Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 11/8 p. 26-27
  • Nduzi Ònye Ka Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nduzi Ònye Ka Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aka Chineke Na-eduzi Ndị Ya
  • Jidesie Aka Chineke Ike!
  • “Guzonụ Onwe Unu n’Ebe A, Hụ Nzọpụta Jehova”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • ‘Jaa Ghọọrọ M Nzọpụta’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Jehova Rụrụ Ọrụ Ebube n’Oké Osimiri Uhie
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Chineke Napụtara Ụmụ Izrel
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 11/8 p. 26-27

Echiche nke Bible

Nduzi Ònye Ka Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

“OGE eruwo ka anyị laa!” ka nna ahụ na-amara nwa ya nwoke dị afọ ise n’ọkwa. Nna ya gbatịpụrụ aka, n’egbughịkwa oge nwa ya gara ma jiri obere aka ya gbakụọ ná mkpịsị aka nna ya. N’agbanyeghị ebe ije ahụ ga-eduga, nwa ahụ na-atụkwasị obi ná nduzi nke nna ya wee jiri obi ike na-eso ya. Ihe ọ sọrọ ya mee, nwa ahụ na-ejigidesi nna ya aka ike.

N’ibi n’ụbọchị ndị a nke ọnọdụ a na-ejighị n’aka nke akụ̀ na ụba, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na nke onwe onye, ọ̀ bụ na ị gaghị anabata nduzi site n’ebe ị pụrụ ịtụkwasị obi n’ụzọ zuru ezu? Ma, anyị na-ebi n’oge mgbe ndị na-enweghị ụkpụrụ na-erigbu ndị na-amaghị nke a na-akọ. Ya mere, e nwere ezi ihe mere e kwesịrị iji kpachara anya banyere onye anyị na-atụkwasị obi. Ikekwe i nwewo oké ndakpọ olileanya n’oge gara aga mgbe onye ị dabeere n’ebe ọ nọ maka nduzi mechuru gị ihu.

Ka o sina dị, Bible na-agba anyị ume ịtụkwasị obi anyị na Chineke. “N’ihi na Mụ onwe m, Jehova, Chineke gị, na-ejidesi aka nri gị ike, bụ́ Onye na-asị gị, Atụla egwu, Mụ onwe m enyeworo gị aka,” ka Aịsaịa onye amụma dekọrọ. (Aịsaịa 41:13) Pita onyeozi dụkwara ọdụ, sị: “Ya mere wedanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka O wee welie unu elu n’oge nke Ya; na-atụkwasịnụ Ya nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi.”—1 Pita 5:6, 7.

Ma, ị ka pụrụ ịjụ, sị, ‘Gịnị mere m ga-eji tụkwasị obi m n’ebe Chineke nọ maka nduzi?’ A na-achọta ihe ndị na-esonụ kwesịrị ekwesị n’ihe ndekọ nke ndị Israel oge ochie.

Aka Chineke Na-eduzi Ndị Ya

Usoro ihe omume ndị ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha kasị elu n’abalị Nisan 14, 1513 T.O.A., bibiri mkpebi siri ike nke onye na-eke ọrụ dị aka ike bụ́ Fero na nke ndị Ijipt, nke mere ka ha tọhapụ ndị Chineke, bụ́ ụmụ Israel, n’ohu. (Ọpụpụ 1:11-13; 12:29-32) Na Nisan 15, mba Israel ahụ na-aṅụrị ọṅụ chere ihu n’ọzara ka ha na-aga Ala Nkwa ahụ. Ụzọ kasị guzoro kwem bụ n’ebe ugwu Memfis, n’akụkụ ụsọ osimiri Mediterranean, na nso nso ala ndị Filistia ahụ a na-atụ egwu bi, wee banye n’Ala Nkwa ahụ. Otú ọ dị, Chineke bu ụzọ ọzọ n’obi.—Ọpụpụ 13:17, 18; Ọnụ Ọgụgụ 33:1-6.

Chineke nyere mba Israel oge ochie ahụ ihe nduzi a na-ahụ anya, nke pụtara dị ka ogidi igwe ojii n’ehihie na ogidi ọkụ n’abalị. (Ọpụpụ 13:21, 22) Tụkwasị n’ihe ịtụnanya a karịrị ike mmadụ, Jehova jiri nwoke ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ Mosis mee ihe dị ka onye nnọchiteanya ya n’elu ụwa. (Ọpụpụ 4:28-31) Ya mere, e nwere ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha na aka Chineke na-eduzi ndị Israel.

N’ebe nke abụọ ha mara ụlọikwuu ha, bụ́ Ịtam, “ná nsọtụ ọzara,” Jehova gwara Mosis ka ọ laghachi azụ wee biri n’ikpere mmiri nke Osimiri Uhie ahụ, na Paịhahaịrot. (Ọpụpụ 13:20) Ihe a yiri njem a na-apụghị ịkọwa ihe kpatara ya kpaliri Fero ikpebi na ndị Israel bụ “ndị a tụhịworo n’ala.” N’ịbụ onye e mesiri obi ike, Fero gbanwere obi ya. N’ịbụ onye kpebisiri ike ugbu a ijideghachi ndị Israel n’ohu, ọ chịkọtara ndị agha ya wee malite ịchụso ha.—Ọpụpụ 14:1-9.

Site n’ịkpọrọ mba ahụ gaa n’ụzọ dị iche, baa n’ihe o doro anya na ọ bụ ala dị larịị nke na-eduga n’Osimiri Uhie ahụ, o yiri ka Mosis na-eguzobe ndị Israel ịbụ ndị ugwu ndị ahụ dị n’akụkụ abụọ nke ọmụma ụlọikwuu ahụ dị na Paịhahaịrot, Osimiri Uhie ahụ, na ndị agha Fero na-abịaru nso mere ka ha bụrụ ndị na-apụghị ịga ihu ma ọ bụ azụ. O yiri ka ndị Israel aghọwo ebe e lekwasịrị anya dị mfe ibuda n’okpuru ma ọ bụ igbuchapụ ngwa ngwa.

Mmetụta dị aṅaa ka nke a nwere n’ebe ha nọ? Hà ga-egosipụta ntụkwasị obi ná nduzi Jehova? N’ihe nile anya na-ahụ, ọnọdụ ahụ bụ nke olileanya na-adịghị na ya. Ya mere, ụfọdụ malitere inwe ahụ erughị ala. Ndị ọzọkwa malitere ịtamu ntamu megide Mosis. Ọbụna na ụfọdụ dị njikere ịchịli aka elu wee laghachi n’ịbụ ohu n’Ijipt!—Ọpụpụ 14:10-12.

Jidesie Aka Chineke Ike!

N’ọnọdụ a ọ dị ndị Israel mkpa igosipụta ntụkwasị obi yiri nke nwatakịrị n’ebe Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nọ. Ọ bụ ezie na mba ahụ n’ozuzu ya amaghị, Jehova nwere ezi ihe mere o ji nye Mosis iwu ka ọ gafee Osimiri Uhie ahụ na Paịhahaịrot. Site n’iduzi ngafe ndị Israel baa n’Ala Nkwa ahụ n’ebe ndịda nke ala ndị Filistia, Jehova gosiri nghọta ịhụnanya. Mgbe ha nọsịrị afọ 215 n’Ijipt, obi abụọ adịghị ya na ndị Israel adịghị njikere maka ibu agha megide mba nke ndị dike obi tara mmiri. Ya mere, Jehova họọrọ ụzọ nke ga-eme ka e zere agha dị otú ahụ.a—Ọpụpụ 13:17, 18.

Mgbapụta nke mba ahụ na mmeri e meriri Fero na ndị agha ya n’Osimiri Uhie na-agba akaebe dị ịtụnanya nye ikike nzọpụta Chineke nwere. Ọzọkwa, lee aha ekele ndị Israel nwere bụ́ ndị, ọ bụ ezie na ha aghọtaghị ihe mere Chineke ji na-edu ha aga n’ụzọ dị iche, na-ahapụghị aka Chineke! Ha jidesiri ya aka ike wee hụ nkewa nke Osimiri Uhie ahụ kewara n’ụzọ ọrụ ebube tinyekwara mgbuchapụ nke ndị iro ha. A kwụghachiri ntụkwasị obi ha ná nduzi Jehova ụgwọ ọrụ.—Ọpụpụ 14:19-31.

Ọzọ, ka anyị tụlee ihe atụ nke nwatakịrị na-ejide aka nke onye mụrụ ya. Mgbe nwatakịrị nwere nchegbu, olee otú o si emeghachi omume? Kama ịgbahapụ aka ma ọ bụ na-ahapụ njisi aka ike ya, nwatakịrị ahụ na-ejidesi mkpịsị aka nke onye mụrụ ya ike. N’ime otú ahụ, ọ na-egosipụta ntụkwasị obi siri ike na onye mụrụ ya ga-enye nduzi na-adịghị ada ada na ume n’oge ihe isi ike.

N’otu aka ahụ, mgbe anyị nwere nsogbu ná ndụ anyị, ọ dị anyị mkpa ijisikwu aka anyị ike, ọbụna na-atụkwasị obi karị ná nduzi Chineke! Okwu Ya, bụ́ Bible, pụrụ ịghọ ìhè na-eduzi anyị. (Abụ Ọma 119:105) Chetakwa na ntụkwasị obi na ndidi na-agakọ. Ya mere, anyị aghaghị inye Jehova ohere idozi ihe, ọbụna ọ bụrụ na anyị apụghị ịghọtazu ruo n’oge ụfọdụ ihe mere o ji na-eduzi anyị n’otu ụzọ. Ee, anyị pụrụ ịtụkwasị obi ná nduzi Chineke.—Ọpụpụ 15:2, 6; Deuterọnọmi 13:4; Aịsaịa 41:13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere Paịhahaịrot, lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 638-639, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc. bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya