Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 6/8 p. 24-28
  • Iyi Egwu Mmekọahụ—Ụzọ Isi Chebe Onwe Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iyi Egwu Mmekọahụ—Ụzọ Isi Chebe Onwe Gị
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Àgwà Kwesịrị Ekwesị Maka Ndị Ikom
  • Igbochi Iyi Egwu
  • Ọ Bụrụ na E Yie Gị Egwu
  • Ngwụsị nke Iyi Egwu Mmekọahụ
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Guzogide Iyi Egwu Mmekọahụ?
    Teta!—2000
  • Iyi Egwu Mmekọahụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—1996
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mmadụ Ghara Igwusa M Egwuregwu Iberiibe?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ma Mmadụ Gwusawa M Egwuregwu Iberiibe?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 6/8 p. 24-28

Iyi Egwu Mmekọahụ—Ụzọ Isi Chebe Onwe Gị

“Ọ DỊGHỊ nwanyị ọ bụla kwesịrị ịdị na-agbaso ihe ịma aka nke echiche mmekọahụ mgba kwa ụbọchị,” ka Gretchen Morgenson, bụ́ editọ magazin na-ekwu, “ezi uche adịghịkwa na ya ka ndị inyom tụọ anya gburugburu ebe ọrụ nke a na-enweghị akparamàgwà na-adịghị mma.” N’ụzọ a pụrụ ịja mma, mgbalị ndị were mmadụ n’ọrụ na ụlọikpe dị iche iche na-eme iji mee ka ebe ọrụ bụrụ ebe na-adịghị ize ndụ arụpụtawo ihe ndị dị mma. Dị ka ihe atụ, ihe ize ndụ nke ịgba akwụkwọ akpaliwo ndị were mmadụ n’ọrụ na ndị e were n’ọrụ gburugburu ụwa ịnwa imeziwanye gburugburu ebe ọrụ. Ọtụtụ ụlọ ọrụ ewulitewo ụkpụrụ ndị nke onwe ha iji hụ maka mkpasu iwe ebe ọrụ. A na-enwe nzukọ na nnọkọ ọmụmụ ihe iji nye ndị were mmadụ n’ọrụ nduzi banyere akparamàgwà kwesịrị ekwesị n’ebe ọrụ.

N’ezie, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịmara na ịgbaso ụkpụrụ ụlọ ọrụ na iwu ndị dị ná mba ahụ. (Ndị Rom 13:1; Taịtọs 2:9) Ndị Kraịst ahụwokwa ya dị ka ihe na-enye aka itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Ịgbaso nduzi ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ ná mmekọrịta gị na ndị ọrụ ibe gị pụrụ ime ihe dị ukwuu n’inyere gị aka izere ịbụ onye e yiri egwu mmekọahụ—ma ọ bụ onye na-eme ya eme.

Àgwà Kwesịrị Ekwesị Maka Ndị Ikom

Tụlee okwu banyere otú ndị ikom kwesịrị isi meso ndị inyom. Ọtụtụ ndị ọkachamara na-adọ aka ná ntị megide imetụ ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị aka. Ha na-adọ aka ná ntị na a pụrụ ịghọtahie n’ụzọ dị mfe mmetụ aka enyi e metụrụ mmadụ n’azụ. “Ndị òtù ikpe na-ewere mmetụ aka n’ihe siri oké ike,” ka onye ọkàikpe ndị ọrụ bụ́ Frank Harty na-ekwu. Gịnị bụ aro ọ tụrụ? “Ọ bụrụ na ọ gụnyere ihe karịrị ikwe n’aka, emela ya.” N’eziokwu, Bible n’onwe ya adịghị eti iwu n’okwu a.a Ma n’ihi ọnọdụ iwu na omume dị ugbu a, nlezianya kwesịrị ekwesị—karịsịa nye ndị nwere àgwà nke amaghị ụma na-emetụ mmadụ aka ka ha na-ekwurịta okwu.

N’ụzọ kwere nghọta, ndụmọdụ dị otú ahụ adịghị adị mfe mgbe nile ịgbaso. Dị ka ihe atụ, Glen sitere n’ọdịbendị ndị Spain. “Ebe m si bịa,” ka ọ na-ekwu, “ndị mmadụ na-achọkarị nnọọ ịmakụ mmadụ, karịa na United States ebe a. N’ezinụlọ m, anyị na-ejikarị nsutu ọnụ ekele ndị enyi, ma n’ebe a, a dụrụ anyị ọdụ ka anyị ghara ịdị ngwa n’ime nke ahụ.” Otú ọ dị, ụkpụrụ Bible na-enye aka n’okwu a. Pọl onyeozi gwara nwa okoro ahụ bụ́ Timoti, sị: “Mesoo ụmụ okoro dị ka ụmụnne ndị ikom, agadi ndị inyom dị ka nne, na ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne ndị inyom, n’ịdị ọcha zuru okè.” (1 Timoti 5:1, 2, New International Version) Ọ̀ bụ na nke ahụ agaghị akagbu mmetụ aka aghara aghara, na-akpali akpali, ma ọ bụ nke a na-achọghị?

A pụkwara iji otu ụkpụrụ ahụ mee ihe n’ihe banyere okwu. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Bible na-asị: “Ma ịkwa iko, na adịghị ọcha nile, ma ọ bụ anyaukwu, ka a ghara ịkpọ ọbụna aha ya n’etiti unu, dị ka o kwesịrị ndị nsọ; ma ọ bụ ihe ihere, ma ọ bụ ikwu okwu nzuzu, ma ọ bụ okwu na-abaghị n’ihe, nke na-ekwesịghị.” (Ndị Efesọs 5:3, 4) Onye ọkàikpe iyi egwu mmekọahụ bụ́ Kathy Chinoy na-atụ aro ka ị tụlee otu ajụjụ tupu gị ekwuo okwu: “Ị̀ ga-achọ ka nne gị, nwanne gị nwanyị, ma ọ bụ ada gị bụrụ onye e kpughere nye nke ahụ?” Okwu rere ure, nke na-atụ aro mmekọahụ na-eweda ma onye kwuru ya ma onye nụrụ ya n’ala.

Igbochi Iyi Egwu

Olee otú mmadụ pụrụ isi gbalịa izere ịbụ onye e yiri egwu? Ikekwe a pụrụ iji ndụmọdụ Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe o zipụrụ ha maka ọrụ nkwusa ha nke mbụ mee ihe n’ọnọdụ a: “Lee, Mụ onwe m na-ezipụ unu dị ka atụrụ n’etiti agụ: ya mere, bụrụnụ ndị nwere uche dị ka agwọ, ndị na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru.” (Matiu 10:16) Otú o sina dị, onye Kraịst anọghị n’enweghị enyemaka. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị . . . , izùzù ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị.” (Ilu 2:10, 11) Ya mere, ka anyị tụlee ụkpụrụ ụfọdụ nke Bible ndị pụrụ inyere gị aka ichebe onwe gị.

1. Lezie anya otú i si emeso ndị ọrụ ibe gị omume. Nke a apụtaghị ịdị na-eme oyi oyi ma ọ bụ ibuso iro, n’ihi na Bible na-agba anyị ume ‘ịgbaso udo n’ebe mmadụ nile nọ.’ (Ndị Hibru 12:14; Ndị Rom 12:18) Ma ebe ọ bụ na Bible na-adọ ndị Kraịst aka ná ntị ka ha ‘na-ejegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ,’ ọ bụ ihe ezi uche dị na ya inwe àgwà a naadịghị enyo enyo, karịsịa mgbe anyị na-emeso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị ihe. (Ndị Kọlọsi 4:5) Akwụkwọ bụ́ Talking Back to Sexual Pressure (Ịzaghachi ná Nrụgide Mmekọahụ), nke Elizabeth Powell dere na-agba ndị ọrụ ume “ịmata kpọmkwem ihe dị iche n’omume dị mma kwesịrị ekwesị n’ọrụ ha na ụdị omume enyi nke pụrụ ịtụ aro ịnakwere mmekọahụ.”

2. Jie ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ihe i yi n’ahụ na-ezipụrụ ndị ọzọ ozi. Laa azụ n’oge Bible, iyi ụdị ákwà ụfọdụ na-egosipụta mmadụ dị ka onye na-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ onye na-enwe mmekọahụ aghara aghara. (Ilu 7:10) Otu ihe ahụ na-abụkarị eziokwu taa; ákwà kegidere ekegide n’ahụ, nke na-egbukepụ egbukepụ, ma ọ bụ nke na-ahụ ụzọ, pụrụ ịdọta ụdị mmasị na-ekwesịghị ekwesị. N’eziokwu, ụfọdụ pụrụ iche na ha nweere onwe ha iyi ihe ọ bụla masịrị ha. Ma dị ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ Elizabeth Powell si na-etinye ya, “ọ bụrụ na gị na ndị kwetara na izu ego adịghị njọ na-arụkọ ọrụ, m ga-agwa gị ka ị ghara itinye wọlet gị n’akpa azụ gị. . . . Ị ghaghị ịghọta ọnọdụ na-adịghị mma nke . . . àgwà ọha mmadụ ma gbalịa ichebe onwe gị pụọ n’ịbụ onye ha wakporo.” Ndụmọdụ Bible si otú a bụrụ ihe kasị dị irè. Ọ na-adụ ndị inyom ọdụ ka ha “were ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, ya na nsọpụrụ na uche zuru okè.” (1 Timoti 2:9) Jie ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ pụkwara ịbụ na ị gaghị abụcha onye e lekwasịrị anya maka okwu na àgwà ndị na-akpasu iwe.

3. Kpachara anya maka mkpakọrịta gị! Bible na-agwa anyị banyere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Daina bụ́ onye a wakporo n’ụzọ mmekọahụ. Ọ ghaghị ịbụworị na ọ dọọrọ mmasị onye wakporo ya n’ihi na ọ na-aga mgbe nile ileta ‘ụmụ ndị inyom nke ala’ Kenean—bụ́ ndị inyom a maara dị ka ndị na-enwe mmekọahụ aghara aghara! (Jenesis 34:1, 2) N’otu aka ahụ taa, ọ bụrụ na ị na-esoro ná mkparịta ụka—ma ọ bụ na-ege—ndị ọrụ ibe gị ntị mgbe nile, bụ́ ndị a maara maka ikwu okwu ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ụfọdụ pụrụ ikwubi na i nwere ike ịnabata aro mmekọahụ.

Nke a apụtaghị na ị ghaghị ịgbachi ndị ọrụ ibe gị nkịtị. Kama ọ bụrụ na mkparịta ụka ahụ aghọọ ihe na-adịghị ọcha, gịnị ma i si nnọọ n’ebe ahụ pụọ? N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova achọpụtawo na ịbụ ndị a maara maka ụkpụrụ omume ndị dị elu na-echebe ha pụọ n’iyi egwu.—1 Pita 2:12.

4. Zere ọnọdụ ndị ga-eme ka i mee ihe ọjọọ. Bible na-akọ otú nwa okoro aha ya bụ Amnọn ji kpaa nkata ka ya na nwa agbọghọ aha ya bụ Tema nọrọ nanị ha ka o wee meso ya otú o si masị ya n’ụzọ mmekọahụ. (2 Samuel 13:1-14) Ndị na-eyi egwu taa pụkwara ịkpa àgwà n’otu ụzọ ahụ, ikekwe na-akpọ onye nọ n’okpuru ha òkù isoro ha ṅụọ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ma ọ bụ ka ọ nọgide n’ebe ọrụ mgbe ọrụ mechisịrị n’enweghị ihe doro anya kpatara ya. Kpachara anya banyere òkù ndị dị otú ahụ! Bible na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya.”—Ilu 22:3.

Ọ Bụrụ na E Yie Gị Egwu

N’eziokwu, ndị ikom ụfọdụ ga na-akpụdebe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị ọbụna ma a sị na nwanyị na-akpa àgwà n’ụzọ dị mma. Olee otú i kwesịrị isi meghachi omume ná mkpụdebe ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na ị bụ onye e lekwasịrị anya? Ụfọdụ atụwo aro iji nnọọ nwayọọ soo ha nile! ‘Mmekọahụ ọfịs bụ ihe e ji eme ka ndụ dịkwuo ụtọ!’ ka otu nwanyị na-ekwu. Otú ọ dị, kama ile mmasị na-ekwesịghị ekwesị dị otú ahụ anya dị ka ihe ọchị ma ọ bụ otuto ọnụ efu, ọ na-asọ ezi ndị Kraịst oyi. Ha “na-akpọ ihe ọjọọ asị,” na-aghọtakwa na nzube nke mkpụdebe dị otú ahụ bụ iji raba mmadụ ná mmekọahụ rụrụ arụ. (Ndị Rom 12:9; tụlee 2 Timoti 3:6.) Ma ọ dịghị nnọọ ihe ọzọ, àgwà ọjọọ ahụ bụ mkparị nye ùgwù ndị Kraịst ha. (Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 4:7, 8.) Olee otú ị pụrụ isi chịkwaa ọnọdụ dị otú ahụ?

1. Were nguzo! Bible na-agwa anyị otú nwoke ahụ na-atụ egwu Chineke aha ya bụ́ Josef si meghachi omume n’arịrịọ omume rụrụ arụ: “O ruo, mgbe ihe ndị a gasịrị, na nwunye nke onyenwe ya weliri anya ya abụọ lekwasị Josef, sị, Ka mụ na gị dinaa.” Josef ọ̀ gbachiri nnọọ nkịtị n’ịtụ aro ahụ, na-enwe olileanya na nsogbu ahụ ga-akwụsị n’onwe ya? Ọ dịghị ma ọlị! Bible na-agwa anyị na o ji obi ike jụ mkpụdebe ya, na-asị: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?”—Jenesis 39:7-9.

Àgwà Josef setịpụụrụ ma ndị ikom ma ndị inyom ezi ihe nlereanya. Ịgbachi nkịtị—ma ọ bụ nke ka njọ, ịbụ onye e menyere egwu site—n’okwu ndị na-atụ aro mmekọahụ ma ọ bụ àgwà obi ọjọọ adịghị emekebe ka ọ pụọ; kama nke ahụ, egwu ma ọ bụ enweghị obi ike pụrụ ime ka ọ mụbaa! Onye ndụmọdụ mgbochi ndina n’ike bụ́ Martha Langelan na-adọ aka ná ntị na ndị na-edina mmadụ n’ike na-ejikarị iyi egwu mmekọahụ eme ihe dị ka “ụzọ iji tụọ ikwe omume na nwanyị ga-emeghachi omume n’ụzọ dị njọ ná mwakpo n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀; ọ bụrụ na ọ gbachi nkịtị ma tụọ ụjọ mgbe e yiri ya egwu, ha na-ewere ya na ọ ga-agbachi nkịtị ma tụọ ụjọ mgbe a wakwasịrị ya.” Ya mere ọ dị mkpa na i weere nguzo n’ihe àmà mbụ nke iyi egwu. Dị ka otu onye na-ede akwụkwọ si kwuo, “Ịsị ee e ozugbo na n’ụzọ doro anya na-ezukarị ime ka onye ahụ na-eyi mmadụ egwu kwụsị àgwà ahụ na-ewe iwe.”

2. Ka ee e gị bụrụ ee e! Jisọs kwuru nke ahụ n’Ozizi Elu Ugwu ya. (Matiu 5:37) Okwu ya kwesịrị ekwesị nye ọnọdụ ndị a, ebe ọ bụ na ndị na-eyi egwu na-agbakarị nnọọ isi akwara. Ruo nnọọ ókè hà aṅaa ka ọ dị gị mkpa iguzosi ike? Nke ahụ na-adabere n’ọnọdụ dịnụ na mmeghachi omume nke onye ahụ na-eyi egwu. Jiri ọ̀tụ̀tụ̀ nguzosi ike ọ bụla dị mkpa mee ka a ghọta ebe ị kwụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, okwu dị mfe, gara n’ihe a chọrọ, nke e kwuru n’ụda olu dị jụụ ga-ezu. Lee ya anya ná mkpụrụ anya. Ndị ọkachamara na-atụ aro ihe na-esonụ: (a) Kwuo ihe bụ mmetụta gị. (“Adịghị m enwe mmasị na ya ma ọlị mgbe ị . . .”) (b) Kpọọ omume ahụ na-ewe iwe aha kpọmkwem. (“. . . mgbe ị na-ekwu okwu rụrụ arụ, nke na-adịghị ọcha . . .”) (ch) Mee ka ihe ị chọrọ ka onye ahụ mee doo anya. (“Achọrọ m ka ị kwụsị ịgwa m okwu otú ahụ!”)

“Otú ọ dị, ya adịla ọnọdụ ọ bụla,” ka Langelan na-adọ aka ná ntị, “ị ga-ekwe ka mmegiderịta ahụ ghọọ ịlụ ọgụ. Ịlụso ya ọgụ (na-eji mkparị, iyi egwu, na ịkpọ iyi, ịkụ aka, ịbụsa onye ahụ na-eyi egwu ọnụ mmiri) adịghị arụpụta ihe dị mma. Iji ọnụ asa mmadụ ahụ dị ize ndụ, ọ dịghịkwa mkpa iji ime ihe ike efu mee ihe, ọ gwụla ma e nwere mwakwasị nkịtị nke na-achọ ime ihe iji chebe onwe onye.” Ndụmọdụ dị otú ahụ dị irè na-ekwekọ n’okwu Bible dị ná Ndị Rom 12:17: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ.”

Gịnị ma ọ bụrụ na iyi egwu ahụ agaa n’ihu n’agbanyeghị mgbalị gị ndị kasị mma ịkwụsị ya? Ụlọ ọrụ ụfọdụ eguzobewo ụkpụrụ dị iche iche iji mee ihe banyere iyi egwu mmekọahụ. Ọtụtụ mgbe nanị iyi egwu nke ịmalite usoro ime mkpesa nke ụlọ ọrụ ga-eme ka onye na-eyi gị egwu hapụ gị. Otú ọ dị, o nwere ike ọ gaghị eme. N’ụzọ dị mwute, ịchọta onye nlekọta ọrụ nwere ọmịiko adịghị abụ ihe dị mfe mgbe nile nye ma ndị ikom ma ọ bụ ndị inyom. Glen, bụ́ onye kwuru na nwanyị e were n’ọrụ yiri ya egwu mmekọahụ, nwara ime mkpesa. Ọ na-echeta, sị: “Mgbe m gwara onye isi ọrụ anyị banyere ya, enwetaghị m enyemaka ma ọlị. N’eziokwu, o chere na ọ bụ ihe obi ụtọ. Aghaghị m nnọọ ilezianya banyere nwanyị ahụ, wee na-eme mgbalị iji zere ya.”

Ụfọdụ anwawo ịgba akwụkwọ. Ma ọtụtụ ikpe e kpebiri n’akwụkwọ ndị a gbara, bụ́ ndị ị na-agụ banyere ha n’usoro mgbasa ozi, abụghị ụdị nke a. E wezụga nke ahụ, akwụkwọ bụ́ Talking Back to Sexual Pressure na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe ngwọta megide iyi egwu mmekọahụ n’ụzọ iwu chọrọ ikike mmetụta uche dị ukwuu na oge; ha na-arụpụta nrụgide nke ahụ tinyekwara nke uche.” E nwere ezi ihe mere Bible ji na-adụ ọdụ, sị: “Apụla ngwa ngwa ise okwu.” (Ilu 25:8) Mgbe a tụlesịrị ihe ịgba akwụkwọ ga-efu n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ ime mmụọ, ụfọdụ ahọrọwo ịchọ ọrụ n’ebe ọzọ.

Ngwụsị nke Iyi Egwu Mmekọahụ

Iyi egwu mmekọahụ abụghị ihe ọhụrụ. O zuru ụwa ọnụ dị ka obi mmadụ na-ezughị okè nke dị anyaukwu, na-ezube ihe ọjọọ. Inye ikike na okwu ikpe dị iche iche adịghị mgbe ọ ga-ekpochapụ iyi egwu mmekọahụ n’ọha mmadụ. Ikpochapụ iyi egwu mmekọahụ na-achọ mgbanwe gbara ọkpụrụkpụ nke obi n’ime ndị mmadụ.

Taa, Okwu Chineke na mmụọ ya na-eme ka e nwee mgbanwe dị otú ahụ ná ndị mmadụ n’ụwa nile. Ọ bụ dị ka à ga-asị na anụ ọhịa wolf na ọdụm na-amụta ịkpa àgwà dị ka ụmụ atụrụ na ụmụ ehi, dị nnọọ ka Aịsaịa onye amụma buru ya n’amụma. (Aịsaịa 11:6-9) Site n’isoro ndị mmadụ na-amụ Bible, Ndịàmà Jehova na-enyere ọtụtụ puku ndị bụbu “anụ ọhịa wolf” aka kwa afọ, ime mgbanwe ndị siri ike, na-adịgide adịgide n’ọdịdị onwe onye ha. Ndị a na-aṅa ntị n’iwu Akwụkwọ Nsọ ‘ịtụpụ mmadụ ochie ha, nke dị ka ibi obi ha na mbụ si dị’ na iji ‘mmadụ ọhụrụ, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ’ dochie ya.—Ndị Efesọs 4:22-24.

Otu ụbọchị, ụwa ga-ejupụta ná ndị ikom na ndị inyom na-agbaso ụkpụrụ Bible. Ndị na-atụ egwu Chineke na-atụsi anya ụbọchị ahụ ike, mgbe a ga-enwe ngwụsị nke ụdị nile nke mmeso ọjọọ. Tupu oge ahụ eruo, ha na-anagide ihe ọjọọ ndị dị adị n’ezie nke taa ruo n’ókè kasị mma ha nwere ike.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ụzọ ihe àmà na-egosi, ịdọ aka ná ntị Pọl ná 1 Ndị Kọrint 7:1 ‘ịghara imetụ nwanyị aka’ na-ezo aka n’inwe mmekọahụ, ọ bụghị mmetụ aka nkịtị. (Tụlee Ilu 6:29.) N’okwu ndị gbara ya gburugburu, Pọl na-agba ume ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ma na-adọ aka ná ntị megide itinye aka ná mmekọahụ rụrụ arụ.—Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche nke August 15, 1974.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]

“Ị̀ ga-achọ ka nne gị, nwanne gị nwanyị, ma ọ bụ ada gị bụrụ onye e kpughere nye nke ahụ?”

[Foto dị na peeji nke 26]

Àgwà a na-adịghị enyo enyo na ejiji kwesịrị ekwesị pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ichebe mmadụ pụọ n’iyi egwu

[Foto dị na peeji nke 28]

Ezi ndị Kraịst taa na-amụta imeso otu onye na ibe ya n’ụzọ nsọpụrụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya