Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 1/8 p. 3-5
  • Ọgụ A Na-alụ Ịzọpụta Mbara Ụwa Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọgụ A Na-alụ Ịzọpụta Mbara Ụwa Anyị
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iyi Egwu Na-arị Elu
  • Ọgụ A Na-alụ Ichebe Mbara Ụwa
  • À Na-emeri n’Ọgụ Ahụ?
    Teta!—1996
  • Mbara Ụwa Anyị Na-esighị Ike—Gịnị Banyere Ọdịnihu?
    Teta!—1996
  • Gịnị Ka Mmadụ Na-eme Elu Ala?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ewo, Ka M Kurutụ Ikuku Dị Ọcha!
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 1/8 p. 3-5

Ọgụ A Na-alụ Ịzọpụta Mbara Ụwa Anyị

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA SPAIN

YURY, onye bi n’obodo ukwu Russia bụ́ Karabash, nwere ụmụ abụọ, ha abụọ na-arịakwa ọrịa. Ọ na-enye ya nsogbu ma o jughị ya anya. “E nweghị ụmụaka ahụ dị mma n’ebe a,” ka ọ na-akọwa. A na-eme ndị Karabash nsí. Kwa afọ ụlọ ọrụ dị n’ebe ahụ na-agbanye n’ikuku 162,000 tọn nke ihe ndị na-emetọ ihe—tọn 9 maka nwoke, nwanyị, na nwatakịrị ọ bụla bi n’ebe ahụ. Na Nikel na Monchegorsk nke dị n’Ókèala Dịịrị Banye n’Ime Mmiri Kola, n’ebe ugwu nke Ebe Na-ajụ Oké Oyi, “abụọ n’ime ebe ndị kasị buo ibu ma mee ochie n’ụwa nile n’ebe ndị a na-agbaze ọla nickel . . . na-agbanye ọgwụ metal siri ike na sulfur dioxide n’ikuku kwa afọ karịa ụlọ ọrụ mmepụta ihe ọzọ ndị dị ka ha na Russia.”—The New York Times.

Ikuku adịghịkwa mma karị na Mexico City. Otu nnyocha nke Dr. Margarita Castillejos mere chọpụtara na ọbụna n’ógbè bara ọgaranya nke obodo ukwu ahụ, ụmụaka na-arịa ọrịa ụbọchị 4 n’ime ụbọchị 5. “Ịrịa ọrịa aghọworo ha ihe dị ka o kwesịrị,” ka o kwuru. Otu n’ime ihe bụ isi a ga-ata ụta, ka ọ na-ekwu, bụ anwụrụ na-agbasazu ebe nile nke ọtụtụ puku ụgbọ ala na-ejupụta okporo ámá na-agbapụ. Njupụta nke alụlụ ozone bụ okpukpu anọ nke ntụziaka kasị elu nke Òtù Ahụ Ike Ụwa.

N’Australia a dịghị ahụ ihe ize ndụ ahụ anya—ma ọ na-egbukwa egbu n’otu aka ahụ. Ụmụaka aghaghị ikpu okpu ugbu a mgbe ha na-egwuri egwu n’ebe ngwuri egwu ụlọ akwụkwọ. Mmebi nke ihe mkpuchi nchebe nke ozone mebiri n’Ebe Ndịda Ụwa emewo ka ndị Australia malite ile anyanwụ anya dị ka onye iro kama enyi. Ha ahụworị ịrị elu dị okpukpu atọ n’ọrịa cancer akpụkpọ ahụ.

N’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa, ịchọta mmiri dị mma bụ ọgụ a na-alụ kwa ụbọchị. Mgbe Amalia dị afọ 13, ụkọ mmiri ozuzo bịara na Mozambique. Ọ fọrọ nke nta ka a ghara inwe mmiri zuru ezu n’afọ nke mbụ, o sikwara ike inweta mmiri ma ọlị n’afọ na-eso ya. Ihe ọkụkụ akwụkwọ nri kpọnwụrụ ma nwụọ. A manyere Amalia na ezinụlọ ya iri mkpụrụ osisi ọhịa na igwu ala n’ájá dị n’ụsọ osimiri maka mmiri ọ bụla dị oké ọnụ ahịa ha pụrụ ịchọta.

Na steti India bụ́ Rajasthan, ọ bụ ala ahịhịa ji ọsọ ọsọ na-apụ n’anya. Phagu, onye si n’agbụrụ na-awagharị awagharị, na-eso ndị ọrụ ugbo ebe ahụ na-ese okwu mgbe mgbe. Ọ pụghị ịchọta ebe ịta ahịhịa maka ìgwè atụrụ na ewu ya. N’ihi ajọ ụkọ nke ala na-eme nri, mbikọ ọnụ nke ndị ọrụ ugbo na ndị na-awagharị awagharị bikọworo n’udo eri ọtụtụ narị afọ ekwekwaghị omume.

Ọnọdụ ahụ ka ọbụna njọ n’ógbè Sahel, obosara ala nke a na-enwe ntakịrị mmiri ozuzo na ya n’akụkụ ndịda nke Sahara n’Africa. N’ihi igbukpọsị oké ọhịa na ụkọ mmiri ozuzo na-esochi, e kpochapụwo ìgwè anụ ụlọ dum, a na-elikwa ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ibé ala a na-akọ nri n’ime ájá ọzara nke na-eru nso. “Agaghị m akụ ihe ọzọ,” ka onye Fulani bụ onye ọrụ ugbo sitere Niger ṅụrụ iyi kwuo mgbe ọ hụrụ ka ihe ọkụkụ ọka ya na-emepụtaghị ihe ọ bụla n’ugboro nke asaa ya. Ehi ya nile anwụworị n’ihi ụkọ ebe ịta nri.

Iyi Egwu Na-arị Elu

E nwere usoro na-eyi egwu n’azụ ụkọ mmiri ozuzo ndị e nwere n’oge ndị na-adịbeghị anya, ihe a kụrụ n’ubi na-emeghị nke ọma, na ikuku e metọrọ emetọ nke na-emebi obodo ukwu dị iche iche. Ha bụ mgbaàmà nke mbara ụwa na-arịa ọrịa, mbara ụwa nke na-apụkwaghị ịnagide ọchịchọ nile ụmụ mmadụ na-atụkwasị n’isi ya.

Ọ dịghị ihe ọ bụla n’ụwa nke dị mkpa maka nlanarị anyị karịa ikuku anyị na-ekuru, nri anyị na-eri, na mmiri anyị na-aṅụ. N’akwụsịghị akwụsị, ma ọ́ bụghị na a na-emetọ ihe ndị a dị mkpa n’ịkwado ndụ, ọ bụrụ na e ji nwayọọ nwayọọ emebi ya—site n’aka mmadụ n’onwe ya. Ná mba ụfọdụ, ọnọdụ gburugburu ebe obibi abụrụworị ihe na-eyi ndụ egwu. Dị ka onye bụbu onye isi ala Soviet bụ́ Mikhail Gorbachev si kwuo ya n’ezoghị ọnụ, “nsogbu gburugburu ebe obibi na-eyi ịdị adị anyị egwu nke ukwuu.”

E kwesịghị ileghara iyi egwu ahụ anya. Ụba mmadụ nọ n’ụwa anọgidewo na-arị elu, ọchịchọ a na-achọ ihe ole na ole ndị e nwere na-amụbakwa. Lester Brown, onye isi nke Worldwatch Institute, kwuru n’oge na-adịbeghị anya na “iyi egwu dị ukwuu nke a na-eyi ọdịnihu anyị abụghị mwakpo nke ịlụ agha kama ọ bụ mbibi gburugburu ebe obibi nke mbara ụwa.” À na-eme ihe zuru ezu iji gbanahụ ọdachi?

Ọgụ A Na-alụ Ichebe Mbara Ụwa

O siri ike inyere onye aṅụrụma nke kwenyesiri ike na ya enweghị nsogbu aṅụrụma aka. N’otu aka ahụ, nzọụkwụ mbụ n’ime ka ahụ ike nke mbara ụwa ka mma bụ ịghọta ókè ọnọdụ ọjọọ ahụ ruru. Ma eleghị anya, inye ihe ọmụma bụ ihe ịga nke ọma gbara ọkpụrụkpụ nke gburugburu ebe obibi n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ mmadụ taa maara nke ọma na a na-emebi ụwa anyị, na-emetọkwa ya—na a ghaghịkwa ime ihe banyere ya. Iyi egwu nke mbibi gburugburu ebe obibi na-erugharị ugbu a karịa iyi egwu nke agha nuklia.

Ndị ndú ụwa matakwara banyere nsogbu ndị ahụ. Ihe dị ka 118 ndị isi ala gara Nzukọ Ụwa ahụ e nwere na 1992, nke a nọ na ya were nzọụkwụ ole na ole iji chebe mbara ikuku na akụ̀ na ụba ndị dị n’ala bụ́ ndị na-ebelata ebelata. Ihe ka ọtụtụ n’ime mba dị iche iche bịanyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta ihu igwe, bụ nke ha ji kwekọrịta iguzobe otu usoro maka inye akụkọ banyere mgbanwe ndị e nwere ná nkupụ nke carbon, na-enwe ihe mgbaru ọsọ nke ịkwụsị kpam kpam nkupụ ahụ n’ọdịnihu dị nso. Ha tụlekwara ụzọ ndị a ga-esi chebe ụdị dị iche iche nke ihe dị ndụ ná mbara ụwa anyị, ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke ụdị dị iche iche nke ihe ọkụkụ na anụmanụ. E nweghị ike iru ná nkwekọrịta n’ichebe oké ọhịa nile nke ụwa, ma nzukọ ahụ wepụtara ihe odide abụọ—“Mkpọsa Rio” ahụ na “Atụmatụ 21,” nke nwere ntụziaka n’otú mba dị iche iche pụrụ isi nwee “mmepe na-enye nkwado.”

Dị ka ọkachamara na gburugburu ebe obibi bụ́ Allen Hammond si arụtụ aka, “ule dị oké mkpa bụ ma à ga-emezu nkwa ndị e kwere na Rio—ma okwu ndị ahụ e dere ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo hà ga-eduje n’ime ihe n’ime ọnwa na afọ ndị dị n’ihu.”

Otú ọ dị, nzọụkwụ na-aga n’ihu nke bụ́ isi bụ Mkpebi Montreal ahụ nke 1987, bụ nke gụnyere nkwekọrịta mba nile ikpochapụ ọgwụ bụ́ chlorofluorocarbon (CFC) n’ime oge a kara aka.a N’ihi gịnị ka e ji nwee nchegbu ahụ? N’ihi na a na-ekwu na ọgwụ CFC na-atụnye ụtụ ná mbelata nke ihe nchebe ozone nke ụwa. Alụlụ ozone nke dị na mbara ikuku ka elu na-arụ ọrụ dị mkpa n’ịzacha mwakwasị anyanwụ na-achasi ike, bụ́ nke pụrụ ịkpata ọrịa cancer akpụkpọ ahụ na ọrịa mkpuchi anya. Nke a bụ nsogbụ n’abụghị n’Australia nanị. N’oge na-adịbeghị anya, ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo mbelata nke 8 pasent ná njupụta nke alụlụ ozone udu mmiri karịa n’ógbè anyanwụ na-adịghị achasi ike n’Ebe Ugwu Ụwa. Iri nde tọn abụọ nke CFC akwụgoworị elu gaa n’ebe dịtụ elu karị mbara ikuku efu.

N’ịbụ ndị ajọ mmetọ a nke mbara ikuku na-eche ihu, mba dị iche iche nke ụwa wezụgara esemokwu ha n’ụsọ ma mee ihe ndị a hụrụ anya. Ihe omume mba dị iche iche ndị ọzọ anọwokwa na-ewere ọnọdụ iji chebe ụdị ndị fọrọ nke nta ka e kpochapụ ha, chekwaa Antarctica, ma chịkwaa mbupụ nke ihe mkpofu ndị na-egbu egbu.

Ọtụtụ mba na-ewere nzọụkwụ ụfọdụ iji mee ka osimiri ha dị ọcha (azụ salmon alọghachiwo ugbu a n’Osimiri Thames nke England), iji chịkwaa mmetọ ikuku (o jiriwo 10 pasent belata n’obodo ukwu dị iche iche nke United States ndị nwere anwụrụ ndị kasị njọ), iji nweta ebe e si enweta ike dị mma na gburugburu ebe obibi (a na-eji ike okpomọkụ sitere n’ime ala na-eme ka 80 pasent nke ebe obibi kporo ọkụ na Iceland), ijikwa chekwaa ihe nketa ha ndị sitere n’okike (Costa Rica na Namibia agbanwewo ihe dị ka 12 pasent nke ngụkọta ala nkịtị ha ịghọ ogige dị iche iche nke mba).

Ihe àmà ndị a doro anya hà na-egosi na ihe a kpọrọ mmadụ na-eji ihe ize ndụ ahụ akpọrọ ihe? Ọ̀ bụ nanị oge ka ọ ga-ewe tupu mbara ụwa anyị enwee ahụ ike ọzọ? Isiokwu ndị na-esonụ ga-achọ ịza ajụjụ ndị ahụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a E jiriwo CFC mee ihe n’ụzọ sara mbara n’ọgwụ a na-agba agba ndị e ji egbu ụmụ ahụhụ, friji na ígwè ntụ oyi, ọgwụ ndị e ji ehicha ihe, na imepụta foom na-egbochi ike eletrik. Lee Teta! (Bekee) nke December 22, 1994, “Mgbe E Mebiri Mbara Ikuku Anyị.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya