọkọ nke otu narị na iri abụọ na itoolu nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na-enwe kwa afọ. Ụfọdụ bịara n’ụlọ nzukọ a nọ nwee nnọkọ a, ebe ndị ọzọ nọ n’ebe ndị ọzọ ma si n’Ịntanet na-ekiri ihe a na-eme. Ná ngwụcha izu ahụ, ọtụtụ ụmụnna anyị nọ n’ebe dị iche iche lee ihe omume ahụ e tinyere na teepụ. A gụkọta ndị niile bịara nnọkọ a na ndị nọ ebe ọzọ kirie ma gere ya, ha dị 1,413,676. Ha niile si mba iri atọ na otu. Ihe a bụ nnọkọ kachanụ Ndịàmà Jehova nwetụrụla.

Kemgbe afọ 1922, Ndịàmà Jehova na-esi na telefon nakwa na redio eme ka ọtụtụ ndị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa gere ihe a na-ekwu ná mgbakọ ha. Taa, a na-esi n’Ịntanet eme ka ndị nọ ma n’ime ime obodo na-egere ma na-ekiri ihe a na-eme n’ebe ọzọ n’oge a na-eme ihe ahụ ma ọ bụ mgbe e mechara ya.

Ọtụtụ ụmụnna nọ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche rụrụ ọrụ ihe karịrị otu afọ ka ha nweta ihe ga-eme ka ha si n’Ịntanet na-ekiri ma na-egere ihe na-eme ebe ọzọ. Ná ngwụcha izu ụbọchị e nwere nnọkọ ahụ, ụmụnna anyị ndị okwu gbasara Ịntanet doro anya si na Bruklin, Niu Yọk, na-ele otú ihe a ha rụrụ si na-arụ ọrụ iji hụ na e gosiri ụmụnna anyị ndị nọ ná mpaghara dị iche iche n’ụwa ihe omume ahụ. Ha rụrụ ọrụ n’akwụsịghị akwụsị ruo mgbe e mechara ihe omume a n’ebe niile a chọrọ ka e mee ya.

Ihe Ndị Anyị Kwesịrị Ịma Gbasara Ebe Ndị E Gosiri Ihe Omume A

  • Ebe A Nọ Mee Ya: Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Niu Jesi, n’Amerịka Ndị bịaranụ dị 4,732

  • Ebe Ndị Bịara Ya Kacha: Pet, Ọstrelia Ndị bịaranụ dị 7,186

  • Ebe Kacha Anya n’Ebe Ugwu Ụwa: Febanks, Alaska, nke dị n’Amerịka Ndị bịaranụ dị 255

  • Ebe Kacha Anya n’Ebe Ndịda Ụwa: Invakagil, Niu Ziland Ndị bịaranụ dị 190

  • Ebe Kacha Anya: Isi Jesi Siti ruo obodo Pet, nke dị n’Ọstrelia, dị ihe dị ka kilomita 18,700

Otú E Si Gosi Ihe Omume A n’Ebe Ndị Ọzọ

  1. E ji ọtụtụ vidio na-esere ihe omume ahụ.

  2. Ihe vidio ndị ahụ setara na-aga n’otu ígwè, ígwè ahụ ahọrọ nke kacha mma.

  3. Vidio ahụ kacha mma na-agazi na kọmputa dị n’ọfis ndị na-apị aka n’ígwè.

  4. Kọmputa ahụ na-ewepụta ihe omume ahụ ụzọ atọ. Otu na-adị obere, nke ọzọ na-ebu ibu, ebe nke atọ na-aka ha niile.

  5. Kọmputa ahụ na-ekeri ihe omume ahụ irighiri irighiri.

  6. Ihe omume ahụ e keriri ekeri na-abanyezi n’Ịntanet.

  7. A na-eji ihe e ji enweta ihe n’Ịntanet enweta ihe omume ahụ ná nkebi ná nkebi. Ihe ahụ e ji enweta ihe n’Ịntanet na-ejikọtazi ihe omume ahụ ọnụ ma na-egosi ya ka vidio a na-ekebighị ekebi.

  8. Ndị nọ n’ebe a na-egosi ihe omume a na-ekiri ya, na-anụkwa ihe a na-ekwu.

Ihe Osise dị na peeji nke 26, 27
    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya