Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 129
  • À Gbanweela Baịbụl Ma Ọ Bụ Degharịa Ihe Dị Na Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Gbanweela Baịbụl Ma Ọ Bụ Degharịa Ihe Dị Na Ya?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ pụtara na e nweghị ebe ụfọdụ ndị na-edepụta Baịbụl dehiere ihe?
  • Gịnị mere obị ga-eji sie anyị ike na e nweghị ọtụtụ ihe ndị ọzọ e dehiere na Baịbụl ndị nwere ike pụta ìhè n’ọdịnihu?
  • Olee ihe ndị ọzọ na-enye anyị obi ike na Baịbụl ruru anyị aka taa a dịghị iche na Baịbụl mbụ?
  • Olee Otú Akwụkwọ Ahụ Si Lanarị?
    Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • A3 Otú Anyị Si Nweta Baịbụl
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Ọ̀ Dị Anyị Mkpa n’Ezie Inweta Ndị Mbụ Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Mbọ A Gbara Ịgbanwe Ihe Dị na Baịbụl Kụrụ Afọ n’Ala
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 129
Ebe otu nwoke ji aka na-edepụta Baịbụl n’oge ochie

À Gbanweela Baịbụl Ma Ọ Bụ Degharịa Ihe Dị Na Ya?

Mba. N’agbanyeghị na a na-edepụta Baịbụl kemgbe ọtụtụ puku afọ n’ihe ndị na-anaghị anọte aka, e leruo anya na Baịbụl dị iche iche e ji aka dee n’oge ochie, o doro anya na e nweghị ihe rijuru afọ gbanwere na Baịbụl.

Ọ̀ pụtara na e nweghị ebe ụfọdụ ndị na-edepụta Baịbụl dehiere ihe?

Taa, e nwere ọtụtụ puku Baịbụl e ji aka dee n’oge ochie ka dịnụ. Ụfọdụ n’ime ha nwere ihe dị iche na ndị ọzọ, nke gosiri na e dehietụrụ ihe ụfọdụ mgbe a na-edepụta ha. Ma, ọtụtụ ihe ndị a e dehiere e nweghị ihe ha bụ, ha emeghịkwa ka ihe akụkụ Baịbụl ndị ahụ na-ekwu gbanwee. Ma e nwere ebe ole na ole a chọpụtara na e dehiere nnukwu ihe. Ọ ga-abụkwa na e nwere ndị ma ụma dehie ha iji gbanwee ihe Baịbụl na-ekwu. Ka anyị leba anya n’abụọ n’ime ha:

  1. Na 1 Jọn 5:7, ụfọdụ Baịbụl ochie kwuru sị, “e nwere Nna ahụ, Okwụ ahụ na Mmụọ Nsọ n’eluigwe: ha atọ bụkwa otu.” Ma, Baịbụl e ji aka dee n’oge ochie ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi gosiri na okwu ndị a adịghị na Baịbụl mbụ. Ọ bụ ndị mmadụ mechara denye ha.a Ya mere Baịbụl ndị e leziri anya sụgharịa n’oge a wepụrụ ha.

  2. E dere aha Chineke ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl dị iche iche e ji aka dee n’oge ochie. Ma, e wepụla ya n’ọtụtụ Baịbụl ma jirizie utu aha dị iche iche dị ka “Onyenwe Anyị” ma ọ bụ “Chineke” dochie ya.

Gịnị mere obị ga-eji sie anyị ike na e nweghị ọtụtụ ihe ndị ọzọ e dehiere na Baịbụl ndị nwere ike pụta ìhè n’ọdịnihu?

Ka ọ dị ugbu a, a hụla ọtụtụ Baịbụl dị iche iche e ji aka dee n’oge ochie nke na ọ dịzi mfe ịchọpụta ihe ndị e dehiere.b A tụlee akwụkwọ ndị a, gịnị ka a na-chọpụta banyere ma a gbanweela Baịbụl?

  • Mgbe ọ na-ekwu banyere Akwụkwọ Nsọ Hibru, ya bụ, Agba Ochie onye ọkachamara bụ , William H. Green kwuru sị: “E nweziri ike ikwu na a tulee akwụkwọ niile ndị e dere n’oge ochie e nweghị akwụkwọ ọzọ dị taa nke zuru oke karịa Baịbụl.”

  • Onye okà mmụta n’ihe gbasara Baịbụl bụ́ F. F. Bruce dere banyere Akwụkwọ Grik nke Ndị Kraịst, ya bụ “Agba Ọhụrụ”, sị: “N’agbanyegị na ihe ndị e nwere taa ndị na-akwado ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ “Agba Ọhụrụ” karịrị nnọọ ihe ndị na-akwado akwụkwọ ndị ndị a ma ama n’oge ochie dere e nweghị onye na-arụ ụka ná-ekwu na agbanweela ihe ndị ha dere.”

  • Sir Frederic Kenyon, bụ́ onye ma nke a kọrọ n’ihe banyere Baịbụl dị iche iche e ji aka dee n’oge ochie kwuru na onye ọ bụla “nwere ike ijide Baịbụl n’aka ma kwuo n’atụghị egwu ma ọ bụ maa jijiji na ihe ya ji n’aka bụ Okwu Chineke nke si n’aka ọgbọ dị iche iche kemgbe ọtụtụ narị afọ ruo anyi aka n’enweghi mgbanwe ọ bụla rijuru afọ.”

Olee ihe ndị ọzọ na-enye anyị obi ike na Baịbụl ruru anyị aka taa a dịghị iche na Baịbụl mbụ?

  • Ndị odeakwụkwọ ndị Juu na ndị nke Grik bụ́ ndi na-edepụta Baịbụl e wepụghị akụkọ banyere ezigbote mmehie ndị Chineke.c (Ọnụ Ọgụgụ 20:12; 2 Samuel 11:2-4; Ndị Galeshia 2:11-​14) Ha e wepụghịkwa akụkọ banyere nnupụisi ndị Juu na ndị katọrọ nkụzi ụgha si n’aka ndị mmadụ. (Hosia 4:2; Malakaị 2:8, 9; Matiu 23:8, 9;1 Jọn 5:21) Ndị odeakwụkwọ a gosiri na ha kwesịrị ntụkwasị obi ma jirikwa Okwu Chineke dị nsọ kpọrọ ihe site n’igba mbọ ghara ị denye ihe ma ọ bụ wepụ ihe mgbe ha na-edepụta Baịbụl.

  • Ọ̀ bụ na o kwesịghị ekwesị na Chineke, bụ onye Baịbụl si n’aka ya, ga-echebe Baịbụl ka a ghara ịgbanwe ya?d (Aịzaya 40:8; 1 Pita 1:24, 25) O doro anya na ọ chọrọ ka Baịbụl baara ndị mmadụ uru ma n’oge ochie ma n’oge anyị a. (1 Ndị Kọrịnt 10:11) N’eziokwu “e dere ihe niile e dere n’oge gara aga ka e jiri ha kụziere anyị ihe, ka obi anyị na-atachi na nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ wee mee ka anyị nwee olileanya.”​—Ndị Rom 15:4.

  • Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ji ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mee ihe na-echegbughị onwe ha ma agbanweela ihe e dere na ya.​—Luk 4:16-​21; Ọrụ Ndịozi 17:1-3.

a Okwu ndị a adịghị na Baịbụl dị iche iche e ji aka dee n’oge ochie dị ka Codex Sinaiticus, Codex Alexandrinus, Vatican Manuscript nke 1209, Latin Vulgate mbụ, Philoxenian-Harclean Syriac Version na Syriac Peshitta.

b Dị ka ihe atụ, a hụla Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ma ọ bụ Agba Ọhụrụ e ji aka dee n’oge ochie karịrị puku ise.

c Baịbụl e kwughị na ndị na-anọchite anya Chineke emekataghị mehie ihe. O kwuru nke bụ eziokwu sị: “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-anaghị eme mmehie.”​—1 Ndị Eze 8:46.

d Baịbụl kwuru na ọ bụghị okwu niile dị na ya ka Chineke ji ọnụ ya kwuo ma Chineke duziri echiche ndị dere ya.​—2 Timoti 3:16, 17; 2 Pita 1:21.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya