Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 7/8 p. 10-15
  • Abụbu M Onye Na-emebi Iwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Abụbu M Onye Na-emebi Iwu
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere M Ji Ghọọ Onye Na-emebi Iwu
  • Ihe Omume Onye Na-emebi Iwu
  • Ịtụ Mkpọrọ na Ịma Ikpe
  • Ịmụta Eziokwu Bible
  • Mmegide Site n’Aka Ụkọchukwu
  • Otu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụlọ Mkpọrọ
  • E Mere M Baptism n’Ụlọ Mkpọrọ
  • Ime Ndị Na-eso Ụzọ n’Ụlọ Mkpọrọ
  • Oge Oké Ọṅụ
  • Nanị Olileanya E Nwere Maka Ikpe Ziri Ezi
  • Ndụ nke Na-akwụghachi Ụgwọ
  • “Unu Agbanweela Echiche M Banyere Ndịàmà Jehova”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Site n’Ịbụ Ọdụm Na-agbọ Ụja Gaa n’Ịbụ Nwa Atụrụ Dị Nwayọọ
    Teta!—1999
  • Site n’Ịbụ Onye Na-eme Mkpọsa Maka Mgbanwe Ọchịchị gaa n’Ịbụ Onye Kraịst Nọpụrụ Iche
    Teta!—2002
  • Akụkọ Okwukwe Sitere n’Ụlọ Mkpọrọ Mere Ihe Akụkọ
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 7/8 p. 10-15

Abụbu M Onye Na-emebi Iwu

Ọ BỤ May 1, 1947, na Sicily. Ihe dị ka 3,000 mmadụ, tinyere ndị inyom ku ụmụ ọhụrụ, ezukọwo na ndịda ugwu maka ememe mgbaafọ nke Ụbọchị Ndị Ọrụ. Ha amaghị banyere ihe ize ndụ zoro ezo n’ugwu ndị dị nso. Ikekwe ị gụwo banyere ma ọ bụ ọbụna hụ ihe nkiri nke ọdachi sochirinụ. A kpọwo mgbukpọ ahụ Ogbugbu nke Portella della Ginestra, nke gburu mmadụ 11, merụọkwa 56 ahụ.

Ọ bụ ezie na ekereghị m òkè n’ọdachi ahụ, eso m n’òtù nkwado nnwere onwe bụ́ ndị kpatara ya. Onye ndú ha bụ Salvatore Giuliano, onye mụ na ya tokọrọ n’obodo nta bụ́ Montelepre. O ji nanị otu afọ tọọ m. Na 1942, mgbe m dị afọ 19, a kpọrọ m òkù ije agha n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ná mmalite afọ ahụ, enwewo m ịhụnanya n’ebe Vita Motisi nọ, lụọkwa ya. E mesịa, anyị mụrụ ụmụ ndị ikom atọ; a mụrụ nke mbụ na 1943.

Ihe Mere M Ji Ghọọ Onye Na-emebi Iwu

Na 1945, afọ Agha Ụwa nke Abụọ kwụsịrị, esonyeere m usuu ndị agha nke ebe ọdịda anyanwụ nke Ndị Agha Afọ Ofufo Maka Nnwere Onwe nke Sicily (EVIS). Nke a bụ ìgwè e guzobere n’ụkpụrụ ndị agha nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nnwere onwe a maara dị ka Òtù Nnwere Onwe nke Sicily (MIS). Ndị nọ n’ọkwá dị elu nke EVIS na MIS ahọpụtawo Salvatore Giuliano, nke bụrịị onye na-agba ọsọ ndụ, ka ọ bụrụ onye isi nke ìgwè anyị.

Ịhụnanya anyị nwere maka àgwàetiti anyị bụ́ Sicily na maka ndị ala anyị jikọtara anyị n’otu. Iwe wekwara anyị n’ihi ikpe na-ezighị ezi e nwere megide anyị. Ya mere anakweere m ụzọ nke òtù Giuliano, bụ́ nke chọrọ ka e jikọta Sicily na United States of America dị ka mba ya nke 49. È nwere ihe mere a ga-eji kwere na nke a ga-ekwe omume? N’ezie e nwere, n’ihi na ndị isi nke òtù MIS mesiri anyị obi ike na ha na Washington, D.C. nwere mmekọrịta chiri anya, nakwa na president United States bụ́ Harry S. Truman kwadoro njikọta dị otú ahụ.

Ihe Omume Onye Na-emebi Iwu

Ihe mejupụtara ọrụ ìgwè m n’ụzọ bụ isi bụ ịtọrọ na ijigide ndị a maara aha ha ruo mgbe a kwụrụ ihe mgbapụta. Site n’ụzọ dị otú a anyị na-enweta ego iji zụọ ihe ndị dị anyị mkpa. Ọ dịghị mgbe e merụrụ nke ọ bụla n’ime ndị ahụ a tọọrọ atọrọ ahụ, bụ́ ndị anyị na-akpọ “ndị ọbịa anyị.” Mgbe a tọhapụrụ ha, anyị na-enye ha risit nke a ga-eji nwetaghachi ego mgbapụta ahụ anyị nataworo. A na-agwa ha na a pụrụ iji risit ahụ nwetaghachi ego ha mgbe anyị nwesịrị mmeri.

Ekeere m òkè n’ihe dị ka 20 ntọrọ, tinyekwara ná mwakwasị e ji ngwá agha mee n’ebe obibi ndị agha Carabinieri, bụ́ ìgwè ndị uwe ojii bụ ndị agha nke mba ahụ. Otú ọ dị, enwere m obi ụtọ ikwu na ọ dịghị mgbe ọ bụla m gburu mmadụ. Mwakpo nke ndị òtù nnwere onwe anyị ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’ihe omume amamihe na-adịghị ya nke weere ọnọdụ n’obodo nta bụ́ Portella della Ginestra. Ihe dị ka ndị ikom 12 nke òtù Giuliano haziri ya, e chekwara ya ihu megide Òtù Ọchịchị Kọmunist.

Ọ bụ ezie na ogbugbu nke ndị nkịtị—tinyere ndị agbata obi na ndị nkwado—abụghị ihe a kpachaara anya mee, ndị kwadoworo anyị ma chee na ha nwere nchebe n’ebe anyị nọ chere na anyị edufuwo ha. Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, a kwụsịghị akwụsị n’ọchịchọ a na-achọ ndị òtù Giuliano bụ́ ndị mmebi iwu. Mgbe a takwunyesịịrị ndị uwe ojii okwu ahụ, e jidere ọtụtụ n’ime ndị enyi m. Na March 19, 1950, adabara m n’ọnyà, e jidekwara m. N’oge okpomọkụ ahụkwa, e gburu Giuliano n’onwe ya.

Ịtụ Mkpọrọ na Ịma Ikpe

N’ụlọ mkpọrọ Palermo, bụ́ ebe e jidere m na-echere ikpe, eruru m újú n’ihi ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe nwunye m na-akatabeghị ahụ na ụmụ m ndị nwoke atọ nọ. Otú ọ dị, ọchịchọ nke ịlụ ọgụ maka ihe m chere na o ziri ezi chebere m pụọ n’inwe ajọ obi nkoropụ. Amalitere m ịgụ ihe iji mejupụta oge m. Otu akwụkwọ kpaliri ọchịchọ m ịgụ Bible. Ọ bụ akụkọ ndụ Silvio Pellico, bụ́ onye Itali a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ime narị afọ nke 19.

Pellico dere na ya na-eji Bible na akwụkwọ ọkọwa okwu mgbe nile n’ụlọ mkpọrọ. Ọ bụ ezie na mụ na ezinụlọ m bụ ndị Roman Katọlik, o nwebeghị ihe m nụrụ n’ezie banyere Bible. Ya mere etinyere m akwụkwọ n’aka ndị isi iji nweta otu. A gwara m na a machibidoro ya iwu, ma e nyere m otu nke nwere Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Mgbe e mesịrị, enwere m ike inweta otu Bible zuru ezu, bụ́ nke m ka na-ewere dị ka ihe ncheta dị oké ọnụ ahịa.

N’ikpeazụ, na 1951 ikpe m malitere na Viterbo, dị nso na Rom. O were ọnwa 13. A tụrụ m mkpọrọ mkpụrụ ọka ụzọ abụọ tinyere 302 afọ! Nke ahụ pụtara na mụ agaghị esi n’ụlọ mkpọrọ pụta ná ndụ ma ọlị.

Ịmụta Eziokwu Bible

Ngwa ngwa a kpọghachiri m n’ụlọ mkpọrọ dị na Palermo, e tinyere m n’akụkụ ebe a tụkwara onye òtù nke ìgwè anyị, bụ́ nwa nwanne Giuliano mkpọrọ. E jidewo ya afọ atọ tupu e jide m. Tupu mgbe ahụ, o zutewo otu n’ime Ndịàmà Jehova nke sitere Switzerland n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ onye gwaworo ya okwu banyere nkwa ndị dị ịtụnanya nke Bible. E jidewo nwoke ahụ na otu Onyeàmà ibe ya sitere Palermo ka ha na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) E mesịrị gwa m na ọ bụ ndị ụkọchukwu kpatara njide ya.

N’agbanyeghị ihe omume mmebi iwu m, ekwere m na Chineke na ná nkụzi chọọchị. Ya mere ọ wụrụ m akpata oyi ịmata na ife ndị ahụ a na-akpọ ndị senti bụ ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nakwa n’otu n’ime Iwu Iri ahụ machibidoro iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe iwu. (Ọpụpụ 20:3, 4) Atụrụ m ụtụ magazin Ụlọ Nche na Teta!, bụ́ ndị ghọrọ ihe dị oké ọnụ ahịa nye m. Aghọtaghị m ihe nile m gụrụ, ma ka m na-agụkwu, otú ahụ ka m na-enwekwu mkpa nke ịgbapụ, ọ bụghị site n’ụlọ mkpọrọ, kama site na mkpọrọ nke ụgha okpukpe na ìsì ime mmụọ.

Ka oge na-aga, achọpụtara m na iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ ọ dị m mkpa iyipụ ọdịdị mmadụ ochie m ma yikwasị nke ọhụrụ—nke dị umeala, dịkwa ka nke Kraịst Jisọs. (Ndị Efesọs 4:20-24) Mgbanwe m bịara nke nta nke nta. Ma ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ, amalitere m imere ndị mkpọrọ ibe m ihe, anwakwara m ịgwa ha okwu banyere ihe ndị dị ebube m na-amụta. N’ihi ya, na 1953 oge ọṅụ maliteere m. Ma e nwere ihe mgbochi.

Mmegide Site n’Aka Ụkọchukwu

Ọnwa isii mgbe m tụsịrị ụtụ Ụlọ Nche na Teta!, e gbochiri mweta ha. Agara m na nke onye na-ahụ maka nderịta akwụkwọ ndị mkpọrọ ma kọọrọ ya ihe banyere okwu ahụ. Ọ gwara m na ọ bụ ụkọchukwu na-ahụ maka ndị mkpọrọ bụ onye kwụsịrị mweta ha.

Arịọrọ m ka m hụ ụkọchukwu ahụ. N’oge nkwurịta okwu anyị egosiri m ya obere ihe m maara site na Bible, tinyere akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Ọpụpụ 20:3, 4 na Aịsaịa 44:14-17 banyere iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe. Agụkwaara m ya okwu Jisọs e dekọrọ na Matiu 23:8, 9, ịghara ‘ịkpọ onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa.’ N’iwe, ọ zaghachiri na mụ apụghị ịghọta Bible n’ihi na m bụ nwoke na-amaghị nke a na-akọ.

Ọ dị mma na mụ amaliteworị ịgbanwe ọdịdị mmadụ m—e wezụga ya, amaghị ihe m gaara emewo. N’ịnọrọ duu, azaghachiri m, sị: “Ee, ọ bụ eziokwu; amaghị m nke a na-akọ. Ma ị mụwo ihe, ọ dịbeghịkwa ihe i mere iji kụziere m eziokwu Bible.” Ụkọchukwu ahụ zaghachiri na iji nweta akwụkwọ Ndịàmà Jehova, na mụ aghaghị ịrịọ Ministri Ikpe Ziri Ezi iji jụ okpukpe Katọlik. Emere m otú ahụ ozugbo, ma a nabataghị arịrịọ ahụ. Otú ọ dị, mgbe oge na-aga, enwere m ike ideba aha m n’akwụkwọ dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, nweekwa ike inweta magazin ndị ahụ ọzọ. Ma esiri m nnọọ ọnwụ.

Otu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụlọ Mkpọrọ

Ruo oge ụfọdụ arịọwo m onye ntụzi ụlọ mkpọrọ maka ọrụ ka m wee nwee ike inweta ego m ga-ezigara ezinụlọ m. Ọ nọgidere na-ekwu na ọ bụrụ na ya enye m ọrụ, na ya ga-enyekwa ndị ọzọ, nke ahụ ekweghịkwa omume. Ma n’ụtụtụ August 5, 1955, onye ntụzi ahụ nyere m ozi obi ụtọ—m ga na-arụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ.

Ọrụ m nyeere m aka inweta nkwanye ùgwù nke onye ntụzi ụlọ mkpọrọ ahụ, o jikwa obi ọma nye m ikike iji otu ọnụ ụlọ a na-edebe ihe na ya na-enwe nzukọ maka ọmụmụ Bible. Ya mere na 1956, n’iji osisi ndị sitere n’igbe ndị a tụfuru atụfu mee ihe, arụrụ m bench maka ihe a pụrụ iwere dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze, dị ka a na-akpọ ebe Ndịàmà Jehova na-ezukọ. Mụ na ndị mkpọrọ ndị ọzọ na-ezute ebe ahụ na Sunday ọ bụla, anyị rukwara ọnụ ọgụgụ kasị elu bụ́ 25 maka ọmụmụ Bible anyị.

Mgbe oge na-aga, ụkọchukwu ahụ matara banyere nzukọ m na-enwe, oké iwe wekwara ya. Dị ka ihe si n’ime ya pụta, n’oge okpomọkụ nke 1957, e zigara m site na Palermo gaa n’ụlọ mkpọrọ dị na Porto Azzurro nke dị n’àgwàetiti Elba. Ebe a nwere aha ọjọọ.

E Mere M Baptism n’Ụlọ Mkpọrọ

Mgbe m bịarutere, e tinyere m na mkpọrọ ịnọ nanị onwe onye ruo ụbọchị 18. N’ebe ahụ, e nyeghị m ọbụna ohere ijiri Bible m. Mgbe e mesịrị, edegaara m Ministri Ikpe Ziri Ezi akwụkwọ ọzọ na-arịọ ka e nye m ohere ịjụ okpukpe Katọlik. Otú ọ dị, n’oge a, arịọrọ m maka enyemaka nke alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Rom. Mgbe ọnwa iri gasịrị, azịza ahụ e cheworo ogologo oge bịara. Ministri ahụ nabatara mgbanwe okpukpe m! Nke a apụtaghị nanị na m pụrụ inwe Bible, magazin, na akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Bible, kama ọ pụtakwara na m pụrụ inwe nleta chiri anya site n’aka onye ozi nke Ndịàmà Jehova.

Ọṅụ m enweghị atụ mgbe Giuseppe Romano, bụ́ onye sitere n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Itali mgbe ahụ letara m na nke mbụ ya. Site n’ikike nke ndị isi ụlọ mkpọrọ, e mere ndokwa ka m wee nwee ike igosipụta nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri. N’October 4, 1958, n’ihu onye ntụzi ụlọ mkpọrọ, ọchịagha na-ahụ maka inye ahụhụ, na ndị isi ndị ọzọ, Nwanna Romano mere m, tinyere onye mkpọrọ ọzọ, baptism n’otu nnukwu ọkwá e ji agba ubi ndị mkpọrọ mmiri.

Ọ bụ ezie na m na-enwe ike isoro ndị mkpọrọ ndị ọzọ amụ Ụlọ Nche n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile, aghaghị m ime Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst a na-eme kwa afọ n’ime ụlọ mkpọrọ nanị m n’ihi na ihe omume a na-ewere ọnọdụ mgbe anyanwụ dasịrị. M na-emechi anya m wee na-ekpe ekpere, na-ewere ya na mụ na Ndịàmà ibe m zukọrọ.

Ime Ndị Na-eso Ụzọ n’Ụlọ Mkpọrọ

Na 1968, e zigara m n’ụlọ mkpọrọ dị na Fossombrone, nke dị n’ógbè Pesaro. N’ebe ahụ enwetara m ihe ndị dị mma site n’ịgwa ndị ọzọ okwu banyere eziokwu Bible. Arụrụ m ọrụ n’ebe a na-elekọta ndị ahụ na-esighị ike, bụ́ ebe ọ dị mfe inweta ohere ịgba àmà. Ọ bụ ihe ọṅụ karịsịa ịhụ ọganihu nke otu onye mkpọrọ, bụ́ Emanuele Altavilla. Mgbe ọ mụsịrị ihe ruo ọnwa abụọ, ọ ghọtara na ya aghaghị itinye ndụmọdụ dị n’Ọrụ 19:19 n’ọrụ ma bibie akwụkwọ ya ndị metụtara ime mgbaasị. Mgbe oge na-aga, Emanuele ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova.

N’afọ nke sochirinụ e zigara m n’ụlọ mkpọrọ dị n’àgwàetiti Procida, kpọmkwem n’ofe ọzọ nke ọnụ mmiri Naples. N’ihi omume ọma, e kenyere m ọrụ ọzọ n’ebe a na-elekọta ndị ahụ na-esighị ike. N’ebe ahụ, ezutere m Mario Moreno, onye mkpọrọ bụ́ onye Katọlik a kwọworo aka n’isi. O nwekwara ibu ọrụ, ịrụ ọrụ ná ngalaba ndekọ ego.

N’otu uhuruchi Mario rịọrọ m ihe ọ ga-agụ, enyekwara m ya akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi.a Ọ ghọtara ozugbo ahụ ịdị mkpa nke ihe ọ na-agụ, anyị malitekwara ọmụmụ Bible. Mario kwụsịrị ise mkpọ siga atọ ọ na-ese kwa ụbọchi. Ọzọkwa, ọ ghọtara na ya aghaghị iji eziokwu na-eme ihe ọbụna n’ọrụ ndekọ ego a na-eme n’ụlọ mkpọrọ. Ọ malitere ịgbara nwaada ọ chọrọ ịlụ àmà, ya onwe ya kwa nakweere nkụzi Bible. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ha lụrụ n’ebe ahụ n’ụlọ mkpọrọ. N’otu mgbakọ na Naples na 1975, e mere nwunye Mario baptism. Ọṅụ ya dị ukwuu mgbe ọ nụrụ na e mewo di ya baptism n’otu ụbọchị ahụ n’ụlọ mkpọrọ!

E nyere m ohere isoro Ndịàmà na-eleta m na Procida nwee mkparịta ụka kwa izu. E nyekwara m ikike ịkwadebe nri mụ na ha ga-eri n’ụlọ nzukọ ndị nleta. Ihe ruru mmadụ iri pụrụ ịnọ ya n’otu oge. Mgbe onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova bịara, anatara m ikike igosi ihe nkiri slide ha. N’otu oge enwere m obi ụtọ iduzi ọmụmụ ihe Ụlọ Nche n’oge nleta nke Ndịàmà 14. O yiri ka ndị isi tụkwasịrị m obi n’ụzọ zuru ezu. N’ụbọchị ndị e kenyere m, n’oge uhuruchi, m ga-aga na-eme nkwusa site n’ụlọ nga ruo n’ụlọ nga.

Na 1974, mgbe m nọsịworo 24 afọ n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche, otu ọkàikpe letara m, bụ́ onye gbara m ume itinye akwụkwọ arịrịọ maka mgbaghara. Eleghị m ime otú ahụ anya dị ka ihe kwesịrị ekwesị n’ihi na ọ ga-apụta ikwenye na m tinyere aka n’ogbugbu ahụ weere ọnọdụ na Portella della Ginestra, ma ekereghị m òkè na ya.

Oge Oké Ọṅụ

Na 1975 iwu ọhụrụ nyere ohere maka inye ikike ịpụ apụ site n’ụlọ mkpọrọ. N’ihi ya, enwere m ohere ịga mgbakọ mbụ m nke Ndịàmà Jehova n’obodo ukwu bụ́ Naples. Anụrụ m ụtọ ụbọchị ise a na-apụghị ichefu echefu, nke m nọ n’ime ya zute ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị Kraịst ndị ọzọ karịa otú m hụtụworo.

Ihe wetaara m ọṅụ pụrụ iche bụ ịbụ onye e jikọghachiri mụ na ezinụlọ m n’ikpeazụ mgbe ọtụtụ afọ gafeworo. Nwunye m, bụ́ Vita, anọgidewo na-ekwesị ntụkwasị obi nye m, ụmụ atọ m bụzi ụmụ okorobịa nọ n’afọ ndụ ha ndị nke 20 na 30.

N’afọ sochirinụ—bụ́ mgbe m nụrụ ụtọ ịnọ n’oge ezumike site n’ụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe—a tụrụ aro ka m tinye akwụkwọ maka ntọhapụ site n’ụlọ mkpọrọ. N’akụkọ onye majistreti mgbazi olu dere banyere m, ọ tụrụ aro ka a nabata akwụkwọ m. O dere, sị: “A pụrụ ikwu n’enweghị ụjọ ọ bụla—taa na Mannino, n’iji ya tụnyere onye ntorobịa akpịrị ọbara na-akpọ nkụ nke mere ihe Giuliano kwuru, bụ́ nwoke dị iche; ọ gbanweela kpam kpam.”

Mgbe oge na-aga, ndị isi ụlọ mkpọrọ nke Procida rịọrọ ka a gbaghara m. N’ikpeazụ, a nabatara mgbaghara ahụ, na December 28, 1978 kwa, a tọghapụrụ m site n’ụlọ mkpọrọ. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịbụ onye nweere onwe ya mgbe ihe karịrị 28 afọ nke mkpọchi gasịrị!

Nanị Olileanya E Nwere Maka Ikpe Ziri Ezi

Dị ka onye na-atọrọ mmadụ n’inye iwu nke Salvatore Giuliano, alụrụ m ọgụ n’ihi ihe m chere na ọ ga-ewetara ezinụlọ m na ndị ala m ezi nnwere onwe. Otú ọ dị, abịara m mụta site na Bible na n’agbanyeghị otú ụmụ mmadụ si nwee ezi nzube obi, ha apụghị iweta mgbe ọ bụla ikpe ziri ezi ahụ m chọsiri ike. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ihe ọmụma Bible nyeere m aka ịhụ na nanị Alaeze Chineke nke dị n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, pụrụ inye ahụ efe pụọ n’ikpe na-ezighị ezi nke a na-achọsi ike.—Aịsaịa 9:6, 7; Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10; Mkpughe 21:3, 4.

Ọtụtụ akwụkwọ akụkọ dekọrọ mgbanwe m nwere n’ọdịdị mmadụ m, nke ọ bụ ihe ọmụma Bible dị otú ahụ kpatara. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ Paese Sera hotara onye na-eche ndị mkpọrọ nke Procida dị ka onye kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ndị mkpọrọ nile dị ka Franck, ụlọ mkpọrọ agaghị adị; àgwà ya abụwo nke a na-apụghị ịta ụta, o setụbeghị okwu, a babekwaraghị ya ọbụna mba kasị dị nta.” Akwụkwọ akụkọ ọzọ, bụ́ Avvenire, kwuru, sị: “Ọ bụ onye mkpọrọ e ji ama atụ, nke pụrụ nnọọ iche. Mgbanwe ya karịrị atụmanya nile. O nwere nkwanye ùgwù n’ebe ụlọ mkpọrọ dị na n’ebe ndị isi ụlọ mkpọrọ nọ, nweekwa ọnọdụ ime mmụọ pụrụ iche.”

Ndụ nke Na-akwụghachi Ụgwọ

Kemgbe 1984, ejewo m ozi n’otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị ka okenye na onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile. Na 1990 otu onye nche ụlọ mkpọrọ nke m soworo kerịta ihe ọmụma Bible afọ 15 gara aga kpọrọ na fon ịgwa m na ya na ezinụlọ ya nile aghọwo Ndịàmà Jehova.

Ma ahụmahụ m kasị enye obi ụtọ bịara na July 1995. N’afọ ahụ enwere m oké ọṅụ nke ịnọ ya n’oge baptism ezi nwunye m, bụ́ Vita. Mgbe ọtụtụ afọ gasịworo, o mewo ka nkụzi Bible bụrụ nke ya. Ikekwe ụmụ atọ m, bụ́ ndị mụ ha na-anọghị n’otu okwukwe ka ọ dị ugbu a, n’otu ụbọchị ga-anabata ihe m mụtaworo n’Okwu Chineke.

Ahụmahụ inyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu Bible enyewo m obi ụtọ na-enweghị atụ. Lee ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ ọ bụ inweta ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi na inwe ike isoro ndị nwere obi eziokwu kerịta ya!—Jọn 17:3.—Dị ka Franck Mannino si kọọ ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndịda ugwu ahụ na Sicily ebe mgbukpọ ahụ weere ọnọdụ

[Foto dị na peeji nke 11]

Mgbe anyị lụrụ, na 1942

[Foto dị na peeji nke 13]

Esooro m ndị nche ụlọ mkpọrọ kerịta eziokwu Bible mgbe mgbe

[Foto dị na peeji nke 15]

Mụ na nwunye m

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya