Ịhụnanya Anyị Maka Ubi
Ị̀ NA-ENWE mmasị n’ịdị jụụ nke ubi mara mma dị ka ebe mgbaba pụọ ná mkpọtụ na ime ihe ọkụ ọkụ nke ndụ? Ogige ndị dị jụụ na ala ahịhịa ha, okooko osisi, osisi ndị na-enye ndò, na ọdọ mmiri ha hà bụ ụdị ebe na-amasị gị karị ime mkpapụ gị na ezinụlọ gị ma ọ bụ iso otu enyi gagharịa? Ee, lee ka ubi si na-enye ntụsara ahụ, ume ọhụrụ, dị n’udo, na ọbụna na-agwọ ọrịa!
Ọ bụ ezie na ụfọdụ pụrụ izere ilekọta ubi, ikekwe n’ihi enweghị ohere, anyị nile na-enwe obi ụtọ n’àgwà, ísìsì ọma, ụda, na mkpụrụ osisi nke ubi. Thomas Jefferson—onye na-atụ ụkpụrụ ụlọ, ọkà mmụta sayensị, ọkàiwu, onye nchepụta ihe, na president United States—hụrụ ubi n’anya. O dere, sị: “Ọ dịghị ọrụ na-enye m obi ụtọ ka ịkọ ala. . . . M ka mikpuru onwe m n’ubi. Ma ọ bụ ezie na m bụ agadi nwoke, abụ m onye ọrụ ubi ka na-amalite amalite.”
Ọtụtụ ndị nwere echiche yiri nke ya. Ọtụtụ nde ndị nleta na-enuga kwa afọ n’ubi ndị a ma ama n’ụwa—Ubi Kew (Ubi Osisi nke Eze), n’England; ubi ndị dị na Kyoto, Japan; ubi nke Obí Eze nke Versailles, na France; Ubi Longwood, na Pennsylvania, U.S.A., ịkpọ nanị ole na ole. Ọtụtụ mba nwekwara ógbè ndị dị n’obodo ukwu ebe ụmụ obere osisi, osisi, na ụdị okooko osisi dị iche iche gbara ebe obibi, ndị dị n’okporo ámá ebe osisi dị n’akụkụ ha, gburugburu—dị ka ntakịrị paradaịs.
Ubi Pụrụ Ịkwalite Ahụ Ike
A chọpụtawo na mgbe ụmụ mmadụ nọdewere ihe ndị e kere eke, ahụ ike ha pụrụ ịka mma, ọ bụ ezie na nnọdewe ahụ abụghị ihe ọzọ ma e wezụga isi na window na-ekiri okooko osisi, osisi, ụmụ obere osisi, na nnụnụ. Nke a mere ka otu ụlọ ọgwụ dị na New York City kụọ ubi n’elu ụlọ ya. E ji “oké obi ụtọ nabata” ya, ka otu onye ọrụ ụlọ ọgwụ kwuru. “Ọ bụrụwo ihe na-akwali mmụọ nye ma ndị ọrịa ma ndị ọrụ. . . . Anyị na-ahụ ya dị ka ihe pụrụ inwe ike ịgwọ ọtụtụ ọrịa.” N’ezie, ihe ọmụmụ na-egosi na ndị mmadụ pụrụ irite uru n’ụzọ anụ ahụ, uche, na mmetụta uche site n’imejụ echiche ịmata ihe ha n’ihe e kere eke.
Ọzọkwa, onye na-eche banyere ihe ime mmụọ pụrụ inwe mmetụta nke ịnọdewe Chineke nso karị mgbe ọ nọ n’etiti ọrụ aka Ya. A pụrụ ịchọta akụkụ a nke ubi laa azụ n’ubi mbụ e nwere n’elu ala, Ogige Iden, ebe Chineke gwara mmadụ okwu na nke mbụ ya.—Jenesis 2:15-17; 3:8.
Ịhụnanya maka ubi zuru ụwa nile. Nke a kwa, dị ka anyị ga-ahụ, dị oké mkpa. Otú ọ dị, tupu anyị atụlee akụkụ ahụ, anyị na-akpọ gị òkù “ịgagharị” n’ime ubi ole na ole ndị e nwere n’akụkọ ihe mere eme iji hụ otú agụụ maka Paradaịs dịruru omimi n’obi mmadụ nile.