Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 6/8 p. 21-24
  • Iyi Egwu Mmekọahụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iyi Egwu Mmekọahụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Ike Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
  • Olee Ókè Ọ Gbasaruru?
  • Ihe Àmà nke Oge Ndị A
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Guzogide Iyi Egwu Mmekọahụ?
    Teta!—2000
  • Iyi Egwu Mmekọahụ—Ụzọ Isi Chebe Onwe Gị
    Teta!—1996
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mmadụ Ghara Igwusa M Egwuregwu Iberiibe?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ebe Ọrụ Ka Ọ̀ Bụ Ọgbọ Agha?
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 6/8 p. 21-24

Iyi Egwu Mmekọahụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

ỌRỤ aghọwo nrọ ọjọọ nye otu onye na-eto eto bụ odeakwụkwọ aha ya bụ Rena Weeks. N’eziokwu, ụlọ ọrụ ọkà iwu were ya n’ọrụ nwere aha a na-akwanyere ùgwù na ọfịs dị iche iche n’ime ihe karịrị mba iri abụọ na anọ. Ma dị ka ọ na-ekwu, ọ rụụrụ nwoke nọgidere na-ejide ya ma na-emetụ ya aka ọrụ. Ihe ya na mwakpo ahụ na-eme ihere na-esokarị bụ okwu arụrụala, nke na-atụ aro ihe rụrụ arụ.

Ọtụtụ afọ gara aga, ndị inyom nọ n’ọnọdụ ndị yiri nke a enwechaghị ebe nchebe—ma e wezụga ịkwụsị ọrụ ma eleghị anya. ‘Okwu nwanyị ahụ megide nke ya’ gaara abụ mkpebi ikpe nke òtù na-atụzi ọrụ. Ọbụnakwa ndị gaara ekwerewo okwu nwanyị ahụ gaara eleghara nsogbu ahụ anya ma eleghị anya site n’ịsị, ‘Ọ̀ dịkwanụ ihe nke ahụ mere?’ Ma oge agbanwewo. Rena Weeks mere ihe karịrị nanị iwe iwe ma kwụsị ọrụ. Ọ gbara akwụkwọ.

Otu òtù ikpe na United States kwuru ka a kwụọ ya $50,000 iji tie ya aka n’obi maka nsogbu mmetụta uche, tinyere $225,000 nhá nke onye bụbu onye isi ọrụ ya ga-akwụ dị ka ntaramahụhụ. Mgbe ahụ, na nzọụkwụ dọtara mmasị nke achụmnta ego na ụlọ ọrụ ọkà iwu dị iche iche gburugburu ụwa, òtù ikpe ahụ nyere ụlọ ọrụ ọkà iwu ahụ iwu ka ọ kwụọ nnukwu ego bụ́ $6.9 nde dị ka nhá maka enweghị ike idozi nsogbu ahụ!

Akwụkwọ Weeks gbara abụghị ihe omume pụrụ iche ma ọlị. Akwụkwọ ọzọ a gbara n’oge na-adịbeghị anya metụtara ìgwè ụlọ ahịa zuru mba (U.S.) ndị na-ere ngwá ahịa n’ọnụ ego dị ala. Otu onye e were n’ọrụ aha ya bụ Peggy Kimzey zọọrọ na onye nlekọta ọrụ ya agwawo ya ọtụtụ okwu rụrụ arụ nke mmekọahụ. Na 1993, Peggy Kimzey gbara arụkwaghịm wee gbaa akwụkwọ. E kpebiri ka a kwụọ ya $35,000 maka mmechuihu na ntaramahụhụ uche, ya na $1 ihe atụ n’ụgwọ ọrụ ndị a na-akwụghị ya. Òtù ikpe ahụ kpebikwara na onye ahụ weburu ya n’ọrụ emewo ka e nwee ọnọdụ dị njọ na gburugburu ebe ọrụ site n’ikwere ka iyi egwu ahụ dịrị. Gịnị bụ ntaramahụhụ ya? Nde dollar 50 ná nhá!

Magazin bụ́ Men’s Health na-asị: “Okwu ikpe ndị metụtara iyi egwu mmekọahụ anọwo na-amụba dị ka nje. Na 1990, òtù EEOC [Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ohere Ọrụ Hà Nhata] lebara anya na 6,127 mkpesa dị otú ahụ; ka ọ na-erule afọ gara aga [1993] ngụkọta e nwere n’afọ ahụ fọrọ nke nta ka o jiri okpukpu abụọ ruo 11,908.”

Iji Ike Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi

Ọ bụ ezie na ego buru oké ibu nke òtù ikpe na-ekwu ka a kwụọ nọ na-abụ isiokwu akwụkwọ akụkọ dị iche iche, eziokwu bụ na ọ bụ nanị ole na ole ka e kpere ikpe ya n’ụlọikpe. Ọtụtụ ndị e yiri egwu nwere mmechuihu ha n’ịgba nkịtị—ihe ibé n’ajọ egwuregwu nke ike na mmenye egwu, bụ́ nke na-ewere ọnọdụ n’ọfịs, n’okporo ámá, na bọs, n’ebe a na-eri nri ehihie, na n’ụlọ ọrụ dị iche iche. Mgbe ụfọdụ, a na-enwe mmanye doro anya ka e nwee mmekọahụ. Otú ọ dị, n’ime oge ka ukwuu, mkpasu iwe ahụ na-agụnye ihe omume dị aghụghọ karị, ma na-akpasu iwe n’ụzọ na-enweghị ihere: mmetụ aka na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ nke a na-achọghị, ikwu okwu na-adịghị ọcha, ilegide anya n’ụzọ na-egosi ọchịchọ mmekọahụ.

N’eziokwu, ụfọdụ na-ajụ ịkpọ akparamàgwà dị otú ahụ iyi egwu, na-ekwu na ọ bụ nanị mgbalị na-ekwesịchaghị ekwesị ndị ikom ụfọdụ na-eme iji dọrọ mmasị ndị inyom. Ma ọtụtụ ndị, dị ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ Martha Langelan, jụrụ mgbalị dị otú ahụ ileghara akparamàgwà ahụ na-akpasu iwe anya. Ọ na-ede, sị: “Ọ bụghị ndọrọ mmasị a na-ejighị akọ eme, ma ọ bụ ndọrọ mmasị nsọpụrụ na-adịghị na ya, ma ọ bụ ndọrọ mmasị egwuregwu, ma ọ bụ ndọrọ mmasị ‘a ghọtahiere aghọtahie.’ A dịghị eme ya ka ọ masị ndị inyom; ọ bụ akparamàgwà na-arụzu ihe dị iche kpam kpam. Dị ka ndina n’ike, a na-eyi egwu mmekọahụ iji manye ndị inyom, ọ bụghị iji dọrọ mmasị ha. . . . [Ọ] bụ ngosipụta nke ike.” Ee, ọtụtụ mgbe ụdị mmeso ọjọọ dị otú ahụ bụ nanị ụzọ ọjọọ ọzọ nke ‘mmadụ inwe ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.’—Eklisiastis 8:9; tụlee Eklisiastis 4:1.

Ndị inyom na-emeghachikarị omume n’iyi egwu mmekọahụ, ọ bụghị n’obi ụtọ, kama site ná mmetụta ndị nke malite n’ịkpọasị na iwe ruo n’ịda mbà n’obi na mweda n’ala. Otu onye e yiri egwu mmekọahụ na-echeta: “Ọnọdụ ahụ bibiri m. Atụfuru m ntụkwasị obi m, obi ike m, ùgwù onwe onye m, na nchụso nke ọrụ m. Ọdịdị m gbanwere n’ụzọ dị njọ. Abụrụwo m onye a na-ejighị kpọrọ ihe. Iwe were m, ekewapụrụ m onwe m, ihere mekwara m.” Mgbe onye yiri egwu ahụ bụkwa onye were mmadụ n’ọrụ ma ọ bụ onye ọzọ nọ n’ike, iyi egwu ahụ na-eyikwasị ọdịdị dị iche jọgburu onwe ya.

Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere na ụlọikpe dị iche iche amalitewo inye ndị mere ihe ọjọọ ahụhụ ma na-eti ndị e yiri egwu mmekọahụ aka n’obi. Kemgbe Ụlọ Ikpe Kasị Elu na United States kọwara mmeso ọjọọ dị otú ahụ dị ka mmebi nke ihe ruuru mmadụ n’ụzọ ọchịchị, e werewo ndị were mmadụ n’ọrụ n’ụzọ na-arị elu dị ka ndị ọ dịịrị n’ụzọ iwu kwadoro ịhụ na e nwere ọnọdụ ebe ọrụ na-adịghị “njọ ma ọ bụ na-akpasu iwe.”

Ụlọ ọrụ ndị na-anabata iyi egwu mmekọahụ pụrụ inwe ndị ọrụ nwere mmasị dị ala n’ịrụ ọrụ, oké ịgha ọrụ, nrụpụta ihe dị nta, oké mgbanwe ndị ọrụ—ma ya fọdụkwa ọdachi ego ma ọ bụrụ na ndị e yiri egwu ekpebie ịgba akwụkwọ.

Olee Ókè Ọ Gbasaruru?

Olee nnọọ ókè iyi egwu mmekọahụ gbasaruru? Nnyocha ndị e mere na-egosi na ihe karịrị ọkara nke ndị inyom na-arụ ọrụ na United States enwewo ahụmahụ ya. N’ihi ya otu akwụkwọ na-azọrọ, sị: “Iyi egwu mmekọahụ bụ nsogbu jupụtara ebe nile. Ọ na-eme ndị inyom nọ n’ụdị ọrụ ọ bụla, site ná ndị nchere n’ụlọ nri ruo ná ndị nọ n’ọkwá ọrụ dị elu. Ọ na-eme n’ọkwá nile nke ndị nọ n’ọkwá ọrụ dị elu na n’ụdị achụmnta ego na ụlọ ọrụ mmepụta ihe nile.” Otú ọ dị, ọ bụghị nnọọ nanị na United States ka nsogbu ahụ dị. Akwụkwọ bụ́ Shockwaves: The Global Impact of Sexual Harassment (Akpata Oyi: Mmetụta Iyi Egwu Mmekọahụ Na-enwe n’Ụwa Nile), nke Susan L. Webb dere, na-ehota ndekọ ọnụ ọgụgụ ndị na-esonụ:a

CANADA: “Otu nnyocha gosiri na 4 n’ime ndị inyom 10 kọrọ na e yiri ha egwu mmekọahụ n’ebe ọrụ.”

JAPAN: “Otu nnyocha e mere n’August 1991 gosiri na 70 pasent nke ndị inyom zara òkù nnyocha ahụ nwere ahụmahụ” nke iyi egwu n’ebe ọrụ. “Pasent 90 kwuru na e yiri ha egwu mmekọahụ mgbe ha na-aga na mgbe ha na-alọta ọrụ.”

AUSTRIA: “Otu nnyocha e mere na 1986 gosiri na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 31 pasent nke ndị inyom kọrọ akụkọ ihe omume iyi egwu ndị dị oké njọ.”

FRANCE: “Na 1991 otu ihe ọmụmụ . . . chọpụtara na 21 pasent nke 1,300 ndị inyom e nyochara kwuru na ha enwewo ahụmahụ nke iyi egwu mmekọahụ n’onwe ha.”

THE NETHERLANDS: Otu ihe ọmụmụ gosiri na “58 pasent nke ndị inyom zaghachiri [ná nnyocha ahụ] kwuru na ha enwewo ahụmahụ nke iyi egwu mmekọahụ n’onwe ha.”

Ihe Àmà nke Oge Ndị A

N’eziokwu, mkpasu iwe na iyi egwu n’ebe ọrụ abụghị ihe ọhụrụ. Ndị inyom—mgbe ụfọdụkwa ndị ikom—bụ ndị e mesoro mmeso ọjọọ dị otú ahụ ọbụna laa azụ n’oge Bible. (Jenesis 39:7, 8; Rut 2:8, 9, 15) Ma omume ọjọọ dị otú ahụ yiri ka ọ kachasị jupụta ebe nile taa. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?

Otu ihe bụ na, n’afọ ndị na-adịbeghị anya ndị inyom abanyewo n’ọrụ n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu. Ya mere a na-ekpughe ọtụtụ ndị inyom nye ọnọdụ ebe mmetọ ndị dị otú ahụ pụrụ iwere ọnọdụ na ha. Otú ọ dị, ọbụna nke ka mkpa bụ ihe Bible buru amụma ya ogologo oge gara aga: “Cheta nke a! A ga-enwe oge ndị siri ike n’oge ikpeazụ. Ndị mmadụ ga-abụ ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, ndị anyaukwu, ndị na-etu ọnụ, na ndị dị mpako; ha ga na-akparị mmadụ . . . ; ha ga-abụ ndị na-enweghị obi ọma, obi ebere, ndị na-akatọ mmadụ, ndị na-eme ihe ike, na ndị nwere obi ọjọọ.” (2 Timoti 3:1-3, Today’s English Version) Njupụta nke iyi egwu mmekọahụ bụ nanị otu ihe atụ pụtara ìhè na a na-emezu okwu ndị a taa. N’ụzọ na-akpali mmasị, otu isiokwu dị na magazin bụ Men’s Health na-ekwu na “ndalata dị egwu n’ihe nile a kpọrọ omume ọma esochiwo mmụba e nwere ná mkpesa na-arị elu nke iyi egwu mmekọahụ. Omume ọjọọ juru ebe nile.”

Njupụta nke iyi egwu mmekọahụ na-egosikwa “usoro omume ọhụrụ,” nke gbasazuru ụwa nile n’afọ ndị 1960. Enweghị nkwanye ùgwù na-awụ akpata oyi maka mmetụta na ihe ruuru ndị ọzọ esochiwo mbibi nke e bibiri ókè nke ụkpụrụ omume ọma mbụ. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, iyi egwu mmekọahụ bụ ihe dị adị na-eyi egwu n’ebe ọrụ. Gịnị ka ndị ikom na ndị inyom pụrụ ime iji chebe onwe ha? À ga-enwe oge mgbe iyi egwu na-agaghị adị n’ebe ọrụ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ndekọ ọnụ ọgụgụ na-adịwaga iche, ebe ọ bụ na ndị nnyocha na-eji ụdị ime nnyocha na ụdị nkọwa dị iche iche nke iyi egwu mmekọahụ eme ihe.

[Igbe dị na peeji nke 22]

Iyi Egwu Mmekọahụ—Echiche Ụgba Megide Ihe Mere Eme

Echiche ụgha: A na-akọ akụkọ iyi egwu mmekọahụ n’ụzọ gabigara ókè nke ukwuu. Ọ bụ nanị ihe ọzọ na-ewu ewu, ihe si n’ime oké mkpọsa na mkpali gabigara ókè apụta.

Ihe mere eme: N’ozuzu ya, nwanyị nwere ọtụtụ ihe ịtụfu na ihe dị nta ọ ga-erite site n’ikwu na e yiri ya egwu. N’ezie, nanị ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị inyom (22 pasent dị ka otu nnyocha si gosi) gwatụrụla mmadụ na e yiwo ha egwu. Ụjọ, mmechuihu, ịta onwe onye ụta, mgbagwoju anya, na amaghị ihe ruuru ha n’ụzọ iwu kwadoro na-eme ka ọtụtụ ndị inyom mechie ọnụ. N’ihi ya ọtụtụ ndị ọkachamara kwetara na a dịghị enyezu akụkọ nsogbu ahụ ma ọlị!

Echiche ụgha: Ọtụtụ ndị inyom na-enwe mmasị ná nlekwasị anya ahụ. Ndị na-azọrọ na e yiwo ha egwu bụ nanị na ha na-emeghachi omume n’ụzọ gabigara ókè.

Ihe mere eme: Nnyocha nọgidere na-egosi na ndị inyom na-ewe iwe ná mmeso ọjọọ dị otú ahụ. N’otu nnyocha, “ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ ise nke ndị inyom kwuru na ha nwere mmetụta ọjọọ, ihe dịkwa ka otu ụzọ n’ime ụzọ atọ kwuru na iwe were ha.” Ndị ọzọ kọrọ na ha nwere nchegbu, wee iwe, nweekwa nkụda mmụọ.

Echiche ụgha: A na-eyikwa ndị ikom egwu dị nnọọ ka a na-eyi ndị inyom.

Ihe mere eme: Ndị nchọpụta maka Òtù Mba Maka Ndị Inyom Na-arụ Ọrụ (U.S.) kọrọ na “ọnụ ọgụgụ e mere atụmatụ ya bụ́ 90 pasent nke okwu iyi egwu metụtara ndị ikom yiworo ndị inyom egwu, pasent 9 bụ n’etiti ụdị onwe onye . . . , nanị 1 pasent metụtara ndị inyom yiworo ndị ikom egwu.”

[Foto dị na peeji nke 23]

Iyi egwu mmekọahụ abụghị nanị banyere mmekọahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya