Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 9/15 p. 27-28
  • “Unu Agbanweela Echiche M Banyere Ndịàmà Jehova”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Unu Agbanweela Echiche M Banyere Ndịàmà Jehova”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akụkọ Okwukwe Sitere n’Ụlọ Mkpọrọ Mere Ihe Akụkọ
    Teta!—2001
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Abụbu M Onye Na-emebi Iwu
    Teta!—1996
  • Ime Ka Ha Gbanwee n’Ezie—Ọ̀ Ga-ekwe Omume?
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 9/15 p. 27-28

“Unu Agbanweela Echiche M Banyere Ndịàmà Jehova”

OTÚ ahụ ka otu onye ọrụ ụlọ mkpọrọ bụ́ onye Poland kwuru banyere otu isiokwu kwuru banyere ọrụ Ndịàmà Jehova, dị ka e si kọọ ya ná mbipụta anyị nke October 15, 1998. Isiokwu ahụ, bụ́ “Mgbe Obi Ndị Dị Ka Nkume Ṅawara Ntị,” dekọrọ ihe ịga nke ọma Ndịàmà Jehova nweworo n’iso ndị mkpọrọ nọ na Wołów, Poland, na-arụkọ ọrụ.

Tupu e wepụtara ọha na eze Ụlọ Nche ahụ a kpọtụrụ aha n’elu, e mere ndokwa inwe nzukọ pụrụ iche na September 13, 1998, n’ụlọ mkpọrọ nke Wołów, iji wetara ya ndị mkpọrọ ahụ. Ndịàmà bi n’ógbè ahụ, ndị mkpọrọ e mere baptism na ndị nke nwere mmasị, nakwa ọtụtụ ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ, so ná ndị a kpọrọ òkù ịbịa. Ihe na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bịaranụ kwuru.

Jerzy, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nke e mere baptism ihe karịrị afọ ise gara aga n’ụlọ mkpọrọ, kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ nke ukwuu, n’ihi na taa apụrụ m ịgụ banyere ókè ụmụnna si n’ọgbakọ ndị dị nso tinyeruru mgbalị iji nyere anyị aka.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ana m anọgide na-agbalị imeziwanye ndụ m, apụkwara m ịhụ otú Jehova siworo na-akpụzi m.”

Onye mkpọrọ ọzọ aha ya bụ́ Zdzisław, kwuru banyere ọrụ ịgba àmà n’ụlọ mkpọrọ, sị: “Ka ọ dị ugbu a, ndị mkpọrọ anọ na-ejikere maka baptism, ndị ọhụrụ nwere mmasị na-anọgidekwa na-abịa nzukọ n’ụlọ nzukọ anyị. Isiokwu a bụụrụ anyị ihe mkpali siri ike maka ịgakwu n’ihu n’ubi a.” Lee àgwà ziri ezi nke ahụ bụ, n’iburu n’uche na Zdzisław ka ga-anọ afọ 19 n’ụlọ mkpọrọ!

Mgbe otu onye ọrụ ụlọ mkpọrọ gụsịrị isiokwu ahụ kwuru banyere ụlọ mkpọrọ Wołów, o kwuru, sị: “A kwanyeworo anyị ùgwù n’ụzọ pụrụ iche. Echetụbeghị m n’echiche ma ọlị na ụlọ mkpọrọ a ga-enweta mkpọsa ọma dị otú ahụ n’asụsụ 130 n’ụwa. Enwere m mmasị n’ebe unu nọ, enwekwara m ekele maka mgbalị ndị unu na-eme n’ihi ndị mkpọrọ.” Onye ọrụ ọzọ gbakwụnyere, sị: “Unu agbanweela echiche m banyere Ndịàmà Jehova. N’oge mbụ, eweere m unu dị ka ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè. Ugbu a ana m ahụ na unu bụ ndị ụkpụrụ na-eduzi.”

Onyeisi ụlọ mkpọrọ Wołów, bụ́ Marek Gajos, mụmụrụ ọnụ ọchị ma kwuo, sị: “Anyị chere na mbụ na unu ga-arụzu ihe dị nnọọ nta. Anyị chere na unu bụ nnọọ okpukpe ọzọ nke nwere oké ọchịchọ nke iji Bible akpụzigharị uche ndị mkpọrọ. Otú ọ dị, mgbe anyị hụrụ ihe si n’ọrụ mbụ unu pụta, anyị kpebiri inye unu nkwado. Unu anọgidewo na-abịa ebe a n’enweghị ike ọgwụgwụ ruo afọ itoolu ugbu a, enwekwara m ekele dị nnọọ ukwuu maka ihe unu meworo ruo ugbu a.”

Otú ọ dị, olee otú ndị mkpọrọ nọ na Wołów n’ozuzu ha si nabata isiokwu ahụ? Mmasị ndị mkpọrọ gosipụtara dị nnọọ ukwuu nke na magazin ahụ gwụnahụrụ Ndịàmà nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ. Ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ gosikwara mmasị site n’ịrịọ ka e wetakwuoro ha magazin 40 ọzọ maka onwe ha. Iji mee ka o ruo ndị na-achọ ya aka, ọgbakọ ndị dị n’ógbè ahụ nyere aka ma wetakwuoro ụmụnna nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ 100 magazin. N’otu mgbe ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ n’ụlọ mkpọrọ mụbara.

Piotr Choduń, bụ́ onye ọrụ ụlọ mkpọrọ nke nyeworo nnọọ Ndịàmà Jehova nkwado, kwuru, sị: “Anyị kpebiri idebe isiokwu a n’ebe ndebe akwụkwọ nile dị n’ụlọ mkpọrọ anyị. Anyị nwere olileanya na ndị mkpọrọ nile na-amalitebeghị iso unu na-amụ Bible ga-agụ magazin ahụ.”

Ezi ihe nlereanya nke Ndịàmà ahụ na mgbalị ime nkwusa ha ji mkpebisi ike na-eme nọgidere na-arụpụta ezi ihe. Tinyere ndị mkpọrọ 15 bụ́ ndị nweworo ihe ịga nke ọma ruo n’ime baptism, ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ 2 ararawo ndụ ha nye Jehova, onye ọrụ ụlọ mkpọrọ ọzọ arịọwokwa maka ọmụmụ Bible. N’ezie, ụmụnna ahụ na-eme nkwusa n’ụlọ mkpọrọ Wołów na-enye Jehova Chineke otuto nile maka ihe ịga nke ọma ha.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 3:6, 7.

[Foto dị na peeji nke 28]

Ndịàmà atọ na otu onye mkpọrọ n’oge nkesa magazin ahụ n’ụlọ ezumezu nke ụlọ mkpọrọ ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya