Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 1/8 p. 6-11
  • À Na-emeri n’Ọgụ Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Na-emeri n’Ọgụ Ahụ?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Eziokwu Atọ Dị Mwute nke Nkà Mmụta Gburugburu Ebe Obibi
  • Mmebi Hà Aṅaa Ka E Meworo?
  • Mmadụ Ọ̀ Pụrụ Ịchịkwa Nsogbu Ndị Ahụ?
  • Gịnị Ka Mmadụ Na-eme Elu Ala?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ọgụ A Na-alụ Ịzọpụta Mbara Ụwa Anyị
    Teta!—1996
  • Akụ̀ Ụwa nke Na-ebelata Ebelata
    Teta!—2005
Teta!—1996
g96 1/8 p. 6-11

À Na-emeri n’Ọgụ Ahụ?

“LEKỌTA mbara ụwa a, ọ bụ nanị nke anyị nwere.” Nke a bụ arịrịọ siri ike nke Nwa Eze Philip nke Britain, onye isi nke Òtù Ego Ụwa Maka Ihe Ndị E Kere Eke.

Ọtụtụ puku afọ bu ụzọ, onye ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova nwere; ma ụwa ka O nyeworo ụmụ mmadụ.” (Abụ Ọma 115:16) Chineke enyewo anyị ụwa dị ka ebe obibi anyị, anyị aghaghịkwa ilekọta ya. Nke ahụ bụ ihe nkà mmụta gburugburu ebe obibi pụtara.

N’ụzọ nkịtị okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “nkà mmụta gburugburu ebe obibi” pụtara “ihe ọmụmụ ebe obibi.”a Otu nkọwa nke akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ The American Heritage Dictionary nyere bụ “ihe ọmụmụ nke mmetụta ọjọọ mmepeanya ọgbara ọhụrụ na-enwe na gburugburu ebe obibi, n’ebumnobi nke igbochi ya ma ọ bụ ịgbanwe ya site n’iji ya mee ihe nke ọma.” N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, nkà mmụta gburugburu ebe obibi pụtara ịchọpụta mbibi mmadụ bibiworo na mgbe ahụ ịchọ ụzọ isi dozie ya. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha bụ ọrụ dị mfe.

Eziokwu Atọ Dị Mwute nke Nkà Mmụta Gburugburu Ebe Obibi

Barry Commoner, onye ọkà n’ihe ndị dị ndụ, n’akwụkwọ ya bụ́ Making Peace With the Planet (Isoro Mbara Ụwa Mee Udo), na-akọwapụta iwu atọ bụ isi nke nkà mmụta gburugburu ebe obibi ndị na-enye aka ịkọwa ihe mere ụwa ji bụrụ ebe mmetọ na-emetụta otú a.

E jikọtara ihe ọ bụla n’ihe ọ bụla ọzọ. Dị nnọọ ka ezé na-adịghị mma pụrụ imetụta ahụ anyị dum, otú a ka mmebi e mebiri otu ihe sitere n’okike pụrụ ịkpali njikọ dum nke nsogbu gburugburu ebe obibi.

Dị ka ihe atụ, n’ime 40 afọ gara aga, e gbukpọwo 50 pasent nke oké ọhịa Himalaya nke Nepal n’ihi nku ma ọ bụ maka ihe e ji osisi na-arụ. Ozugbo e gbutusịworo osisi ndị dị na ya, a na-asachapụ ájá ndagwurugwu n’oge na-adịghị anya mgbe mmiri ozuzo nke ya na oké ifufe na-eso malitere. Ọ bụrụ na ájá elu ala adịghị, osisi ndị ọhụrụ apụghị ịgbanye mkpọrọgwụ n’ụzọ dị mfe, ọtụtụ ugwu na-atọgbọkwa chakoo. N’ihi igbukpọsị oké ọhịa, Nepal na-atụfu ugbu a ọtụtụ nde tọn nke ájá elu ala kwa afọ. Ọ bụghịkwa nanị Nepal nwere nsogbu ahụ.

Na Bangladesh oké mmiri ozuzo, bụ́ nke osisi na-amịrị na mbụ, na-agbadazi n’ugwu ndị ahụ tọgbọrọ nkịtị ma chee ihu n’ụsọ mmiri, bụ́ ebe ha na-akpata iju mmiri na-ebibi ihe. N’oge ndị gara aga, Bangladesh nwere iju mmiri dị ize ndụ otu ugboro n’ime 50 afọ ọ bụla; ugbu a ọ bụ kwa afọ 4 ọ bụla ma ọ bụ ọ ghara iru.

N’akụkụ ụwa ndị ọzọ, igbukpọsị oké ọhịa akpatawo ala ịghọ ọzara, ya na mgbanwe n’ihu igwe n’ebe ahụ. Oké ọhịa bụ nnọọ otu ihe sitere n’okike nke mmadụ ji eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma. Ebe ndị ọkà n’ihe ọmụmụ gburugburu ebe obibi ka matara ihe dị nnọọ nta banyere akụkụ ndị jikọrọ ọnụ nke usoro gburugburu ebe obibi anyị sara mbara, e nwere ike a gaghị amata banyere otu nsogbu ruo mgbe e nweworo oké mmebi. Nke a bụ eziokwu n’ihe banyere mkpofu ihe ruru unyi, nke bụ ihe atụ dị mma banyere iwu nke abụọ nke nkà mmụta gburugburu ebe obibi.

Ihe ọ bụla nwere ebe ọ na-aghaghị ịga. Cheedị echiche ihe ebe obibi ga-adị ka ya ma ọ bụrụ na e nweghị ebe a na-ekpofu ihe. Mbara ụwa anyị dị nnọọ ka usoro e mechiri emechi dị otú ahụ—ihe mkpofu nile anyị aghaghị inwe ebe ọ ga-aga n’ime ebe obibi bụ ụwa. Mmebi e mebiri ihe nchebe ozone ruo n’ókè ụfọdụ na-egosi na ọbụna gas ndị o doro anya na ha adịghị ize ndụ, dị ka chlorofluorocarbon (CFC), adịghị nnọọ apụ n’anya kpam kpam. CFC bụ nanị otu n’ime ọtụtụ narị ihe ndị pụrụ imerụ ahụ ndị a na-agbapụ n’igwe, osimiri, na oké osimiri dị iche iche.

N’ezie, ihe ụfọdụ—a na-akpọ “kwere omume mgbari”—pụrụ ịgbari ka oge na-aga ma bụrụ nke usoro ihe ndị dị ndụ ndị ọzọ mịkọọrọ, ma ndị ọzọ apụghị. Mkpọ plastik tụsarịrị aghara aghara n’ụsọ oké osimiri nile nke ụwa, bụ́ ndị ga-atụsasị n’ebe ahụ ruo ọtụtụ iri afọ n’ihu. Ndị anya na-adịghị ahụkarị bụ ihe mkpofu na-egbu egbu nke ụlọ ọrụ mmepụta ihe, bụ nke nwere ebe a na-elikarị ya. Ọ bụ ezie na anya adịghị ahụ ya, e nweghị ihe ọ bụla e ji n’aka na a ga-echezọ ha kpam kpam. Ọ ka pụkwara ịmịba n’ime mmiri dị n’okpuru ala ma na-etinye mmadụ na anụmanụ n’ihe ize ndụ ahụ ike ndị dị oké njọ. “Anyị amaghị ihe anyị ga-eji ọgwụ nile nke ụlọ ọrụ mmepụta ihe ọgbara ọhụrụ dị iche iche na-emepụta mee,” ka onye Hungary bụ́ ọkà mmụta sayensị Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mmụta Banyere Mmiri nke dị na Budapest kwetara. “Anyị apụghị ọbụna ịmata banyere ha nile.”

Ihe mkpofu kasị na-eyi egwu bụ nke radioactive, ihe na-esi n’ụlọ ọrụ nuklia na-apụta. A na-ebukọba ọtụtụ puku tọn ihe mkpofu nuklia n’ebe ndị ọ ga-adị ruo nwa oge, ọ bụ ezie na a wụnyeworị ụfọdụ n’ime oké osimiri. N’agbanyeghị ọtụtụ afọ nke ime nnyocha sayensị, a chọtabeghị ọgwụgwọ ọ bụla maka ebe nchekwa ma ọ bụ ebe mkpofu na-adịgide adịgide, na-adịghị ize ndụ, ọ dịghịkwa nke a pụrụ ịtụ anya ya n’ọdịnihu. Ọ dịghị onye matara mgbe bọmbụ ndị a a kara oge mgbawa ha aka nke gburugburu ebe obibi pụrụ itiwapụ. O doro anya na nsogbu ahụ agaghị apụ n’anya—ihe mkpofu ahụ ga-abụ radioactive ruo ọtụtụ narị afọ ma ọ bụ ruo ọtụtụ puku afọ na-abịanụ, ma ọ bụ ruo mgbe Chineke ga-eme ihe. (Mkpughe 11:18) Nleghara anya mmadụ n’ihe banyere mkpofu ihe ruru unyi bụkwa ihe ncheta iwu nke atọ nke nkà mmụta gburugburu ebe obibi.

Kwe ka usoro dị iche iche nke okike rụọ ọrụ ya. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mmadụ kwesịrị isoro usoro dị iche iche nke okike jikọọ aka n’ọrụ kama ịnwa iburu ụzọ jiri ihe o chere na ọ ka mma eme ihe. Ọgwụ ụfọdụ na-egbu ụmụ ahụhụ bụ otu ihe atụ kwesịrị ekwesị. Mgbe mbụ e wepụtara ha, ha mere ka o kwe ndị ọrụ ugbo omume ibelata ahịhịa ma kpochapụ kpam kpam ụmụ ahụhụ na-ebibi ihe. O yiri ka a ghaghị iweta ihe ubi bara ụba. Ma mgbe ahụ ihe gahiere. Ahịhịa na ụmụ ahụhụ malitere ịnagide nke ọ bụla n’ime ọgwụ ndị na-egbu ụmụ ahụhụ, ọ ghọkwara ihe doro anya na ọgwụ ndị ahụ na-egbu ụmụ ahụhụ na-egbuzi ụmụ anụmanụ, ihe ndị bi n’ọhịa, bụ́ ndị ji ụmụ ahụhụ ndị ahụ mere ihe oriri, na ọbụna mmadụ n’onwe ya. Ma eleghị anya nsí ọgwụ na-egbu ụmụ ahụhụ emetụtawo gị. Mgbe ahụ ịbụ otu n’ime otu nde ma ọ dịkarịa ala, bụ́ ndị o metụtaworo n’ụwa nile.

Ihe ikpeazụ na-agba gharịị bụ ihe àmà na-arị elu na ọgwụ ndị na-egbu ụmụ ahụhụ nwre ike ghara ime ka ihe a kụrụ n’ubi ka mma mgbe ogologo oge gasịworo. Na United States, ụmụ ahụhụ na-eripịazi òkè ka ukwuu n’ihe ubi karịa ka ha mere tupu e mepụta ọgwụ na-egbu ụmụ ahụhụ. N’otu aka ahụ, Òtù Na-ahụ Maka Nnyocha Osikapa n’Ụwa Nile, nke a tọrọ ntọala ya na Philippines, achọpụtawo na ọgwụ ndị na-egbu ụmụ ahụhụ adịkwaghị eme ka otú osikapa a kọrọ si eme ka mma n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia. N’ezie, ihe omume nke gọọmenti Indonesia hụrụ maka ya bụ nke na-adabereghị nke ukwuu n’ọgwụ na-egbu ụmụ ahụhụ enwetawo mmụba nke 15 pasent n’ịkọpụta osikapa kemgbe 1987 n’agbanyeghị ndalata nke 65 pasent e nwere n’iji ọgwụ na-egbu ụmụ ahụhụ eme ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, kwa afọ ndị ọrụ ugbo n’ụwa ka na-eji ọgwụ na-egbu ụmụ ahụhụ eme ihe n’ụzọ dị ukwuu.

Iwu atọ ndị ahụ nke nkà mmụta gburugburu ebe obibi ndị e depụtara n’elu na-enye aka ịkọwa ihe mere ihe dị iche iche ji agahie. Ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa bụ, Mmebi hà aṅaa ka e nweworo, a pụkwara idozi ya?

Mmebi Hà Aṅaa Ka E Meworo?

Maapụ ụwa a gbakwụnyere (lee peji nke 8-9) na-egosi nsogbu ụfọdụ nke gburugburu ebe obibi na ebe ndị ha kasị njọ. N’ụzọ doro anya, mgbe enweghị ebe obibi ma ọ bụ ihe ndị ọzọ mere ka e kpochapụ otu ụdị nke ihe ọkụkụ ma ọ bụ anụmanụ, ụmụ mmadụ apụghị idozi ihe e mebiri. Mmebi ndị ọzọ—dị ka mbibi nke ihe nchebe ozone—ewereworị ọnọdụ. Gịnị banyere mbibi na-aga n’ihu nke gburugburu ebe obibi? À na-enwe ọganihu n’ịkwụsịlata ya ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ibelata ya?

Abụọ n’ime ihe ndị e ji atụ mmebi nke gburugburu ebe obibi n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bụ ọrụ ugbo na ịkụ azụ. N’ihi gịnị? N’ihi na mmepụta ha na-adabere na gburugburu ebe obibi dị mma na n’ihi na ndụ anyị na-adabere n’usoro mmepụta ihe oriri a pụrụ ịtụkwasị obi.

Akụkụ abụọ ahụ na-egosi ihe àmà nke mmebi. Òtù Mba Ndị Dị n’Otu Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ugbo agbakọwo na ìgwè ndị na-egbu azụ nke ụwa apụghị ijide ihe karịrị 100 nde tọn azụ n’ebelataghị nke ukwuu ụba azụ e nwere. A gafere ngụkọta ahụ na 1989, dị ka a tụkwara anya, n’afọ sochiri ya ọnụ ọgụgụ e gburu n’ụwa nile ji nde tọn anọ dalata. E nwewokwa oké ndalata ná mbelata e nwere n’ebe ụfọdụ a na-egbu azụ. Dị ka ihe atụ, n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Atlantic, ọnụ ọgụgụ azụ a na-akụ ejiriwo 32 pasent dalata n’ime 20 afọ gara aga. Nsogbu ndị bụ isi bụ ịkụbiga azụ ókè, mmetọ nke oké osimiri, na mbibi nke ebe a na-azụ ndị obere.

Ọnọdụ a na-eyi egwu na-apụta ìhè n’ihe ọkụkụ a na-enweta. N’ime afọ ndị 1960 na ndị 1970, ụdị ihe ọkụkụ ka mma na ịgba mmiri n’ala na iji ọgwụ na-egbu ụmụ ahụhụ na ntụ fertilizer mee ihe kwalitetụrụ ịkọpụta ọka n’ụwa. Ugbu a, ọgwụ ndị na-egbu ụmụ ahụhụ na ntụ fertilizer na-atụfu ịdị irè ha, ụkọ mmiri na mmetọ na-atụnyekwa ụtụ n’iweta ihe ubi dị ala karị.

Ọ bụ ezie na e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100 nde mmadụ ndị ọzọ a ga-enye nri kwa afọ, n’ime afọ iri gara aga e nwewo ndalata ná ngụkọta ọnụ ọgụgụ ala a na-akọ nri. Ala ndị a a na-akọ nri adịkwaghị emepụta nri dị ka ha na-emebu. Ụlọ ọrụ Worldwatch Institute na-eme atụmatụ na nrichapụ nke ala anapụwo ndị ọrụ ugbo ihe dị ka 500 ijeri tọn ájá elu ala n’ime 20 afọ gara aga. N’ụzọ a na-apụghị izere ezere, ịkọpụta ihe oriri amalitewo ịdalata. Akụkọ bụ́ State of the World 1993 na-ekwu na “ndalata nke 6 pasent n’ọka maka otu onye n’agbata 1984 na 1992 [bụ] ma eleghị anya ọnọdụ akụ̀ na ụba kasị na-enye nsogbu n’ụwa taa.”

N’ụzọ doro anya, ndụ nke ọtụtụ nde mmadụ nọ ugbu a n’ihe ize ndụ n’ihi nleghara anya ụmụ mmadụ na-eleghara gburugburu ebe obibi.

Mmadụ Ọ̀ Pụrụ Ịchịkwa Nsogbu Ndị Ahụ?

N’agbanyeghị na e nwere ihe mmadụ na-aghọta ugbu a banyere ihe na-agahie, ọ dịghị mfe idozi. Ihe isi ike mbụ bụ na ọ ga-achọ ego buru ibu—ọ dịkarịa ala $600 ijeri n’otu afọ—iji tinye atụmatụ ndị ahụ sara mbara a tụpụtara ná Nzukọ Ụwa ahụ na 1992 n’ọrụ. Ọ ga-adịkwa mkpa ịchụ nnọọ ọtụtụ ihe n’àjà—àjà ndị dị ka ibelata mmefu na idozigharị ihe ka ukwuu, ichekwa mmiri na ike, iji usoro njem ọha mmadụ eme ihe karịa iji nke onwe onye, na, nke sikarịsịrị ike, iche echiche n’ihe metụtara mbara ụwa kama ọdịmma onwe onye nanị. John Cairns, Jr., onye isi oche nke kọmitii United States maka iweghachi usoro gburugburu ebe obibi nke mmiri n’ọnọdụ ha, tinyere nsogbu ahụ n’okwu dị nnọọ mkpirikpi, sị: “Enwere m nchekwube banyere ihe anyị pụrụ ime. Enweghị m nchekwube banyere ihe anyị ga-eme.”

Ihe ọ na-efu nnọọ inwe nnukwu uru zuru ezu buru ibu nke na ihe ka ọtụtụ n’ime mba dị iche iche na-ahọrọ ịhapụ ụbọchị ime mpịazi ruo n’oge dị n’ihu. N’oge ọgba aghara akụ̀ na ụba, a na-ele ihe ndị e ji echekwa gburugburu ebe obibi anya dị ka ihe na-eyi ọrụ egwu ma ọ bụ ihe na-adọghachi akụ̀ na ụba azụ. Ọ dị mfe karị ikwu ihe n’ọnụ karịa ime ya eme. Akwụkwọ bụ́ Caring for the Earth (Ilekọta Ụwa) na-akọwa nzaghachi e nweworo ka ọ dị ugbu a dị ka ihe yiri “ekwu ekwu emeghị eme.” Ma n’agbanyeghị emeghị ihe dị ka o kwesịrị nke a, ọ̀ bụ na nkà na ụzụ ọhụrụ—ọ bụrụ na e nye ya oge—apụghị ịchọta ọgwụgwọ na-adịghị egbu mgbu maka nsogbu mbara ụwa? O doro anya na ọ pụghị.

N’otu okwu ha jikọrọ aka kwuo, òtù National Academy of Sciences nke United States na òtù Royal Society of London kwetara n’ezoghị ọnụ, sị: “Ọ bụrụ na amụma ndị a na-ebu banyere ịrị elu nke ụba mmadụ abụrụ eziokwu, ọ bụrụkwa na ụkpụrụ ihe omume ụmụ mmadụ na mbara ụwa agbanweghị, ọ pụrụ ịbụ na sayensị na nkà na ụzụ agaghị enwe ike igbochi mmebi a na-apụghị ịgbanwe ịgbanwe nke gburugburu ebe obibi ma ọ bụ ịda ogbenye na-aga n’ihu nye akụkụ dị ukwuu nke ụwa.”

Nsogbu na-eyi egwu nke ihe mkpofu nuklia na-enweghị ebe a ga-ekpofu ya bụ ihe ncheta na sayensị apụghị ime ihe nile. Ruo 40 afọ ndị ọkà mmụta sayensị anọwo na-achọ ebe ndị na-adịghị ize ndụ ibukọba n’ụzọ na-adịgide adịgide ihe mkpofu nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke radioactive. Ọchịchọ ahụ siri ike nke na mba ụfọdụ, dị ka Itali na Argentina, ekpebiwo na ha agaghị akwadebe ebe mkpofu ọ bụla ruo afọ 2040 ma o mekarịa ngwa ngwa. Germany, mba kasị nwee nchekwube n’ọnọdụ a, na-enwe olileanya imezu atụmatụ nile ka ọ na-erule afọ 2008.

N’ihi gịnị ka ihe mkpofu nuklia ji bụrụ nsogbu otú a? “Ọ dịghị onye ọkà mmụta sayensị ma ọ bụ onye injinia nke pụrụ inye mmesi obi ike e ji n’aka na ihe mkpofu radioactive agaghị atapụta n’ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị ize ndụ site ọbụna n’ihe ndị kasị mma a na-awụnye ihe,” ka ọkachamara ná mmụta banyere ala bụ́ Konrad Krauskopf na-akọwa. Ma n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị ndị bu ụzọ banyere ihe isi ike nke ịwụfu ihe mkpofu, gọọmenti dị iche iche na ụlọ ọrụ mmepụta ngwá agha nuklia ji obi ụtọ gaa n’ihu, na-eburu n’uche na nkà na ụzụ nke ọdịnihu ga-enwe ngwọta ya. Ọ dịghị mgbe ngwọta ahụ weere ọnọdụ.

Ọ bụrụ na nkà na ụzụ enweghị ngwọta dị ngwa nye ọgba aghara gburugburu ebe obibi, nhọrọ ndị ọzọ dị aṅaa fọrọ? Ịdị mkpa ọ̀ ga-emesị manye mba dị iche iche ịrụkọ ọrụ ọnụ iji chebe mbara ụwa?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Site n’okwu Grik bụ́ oiʹkos (ụlọ, ebe obibi) na lo·giʹa (ihe ọmụmụ).

[Igbe dị na peeji nke 7]

Ọchịchọ A Na-achọ Ebe E Si Enweta Ike A Pụrụ Ime Ka Ha Dịghachi Ọhụrụ

Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-ewere ike dị ka ihe na-adịchaghị mkpa—ruo mgbe ọkụ nyụrụ ma ọ bụ mgbe ọnụ ahịa mmanụ rịrị elu. Otú ọ dị, iji ihe na-enye ike eme ihe bụ otu n’ime ihe kasị akpata mmetọ. A na-enweta ihe ka ukwuu n’ime ike e ji eme ihe site n’isu nkụ ọkụ ma ọ bụ ihe ndị dị n’ime ala na-enwu ọkụ, usoro ime ihe nke na-awụpụ ọtụtụ nde tọn carbon dioxide na mbara ikuku ma na-emebi oké ọhịa dị iche iche nke ụwa.

Ike nuklia, bụ́ nhọrọ ọzọ, na-aghọwanye ihe ọha na-anabataghị n’ihi ihe ize ndụ nke ihe ọghọm na ihe isi ike nke ịkwakọba ihe mkpofu nke radioactive. A matara ihe ndị ọzọ a pụrụ iji mee ihe dị ka ebe ndị e si enweta ike a pụrụ ime ka ha dịghachi ọhụrụ, ebe ọ bụ na ha na-eji ebe e si enweta ike ndị sitere n’okike bụ́ ndị a na-enweta n’efu eme ihe. E nwere ụdị ise ndị bụ isi.

Ike sitere n’anyanwụ. A pụrụ inweta ike a n’ụzọ dị mfe maka ikpo ihe ọkụ, ná mba ụfọdụkwa, dị ka Israel, ọtụtụ ụlọ nwere ọkwá e ji adọta ike sitere n’anyanwụ maka iji sie mmiri n’ọkụ. Iji anyanwụ na-emepụta eletrik siri ike karị, ma ikike eletrik a na-enweta site n’anyanwụ anọworị na-enye ike eletrik n’ime ime obodo, ha na-adịwanyekwa ọnụ ala.

Ike sitere n’ifufe. Nnukwute ígwè ọrụ na-akpa ifufe gbasazuru ebe nile ugbu a n’ọtụtụ ebe ifufe na-ekusi ike n’ụwa. Ike eletrik sitere n’ifufe, dị ka a na-akpọ ya, anọgidewo na-adị ọnụ ala, ọ dịzikwa ọnụ ala n’ebe ụfọdụ karịa ihe ndị na-enye ike ọha mmadụ maara.

Inweta ike eletrik site ná mmiri. Ka ọ dị ugbu a, 20 pasent nke eletrik dị n’ụwa na-esite n’ígwè ọrụ eletrik na-enweta ike site ná mmiri, ma n’ụzọ dị mwute e jiriwo ihe ka ọtụtụ n’ebe ndị a na-atụkwasị obi mee ihe ná mba ndị mepere emepe. Ebe mgbochi mmiri ndị buru oké ibu pụkwara imebi gburugburu ebe obibi n’ụzọ dị ukwuu. O yiri ka atụmanya ka mma, karịsịa nye mba ndị ka na-emepe emepe, bụ iwu ọtụtụ obere ígwè ọrụ eletrik na-enweta ike site ná mmiri.

Ike okpomọkụ sitere n’ime ala. Mba ụfọdụ, karịsịa Iceland na New Zealand, enwewo ike ịmịrị “usoro mmiri ọkụ” dị n’okpuru ala. Mgbawa ugwu n’okpuru ala na-ekpo mmiri ọkụ, bụ́ nke a pụrụ iji mee ka ụlọ kporo ọkụ ma nweta ike eletrik. Itali, Japan, Mexico, Philippines, na United States ewulitewokwa ike a sitere n’okike ruo n’ókè ụfọdụ.

Ikike mmali mmiri. A na-eji mmali nke oké osimiri na-eme ihe ná mba ụfọdụ, dị ka Britain, France, na Russia, iji nweta ike eletrik. Otú ọ dị, e nwere ebe ole na ole n’ụwa nile ebe ọ ga-adị mfe ma kwe omume inye ike nke a n’ọnụ ego dị ala.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Ụfọdụ n’Ime Nsogbu Ndị Bụ Isi nke Gburugburu Ebe Obibi n’Ụwa

Mbibi nke oké ọhịa. A tụfuwo ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke oké ọhịa ndị ihu igwe ha na-adịghị oké njọ na ọkara nke oké ọhịa ebe okpomọkụ nke ụwa, ọ̀tụ̀tụ̀ e ji egbukpọ oké ọhịa arịwokwa elu n’ụzọ dị egwu n’ime iri afọ gara aga. Atụmatụ ndị kasị ọhụrụ na-egosi na mbibi nke oké ọhịa ebe okpomọkụ dị n’agbata 150,000 na 200,000 square kilomita kwa afọ, ebe fọrọ nke nta ka ọ hà ka Uruguay n’obosara.

Ihe mkpofu ndị na-egbu egbu. A na-ewere ọkara nke 70,000 ọgwụ ndị a na-emepụta ugbu a dị ka ndị na-egbu egbu. United States nanị na-emepụta 240 nde tọn nke ihe mkpofu na-egbu egbu kwa afọ. Ụkọ ihe ọmụma ziri ezi na-eme ka ọ ghara ikwe omume ịgbakọ ngụkọta ya n’ụwa nile. Ọzọkwa, ka ọ na-erule afọ 2000, a ga-enwe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 200,000 tọn nke ihe mkpofu radioactive a kwakọbara n’ebe ha ga-adị ruo nwa oge.

Mbibi nke ala. Mgbasa nke ọzara na-eyi otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke mbara ala dum egwu. N’akụkụ ụfọdụ nke Africa, Ọzara Sahara agbasawo ruo 350 kilomita n’ime nanị 20 afọ. Ka ọ dị ugbu a a na-eyi ihe na-akwado ọtụtụ nde ndụ egwu.

Ụkọ mmiri. Ihe dị ka ijeri mmadụ abụọ bi n’ebe e nwere ụkọ mmiri jọgburu onwe ya. Ihe so na-eme ka ụkọ ahụ kawanye njọ bụ ntakpọ nke ọtụtụ puku mmiri dị n’ebe a na-apụghị ịmịta ya n’okpuru ala na-atakpọ n’ihi ọ̀tụ̀tụ̀ na-adalata adalata nke ọdọ mmiri ndị ha na-adabere na ha.

Ụdị dị iche iche nọ n’ihe ize ndụ nke mkpochapụ. Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ndị ahụ yiri ihe e chepụtara echepụta, ndị ọkà mmụta sayensị na-eme atụmatụ na a ga-ekpochapụworị ihe dị n’agbata 500,000 na 1,000,000 nke ụdị dị iche iche nke anụmanụ, ihe ọkụkụ, na ụmụ ahụhụ ka ọ na-erule afọ 2000.

Mmetọ nke mbara ikuku. Otu ihe ọmụmụ òtù Mba Ndị Dị n’Otu nwere n’afọ ndị 1980 chọpụtara na a na-ekpughe otu ijeri mmadụ bi n’ógbè ndị mepetụrụ emepe nye ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke iberibe ntụ soot ma ọ bụ gas ndị na-egbu egbu, dị ka ikuku sulfur dioxide, nitrogen dioxide, na carbon monoxide. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na uto dị oké ngwa nke obodo ukwu dị iche iche na-eto n’ime iri afọ gara aga emewo ka nsogbu a kawanye njọ. Ọzọkwa, a na-agbanye 24 ijeri tọn nke carbon dioxide n’ime mbara ikuku kwa afọ, a na-atụkwa egwu na “gas ịrị elu nke okpomọkụ ụwa” pụrụ ime ka ụwa dum kporo ọkụ.

[Map]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Igbukpọsị oké ọhịa

Ihe mkpofu ndị na-egbu egbu

Mmetọ nke mbara ikuku

Ụkọ mmiri

Ụdị dị iche iche nọ n’ihe ize ndụ

Mmebi nke ala

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Mountain High Maps™ ike mbipụtaghachi© 1993 Digital Wisdom, Inc.

Foto: Hutchings, Godo-Foto

Foto: Mora, Godo-Foto

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya