Gịnị Ka Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe Pụtara Nye Gị?
Ọ bụ ezie na a na-agụ nnwere onwe ikpe okpukpe dị ka ihe gbara ọkpụrụkpụ ruuru mmadụ na United States, ntiwapụ ìgwè ndị na-eme ihe ike megide Ndịàmà Jehova mere n’ala ahụ dum n’afọ ndị 1940
ỌTỤTỤ nde mmadụ alụworo ya ọgụ. Ụfọdụ ọbụna anwụworo ya. Ọ bụ n’eziokwu otu n’ime ihe onwunwe kasị oké ọnụ ahịa ihe a kpọrọ mmadụ nwere. Gịnị ka ọ bụ? Nnwere onwe! Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-akọwa nnwere onwe dị ka “ikike ime nhọrọ na itinye ha n’ọrụ.” Ọ na-aga n’ihu, sị: “Site n’ụzọ iwu si ele ihe anya, ndị mmadụ nweere onwe ha ma ọ bụrụ na ọha na eze ebokwasịghị ha ihe mgbochi ndị nke ikpe na-ezighị ezi, na-adịghịkwa mkpa ma ọ bụ ndị ezi uche na-adịghị na ha. Ọha na eze aghaghị ichebekwa ihe ruuru ha—ya bụ, nnwere onwe, ike, na ihe ùgwù ha ndị bụ isi.”
Echiche ahụ dara ka ihe dị mfe. Otú ọ dị, n’omume, o yiri ka ọ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-ekweghị omume ka ndị mmadụ kwekọrịta banyere ebe e kwesịrị nnọọ ịkpara nnwere onwe ókè. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ kwere na gọọmenti kwesịrị iti iwu iji chebe nnwere onwe nke ndị amaala ya. Ma ndị ọzọ ga-arụ ụka na iwu ndị a bụ kpọmkwem ịgà ndị ahụ ọ dị mkpa ka a tọhapụ ndị amaala site na ha! N’ụzọ doro anya, nnwere onwe pụtara ihe dị iche iche nye ndị dị iche iche.
Gịnị Banyere Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe?
Ikekwe nnwere onwe a kasị esere okwu dị ọkụ bụ nnwere onwe nke okpukpe, nke a kọwaworo dị ka “ikike ikwere na itinye okwukwe mmadụ họọrọ n’ọrụ.” Dị ka Òtù Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke Mba Ndị Dị n’Otu kwuru, “nnwere onwe nke echiche, akọ na uche na okpukpe ruuru onye ọ bụla.” Nke a na-agụnye ikike mmadụ nwere “ịgbanwe okpukpe ma ọ bụ nkwenkwe ya,” tinyere nnwere onwe “igosipụta okpukpe ma ọ bụ nkwenkwe ya ná nkụzi, omume, ofufe na idebe ihe.”—Nọmba 18.
N’ezie, anyị ga-atụ anya ka mba ọ bụla na-enwe ezi nchegbu maka ndị ọ na-achị nye ụdị nnwere onwe ahụ. N’ụzọ dị mwute, nke a adịghị eme mgbe nile. “Okpukpe na-eru ná mmetụta ndị kasị omimi nke ọtụtụ mmadụ,” ka The World Book Encyclopedia na-arịba ama. “Gọọmenti ụfọdụ na-enwe ihe ndị siri ike jikọrọ ha na otu okpukpe ma na-ewere ndị si n’okpukpe ndị ọzọ dị ka ihe iyi egwu nye ike ọchịchị. Gọọmenti pụkwara iwere otu okpukpe dị ka ihe ize ndụ n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ihi na okpukpe pụrụ idebe nrara nye Chineke n’elu nrubeisi nye ọchịchị.”
N’ihi ihe ndị a gọọmenti ụfọdụ na-etinye ihe mgbochi dị iche iche maka ikpe okpukpe. Ole na ole na-eguzogide ikpe okpukpe ọ bụla ma ọlị. Ndị ọzọ, ọ bụ ezie na ha na-azọrọ ịkwado nnwere onwe ife ofufe, na-ejikpa ihe omume okpukpe nile aka ike.
Tụlee, dị ka ihe atụ, ọnọdụ dịrị ọtụtụ afọ na Mexico. Ọ bụ ezie na Ụkpụrụ Iwu nyere ikike nnwere onwe ikpe okpukpe, ọ tụpụtara sị: “Ụlọ chọọchị e ji efe ofufe ihu ọha bụ ihe onwunwe nke Mba, nke Gọọmenti Etiti nọchitere anya ya, nke ga-ekpebi ndị a pụrụ ịnọgide jiri na-eme ihe n’ụzọ dị otú ahụ.” Na 1991 e dezigharịrị Ụkpụrụ Iwu ahụ ịkwụsị ihe mgbochi a. Otú ọ bụla o si dị, ihe atụ a na-egosi na a pụrụ ịkọwa nnwere onwe ikpe okpukpe n’ụzọ dị iche iche n’ọtụtụ ala.
Ụdị Ọzọ nke Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe
Nnwere onwe ikpe okpukpe ọ̀ dị n’ala i bi na ya? Ya bụrụ otú ahụ, olee otú e si akọwa ya? Ị̀ pụrụ ife Chineke ofufe n’usoro ị họọrọ, ka à na-amanye gị ịghọ onye òtù okpukpe Obodo? È kwere gị ịgụ na ikesa akwụkwọ okpukpe, ka gọọmenti ọ̀ machibidoro ụdị akwụkwọ e biri ebi dị otú ahụ iwu? Ị̀ pụrụ ịgwa ndị ọzọ banyere okpukpe gị, ka à na-ewere nke a dị ka mmebi nke ihe ruuru ha n’ụzọ okpukpe?
Azịza nye ajụjụ ndị a dabeere n’ebe i bi. Otú ọ dị, ọ dị mma ịmara na e nwere ụdị nnwere onwe ikpe okpukpe nke na-adabereghị n’ụzọ ọ bụla n’ebe ma ọlị. Mgbe ọ nọ na Jerusalem n’afọ 32 O.A., Jisọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu anọgide n’okwu m, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’ezie; unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”—Jọn 8:31, 32.
Gịnị ka Jisọs bu n’obi n’okwu a? Ndị Juu na-ege ya ntị nwere agụụ maka nnwere onwe pụọ n’ịchịisi ndị Rom. Ma Jisọs adịghị atụle nnwere onwe pụọ ná mmegbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Kama nke ahụ, ọ na-ekwe ndị na-eso ụzọ ya nkwa ihe ka nnọọ mma, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.