Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 8/8 p. 11-13
  • Ntolite nke Nnwere Onwe Ikwu Okwu n’Akụkọ Ihe Mere Eme

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ntolite nke Nnwere Onwe Ikwu Okwu n’Akụkọ Ihe Mere Eme
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ndị Nweere Onwe Ha Ma Bụrụ Ndị Ga-aza Ajụjụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ekwela Ka Nzube nke Nnwere Onwe nke Chineke Nyere Funarị Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ùnu Abịala ná Mgbakọ Distrikt “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 8/8 p. 11-13

Ntolite nke Nnwere Onwe Ikwu Okwu n’Akụkọ Ihe Mere Eme

NDỊ mmadụ agbawo mgba maka nnwere onwe ikwu okwu n’akụkọ ihe mere eme nile. E tiwo iwu, a lụwo ọgụ, a tụfuwokwa ọtụtụ ndụ n’ihe ruuru mmadụ ikwupụta echiche n’ihu ọha.

N’ihi gịnị ka ihe ahụ yiri ka ọ bụ ihe ruuru mmadụ site n’okike kwesịrị iji kpalite esemokwu, ọbụna ruo n’ókè nke mwụfu ọbara? N’ihi gịnị ka ọha mmadụ dị iche iche, ma ndị gaworo aga ma ndị dị ugbu a, jiworo hụ ya dị ka ihe dị mkpa igbochi ma ọ bụ ọbụna ịmachibido iji ihe ruuru mmadụ nke a eme ihe?

Àgwà e nwere n’ebe nnwere onwe ikwu okwu nke ndị mmadụ dị anọwo na-agbanwe ka oge na-aga. E lewo nnwere onwe ikwu okwu anya mgbe ụfọdụ dị ka ihe ùgwù a ga-enwe. E lewo ya anya n’oge ndị ọzọ dị ka nsogbu nke ọchịchị ma ọ bụ okpukpe ga-eme ihe banyere ya.

Ebe ọ bụ na akụkọ ihe mere eme jupụtara n’ihe ndekọ nke ndị gbaworo mgba maka nnwere onwe ikwupụta echiche ha n’ihu ọha, bụ́ nke na-edugakarị na ha ịbụ ndị a kpagburu n’ụzọ ime ihe ike ma ọ bụ gbuo, ntụle nke ụfọdụ n’ime ihe omume ndị a kwesịrị inye anyị nghọta ná nsogbu ahụ.

O yiri ka ndị mmụta akụkọ ihe mere eme pụrụ icheta onye ọkà ihe ọmụma Gris ahụ bụ́ Socrates (470-399 T.O.A.), bụ́ onye e lere echiche na ozizi ya anya dị ka mmetụta na-emerụ emerụ n’ebe ụkpụrụ omume ndị ntorobịa Atens dị. Nke a kpatara mgbagwoju anya dị ukwuu n’etiti ndị ndú ọchịchị na okpukpe nke ndị Gris nọ n’ọkwá dị elu, dugakwa n’ọnwụ ya. Arịrịọ ya n’ihu ọkàikpe ahụ nke mesịrị maa ya ikpe nọgidere bụrụ otu n’ime ngọpụ kasị doo anya nke nnwere onwe ikwu okwu: “Ọ bụrụ na ị tọhapụ m ugbu a ka m laa n’ọnọdụ nke na mụ agaghị ekwukwa obi m ọzọ n’ọchịchọ a a na-achọ amamihe, na ọ bụrụkwa na e jide m ọzọ ebe m na-eme nke a na m ga-anwụ, ana m agwa unu, ‘Ndị ikom Atens, m ga-erubere Chineke isi karịa unu. Ọ bụrụhaala na m nwere ndụ na ume, agaghị m akwụsị ma ọlị ịgbaso nkà ihe ọmụma na ịgba ume na ịrụgide onye ọ bụla n’ime unu m zutere. N’ihi nke a, maranụ na ọ bụ iwu Chineke . . .’ Ọzọ, ndị Atens, aga m aga n’ihu ikwu sị, ‘Tọhapụnụ m ma ọ bụ jidenụ m; ma chetanụ na ọ dịghị mgbe m ga-eme ihe dị iche, ọ bụrụgodị na m ga-anwụ n’ihi ya ọtụtụ ugboro.’”

Ka oge na-aga, akụkọ ihe mere eme nke Rom hụrụ ka mgbanwe ahụ gara ruo n’ihe mgbochi dịkwu ole na ole, ma gbanwee gaa n’inwekwu ihe mgbochi ka alaeze ukwu ahụ gbasara. Nke a kara akara mmalite nke oge kasị gbaa ọchịchịrị nye nnwere onwe ikwu okwu. N’oge ọchịchị Taịberiọs (14-37 O.A.), a nabataghị ndị kwuru okwu megide ọchịchị na ụkpụrụ ya dị iche iche. Ọ bụghịkwa nanị Rom megidere nnwere onwe ikwu okwu; ọ bụ n’oge a ka ndị ndú ndị Juu manyere Pọntiọs Paịlet igbu Jisọs n’ihi ozizi ya, wee nyekwa ndị ozi ya iwu ka ha kwụsị ime nkwusa. Ndị a kwa dị njikere ịnwụ kama ịkwụsị.—Ọrụ 5:28, 29.

N’oge ka ukwuu nke akụkọ ihe mere eme, e megharịrị ma ọ bụ wepụ ihe ruuru mmadụ n’ụzọ ọchịchị nke gọọmenti nyere ikike mgbe ọ bụla ọ masịrị ha, bụ́ nke dugara n’esemokwu na-aga n’ihu n’ihi nnwere onwe ikwu okwu. Malite na Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ụfọdụ ndị mmadụ kwuru ka e nwee okwu ndị e dere ede nke na-akọwapụta ihe ruuru ha, na-akpara nchịkwa gọọmenti n’ebe ihe ndị ahụ ruuru mmadụ dị ókè. Dị ka ihe si na ya pụta, a malitere imepụta nchịkọta nke ihe ndị bụ isi ruuru mmadụ. Otu n’ime ndị a bụ Magna Carta, nke kara oge mgbanwe n’ihe banyere ihe ndị ruuru mmadụ akara. E mesịrị nwee Akwụkwọ Ihe Ruuru Mmadụ nke England (1689), Nkwupụta nke Ihe Ruuru Mmadụ nke Virginia (1776), Nkwupụta nke Ihe Ruuru Mmadụ nke France (1789), na Akwụkwọ Ihe Ruuru Mmadụ nke United States (1791).

A nụrụ olu nke ọtụtụ ndị a maara aha ha n’akụkọ ihe mere eme na narị afọ nke 17, 18, na nke 19, bụ́ ndị kwuru okwu ná nkwado nnwere onwe ikwu okwu. Na 1644, onye England na-ede abụ uri bụ́ John Milton, onye a pụrụ icheta karịsịa n’ihi akwụkwọ bụ́ Paradise Lost, dere otu akwụkwọ nta a ma ama bụ́ Areopagitica dị ka ihe ịrụ ụka megide ihe mgbochi ná nnwere onwe nke nta akụkọ.

E nwere nnwere onwe ikwu okwu n’England na narị afọ nke 18, ọ bụ ezie na ihe mgbochi dị iche iche dịgidere. N’America ndị a na-achị achị na-arụgide ka e nwee nnwere onwe ikwu okwu, ma nke okwu ọnụ ma nke e dere ede. Dị ka ihe atụ, Ụkpụrụ Iwu Mba Commonwealth bụ́ Pennsylvania, September 28, 1776, kwuru n’akụkụ ya ụfọdụ, sị: “Na ndị mmadụ nweere onwe ha ikwu okwu, na nke ide ihe, na nke ibipụta echiche ha, n’ihi ya na e kwesịghị igbochi nnwere onwe nke nta akụkọ.”

Okwu a bụ ihe mkpali maka Mmegharị Mbụ nke Ụkpụrụ Iwu United States na 1791, nke kwupụtara echiche nke ndị guzobere Ụkpụrụ Iwu America n’ihe banyere ihe ndị ruuru mmadụ nke ọha mmadụ nwere mmasị na ha: “Nzukọ ezumezu agaghị eme iwu ọ bụla banyere nguzobe nke okpukpe, ma ọ bụ ịmachibido ikpe okpukpe n’enweghị mgbochi iwu; ma ọ bụ ịkpara nnwere onwe ikwu okwu, ma ọ bụ nke nta akụkọ ókè; ma ọ bụ ikike ndị mmadụ nwere izukọta n’udo, na ịrịọ Gọọmenti arịrịọ maka ilebagharị anya ná mkpesa.”

Onye England bụ́ ọkà ihe ọmụma nke narị afọ 19 bụ́ John Stuart Mill bipụtara edemede ya “Banyere Nnwere Onwe” na 1859. A na-ehotakarị ya, nke e zowokwara aka na ya dị ka otu n’ime okwu ndị kasịnụ ná nkwado nke nnwere onwe ikwu okwu.

Otú ọ dị, ọgụ a na-alụ maka ikike nnwere onwe ikwu okwu n’ihu ọha akwụsịghị mgbe afọ ndị ahụ e chere na ha bụ nke ihe ọmụma nke narị afọ nke 20 bịara. Dị ka ihe atụ, n’ihi mgbalị ndị e mere iji gbochie nnwere onwe ikwu okwu n’America, nkwupụta ndị na-agbachitere nnwere onwe ahụ adapụtawo ugboro ugboro site n’ụlọikpe dị iche iche, ma site n’ụlọikpe ndị dị ala ma n’Ụlọikpe Kasị Elu nke United States.

Ọkàikpe Oliver Wendell Holmes, Jr., nke Ụlọikpe Kasị Elu nke United States, kwupụtara nkweta ya ná nnwere onwe ikwu okwu n’ọtụtụ mkpebi ikpe nke ụlọikpe. N’ịkọwa ihe ndabere nke nnwere onwe ikwu okwu, ọ sịrị: “Ọ bụrụ na e nwere ụkpụrụ ọ bụla nke Ụkpụrụ Iwu nke kwesịrị ka a tụkwasị obi karịa nke ọ bụla ọzọ, ọ bụ ụkpụrụ nke nnwere onwe nke echiche—ọ bụghị nnwere onwe nke echiche maka ndị na-ekwenyere anyị, kama nnwere onwe maka echiche anyị kpọrọ asị.”—United States v. Schwimmer, 1928.

Ọ bụ ejighị ụkpụrụ a kpọrọ ihe kpataworo ọgụ ndị a na-alụ n’ụlọikpe nke mere ka mgbanwe dị n’etiti nnwere onwe na mmanye dịgide. Ọtụtụ mgbe echiche a na-enwe bụ, “Nnwere onwe ikwu okwu dịịrị m—ma ọ dịghịrị gị.” N’akwụkwọ ya nke nwere aha ahụ, Nat Hentoff na-ezo aka n’ọnọdụ dị iche iche nke ndị na-akwadosi Mmegharị Mbụ ahụ ike na-esoro mgbanwe ahụ na-agbanwe site n’aka nri gaa n’aka ekpe dị ka ụzọ ile ihe anya ha si dị. O zoro aka n’ọnọdụ ụfọdụ ebe Ụlọikpe Kasị Elu nke United States gbanwere ụfọdụ mkpebi nke ya, tinyere ndị ụfọdụ n’ime ha bụ banyere okwu ikpe ndị metụtara Ndịàmà Jehova na ọtụtụ afọ ha nke ịlụ ọgụ maka ihe ruuru mmadụ ikwu okwu banyere nkweta okpukpe ha n’enweghị mgbochi. Banyere ha, o dere, sị: “Ndị òtù okpukpe ahụ atụnyewo ụtụ dị ukwuu eri ọtụtụ iri afọ gaa n’ịgbasawanye nnwere onwe nke akọ na uche site n’ịgba akwụkwọ ụkpụrụ iwu kwadoro.”

Ọtụtụ ndị na-ahazi iwu na ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme nke oge a edewo ọtụtụ ihe banyere ọtụtụ ọgụ ndị a lụrụ n’ụlọikpe iji chebe nnwere onwe ikwu okwu ná ngwụsị narị afọ nke 20 nke a, ọ bụghị nanị n’America kama ná mba ndị ọzọkwa. Ọ dịbeghị mgbe nnwere onwe ikwu okwu bụ ihe e ji n’aka. Ọ bụ ezie na ndị ọchịchị pụrụ itu ọnụ banyere nnwere onwe ha na-enye ndị ha, a pụrụ ịtụfu ya ná mgbanwe ọchịchị ma ọ bụ nke ndị ọkàikpe, dị ka ahụmahụ gosiworo. Ndịàmà Jehova anọrọwo n’ihu n’ịlụ ọgụ a maka nnwere onwe a na-achọsi ike.

N’akwụkwọ ya bụ́ These Also Believe, Prọfesọ C. S. Braden na-ede, sị: “Ha [Ndịàmà Jehova] ejewo ozi pụrụ iche n’ebe ọchịchị onye kwuo uche ya dị site n’ọgụ ha na-alụ iji chekwaa ihe ndị ruuru ha n’ụzọ ọchịchị, n’ihi na site ná mgbalị ha, ha emewo ihe dị ukwuu iji chekwaa ihe ndị ahụ ruuru mmadụ maka ìgwè ọ bụla dị nta n’America. Mgbe a wakporo ihe ruuru otu ìgwè nke ọ bụla n’ụzọ ọchịchị, ọ dịghị ìgwè nke ọ bụla ihe ruuru ha na-anọ ná nchebe. N’ihi ya, ha atụnyewo ụtụ doro anya ná nchekwa nke ụfọdụ n’ihe ndị kasị oké ọnụ ahịa n’ọchịchị anyị nke onye kwuo uche ya.”

Ọ na-esiri ndị hụrụ nnwere onwe n’anya ike ịghọta ihe mere ọchịchị na okpukpe ụfọdụ ga-eji jighachi nnwere onwe a n’ebe ndị ha nọ. Ọ bụ nnapụ nke otu ihe bụ isi ruuru mmadụ, ọtụtụ mmadụ gburugburu ụwa na-ahụjukwa anya n’okpuru mbịada nke nnwere onwe a. Àgwà e nwere n’ebe nnwere onwe ikwu okwu dị, ọbụna ná mba ndị na-anụ ụtọ ihe a bụ isi nke ruuru mmadụ, ọ̀ ga-anọgide na-aga ihu na azụ dị ka ihe a kwụnyere n’elu? À ga-eji echiche nke nnwere onwe ikwu okwu mee ka okwu rụrụ arụ ma ọ bụ nke na-adịghị ọcha zie ezi? Ka ọ dị ugbu a ụlọikpe dị iche iche na-agbaso esemokwu ahụ mgba.

[Foto dị na peeji nke 11]

Socrates rụrụ ụka iji kwadoo nnwere onwe ikwu okwu

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musei Capitolini, Roma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya