Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 9/8 p. 12-16
  • Gịnị Ka Ọdịnihu Ha Ga-abụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Ọdịnihu Ha Ga-abụ?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agụmakwụkwọ Ndị Amaala America
  • Ala Nsọ
  • Ihe Ịma Aka nke Taa
  • Ịlụso Ọgwụ Ọjọọ na Mmanya Na-aba n’Anya Ọgụ
  • Ụlọ Ọkụ Na-eri Ego na Ịgba Chaa Chaa Hà Bụ Azịza?
  • Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-abụ?
  • Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Ịdị n’Otu na Ezi Ikpe
  • Aha Chineke Gbanwere Ndụ M!
    Teta!—2001
  • Otú Ụwa Ha Siri Fuo
    Teta!—1996
  • Ndị India America Na Bible
    Teta!—1999
  • Ndị Amaala America—Ngwụsị nke Otu Oge
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 9/8 p. 12-16

Gịnị Ka Ọdịnihu Ha Ga-abụ?

N’OTU ajụjụ ọnụ Teta! gbara, chiifu udo ndị Cheyenne, bụ́ Lawrence Hart sịrị na otu n’ime nsogbu na-emetụta ndị India “bụ na ikike nnabata na ngwakọrịta ọdịbendị ndị ọzọ na-eche anyị ihu. Dị ka ihe atụ, asụsụ anyị na-efunahụ anyị. N’otu oge nke a bụ ụkpụrụ gọọmenti leziri anya mee. E mere mgbalị dị ukwuu iji agụmakwụkwọ ‘mepee anya’ anyị. E zigara anyị n’ụlọ akwụkwọ ndị nwere ụlọ obibi ma machibido anyị iwu ịsụ asụsụ obodo anyị.” Sandra Kinlacheeny na-echeta: “Ọ bụrụ na mụ asụọ Navajo n’ụlọ akwụkwọ m nke nwere ụlọ obibi, onye nkụzi na-eji ncha saa m ọnụ!”

Chiifu Hart na-aga n’ihu, sị: “Otu ihe na-agba ume n’oge na-adịbeghị anya bụ na ebo dị iche iche amatawo nke a na-akọ. Ha na-aghọta na asụsụ ha pụrụ ịpụ n’anya ọ gwụla ma e mere mgbalị iji chekwaa ha.”

Nanị mmadụ iri fọdụrụ ná ndị na-asụ asụsụ Karuk, asụsụ nke otu n’ime ebo ndị dị na California. Na January 1996, Red Thunder Cloud (Carlos Westez), onye India ikpeazụ sụrụ asụsụ Catawba, nwụrụ mgbe ọ gbara afọ 76. Ruo ọtụtụ afọ, o nweghị onye ọ ga-eji asụsụ ahụ gwa okwu.

N’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova n’ógbè ọha mmadụ ndị dị na Navajo na Hopi n’Arizona, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-asụ ma Navajo ma ọ bụ Hopi na Bekee. Ọbụna Ndịàmà na-abụghị ndị India na-amụ asụsụ Navajo. Ọ dị Ndịàmà ahụ mkpa ịma Navajo ka ha wee rụọ ọrụ ha nke ịkụzi Bible, ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị Navajo na-eme nke ọma nanị n’asụsụ ha. A ka na-asụ asụsụ Hopi na Navajo nke ukwuu, a na-agbakwa ndị na-eto eto ume iji ha na-eme ihe n’ụlọ akwụkwọ.

Agụmakwụkwọ Ndị Amaala America

E nwere kọleji ndị India 29 na United States, bụ́ ndị nwere ụmụ akwụkwọ 16,000. Nke mbụ meghere n’Arizona na 1968. “Nke a bụ otu n’ime mgbanwe kasị mma e nweworo ná Mba India, ikike ịkụzi ihe dị ka anyị si chọọ,” ka Dr. David Gipp kwuru, nke Kọmitii Agụmakwụkwọ Dị Elu n’American India. Na Mahadum Sinte Gleska, asụsụ Lakota bụ ihe ọmụmụ bụ iwu.

Dị ka Ron McNeil (Hunkpapa Lakota), onye isi oche nke Òtù Kọleji American India, si kwuo, ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghị ọrụ ná Ndị Amaala America dị malite na 50 ruo 85 pasent, ndị India nwekwara afọ ndụ kasị ala na ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ọrịa shụga, ụkwara nta, na aṅụrụma n’etiti ìgwè ọ bụla na United States. Agụmakwụkwọ ka mma bụ nanị otu n’ime atụmatụ ndị pụrụ inye aka.

Ala Nsọ

Nye ọtụtụ Ndị Amaala America, ala ndị nna ochie ha dị nsọ. Dị ka White Thunder gwara otu onye òtù ndị ome iwu: “Ala anyị n’ebe a bụ ihe kasị dị oké ọnụ ahịa nye anyị n’elu ụwa.” Mgbe a na-ede akwụkwọ nkwekọrịta dị iche iche, ndị India na-echekarị na ndị a bụ maka ojiji ndị ọcha ji ala ha eme ihe, ma ọ bụghị maka inwe ya kpam kpam. Ala bara oké uru n’Ugwu Ojii nke Dakota funahụrụ ebo ndị India bụ́ Sioux n’afọ ndị 1870, mgbe ndị na-egwupụta akụ̀ dị n’ime ala nubatara, na-achọ ọlaedo. Na 1980, Ụlọikpe Kasị Elu na United States nyere gọọmenti United States iwu ịkwụ ebo asatọ nke Sioux ihe dị ka $105 nde dị ka ihe iti aka n’obi. Ruo ugbu a, agbụrụ ndị ahụ ajụwo ịnara ụgwọ ahụ—ha chọrọ ka e nyeghachi ha ala nsọ ha, bụ́ Ugwu Ojii nke Ebe Ndịda Dakota.

Ọtụtụ ndị India bụ́ ndị Sioux enweghị obi ụtọ ịhụ ihu president ndị ọcha a tụrụ n’Ugwu Rushmore, nke dị n’Ugwu Ojii. N’ugwu dị nso n’ebe ahụ, ndị nkà n’ịtụ ihe na-atụ ọbụna ihe a tụrụ atụ nke ka ibu. Ọ bụ nke Crazy Horse, bụ́ onye ndú agha Oglala nke Sioux. A ga-akpụsị ihu ya ka ọ na-erule June 1998.

Ihe Ịma Aka nke Taa

Iji lanarị n’ụwa nke oge a, ọ dịwo Ndị Amaala America mkpa ime mgbanwe n’ụzọ dị iche iche. Ọtụtụ nwere agụmakwụkwọ dị mma ugbu a, bụrụkwa ndị a zụrụ na kọleji, na-enwe ikike ndị ha pụrụ iji mee ihe n’ụzọ dị mma n’ihe metụtara ebo. Otu ihe atụ bụ Burton McKerchie na-ekwu okwu n’olu dị nro, bụ́ onye Chippewa sitere Michigan. O sewo foto ihe nkiri ndị na-egosi akụkọ mere eme maka Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi Ọha Mmadụ, ọ na-arụkwa ọrụ ugbu a n’otu ụlọ akwụkwọ dị elu na n’Ókèala Ọha Mmadụ nke Hopi n’Arizona, na-ahụ maka ihe ọmụmụ nkụzi vidio kọleji na steti ahụ dum. Ihe atụ ọzọ bụ Ray Halbritter, onye ndú ebo ná mba Oneida, onye gụrụ akwụkwọ na Harvard.

Arlene Young Hatfield, mgbe ọ na-ede ihe n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Navajo Times, kwuru na ndị Navajo na-eto eto enweghị ahụmahụ, ha adịghịkwa achụ àjà ndị mụrụ ha na ndị nna nna ha chụrụ mgbe ha na-etolite. O dere, sị: “N’ihi ihe ntụsara ahụ [ọgbara ọhụrụ] ọ dịbeghị mgbe ha gara kpata ma ọ bụ waa nkụ, chute mmiri, ma ọ bụ zụọ atụrụ dị ka ndị nna ochie ha mere. Ha adịghị atụnye ụtụ n’ihe ezinụlọ anyị ji adị ndụ dị ka ụmụaka mere n’ogologo oge gara aga.” Ọ na-ekwubi, sị: “O kweghị omume ịgbanahụ nsogbu ọha mmadụ ndị na-aghaghị imetụta ụmụ anyị. Anyị apụghị ikewapụ ezinụlọ anyị, ma ọ bụ ókèala ọha mmadụ site n’ebe ụwa dum nọ, anyị apụghịkwa ịlaghachi ná ndụ ndị nna ochie anyị biri.”

N’ebe ahụ ka ihe ịma aka Ndị Amaala America nwere dị—otú ha ga-esi jigide ọdịnala na ụkpụrụ ebo ha ndị pụrụ iche ma na-ekwekọ n’ụwa nke ji oké ọsọ na-agbanwe n’èzí.

Ịlụso Ọgwụ Ọjọọ na Mmanya Na-aba n’Anya Ọgụ

Ruo taa, aṅụrụma na-etisasị ọha mmadụ Ndị Amaala America. Dr. Lorraine Lorch, bụ́ onye jewooro ndị Hopi na ndị Navajo ozi dị ka onye ọkà n’ịgwọ ọrịa ụmụaka ruo afọ 12, kwuru n’ajụjụ ọnụ Teta! gbara ya, sị: “Aṅụrụma bụ nsogbu siri ike nye ma ndị ikom ma ndị inyom. Ọrịa imeju, ọnwụ mberede, igbu onwe onye, na igbu ọchụ na-emetụta ahụ ndị gbasiri ike. Ọ dị mwute ịhụ ka aṅụrụma na-ebute ụzọ tupu ụmụaka, onye òtù ọlụlụ, na ọbụna Chineke. A na-agbanwe ọchị ịghọ anya mmiri, ịdị nwayọọ ịghọ ime ihe ike.” O kwukwasịrị: “Ọbụna ụfọdụ n’ime ememe, nke ndị Navajo na ndị Hopi weere n’otu oge dị ka ndị dị nsọ, ka a na-ejizi ịṅụbiga mmanya ókè na omume rụrụ arụ emerụ mgbe ụfọdụ. Mmanya na-aba n’anya na-anapụ ndị ọma a ahụ ike ha, ọgụgụ isi ha, nkà ha, na ezi ọdịdị ha.”

Philmer Bluehouse, bụ́ onye odozi okwu ná Ngalaba Ikpe Ziri Ezi nke mba Navajo, nke dị na Window Rock, Arizona, kọwara iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na mmanya na-aba n’anya n’ụzọ na-adịghị akpasu iwe dị ka “ọgwụgwọ onwe onye.” Iji ihe eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi nke a na-eje ozi irikpu iru újú na iji nyere mmadụ aka ịgbanahụ ọnọdụ ọjọọ dị adị nke ndụ n’arụghị ọrụ, ọtụtụ mgbekwa n’enweghị nzube.

Otú ọ dị, ọtụtụ Ndị Amaala America alụsowo ihe ọṅụṅụ “ajọ mmụọ” ahụ ndị ọcha webatara ọgụ n’ụzọ gara nke ọma, ha agbawokwa mgba iji merie iri ahụ nke ọgwụ ọjọọ. Ihe atụ abụọ bụ Clyde na Henrietta Abrahamson, ndị sitere n’Ókèala Ọha Mmadụ Spokane India dị na Washington State. Clyde gbasiri ike, nweekwa agịrị isi na anya ojii. Ọ kọwaara Teta! sị:

“Anyị etolitewo n’ókèala ọha mmadụ ahụ n’ihe ka ukwuu ná ndụ anyị, mgbe ahụkwa, anyị kwagara n’obodo ukwu bụ́ Spokane ịga kọleji. Ụzọ ndụ anyị amasịghị anyị, bụ́ nke gụnyere mmanya na-aba n’anya na ọgwụ ọjọọ. Ụdị ndụ a bụ nanị ihe anyị maara. Anyị tolitere ịbụ ndị kpọrọ mmetụta abụọ a asị n’ihi nsogbu ndị anyị hụworo na ha na-akpata n’ezinụlọ.

“Mgbe ahụ anyị zutere Ndịàmà Jehova. Ọ dịghị mgbe anyị nụrụ banyere ha tupu anyị agaa obodo ukwu. Ọganihu anyị adịghị ngwa. Eleghị anya ọ bụ n’ihi na anyị atụkwasịchaghị ndị anyị na-amataghị obi, karịsịa ndị ọcha. Anyị nwere ihe dị ka afọ atọ nke ọmụmụ Bible a mụtụ a kwụsị. Àgwà sikarịịsịrị m ike ịkwụsị bụ ise wii wii. Esewo m siga eri m dị afọ 14, adịkwa m afọ 25 tupu m gbalịa ịkwụsị. Anya na-acha m ọkụ n’ihe ka ukwuu ná ndụ m dị ka onye na-akatabeghị ahụ. Na 1987, agụrụ m isiokwu dị ná mbipụta Teta! nke June 8, nke isiokwu ya bụ “Onye Ọ Bụla Na-ese Wii Wii—n’Ihi Gịnị Ka M Na-agaghị Ese?” O mere ka m mata ihe nzuzu ọ bụ ise wii wii—karịsịa mgbe m gụsịrị Ilu 1:22, bụ́ nke na-asị: ‘Unu ndị na-enweghị uche, ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ enweghị uche n’anya? Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-achọsikwara onwe ha ịkwa emo ike? Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-akpọkwa ihe ọmụma asị?’

“Akwụsịrị m àgwà ahụ, n’oge opupu ihe ubi nke 1986 kwa, mụ na Henrietta lụrụ di na nwunye. E mere anyị baptism na November 1986. Na 1993, aghọrọ m okenye n’ọgbakọ. E mere ụmụ anyị ndị inyom abụọ baptism dị ka Ndịàmà Jehova na 1994.”

Ụlọ Ọkụ Na-eri Ego na Ịgba Chaa Chaa Hà Bụ Azịza?

Na 1984 e nweghị ịgba chaa chaa ndị India na-ahụ maka ya na United States. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Washington Post si kọọ, n’afọ a ebo 200 nwere ebe ịgba chaa chaa 220 n’ime steti 24. Ndị a gụpụrụ n’ụzọ pụtara ìhè bụ ndị Navajo na ndị Hopi, bụ́ ndị nagideworo ọnwụnwa ahụ ruo ugbu a. Ma ụlọ ọkụ na-eri ego na nke bingo hà bụ ụzọ na-eduga n’ọganihu na inwekwu ọrụ maka ókèala ọha mmadụ ndị ahụ? Philmer Bluehouse gwara Teta!, sị: “Ịgba chaa chaa bụ mma agha ihu abụọ. Ajụjụ bụ, Ọ̀ ga-abara ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ uru karịa ka ọ na-emerụ ahụ?” Otu akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ụlọ ọkụ na-eri ego n’India emewo ka e nwee 140,000 ọrụ ná mba ahụ dum ma na-arụtụ aka na ndị India na-ahụ maka nanị 15 pasent n’ime ndị a.

Chiifu Cheyenne bụ́ Hart gwara Teta! echiche ya n’otú ụlọ ọkụ na-eri ego na ịgba chaa chaa si emetụta ókèala ọha mmadụ. Ọ sịrị: “Echiche ndị m nwere na-emegide onwe ha. Nanị ihe dị mma bụ na ọ na-enye ebo dị iche iche ọrụ na ego. N’aka nke ọzọ, achọpụtawo m na ọtụtụ ná ndị na-agba ya bụ ndị nke anyị. Ụfọdụ ndị m maara abụrụwo ndị ụlọ bingo riri ahụ, ha na-ahapụkwa ụlọ n’oge iji jee n’ebe ahụ ọbụna tupu ụmụaka alọta akwụkwọ. Mgbe ahụ, ụmụaka ndị a na-aghọ ụmụaka na-eji ugodi ụlọ ruo mgbe ndị mụrụ ha si ịgba bingo lọta.

“Nsogbu bụ isi bụ na ezinụlọ ndị ahụ na-eche na ha na-aga imeri, ma mụbaa ego ha na-akpata. N’ọtụtụ oge ha adịghị emeri; ha na-enwe mfu. Ahụwo m ka ha na-emefu ego ha chekwaworo maka iji zụta ihe e ji esi nri ma ọ bụ maka uwe maka ụmụaka.”

Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-abụ?

Tom Bahti na-akọwa na e nwere ụzọ abụọ a ma ama e si ele ihe anya mgbe a na-atụle ọdịnihu nke ebo Ndịda Ebe Ọdịda Anyanwụ. “Ụzọ mbụ na-ebu amụma na-ezoghị ọnụ banyere ịpụ n’anya dị nso nke ọdịbendị amaala gaa ná ndụ ndị America na-adị kwa ụbọchị. Nke abụọ dị mgbagwoju anya karị . . . O ji nwayọọ nwayọọ na-ekwu banyere usoro ịgbanwe ọdịbendị, na-atụ aro ngwakọta e chebaara ezi echiche nke ‘ndị kasị mma n’ihe ochie na ndị kasị mma n’ihe ọhụrụ,’ ihe yiri ụcha ọdịda anyanwụ n’ọdịbendị nke onye India pụrụ ịnọgide na-adị iche na nkà ya, nwee ọtụtụ okpukpe, nweekwa amamihe na nkà ihe ọmụma ya—ma ka jiri ezi uche na-eme ihe ná mmekọrịta ya n’ebe anyị (ọdịbendị [ndị ọcha] ka elu) nọ ịhụ ihe n’ụzọ anyị si ahụ ha.”

Mgbe ahụ Bahti na-ajụ otu ajụjụ. “A ghaghị inwe mgbanwe, ma olee ndị ga-eme mgbanwe, n’ihi gịnịkwa? . . . Anyị [ndị ọcha] nwere àgwà na-akpasu iwe nke iwere ndị ọzọ nile dị ka nanị ndị America na-emepeghị emepe. Anyị na-eche na ọ ghaghị ịbụ na ha enweghị afọ ojuju n’ụzọ ndụ ha, na-achọsikwa ike ibi ndụ na iche echiche dị ka anyị si eche.”

Ọ na-aga n’ihu, sị: “Otu ihe doro anya—akụkọ ndị American India agwụbeghị, ma a ka ga-ahụ otú ọ ga-esi bịa ná njedebe ma ọ bụ ọ bụrụ na ọ ga-abịa ná njedebe. Eleghị anya oge ka dị iji malite na-eche banyere ógbè ndị India anyị fọdụrụnụ dị ka ndokwa ọdịbendị bara uru karịa nanị dị ka nsogbu na-eju anya nke ọha mmadụ.”

Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Ịdị n’Otu na Ezi Ikpe

Site n’ụzọ Bible si ele ihe anya, Ndịàmà Jehova matara ihe ọdịnihu pụrụ ịbụ maka Ndị Amaala America na maka ndị nke mba, ebo na asụsụ nile. Jehova Chineke ekwewo nkwa ike “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.”—Aịsaịa 65:17; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1, 3, 4.

Nkwa a apụtaghị mbara ụwa ọhụrụ. Dị ka Ndị Amaala America maara nke ọma, ụwa a bụ ihe dị oké ọnụ ahịa ma a kwanyere ya ùgwù ma mesoo ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Kama nke ahụ, amụma Bible na-atụ aka na ịchịisi ọhụrụ nke eluigwe ga-anọchi anya gọọmenti ihe a kpọrọ mmadụ na-erigbu erigbu. A ga-agbanwe ụwa ka ọ ghọọ paradaịs ebe e weghachiri oké ọhịa, ala ndị dị larịị, osimiri, na anụ ndị bi n’ọhịa n’ọnọdụ ha. Mmadụ nile ga-ekere òkè n’ilekọta ala n’ụzọ ọdịmma onwe onye nanị na-adịghị ya. Nrigbu na anyaukwu agakwaghị ejupụta ebe nile. A ga-enwe ụba ihe oriri dị mma na ọrụ ndị na-ewuli elu.

N’ihe banyekwara mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, a ga-eme ka ikpe na-ezighị ezi nile gara aga gharakwa ịdị. Ee, ọbụna ndị Anasazi (okwu Navajo maka “ndị oge gboo”), ndị nna ochie nke ọtụtụ ndị Pueblo nke India, ndị bi n’Arizona na New Mexico, ga-alaghachi iji nwee ohere nke ndụ ebighị ebi n’ebe a n’elu ala nke e weghachiri eweghachi. Ọzọkwa, ndị ndú ahụ nile a ma ama n’akụkọ ihe mere eme India—Geronimo, Sitting Bull, Crazy Horse, Tecumseh, Manuelito, Chiifu Joseph na Seattle—na ọtụtụ ndị ọzọ pụrụ ịbịa ná mbilite n’ọnwụ ahụ e kwere ná nkwa. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Lee aha olileanya dị ebube nkwa Chineke na-enye ha nakwa ndị nile na-ejere ya ozi ugbu a!

[Foto dị na peeji nke 15]

Ihe atụ nke ụlọ “hogan” nke ndị Navajo, nke e ji osisi na ụrọ wuo

[Foto dị na peeji nke 15]

Ihe oyiyi nke Crazy Horse, ihe ndabere maka ịtụpụta ihe n’ugwu ahụ dị n’ala

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto nke Robb Dewall sere, site n’ikike Crazy Horse Memorial Foundation (nke na-adịghị achọ uru ego)

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndịàmà bụ ndị Hopi na ndị Navajo dị na Keams Canyon, Arizona, na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze a, n’ebe bụbu ọma ahịa

[Foto dị na peeji nke 16]

Ebe obibi ndị Anasazi malite n’ihe karịrị afọ 1,000 gara aga (Mesa Verde, Colorado)

[Foto dị na peeji nke 16]

Geronimo (1829-1909), chiifu a ma ama nke Apache

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike Mercaldo Archives/ Dictionary of American Portraits/Dover

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya