Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 9/8 p. 7-12
  • Otú Ụwa Ha Siri Fuo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ụwa Ha Siri Fuo
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkwekọrịta nke Dugara n’Esemokwu
  • “Oké Olulu nke Nghọtahie”
  • Ihe Kasị Na-egbu Egbu
  • Gịnị Mere Nkwekọrịta Ndị Ahụ?
  • “Ogologo Njem” ahụ na Ọgbụgba nke Anya Mmiri
  • Gịnị Ka Ọdịnihu Ha Ga-abụ?
    Teta!—1996
  • Ndị India America Na Bible
    Teta!—1999
  • Ndị Amaala America—Ngwụsị nke Otu Oge
    Teta!—1996
  • Aha Chineke Gbanwere Ndụ M!
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 9/8 p. 7-12

Otú Ụwa Ha Siri Fuo

RUO ọtụtụ afọ, a chịkọtara akụkọ banyere United States n’okwu bụ́, “Otú e si nweta Ebe Ọdịda Anyanwụ.” Ihe nkiri Hollywood gosiri ndị ọcha bịara abịa na-agafe n’ala dị larịị na ugwu nke America, tinyere ndị agha yiri John Wayne, ndị na-azụ ehi, na ndị bịara abịa na-alụso ndị India ọgụ, bụ́ ndị na-eme ihe ike nwere obi ọjọọ, ndị ji anyụike na-alụ ọgụ. Ka ndị ọcha nọ na-achọ ala na ọlaedo, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị okwuchukwu Krisendọm chere na ha na-azọpụta mkpụrụ obi.

Olee otú akụkọ ahụ dị n’anya ndị mbụ biri n’ebe ahụ, bụ́ ndị amaala nke America? N’ihi ọbịbịa ndị Europe, ndị India “bụ ndị a manyere ịnagide mwebata e webatara onye nripịa kasị njọ ha chetụworo ihu na gburugburu ebe obibi ha: ndị mwakpo bụ́ ndị ọcha Europe,” ka akwụkwọ bụ́ The Native Americans—An Illustrated History na-ekwu.

Nkwekọrịta nke Dugara n’Esemokwu

Ná mmalite, ndị amaala mesoro ọtụtụ n’ime ndị Europe bu ụzọ bịa n’Ebe Ugwu Ọwụwa Anyanwụ America n’ụzọ obi ọma na ịrụkọ ọrụ ọnụ. Otu ihe ndekọ na-asị: “E wezụga enyemaka ndị Powhatan, ebe ndị Britain biri na Jamestown, Virginia, bụ́ ógbè mbụ dịgidere adịgide nke England n’Ụwa Ọhụrụ ahụ, agaraghị alanarị ajọ oge oyi mbụ ya nke 1607-1608. N’otu aka ahụ, ógbè Ndị Na-achị Mba Ọzọ dị na Plymouth, Massachusetts, gara adaworị ma e wezụga enyemaka sitere n’aka ndị Wampanoag.” Ụfọdụ ndị amaala gosiri ndị nkwagharị ndị ahụ otú e si etinye ntụ fertilizer n’ala na ịkụ ihe ọkụkụ. Oleekwa otú njem nke Lewis na Clark mere na 1804-1806—ịchọta usoro ime njem dị irè n’agbata Ókèala Louisiana na ihe a kpọrọ Mba Oregon—gara esi gaa nke ọma ma e wezụga ntinye aka nke nwanyị Shoshone ahụ bụ́ Sacagawea? Ọ bụ “ihe atụ nke udo” ha mgbe ha zutere ndị India ihu na ihu.

Otú ọ dị, n’ihi otú ndị Europe si jiri ala eme ihe na ụkọ ihe oriri, nnubata dị ukwuu e nubatara n’Ebe Ugwu America kpatara nsogbu n’etiti ndị mwakpo ahụ na ndị amaala. Onye Canada na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Ian K. Steele na-akọwa na n’ime narị afọ nke 17, e nwere ndị Narragansett 30,000 na Massachusetts. Chiifu ha bụ́ Miantonomo, “n’ịhụ na ihe ize ndụ dị, . . . gbalịrị ịgbasawanye nkwekọrịta ya na ndị Mohawk iji wulite òtù mmegide nke ọha ndị Amerindia.” A kọrọ na ọ gwara ndị Montauk na 1642, sị: “Anyị [aghaghị] ịbụ otu dị ka ha [ndị England] bụ, ma ọ bụghị ya anyị nile ga-apụ n’anya n’isi nso, n’ihi na unu matara na ndị nna anyị nwere ọtụtụ ele na akpụkpọ anụ, ala anyị ndị dị larịị jupụtara n’ele, dịkwa ka ọhịa anyị jupụtara na [torotoro], obere mmiri anyị jupụtakwara n’azụ na ọkụkọ. Ma ndị England a ewerewo ala anyị, ha ejiriwokwa mma ogè sụchasịa ahịhịa, jirikwa anyụike gbutusịa osisi; ehi na ịnyịnya ha na-atakwa ahịhịa, ézì ha na-emebisịkwa akụkụ oké osimiri anyị nke anụ clam, agụụ ga-agụgbukwa anyị nile.”—Warpaths—Invasions of North America.

Mgbalị Miantonomo mere iji guzobe òtù Ndị Amaala America dị n’otu kụrụ afọ n’ala. Na 1643, n’otu agha ebo, Chiifu Uncas nke ebo Mohegan jidere ya, bụ́ onye nyefere ya n’aka ndị England dị ka onye nnupụisi. Ndị England enweghị ike ịma Miantonomo ikpe na igbu ya. Ha chepụtara ihe ngwọta ọzọ ka mma. Steele na-aga n’ihu, sị: “N’enweghị ike igbu [Miantonomo], bụ́ onye na-anọghị n’ókèala nke ógbè nke ọ bụla, ndị nnọchiteanya gọọmenti mere ka Uncas gbuo ya, nweekwa ndị England ji anya ha hụ iji nwapụta na e gbuwo ya.”

Nke a na-akọwa, ọ bụghị nanị esemokwu na-akwụsịghị akwụsị n’agbata ndị mwakpo na-achị ndị mba ọzọ na ndị amaala obodo, kamakwa ajọ esemokwu na ịgba mgba okpuru nke dị n’etiti ebo dị iche iche, nke dịworo ọbụna tupu ndị ọcha erutetụ Ebe Ugwu America. Ndị Britain, n’agha ndị ha lụsoro ndị France iji weghara Ebe Ugwu America, nwere ebo ụfọdụ ndị kwadoro ha, ebe ndị ọzọ kwadoro ndị France. N’agbanyeghị akụkụ meririnụ, ebo nile tinyere aka na ya tụfuru ihe dị ukwuu.

“Oké Olulu nke Nghọtahie”

Nke a bụ otu echiche e nwere banyere mwakpo ahụ ndị Europe wakporo: “Ihe ndị ndú nke mba ndị India na-aghọtaghị, ọtụtụ ugboro ruo mgbe oge gafeworo, bụ ụzọ ndị Europe siri were ndị India. Ha abụghị ndị ọcha ma ọ bụ ndị Kraịst. Ha bụ ndị na-emepeghị anya—ndị ime ọhịa na ndị dị ka anụ ọhịa—n’echiche nke ọtụtụ ndị, ngwá ahịa dị ize ndụ nke na-enweghị mmetụta nke bụ maka ahịa ohu.” Àgwà a nke ịka ndị ọzọ rụpụtara mmetụta jọgburu onwe ya n’ahụ agbụrụ ndị ahụ.

Ndị Amaala America enweghị ike ịghọta ụzọ ile ihe anya nke ndị Europe. E nwere, dị ka onye ndụmọdụ Navajo bụ́ Philmer Bluehouse si kpọọ ya n’ajụjụ ọnụ Teta! gbara ya n’oge na-adịbeghị anya, “oké olulu nke nghọtahie.” Ndị amaala ewereghị mmepeanya ha dị ka nke dị ala, kama nke ahụ, dị ka nke dị iche, nke nwere ụkpụrụ ndị dị iche kpam kpam. Dị ka ihe atụ, ndị India amaghị ma ọlị ihe bụ ire ala. Ị̀ pụrụ inwe na ire ikuku, ifufe, mmiri? Mgbe ahụ gịnị mere ọ ga-eji bụrụ ala? Ọ dị n’ebe ahụ ka mmadụ nile wee jiri ya na-eme ihe. N’ihi ya, a maghị ndị India ịbụ ndị na-agba ala ogige.

Ozugbo ndị Britain, ndị Spain, na ndị France rutere, e nwere ihe a kọwaworo dị ka “nzute ọjọọ nke ọdịbendị abụọ si esi bịa.” Ndị amaala ahụ bụ ndị mụtaworo ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ala na ihe okike eri ọtụtụ narị afọ, bụrụkwa ndị matara otú e si alanarị n’agbanweghị nguzozi gburugburu ebe obibi nwere. Ma, n’oge na-adịghị anya ndị ọcha malitere ile ndị amaala obodo anya dị ka ndị e kere eke dị ala karị, ndị nwere anya ọkụ—wee jiri ntụsara ahụ na-echefu omume obi ịta mmiri nke ya n’ịchịkwa ha! Na 1831, onye France na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Alexis de Tocqueville chịkọtara echiche ndị ọcha nwere banyere ndị India, sị: “Chineke emeghị ka ha bụrụ ndị mepere anya; ọ dị mkpa na ha nwụrụ.”

Ihe Kasị Na-egbu Egbu

Ka ndị ọbịa ọhụrụ nọgidere na-enubata n’ebe ndịda n’ofe ọzọ nke Ebe Ugwu America, ime ihe ike kpatara ime ihe ike. Ya mere ma ọ̀ bụ ndị mwakpo India ma ọ bụ ndị Europe bu ụzọ busoo ibe ha agha, akụkụ abụọ ahụ rụrụ ọtụtụ arụrụala. A tụrụ ndị India egwu n’ihi ịbụ ndị a ma ama maka ịdọkapụ ma anụ isi ma agịrị isi, ihe omume nke ụfọdụ ndị kwenyere na ha mụtara site n’aka ndị Europe, ndị nyere ọtụtụ onyinye maka anụ isi a dọpụrụ ya na agịrị isi. Otú ọ dị, ndị India na-alụ agha a ga-emeri ha na ya megide ndị ka ha ike—ma n’ọnụ ọgụgụ ma ná ngwá agha. N’ọtụtụ oge, ebo ndị ahụ mesịrị bụrụ ndị na-aghaghị ịhapụ ala ndị nna ochie ha ma ọ bụ bụrụ ndị nwụrụ anwụ. Ọtụtụ mgbe ọ bụ ihe abụọ ahụ—ha hapụrụ ala ha, wee bụrụ ndị e gburu ma ọ bụ ndị nwụrụ n’ihi ọrịa na ịkwụ agụụ.

Ma, ịnwụ n’ọgbọ agha abụghị isi ihe kasị na-egbuchapụ akụkụ ka ukwuu nke ebo ndị amaala ndị ahụ. Ian K. Steele na-ede, sị: “Ngwá agha kasị na-egbu egbu ná mwakpo a wakporo Ebe Ugwu America abụghị égbè, ịnyịnya, Bible, ma ọ bụ ‘mmepeanya’ ndị Europe. Ọ bụ ọrịa na-efe efe.” Banyere mmetụta ọrịa Ụwa Ochie ahụ nwere n’ahụ kọntinent ndị dị n’America, Patrica Nelson Limerick, prọfesọ akụkọ ihe mere eme, dere, sị: “Mgbe e buuru ha gaa Ụwa Ọhụrụ ahụ, otu ọrịa ndị a [nke ndị Europe jiworo ọtụtụ narị afọ rụọ ọrụ iji mepụta ihe na-alụso ya ọgụ]—kpọtọmkpọ, arụbara, ọrịa ahụ ọkụ, ịba, ịba ọcha n’anya, ịba ahụ ọkụ, ụkwara nta, na, karịsịa, kịtịkpa—nwere ihe mgbochi dị nta. Ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’obodo nta nile rịrị elu ruo ihe dị ka pasent 80 ma ọ bụ 90.”

Russell Freedman na-akọwa otu ntiwapụ kịtịkpa tiwapụrụ na 1837. “Ndị Mandan bụ ndị mbụ ọ dakwasịrị, ndị Hidatsa, ndị Assiniboin, ndị Arikara, ndị Sioux, na ndị Blackfoot sochikwara ha ozugbo.” Ọ fọrọ nke nta ka e kpochapụ ndị Mandan kpam kpam. Site n’ụba mmadụ dị ihe dị ka 1,600 na 1834, ha dalatara ruo 130 na 1837.

Gịnị Mere Nkwekọrịta Ndị Ahụ?

Ruo taa, ndị okenye agbụrụ dị iche iche pụrụ ikwu n’egbughị oge akara ụbọchị nkwekọrịta ahụ nke ọchịchị United States na ndị nna ochie ha bịanyere aka na ha na narị afọ nke 19. Ma gịnị dị n’akwụkwọ nkwekọrịta ndị ahụ n’ezie? Ọ na-abụkarị mgbanwerịta ọjọọ nke iji ala dị mma gbanweta ókèala ọha mmadụ nke na-adịghị emepụta ihe na usoro nkwado gọọmenti.

Otu ihe atụ nke omume nleda anya nke e mesoro ebo ndị amaala bụ n’ihe banyere mba ndị Iroquois (site n’ọwụwa anyanwụ ruo ọdịda anyanwụ, Mohawk, Oneida, Onondaga, Cayuga, na Seneca) mgbe ndị America na-achị ndị mba ọzọ merisịworo ndị Britain n’agha maka nnwere onwe, bụ́ nke kwụsịrị na 1783. Ndị Iroquois akwadoworị ndị Britain, nanị ihe ha nwetakwara ná nkwụghachi, dị ka Alvin Josephy, Jr., si kwuo, bụ mgbahapụ na mkparị. Ndị Britain, “n’ileghara [ndị Iroquois] anya, enyefewo ọbụbụeze ala ndị Iroquois n’aka United States.” Ọ na-agbakwụnye na ọbụna ndị Iroquois kwadoworo ndị ọchịchị si mba ọzọ imegide ndị Britain “bụ òtù ndị mgbere ala dị anyaukwu na ndị ahịa uru tinyere gọọmenti America n’onwe ya manyere.”

Mgbe a kpọrọ nzukọ nkwekọrịta na 1784, James Duane, onye bụbu onye nnọchiteanya nke Kọmitii Nzukọ Ezumezu Kọntinent n’Ihe Metụtara India, gbara ndị ọrụ gọọmenti ume “iji ụzọ aghụghọ belata obi ike ọ bụla nke ndị Iroquois ka nwere n’onwe ha site n’ịkpachara anya na-emeso ha dị ka ndị dị ala.”

E mere dị ka aro ndị ahụ o ji nganga tụọ si dị. A nwụchiri ụfọdụ n’ime ndị Iroquois dị ka ndị e ji eji, e jikwa iyi egwu nke mgbagbu nwee “mkparịta ụka.” N’agbanyeghị na ha weere onwe ha dị ka ndị a na-apụghị imeri emeri n’agha, ndị Iroquois aghaghị inyefe ala ha nile dị n’ebe ọdịda anyanwụ New York na Pennsylvania, ma narakwa ókèala ọha mmadụ nke na-asaghị mbara na New York State.

E ji ụzọ aghụghọ ndị yiri nke ahụ mee ihe megide ihe ka ọtụtụ n’ebo amaala ndị ahụ. Josephy na-ekwukwa na ndị ọrụ America ji “iri ngó, iyi egwu, mmanya na-aba n’anya, na iji ndị a na-enyeghị ikike rụọ ọrụ ịgbalị ịnapụ ala n’ike n’aka ndị Delaware, ndị Wyandot, Ottawa, Chippewa [ma ọ bụ Ojibwa], Shawnee, na mba Ohio ndị ọzọ.” O jughị anya ihe mere ndị India ji ghara inwe ntụkwasị obi n’ebe ndị ọcha na nkwa ụgha ha dị!

“Ogologo Njem” ahụ na Ọgbụgba nke Anya Mmiri

Mgbe Agha Obodo America (1861-1865) tiwapụrụ, ọ dọọrọ ndị agha pụọ ná mba Navajo dị na Ndịda Ọdịda Anyanwụ. Ndị Navajo ji ohere nke oge a e gburu wakpo ebe obibi ndị America na ndị Mexico dị na Ndagwurugwu Rio Grande n’ókèala New Mexico. Gọọmenti zigara Colonel Kit Carson na Ndị Ọrụ Afọ Ofufo New Mexico ya ịga bịada ndị Navajo, na ịchụga ha n’ókèala ọha mmadụ nke dị n’ala dị warara nke na-adịghị emepụta ihe a na-akpọ Bosque Redondo. Carson chụsoro ụkpụrụ nke ala chanwụrụ achanwụ iji kwụwa ndị Navajo agụụ ma chụpụ ha n’ọmarịcha Canyon de Chelly ahụ, nke dị n’ugwu ebe ọwụwa anyanwụ Arizona. O bibiri ọbụna ihe karịrị osisi peach 5,000.

Carson chịkọtara ihe dị ka mmadụ 8,000 ma manye ha ịga “Ogologo Njem” nke ihe dị ka mile 300 iji ruo ogige a na-edebe ndị e ji eji na Bosque Redondo dị na Fort Summer, New Mexico. Otu akụkọ na-ekwu, sị: “Ihu igwe jụrụ oké oyi, ọtụtụ n’ime ndị ahụ a na-adọrọ n’agha na-eyighị ákwà nke ọma, na-adịghị eriju afọ nwụrụ n’ụzọ.” Ọnọdụ ndị e nwere n’ókèala ọha mmadụ ahụ jọgburu onwe ha. Ndị Navajo aghaghị igwu olulu n’ala ná mgbalị ha na-eme ịchọta ebe mgbaba. Na 1868, mgbe ọ ghọtasịrị ajọ mmehie ihe ya, gọọmenti nyere Navajo nde 3.5 eka nke ala ndị nna ochie ha dị n’Arizona na New Mexico. Ha laghachiri azụ, ma lee oké ọnụ ahịa a manyeworo ha ịkwụ!

N’agbata 1820 na 1845, a chụpụrụ ọtụtụ iri puku ndị Choctaw, Cherokee, Chickasaw, Creek, na Seminole n’ala ha dị na Ndịda Ọwụwa Anyanwụ, ma manye ha iji ụkwụ gaa n’ebe ọdịda anyanwụ, n’ofe ọzọ nke Osimiri Mississippi, gaa n’ebe bụ́ Oklahoma ugbu a, na-agaru ọtụtụ narị kilomita. N’ọnọdụ oge oké oyi, ọtụtụ nwụrụ. Njem mmanye ahụ a gara n’ọdịda anyanwụ ghọrọ nke a ma ama dị ka Ọgbụgba nke Anya Mmiri.

Okwu onye isi agha ndị America bụ́ George Crook, bụ́ onye chụgharịworo ndị Sioux na ndị Cheyenne n’ebe ugwu, kwuru na-emesiwanye eziokwu nke omume ọjọọ ndị e mesoro Ndị Amaala America ike. Ọ sịrị: “Ọ na-esi ike nke ukwuu ịnụ akụkụ nke ndị India n’okwu ahụ. . . . Ọ bụ nanị mgbe nnupụisi ndị India pụtara ìhè ka a na-atụgharị uche gaa n’ebe [ndị India] nọ, nanị mpụ na arụrụala ha ka a na-akatọ, ebe ndị ọ bụ mmeso ọjọọ ha dubara ha n’ụzọ a na-agbanahụ ntaramahụhụ . . . Ọ dịghị onye maara eziokwu a karịa onye India, n’ihi ya a pụghị ịta ya ụta n’ịhụ na ikpe ziri ezi adịghị n’ọchịchị nke na-enye ya nanị ahụhụ, ebe ọ na-ahapụ onye ọcha ka o bukọrọ ihe ha otú o si masị ya.”—Bury My Heart at Wounded Knee.

Olee otú ọ dị Ndị Amaala America taa mgbe ihe karịrị otu narị afọ nke ịnọ n’okpuru ndị Europe gasịrị? Hà nọ n’ihe ize ndụ nke ịpụ n’anya n’ihi ịbụ ndị e rikpuru? Olileanya dị aṅaa ka ha nwere maka ọdịnihu? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a na ndị ọzọ.

[Igbe dị na peeji nke 9]

Ndụ Siri Ike Nye Ndị Inyom

Ebe ndị ikom bụ ndị dinta na ndị dike n’ihe ka ọtụtụ n’ebo dị iche iche, ndị inyom nwere ọtụtụ ọrụ, gụnyere ịzụlite ụmụaka, ịkụ ọka na iweta ya n’ubi, na ịsụ ya ka ọ ghọọ ntụ ọka. Colin Taylor na-akọwa, sị: “Ọrụ bụ isi nke ndị inyom Ala Dị Larịị . . . bụ ịhụ maka ezinụlọ e hiwere, ịmụ ụmụ na ịkwadebe nri. N’ọha mmadụ ebe a na-akụ osisi ndị na-amị mkpụrụ ha na-elekọtakwa ubi dị iche iche, . . . ebe, n’ọnọdụ nke agbụrụ ndị nkwagharị ebe ọdịda anyanwụ na-achụ nta atụ, ha nyere aka n’ịbọ anụmanụ, webata anụ ya n’ụlọikwuu ma mesịa kwadebe anụ ahụ na akpụkpọ ya maka iji mee ihe n’ọdịnihu.”—The Plains Indians.

Akwụkwọ ọzọ na-ekwu banyere ndị Apache, sị: “Ọrụ ubi bụ ọrụ ndị inyom, ọ dịghịkwa ihe na-ewetu n’ala ma ọ bụ ihe a na-eleda anya dị na ya. Ndị ikom nyere aka, ma ndị inyom weere ọrụ ubi dị ka ihe dị mkpa karịa ndị ikom. . . . Ndị inyom maara mgbe nile ụzọ isi gbasoo ihe omume metụtara ọrụ ugbo. . . . Ihe ka ọtụtụ ná ndị inyom na-ekpe ekpere mgbe ha na-agba ala mmiri.”—The Native Americans—An Illustrated History.

Ndị inyom wukwara ebe obibi ndị na-adịghị adịgide adịgide a na-akpọ tepee, bụ́ ndị na-adịrukarị afọ abụọ. Ha wuru ha ma gbukasịa ha mgbe ebo ahụ na-aghaghị ịkwapụ. N’enweghị obi abụọ, ndị inyom biri ndụ siri ike. Ma otú ahụ ka ọ dịkwa ndị ikom ha dị ka ndị nchekwa nke ebo ahụ. A kwanyeere ndị inyom ùgwù, ha nwekwara ọtụtụ ikike. N’ebo ụfọdụ, dị ka ndị Hopi, ndị inyom na-enwe ala ọbụna taa.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

Otu Anụmanụ nke Gbanwere Ụwa Ha

Ndị Europe webatara otu anụmanụ n’Ebe Ugwu America, bụ́ nke gbanwere ụzọ ndụ nke ọtụtụ ebo—ịnyịnya. Na narị afọ nke 17, ndị Spain ghọrọ ndị mbụ webatara ịnyịnya na kọntinent ahụ. Ndị Amaala America ghọrọ ndị ọkà n’ịnọkwasị n’azụ nkịtị nke ịnyịnya, dị ka ndị mwakpo si Europe chọpụtara n’oge na-adịghị anya. N’iji ịnyịnya, ndị amaala ahụ nwere ike ịchụ nta anụ bison n’ụzọ dị mfe karị. Ebo ndị nkwagharị nwekwara ike ka ukwuu ịchụsasị ebo ndị agbata obi ha bụ́ ndị bi n’obodo nta ndị e hiwere ehiwe, wee si otú a na-akpọkọrọ ndị inyom na ndị ohu ha.

[Map/Foto dị na peeji nke 7]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ebe ebo ụfọdụ dị n’Ebe Ugwu America dị na narị afọ nke 17

Kutenai

Spokan

Nez Perce

Shoshone

Klamath

Ebe Ugwu Paiute

Miwok

Yokuts

Serrano

Mohave

Papago

Blackfoot

Flathead

Crow

Cheyenne

Ute

Arapaho

Jicarilla

Hopi

Navajo

Apache

Mescalero

Comanche

Lipan

Plains Cree

Assiniboin

Hidatsa

Mandan

Arikara

Yanktonai

Teton

Sioux

Yankton

Pawnee

Oto

Kansa

Kiowa

Osage

Quapaw

Caddo

Wichita

Atakapa

Tonkawa

Santee

Iowa

Missouri

Illinois

Chickasaw

Alabama

Choctaw

Creek

Timucua

Ojibwa

Sauk

Fox

Kickapoo

Miami

Shawnee

Cherokee

Catawba

Powhatan

Tuscarora

Delaware

Erie

Susquehanna

Potawatomi

Iroquois

Huron

Ottawa

Algonquian

Sokoki

Massachuset

Wampanoag

Narragansett

Mohegan

Montauk

Abnaki

Malecite

Micmac

[Ebe E Si Nweta Foto]

Onye India: Ihe osise dabeere na foto nke Edward Curtis sere; Ebe Ugwu America: Mountain High Maps® Ike mbipụtaghachi © 1995 Digital Wisdom, Inc.

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Nkà ịkpa ihe na ọla nke ndị Navajo

[Foto dị na peeji nke 11]

Canyon de Chelly, ebe “Ogologo Njem” ahụ malitere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya