“Mgbe Ọ Bụla M Na-adịghị Ike, Mgbe Ahụ Ka M Na-adị Ike”
ETOLITERE m ná ntakịrị obodo dị n’ebe ugwu San Francisco, California, a na-akpọ Petaluma. Mama m jitụ okpukpe kpọrọ ihe, ma papa m enweghị mmasị n’okpukpe. Ekwenyere m mgbe nile n’onye okike—amaghị m nnọọ onye ọ bụ.
Mgbe m na-etolite, abụ m nwatakịrị nwere obi ụtọ. Lee ka m si jiri obi ụtọ na-echeta oge ndị ahụ m na-enweghị nchegbu! Amaghị m na ọ dị ihe ndị na-eme n’ime ahụ m nke ga-ewepụ ihe dị ukwuu ná nnwere onwe m. Ọ bụ na 1960, afọ ikpeazụ m n’ụlọ akwụkwọ dị elu, ka m chetara ịkọrọ ezi enyi m banyere mgbu m na-enwe ná mkpịsị aka m ụfọdụ.
N’oge na-adịghị anya ụkwụ m malitere ịfụ m ụfụ nke ukwuu nke na mama m kpọọrọ m gaa n’otu ụlọ ọgwụ dị na San Francisco, bụ́ ebe m nọrọ ihe dị ka ụbọchị isii. Adị m afọ 18 mgbe ahụ, nnyocha ndị e mere kpughekwara na m nwere ọrịa rheumatoid arthritis. A malitere ịgba m ọgwụ gold sodium thiosulfate, e mesịa prednisone, e mesịakwa ụdị cortisone ọzọ. Ná ngụkọta, a gbara m ọgwụ ndị ahụ ruo afọ 18, n’oge nke ọ bụlakwa ha belatara ahụ mgbu ahụ ruo afọ ole na ole ma jirizie nwayọọ nwayọọ ghara ịrụkwa ọrụ, a malitekwara ịgba m ọzọ. Apụghị m ileghara ahụ mgbu m na-enwe mgbe nile anya, aghọkwara m onye na-enweghị olileanya n’ọchịchọ m na-achọ ụdị ọgwụgwọ dị iche. Achọtawo m ụdị ọgwụgwọ ndị ọzọ nyetụworo aka. N’obi ụtọ, adịghị m enwerucha ahụ mgbu dị ka m na-enwe n’oge ọrịa ahụ ka njọ mgbe ọ na-amụba n’ime ahụ m.
Otu ụbọchị na 1975, nwa m nwoke hụrụ otu akwụkwọ ihe ndekọ nke mama m dekọrọ banyere m mgbe m bụ obere nwa. Achọpụtara m na mgbe m dị ọnwa isii, otu dọkịta malitere iji foto X ray gwọọ m n’ihi thymus zara aza. Ekwetara m na iji ụzarị ọkụ agwọ ọrịa nke e depụtaara m mgbe m bụ nwa ọhụrụ pụrụ ịbụ ihe mere m ji nọrọ n’ọnọdụ a taa. Ọ bụrụ otú ahụ, lee oké ihie ụzọ nke ahụ bụ!
Alụrụ m di na 1962. Na 1968, mgbe ọrịa ahụ ka na-amalite amalite, mụ na di m, bụ́ Lynn, rụkọrọ ọrụ ọnụ n’ebe a na-eme bred ọ bụ anyị nwe. Anyị ga-ebili n’ihe dị ka n’elekere anọ n’ụtụtụ, di m ga-agwakọta flawa ma hitụ ụra mgbe ụfọdụ n’elu akpa flawa mgbe bred dị n’ovun. Anyị ga-eberisị ya ma kwakọta ha, mgbe ahụ Lynn ga-ekesa ya. Otu oge, otu onye na-ere inshọransị kwụsịtụrụ n’ebe ahụ a na-eme bred wee gwa anyị banyere Alaeze Chineke e kwere ná nkwa. Anyị nwere mmasị n’ihe anyị nụrụ, ma anyị ji ọrụ n’aka gabiga ókè. Ebe ndị anyị na-ekesa bred nọ na-amụba, anyị ghọkwara ndị e ji ọbụna ọrụ ego ka ukwuu bogbuo. N’ụzọ nyere anyị obi ụtọ, ụlọ ọrụ ọzọ na-eme bred zụụrụ nke anyị! Lynn gawara ịrụrụ ha ọrụ, m gakwara ịrụ ọrụ n’ebe a na-edozi isi. Otú ọ dị, ka ọrịa arthritis ahụ na-akawanye njọ, apụrụ m ịrụ ọrụ nanị ụbọchị atọ n’izu, n’ikpeazụkwa akwụsịrị m kpam kpam.
N’oge ahụ, otu n’ime Ndịàmà Jehova na-abịachi anya n’ụlọ anyị ma na-enye m magazin Ụlọ Nche na Teta! Ana m enye ya ụtụ mgbe nile ma nara magazin ndị ahụ, na-eche na m na-emere ya ihe ọma. Mgbe ọ lawara, m ga-achịkwasị ha n’elu shelf n’emepeghị ha emepe ruo ụbọchị ole na ole, mgbe ahụkwa otu onye n’ime anyị na-atụfu ha mgbe nile. Nke ahụ dị nnọọ mwute, ebe anyị maara abamuru ime mmụọ ha ugbu a. Otú ọ dị, n’oge ahụ, okwu ndị metụtara okpukpe eyighị nnọọ ihe dịcha mkpa.
Ịmara Mkpa Ime Mmụọ Anyị
N’otu uhuruchi mụ na di m nọ na-akparịta otú a na-aghaghị isi nwee ihe karịrị iri ihe na ihi ụra na ịrụsi ọrụ ike ná ndụ. Anyị malitere ịchọgharị ọnọdụ ime mmụọ nke na-adịghị ná ndụ anyị. Anyị chigharịkwuuru otu obere chọọchị dị ná mgbada okporo ámá, ma anyị ahụghị mwuli elu ime mmụọ anyị tụrụ anya ya. Ndị òtù chọọchị ahụ kwukarịrị okwu banyere nsogbu ndị ha nwere n’ógbè ha.
Onyeàmà ahụ wetara magazin ndị ahụ anọwo na-abịa ruo ihe dị ka otu afọ, ma omume m agbanweghị ruo mgbe m mesịrị gụọ mbipụta Teta! nke October 8, 1968 (Bekee), nke a kpọrọ “Oge Ọ̀ Gafeela Karịa Otú I Chere?” Enwere m mmasị n’ihe m gụrụ, n’ụzọ na-enyekwa obi ụtọ, o metụtara di m n’otu ụzọ ahụ. Anyị malitere ịmụ ihe na ịmịkọrọ eziokwu ahụ dị ka ogbo. Anyị ji oké mmasị nakwere ihe nile dị ebube anyị na-amụta. Na 1969 e mere anyị baptism.
Ka oge na-aga, ọ ghọrọ ihe siiri m ike ibili ọtọ na ịnọdụ ala, o sikwara ike karị ịga ije. Aghaghị m iji ike jikọlata ikpere m iji banye na isi n’ime obere ụgbọala rịtuo. Amụtawo m ịnagide adịghị ike na ahụ mgbu ndị mere ka m na-ebe ákwá ọtụtụ mgbe. Ya mere m ga-etetụkwu ihe ntecha m, anyị ewee gawa nzukọ ma ọ bụ ozi ubi. Agara m site n’ụlọ ruo n’ụlọ ruo otú m nwere ike. Agbalịrị m ije ozi ubi otu ugboro ma ọ bụ abụọ kwa izu, ruo mgbe ịgbasi ike na ahụ mgbu nke ikpere na ụkwụ m mere ka ọ ghara ikwekwa omume. Echegburu m onwe m ọtụtụ mgbe banyere ịda ma ghara inwe ike ibili ọtọ. Ọ na-enye aka mgbe m gwara Jehova okwu. Mgbe ụfọdụ m na-eji anya mmiri dị ukwuu na-etiku ya.
Otú ọ dị, ibe ákwá anaghị ekwecha omume mgbe nile. Onye na-arịa ọrịa rheumatoid arthritis pụkwara inwe anya ịkpọ nkụ. Enwewo m mgbe ịkpọ nkụ ahụ siri ike nke na o siri ike ịgụ akwụkwọ. Mgbe nke ahụ mere, m na-ege tepu Bible. M na-amụchikarị anya wee na-agagharị n’ihi na imegharị mbubere anya m na-echikasị m anya. Agakwaara m ekpuworị ìsì. Mgbe ụfọdụ, aghaghị m ịtụnye anya mmiri aka mere n’anya m na minit ise ọ bụla. Ọbụna nke ka njọ, aghaghị m ịpịnye ọgwụ yiri ude n’anya m ma jiri bandeej kechie ya ruo ụbọchị ise ma ọ bụ isii ruo mgbe ha katụrụ mma. Ịnọgide na-enwe ekele abụghị ntakịrị ọrụ mgbe mmadụ na-agbaso ọrịa na-adịte anya mgba bụ́ nke a na-apụghị iji ezi uche tụọ anya ka ọ tụgharịa n’onwe ya n’usoro ihe a.
Na 1978, aghaghị m iwere oche nkwagharị. Ime mkpebi ahụ siri ike. Eyigharịwo m ya ruo otú m nwere ike, ma e nwekwaghị ihe ọzọ m ga-eme. Amatawo m na ụbọchị ahụ ga-abịa, ma olileanya m bụ na ụwa ọhụrụ Chineke ga-ebu ụzọ bịa. Lynn zụtara otu oche dị elu nke ndị na-ese ụkpụrụ ụlọ bụ́ nke nwere ala sara mbara maka ụkwụ ise. N’iji ya eme ihe, m pụrụ ịkwagharị onwe m n’ụlọ.
Ọ bụụrụ m ihe na-akụda mmụọ ịmatị aka were ihe, ebe ọ bụ na mụ apụghị ịgbatị ogwe aka m otú dị mma, apụghịkwa m iji mkpịsị aka m ndị gbagọsịrị agbagọ ma hịgharịa jidesie ihe ike. Ya mere, m na-eji osisi “njide” ihe m mee ihe. N’iji ya eme ihe, m pụrụ ịtụtụta ihe ndị dị n’ala, mepee kọbọd ma were efere, ma ọ bụ were ihe na friji. Ka m na-azụlite nkà ndị ọhụrụ n’iji osisi “njide” ihe m na-eme ihe, enwere m ike ịrụ ọrụ ụlọ ụfọdụ. Enwere m ike isi nri, ịsa efere, ide na ịpịachi ákwà, na ihicha ala ụlọ. Ana m enwetụ mmetụta nke afọ ojuju ka ikike m na-akawanye mma, obi dịkwa m ụtọ na m ka nwere ike ịtụnye ụtụ ná mkpa ụfọdụ nke ezinụlọ. Otú ọ dị, ihe ndị m na-enwebu ike imecha na minit ole na ole na-ewezi m ọtụtụ hour ugbu a.
Iji Telifon Na-agba Àmà
Ọ na-ewe oge, ma enwetara m obi ike ịnwale iji telifon na-agba àmà. Echeghị m na m ga-emeli ya, ma ọ na-atọ m ụtọ ugbu a n’ezie, enwewokwa m ezi ihe ịga nke ọma ụfọdụ. N’ụzọ juru m nnọọ anya, o yiri ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’echiche nke na m nwere ike iso ndị mmadụ kwurịta okwu banyere Jehova na nzube ya.
Otu n’ime ụzọ iche okwu n’ihu m na-eji eme ihe na-esi otú a amalite: “Ndeewo, ọ̀ bụ Maazị——? Abụ m Oriakụ Maass. M na-agwa ndị mmadụ okwu nanị ná mkpirikpi, ọ bụrụkwa na i nwere minit ole na ole, m̀ pụrụ isoro gị kwurịta okwu? (Azịza m na-enwetakarị bụ: “Ọ̀ bụ banyere gịnị?”) Ịhụ ihe na-eme n’ụwa taa na-atụ egwu, ọ̀ bụ na ọ dịghị atụ? (M na-enye ohere maka ikwu okwu.) M ga-enwe mmasị iso gị kerịta echiche a sitere na Bible nke na-enye anyị ezi olileanya maka ọdịnihu.” Mgbe ahụ m na-agụ Ekpere Onyenwe Anyị na ikekwe 2 Pita 3:13. Enyewo m ụmụnna nwanyị ndị Kraịst ndị ọzọ ma ọ bụ Lynn nletaghachi ụfọdụ ka ha gaara m.
N’afọ ndị gafeworonụ, enwewo m ọtụtụ mkparịta ụka dị mma, enwewokwa m ike izigara ndị gosiri mmasị broshuọ, magazin, na akwụkwọ. Ụfọdụ amalitewo ịmụ Bible site na fon. Otu nwaada m gwara okwu sịrị na ya chere na nanị ya ịmụ ihe n’onwe ya ga-ezu. Ma mgbe anyị nwesịrị ọtụtụ nkwurịta okwu, o kwetara ịbịa n’ụlọ anyị maka ọmụmụ Bible, ebe m gwara ya banyere ọnọdụ m.
Oge ọzọ mgbe m nọ na-akpọ na fon, ígwè na-anata ozi nyere m nọmba ọhụrụ. Ọ bụ ezie na m na-akpọkarị ógbè anyị, nke a abụghịkwa n’ógbè anyị, ka o sina dị a kpaliri m ịkpọ nọmba ahụ. Mgbe mụ na ya kwurịtasịrị okwu ruo nwa oge, nwaada zara fon ahụ kwuru na ya na di ya chọrọ iso ndị bụ́ ndị Kraịst n’ezie kwurịta okwu. Ya mere mụ na Lynn gara n’ụlọ ha, ihe dị ka otu hour site n’ebe obibi anyị, iji duziere ha ọmụmụ ihe.
M ka na-enweta ọṅụ na obi ụtọ n’ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova na nkwa ya banyere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, ebe ezi omume ga-ebi. Na nso nso a, otu nwanyị mụ na ya nọworo na-enwe nkwurịta okwu ruo ọtụtụ ọnwa gwara m, sị: “Mgbe ọ bụla m gwara gị okwu, m na-achọpụta na m na-enwetakwu ihe ọmụma.” Amaara m na ihe ọmụma mụ na ndị ọzọ na-ekerịta na-eduje ná ndụ ebighị ebi ma na-arụpụta ọṅụ nke pụrụ igbukepụta ọbụna n’ihu onye nwere nkwarụ dị ka m. Mgbe ụfọdụ ana m enwe ike ime ihe n’ozi karịa n’oge ndị ọzọ, ma ọ dị m ka ya bụrụ na m pụrụ ime ihe dị ukwuu, ihe ka ukwuu mgbe nile! Amaara m na Jehova maara ọnọdụ onye ọ bụla na ọ na-enwekwa mmasị n’ihe anyị nwere ike ime, n’agbanyeghị otú ọ pụrụ isi yie ihe dị nta. Echewo m echiche ọtụtụ mgbe banyere Ilu 27:11: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu,” achọkwara m iso ná ndị ga-eme Setan onye ụgha.
Ịnọ ná nzukọ na-enye m agbamume mgbe nile, ọ bụ ezie na o siiri m ike iru ebe ahụ. Jehova emeworo anyị nnọọ ọtụtụ ndokwa dị ebube iji bụrụ ndị a na-enyeju afọ n’ụzọ ime mmụọ nke na m chọrọ iji ha mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Lee ka obi si dị anyị ụtọ na ụmụ anyị abụọ emewo eziokwu ahụ nke ha! Nwa anyị nwanyị, bụ́ Terri, lụrụ otu ezi nwanna nwoke, ha nwekwara ụmụ anọ m hụrụ n’anya nke ukwuu. Lee ka o si enye anyị obi ụtọ ịhụ na ụmụ ụmụ anyị hụkwara Jehova n’anya! Nwa anyị nwoke, bụ́ James, na nwunye ya, bụ́ Tuesday, ahọrọwo ijere Jehova ozi na Betel dị na Brooklyn, isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, na New York.
Paradaịs Elu Ala Site n’Ike Jehova
M na-agbalị iburu n’uche nkwa Jehova dị ebube banyere elu ala paradaịs. Ọbụna ugbu a, e nwere ụbara nke ihe ndị o kere eke a ga-achọta obi ụtọ na ha. Ana m enwe mmasị n’ọdịda anyanwụ mara mma. Ana m enwe obi ụtọ n’ịdị iche iche nke okooko osisi na ísìsì ha. Enwere m mmasị n’okooko osisi rose! Enweghị m ike ịdị na-apụta n’ụlọ ọtụtụ mgbe, ma mgbe m nwere ike, ana m enwe nnọọ mmasị ná mmetụta nke anwụ ọchịcha na-ekpo ọkụ. Ana m emechi anya ma jiri uche see onyinyo nke ebe mara mma n’ugwu, ka ezinụlọ m na-ekpori ndụ n’ala ahịhịa nke jupụtara n’okooko osisi ọhịa. E nwere ntakịrị iyi na-asụpụta na ọtụtụ watermelon nwere mmiri dị ukwuu n’ime ya, nke dị ụtọ maka onye ọ bụla! Mgbe m nwere ike, m na-ese ihe ndị na-enyere m aka iche banyere Paradaịs elu ala ahụ e kwere ná nkwa nke gaje ịbịa. Ka m na-ese ihe, m na-eji uche ahụ onwe m n’ebe ahụ. Amaara m na Jehova pụrụ ime ka onyinyo dị oké ọnụ ahịa nke uche m bụ́ ndị m ji kpọrọ ihe ugbu a were ọnọdụ n’ezie.
M na-enwe mmasị iburu ihe e dere na Jemes 1:12 n’uche. Ọ na-asị: “Ngọzi na-adịrị nwoke onye na-atachi obi n’ọnwụnwa: n’ihi na mgbe a nwapụtaworo ya, ọ ga-anata okpueze ahụ, bụ́ ndụ, nke Onyenwe anyị kwere nkwa inye ndị hụrụ Ya n’anya.” Pọl jiri ọrịa o nwere tụnyere ‘mmụọ ozi nke Setan nke nọgidere na-eti ya aka.’ O kpere ekpere ka Jehova wepụ nkwarụ ya, ma a gwara ya na a na-eme ka ike Chineke zuo okè n’adịghị ike ya. Ya mere ihe ịga nke ọma Pọl n’agbanyeghị adịghị ike ya bụ ihe àmà nke ike Chineke n’ahụ ya. Pọl sịrị: “Mgbe ọ bụla m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:7-10) Ana m eche na ntakịrị ihe m pụrụ ime ugbu a n’agbanyeghị adịghị ike m nile bụ nanị site n’ike Chineke n’ahụ m.
Jọn dere ihe ndekọ nke na-agba m ume n’ezie. Ọ bụ banyere nwoke nke nọ n’elu àkwà ruo afọ 38. Ya na ndị ọzọ na-arịa ọrịa ga-eji olileanya dinara n’akụkụ otu ọdọ mmiri, na-achọsi ike inweta ume ọhụrụ n’ime ya. O nweghị ike iru ná mmiri ahụ, bụ́ nke o chere pụrụ ịgwọ ya. Otu ụbọchị Jisọs hụrụ ya wee jụọ ya, sị: “Ị̀ na-achọ ka e mee ka ahụ dị gị mma?” Lee otú anya mmiri ọṅụ m ga-esi zaa ajụjụ ahụ! “Jisọs sị ya, Bilie, chịrị ute gị, na-ejegharị.” (Jọn 5:2-9) E nwere ọtụtụ n’ime anyị na-echesi ike ịnụ ụdị òkù ahụ!—Dị ka Luretta Maass si kọọ.
[Foto dị na peeji nke 27]
Echere m banyere nwatakịrị hụrụ ndị mmadụ n’anya, leekwa ya n’ebe a, ka o ji obi ụtọ na-agafe ala ahịhịa ndụ
[Foto dị na peeji nke 28]
Mgbe obi dị m ụtọ, eji m uche see onyinyo nwa okoro na-achọ ịnwale ihe ka o ji osisi na-aga ije, ebe nkịta ya nọ n’okpuru ụkwụ ya
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
Idekọta nọmba fon maka ozi ubi
Ịkpọ fon