Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 4/8 p. 4-7
  • Ilenye Anya n’Ubi Ụfọdụ A Ma Ama

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ilenye Anya n’Ubi Ụfọdụ A Ma Ama
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ubi Ndị Mbụ
  • Site n’Ubi Ndị Arab Gaa n’Ubi Ndị England
  • Nhado Ala nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ
  • Ịhụnanya Zuru Ụwa Ọnụ
  • Ịhụnanya Anyị Maka Ubi
    Teta!—1997
  • Ihe Oriri Sitere n’Ubi nke Gị
    Teta!—2003
  • Ikwu na Ụwa Ga-aghọọ Paradaịs, Ọ̀ Bụ Ịmụ Anya Arọ Nrọ Ka Ọ̀ Bụ Eziokwu?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Olee ebe Paradaịs Baịbụl kwuru okwu ya dị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Teta!—1997
g97 4/8 p. 4-7

Ilenye Anya n’Ubi Ụfọdụ A Ma Ama

AHỤMAHỤ ụmụ mmadụ nwere banyere Paradaịs malitere n’ubi dị n’ógbè a kpọrọ Iden, ikekwe na nso nso Ọdọ Mmiri Van, nke Turkey oge a. Otu osimiri nke kewara ghọọ osimiri anọ na-ede ubi ahụ maka Adam na Iv, bụ́ ndị ‘ga-arụ ọrụ ya ma debe ya.’ Lee ihe obi ụtọ ọ ga-abụ ilekọta ubi ebe “osisi nile ọ bụla si n’ala puo, bụ́ nke a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri” jupụtara!—Jenesis 2:8-15.

Iden bụ ebe obibi zuru okè. Adam na Iv na ụmụ ha gaje ịgbasapụ ókèala ya, n’enweghị obi abụọ ọ bụla na-eji ụkpụrụ mbụ magburu onwe ya nke Chineke emere ihe nlereanya ha. Ka oge na-aga, ụwa dum ga-aghọ paradaịs nke jupụtara nnọọ nke ọma ná ndị mmadụ. Ma nnupụisi nke nne na nna anyị mbụ leziri anya nupụ rụpụtara ha ịbụ ndị a chụpụrụ n’ebe nchebe a. N’ụzọ dị mwute, a mụrụ ndị ọzọ nile so n’ezinụlọ mmadụ n’èzí ebe obibi a dị n’Iden.

Ka o sina dị, Onye Okike mere ihe a kpọrọ mmadụ ibi n’ime Paradaịs. Ya mere ọ bụ ihe ebumpụta ụwa na ọgbọ ndị dị n’ihu ga-agbalị iji ihe ndị yiri ya gbaa onwe ha gburugburu.

Ubi Ndị Mbụ

E towo Ubi Ndị Koro n’Elu nke Babilọn dị ka otu n’ime ihe ịtụnanya nke ụwa oge ochie. Ọ bụ Eze Nebukadneza wuru ha n’ihe karịrị afọ 2,500 gara aga maka nwunye ya bụ́ onye Midia onye agụụ maka ọhịa na ugwu nke ala nna ya gụsiri ike. Ihe owuwu a nke nwere nzọ̀ ma dị mita 22 n’ịdị elu, nke nwere elu ụlọ dakpuru ime, nke ha nile nwere ọtụtụ ihe ọkụkụ, nwere ájá zuru ezu iji zụọ osisi ndị buru ibu. Nwunye eze ahụ agụụ ụlọ na-agụ nwetara nkasi obi ma eleghị anya ka ọ na-akpagharị n’ebe a yiri Iden nke nwere ụzọ ngafe.

Ịkọ ubi nhado ala bụ nke a ma ama na Ndagwurugwu Naịl na-eme nri nke Ijipt. “Ijipt,” ka akwụkwọ bụ́ The Oxford Companion to Gardens na-ekwu, “bụ ebe e si seta foto kasị ochie n’ụwa banyere ubi na ebe e nwere ọdịnala dị nnọọ . . . ogologo nke ịkọ ubi.” Atụmatụ nhado ala otu ubi nke otu onye ọchịchị Ijipt nwere na Thebes, bụ́ nke dị laa azụ n’ihe dị ka 1400 T.O.A., na-egosi ọdọ mmiri nta, okporo ámá ndị osisi kwụ n’akụkụ ha, na ụlọ ndò. E wezụga ubi ndị eze, ubi ụlọ nsọ bụ ndị kasị ama poko poko, ebe ọwà mmiri ndị si n’ọdọ mmiri dị iche iche ndị jupụtara ná nnụnụ mmiri, azụ̀, na urodi mmiri na-ede ụmụ obere osisi, okooko osisi, na ahịhịa ha mmiri.—Tụlee Ọpụpụ 7:19.

Ndị Peasia so ná ndị mbụ mere ihe dị ịrịba ama n’ihe banyere ịkọ ubi. Ubi dị iche iche nke Peasia na Ijipt na-adọrọ adọrọ nke ukwuu nke na mgbe ndị agha na-enwe mmeri nke Aleksanda Onye Ukwu laghachiri Gris na narị afọ nke anọ T.O.A., ha bu ọtụtụ mkpụrụ, ihe ọkụkụ, na echiche wee laa. N’Atens, Aristotle na nwa akwụkwọ ya bụ́ Theophrastus chịkọtara ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ihe ọkụkụ ma kọọ ubi ihe ọkụkụ, iji mụọ ma gụnye ihe ọkụkụ ná nkebi nkebi. Ọtụtụ ndị Gris nwere ego, dị ka ndị Ijipt na ndị Peasia bu ha ụzọ, nwere ubi ndị gburu ego.

Ndị bi n’obodo ukwu Rom wukọtara ụlọ na ubi ná ntakịrị ohere dị n’obodo ukwu ahụ. Ndị nwere ego wuru ogige ntụrụndụ ndị mara oké mma n’ebe obibi ha ndị dị ná mpụga obodo. Ọbụna onye ọchịchị aka ike bụ Nero chọrọ Iden nke ya, ya mere o ji obi ịta mmiri chụpụ ọtụtụ narị ezinụlọ, bibie ebe obibi ha, ma wuo ogige onwe onye dị ihe karịrị hekta 50 gburugburu obí ya. Ka e mesịrị, n’ihe dị ka na 138 O.A., n’ebe obibi nke Eze Ukwu Hadrian nke dị na Tivoli, nhado ala nke ndị Rom ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu. Ebe obibi ahụ nwere ogige, ọdọ mmiri dị iche iche, na isi mmiri dị hekta 243.

Ndị Israel oge ochie nwekwara ubi na ogige. Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus na-ede banyere ogige ndị mara mma jupụtara n’iyi ndị dị n’ebe a na-akpọ Etam, ihe dị ka kilomita 13 ruo 16 site na Jerusalem. Ogige nile nke Etam pụrụ isoworị n’ime ‘ubi, ogige, ọdọ mmiri, na oké ọhịa’ ndị Bible na-ekwu na Solomọn ‘meere onwe ya.’ (Eklisiastis 2:5, 6) Kpọmkwem ná mpụga Jerusalem n’elu Ugwu Olive bụ ebe Ogige Getsemane dị, nke Jisọs Kraịst mere ka ọ bụrụ nke a ma ama. N’ebe a, Jisọs hụrụ otu ebe mgbaba ọ pụrụ ịnọ kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe n’enweghị mkpọtụ.—Matiu 26:36; Jọn 18:1, 2.

Site n’Ubi Ndị Arab Gaa n’Ubi Ndị England

Mgbe ndị agha Arab gbasara gaa n’akụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ na narị afọ nke asaa O.A., ha onwe ha, dị ka Aleksanda, hụrụ ubi ndị Peasia. (Tụlee Esta 1:5.) “Ndị Arab,” ka Howard Loxton na-ede, “hụrụ na ubi ndị Peasia yiri nnọọ paradaịs e kwere ndị kwesịrị ntụkwasị obi ná nkwa n’ime Koran.” Dị ka ụdị ya nke ndị Peasia, ubi ndị Arab, malite na nke ndị Moor nke Spain ruo Kashmir, bụ nke iyi anọ e jikọtara ọnụ n’etiti site n’otu ọdọ mmiri ma ọ bụ isi mmiri kewara ụzọ anọ, na-echetara mmadụ banyere osimiri anọ ahụ nke Iden.

N’ebe ugwu India, ndị ọchịchị Mogul nke narị afọ nke 17 kụrụ ihe karịrị ubi 700 yiri paradaịs n’akụkụ Ọdọ Mmiri Dal dị na Ndagwurugwu Kashmir mara mma. Ndị a ghọrọ mgbasapụ nke ụdị àgwà dị iche iche nke ọtụtụ narị isi mmiri, ụzọ ngafe, na ntakịrị mmiri ndị si n’elu awụdata kewasịrị. Ụlọ ndò ahụ nke Shah Jahan (onye wuru Taj Mahal) ji nkume ojii wuo n’ikperé Ọdọ Mmiri Dal ka bu ihe odide bụ́: “Ọ bụrụ na e nwere paradaịs n’elu ala, ọ bụ ebe a, ọ bụ ebe a, ọ bụ ebe a.”

Narị afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, Europe esiwo na Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya banye n’Oge Ntụte nke narị afọ nke 14. Ọdịnala ịkọ ubi nke ndị Rom, bụ́ nke a zọdara ala mgbe oge Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya malitere na narị afọ nke ise O.A., maliteghachiri ime nke ọma—ugbu a n’okpuru ịchịisi nke chọọchị. Krisendọm hụrụ ubi dị ka ‘paradaịs dịgodị mgbe ahụ.’ Otu ụkpụrụ ụlọ ndị mọnk e sere na narị afọ nke itoolu na-egosi ubi abụọ a kpọrọ “Paradaịs.” N’oge na-adịghị anya ubi ndị nke Krisendọm buwanyere ibu ma dịwanye ebube, ma kama inye echiche ihe ime mmụọ, ọtụtụ ghọrọ ihe àmà nke ike na akụ̀ na ụba.

Mgbe Charles nke Asatọ nke France meriri Naples, Itali, na 1495, o degara akwụkwọ ozi n’ụlọ, sị: “Unu agaghị ekweta ụdị ubi mara mma ndị m nwere n’obodo ukwu a . . . O yiri ka nanị Adam na Iv bụ ihe na-anọghị na ya ime ya paradaịs elu ala.” Ma a sị na Charles dịruru ndụ na narị afọ nke 17, ọ gaara ahụ ubi ndị sara mbara nke Eze Louis nke Iri na Anọ n’ala France. Akwụkwọ bụ́ The Garden na-ekwusi ike na ubi ndị dị n’Obí Eze nke Versailles “ka pụrụ ịzọrọ ịbụ nke kasị ibu na ebube n’ụwa.”

Otú ọ dị, Oge Ntụte ahụ nwere nkọwa ọhụrụ banyere paradaịs: ihe okike ga-anọ n’okpuru mmadụ nwere nghọta bụ́ onye ga-eme ka ubi dị n’usoro site n’iwepụ ihe nile na-enye ya ọdịdị ọhịa. A haziri osisi na okooko osisi nile ná nkezi ndị a kapịrị ọnụ. Ya mere, ịkwa osisi oge gboo nke ndị Rom—nkà ịgbazi osisi na ụmụ obere osisi site n’ịkwachasị na ịgbazi ha—nwere ntụteghachi na-atụ n’anya.

Ka e mesịrị, na narị afọ nke 18 na nke 19, ime njem na azụmahịa mmiri kpugheere ụwa ọdịda anyanwụ ihe ọkụkụ na echiche ndị ọhụrụ nke ịkọ ubi. England malitere ichebara ịhazi ubi echiche karị. “N’England nke narị afọ nke 18,” ka akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, “mmadụ matawanyere banyere ụwa e kere eke nke ọ bụ otu akụkụ ya. Kama ibokwasị ụwa e kere eke ọ̀tụ̀tụ̀ nkezi ya ndị mmadụ mere, ọ malitere ịtụle ịgbanwe ndụ ya iji kwekọọ na ya.” Ndị dị ka William Kent na Lancelot Brown kasị bụrụ ọkpọka ná nhado ala. Brown haziri ihe karịrị ala na ụlọ narị abụọ n’England. Mmadụ abụọ ndị ghọrọ president United States, bụ́ Thomas Jefferson na John Adams, mere njem nleta n’England na 1786 iji mụọ ubi ndị England.

Nhado Ala nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ

Ọdịnala ịkọ ubi nke China bụụrụ mmepeanya Ọwụwa Anyanwụ ihe ọdịnala Ijipt, Gris, na Rom bụụrụ Ọdịda Anyanwụ. Na mbụ ndị China na-ekpe okpukpe nke kwere na ihe nile e kere eke nwere mmụọ, nke na-ele osimiri, oké nkume, na ugwu nile anya dị ka mmụọ nwogharịrị enwogharị n’ihi ya kwa bụrụ ndị a ga-akwanyere ùgwù. Mgbe nke ahụ gasịrị, okpukpe Tao, Confucius, na Buddha gazuru ala ahụ ma wepụta ụdị ubi nke ha.

N’akụkụ nke ọzọ nke Oké Osimiri Japan, ubi Japan zụlitere ụdị nke ha, bụ́ ebe ọdịdị na-adị mkpa karịa àgwà, ihe ọ bụla nwekwara ọnọdụ ya kpọmkwem. Ná mgbalị inwetacha, n’ime ohere dị ntakịrị, ịma mma na ịdịgasị iche iche nke okike, onye na-akọ ubi na-eji nlezianya edebe nkume ya ma na-eji ịdị uchu akụ ihe ọkụkụ ya ma na-elekọta ya. Nke a pụtara ìhè na bonsai (nke pụtara “ihe ọkụkụ a kụnyere n’ime ite”), bụ́ nkà nke ịzụ ntakịrị osisi ma ọ bụ ikekwe obere ọhịa osisi inwe otu ụdị na ibu kpọmkwem.

Ọ bụ ezie na otú e si akụ ya pụrụ ịdị iche ná ndị nke Ọdịda Anyanwụ, ubi Ọwụwa Anyanwụ na-egosipụtakwa agụụ siri ike maka Paradaịs. Dị ka ihe atụ, n’oge Heian na Japan (794-1185), ka onye Japan na-akọ akụkọ ihe mere eme banyere ubi bụ́ Wybe Kuitert na-ede, ndị na-akọ ubi nwara ịkpasu ọdịdị “paradaịs n’elu ala.”

Ịhụnanya Zuru Ụwa Ọnụ

Gụnyere ọbụna ebo ndị na-achụ nta ma na-akọ ugbo, ndị biri n’ubi “okike”—oké ọhịa dị iche iche na ala ahịhịa—ịhụnanya maka ubi zuru ụwa ọnụ. Banyere “ndị Aztec nke Mexico na ndị Inca nke Peru,” ka akwụkwọ bụ́ Britannica na-ekwu, “ndị mmeri ahụ kọrọ banyere ubi ndị buru ibu ndị nwere ugwu ndị ụzọ ngafe dị na ha, obere ọhịa, isi mmiri, na ọdọ mmiri e ji chọọ mma . . . dị ka ubi ndị dị ugbu a n’Ọdịda Anyanwụ.”

Ee, obere ọhịa oge ochie ndị dị n’akụkụ Naịl, nhado ala nke ebe Ọwụwa Anyanwụ, ogige oge a ndị dị n’obodo ukwu, na ubi ihe ọkụkụ—gịnị ka ihe ndị a na-egosi? Agụụ siri ike nke ihe a kpọrọ mmadụ nwere maka Paradaịs. N’ịrịba ama ‘agụụ a na-adịgide adịgide maka Paradaịs,’ onye edemede bụ́ Terry Comito kwuru, sị: “Ubi bụ ebe ndị mmadụ na-enwetaghachi ahụ iru ala.” Oleekwa mmadụ na-agaghị enwe obi ụtọ n’ikwu, sị, ‘Ebe obibi m yiri Ubi Iden’? Ma ubi Iden zuru ụwa ọnụ—ọ bụghịkwa nanị maka ndị bara ọgaranya—ọ̀ bụ nanị nrọ? Ka ọ̀ bụ ihe ga-eme eme n’ọdịnihu?

[Foto dị na peeji nke 7]

Otú onye na-ese ihe si see Ubi Ndị Koro n’Elu nke Babilọn

[Foto dị na peeji nke 7]

Versailles, France

[Foto dị na peeji nke 7]

Otu ubi oge ochie na Japan

[Foto dị na peeji nke 7]

N’akụkọ ihe mere eme nile ụmụ mmadụ enwewo agụụ maka Paradaịs

[Ebe E Si Nweta Foto]

French Government Tourist Office/Rosine Mazin

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya