Ndịàmà Jehova Nọ na Russia—Echiche Onye Ọka Mmụta Okpukpe
NA Rom, ndị ndú nke ógbè ndị Juu na narị afọ mbụ kwuru banyere Iso Ụzọ Kraịst, sị: “Ihe banyere ịrọ òtù a, anyị mazuuru na a na-ekwugide ya ebe nile.” Gịnị ka ndị ndú ahụ mere? N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ha jekwuuru Pọl onyeozi, onye e ji eji n’ụlọ n’oge ahụ, ma kwuo, sị: “Ọ dị anyị mma ịnụ n’ọnụ gị ihe ị tụkwasịrị uche gị na ha.” (Ọrụ 28:22) Ha gere onye Kraịst maara nke a na-akọ ntị kama ndị ahụ kwugidere Iso Ụzọ Kraịst.
Sergei Ivanenko, onye Russia bụ ọkà mmụta okpukpe a na-akwanyere ùgwù, mere ihe yiri ya. Ọ bụ ezie na o kwere ọtụtụ n’ime akụkọ na-adịghị mma banyere Ndịàmà Jehova ndị nọ na-agbasa na Russia, o kpebiri ịkpọ alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà, dị nnọọ ná mpụga St. Petersburg maka ihe ọmụma. Ọ nakweere ọkpụkpọ òkù ịga leta ebe ahụ, ịjụ ajụjụ, na iji anya ya kirie Ndịàmà.
Mgbe Maazị Ivanenko rutere n’October 1996, ihe owuwu ahụ nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke 200 ndị ọrụ alaka nke Ndịàmà Jehova nọ na Russia bi na ha na-abịaru nso ngwụsị ha. Ruo ụbọchị atọ na-esochinụ e nyere ya ohere ikiri ebe ihe owuwu ahụ, iri nri n’ụlọ iri ihe, na ịgba onye ọ bụla masịrị ya ajụjụ ọnụ.
E bipụtara otu isiokwu nke Maazị Ivanenko dere banyere Ndịàmà n’akwụkwọ akụkọ Russia na-ewu ewu nke na-apụta kwa izu bụ́ Moscow News nke February 16-23, 1997. Isiokwu ahụ, nke a kpọrọ “Ànyị Kwesịrị Ịdị Na-atụ Ndịàmà Jehova Ụjọ?,” pụtakwara ná mbipụta Bekee nke Moscow News, nke February 20-26. Ebe ọtụtụ ndị na-agụ Teta! nwere mmasị dị ukwuu n’ọrụ Ndịàmà Jehova na Russia, anyị na-ebipụtaghachi n’ebe a, site n’ikike anyị natara, ihe ka ukwuu n’isiokwu a. Maazị Ivanenko ji ahụmahụ na-esonụ, nke pụtara ná mkpụrụ okwu ndị gbara okpotokpo malite:
“‘Ndị na-arọ òtù, sinụ na Russia pụọ!’ ka e dere n’akwụkwọ ịma ọkwa nke ndị òtù LDPR nke Zhirinovsky na-ebugharị, bụ́ ndị na-akwụgharị n’otu nzukọ nke Ndịàmà Jehova. ‘Olee ihe na-amasịghị gị banyere nzukọ a?’ ka m jụrụ otu n’ime ndị ahụ na-eme nkwụgharị. O nyefere m otu Megapolis-Express nke nwere isiakụkọ bụ́ ‘Ntiwapụ Ọrịa Ọta Kpụrụkpụrụ Okpukpe na Kamchatka.’ Akwụkwọ ahụ kwuru na iji mejuo igbe ego nke nzukọ ahụ, Ndịàmà Jehova na-achọtara ndị akwụna ndị ahịa, ma nwee òtù ndị akwụna, na-ekesa ọrịa mmekọahụ n’etiti ndị ọrụ ụgbọ mmiri. ‘Ì sokwa n’otu n’ime ndị ha nwetara?’ ka m jiri ọmịiko jụọ, ‘Ì kwere n’ihe ọmụma a?’ ‘Nke ahụ adịghị mkpa,’ ka ọ zara. ‘Ihe bụ isi bụ na ịrọ òtù America a na-emebi ọnọdụ ime mmụọ na ọdịbendị Russia, anyị aghaghịkwa ịkwụsị ya.’”
Isiokwu ahụ Maazị Ivanenko dere sochiri n’okpuru ahịrịokwu bu aha ya: “Site n’aka Sergei Ivanenko, ọkà mmụta okpukpe, ọkà mmụta nkà ihe ọmụma.”
“Ikwu eziokwu dị otú a dị ụkọ n’ezie, ọ bụ ezie na ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị Russia adịghị eche nnọọ echiche ọma banyere Ndịàmà Jehova. Nanị ikwute otu okwu banyere nzukọ a na-eduje n’ọtụtụ okwu banyere ajọ ịnụbiga ọkụ n’obi ókè ya, mmalite ya n’America, banyere okwukwe kpuru ìsì nke ndị òtù ya nkịtị nwere ná ndị ndú nzukọ ahụ, na nkwenkwe bụ na ọgwụgwụ ụwa dị nso. Ndịàmà Jehova na-akpali ma egwu ma ọchịchọ ịmata ihe nye ọtụtụ ndị.
“Gịnị Ka Okpukpe A Bụ, Ànyị Kwesịkwara Ịtụ Ya Ụjọ?
“Iji chọpụta nke a n’onwe m, emere m nleta n’obodo nta bụ́ Solnechnoye dị n’ógbè Kururtnoye, St. Petersburg, bụ́ ebe e nwere ebe nlekọta ọrụ nke Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Russia.
***
[Nke a dị] n’ebe e nwere ihe bụbu ogige oge okpomọkụ. Ka ọ na-erule 1992 ihe owuwu [mbụ] ahụ adakpọsịwo nke ọjọọ ya, ndị ngagharị na-enweghị ebe obibi na ìgwè òké nọchikwara ụmụaka. N’ụzọ doro anya ọ bụ n’ihi ọnọdụ ndakpọsị nke ógbè ahụ nyeere Ndịàmà Jehova aka inweta ibé ala ahụ dị hekta asaa iji mee ihe ruo oge a na-akaghị aka. Ha rụzigharịrị ihe owuwu ndị ochie ahụ ma malitekwa iwu ndị ọhụrụ, tinyere otu ụlọ nlekọta ọrụ dị okpukpu anọ, otu [Ụlọ Nzukọ Alaeze] nke na-aba mmadụ 500, na otu ụlọ iri ihe. Ndịàmà Jehova na-akụkwa ahịhịa ọhụrụ (ndị e mere ọda pụrụ iche maka ha site na Finland) na ụdị osisi dị iche iche dị ụkọ. A na-atụ anya ịrụcha ọrụ ahụ n’oge okpomọkụ a na-abịanụ. Ọrụ bụ isi nke ebe nlekọta ọrụ ahụ bụ ịhazi ọrụ nkwusa na ibugara ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè dị iche iche akwụkwọ. Solnechnoye enweghị ígwè obibi akwụkwọ nke ya, ya mere a na-ebi akwụkwọ ndị Russia na Germany, bugazie ha St. Petersburg, bụ́ ebe a na-esi ekesa ha n’ógbè ndị ahụ. Ihe dị ka mmadụ 190 na-arụ ọrụ n’ebe ahụ. Ha na-arụ ọrụ n’afọ ofufo, ọ bụkwa ezie na ha adịghị anata ụgwọ ọnwa, a na-enye ha ihe nile bụ isi dị mkpa, dị ka ebe obibi, nri, na uwe.
“Kọmitii nke ndị okenye 18 na-eduzi ọrụ n’ebe ahụ. Vasily Kalin anọwo na-abụ onye nchịkọta nke ebe nlekọta ọrụ ahụ kemgbe 1992. A mụrụ ya n’Ivano-Frankovsk. Na 1951, mgbe ọ dị afọ anọ, a chụpụrụ ya na ndị mụrụ ya gaa Siberia (na 1949 na 1951 ndị ọchịchị kpagburu ihe dị ka ezinụlọ 5,000 n’ihi ịbụ Ndịàmà Jehova). E mere ya baptism na 1965, o bikwara n’ógbè Irkutsk. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nọ n’isi n’ụlọ ọrụ na-akwọ osisi.
“E wezụga ndị ọrụ afọ ofufo nke ebe nlekọta ọrụ ahụ e nwekwara ndị ọrụ ihe owuwu 200 nyere onwe ha n’afọ ofufo sitere Russia, Finland, Sweden na Norway ndị bi na Solnechnoye: Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha weere ohere ịhapụ ọrụ ego ha. E nwekwara ọtụtụ Ndịàmà Jehova si Ukraine, Moldova, Germany, United States, Finland, Poland na mba ndị ọzọ. (Ndịàmà Jehova enweghị ajọ mbunobi megide agbụrụ ọ bụla. N’agbanyeghị eziokwu bụ na ndị Georgia, ndị Abkhaz, ndị Azerbaijan na ndị Armenia na-ebikọ ọnụ n’ebe ahụ, n’ime afọ anọ e nwebeghị otu mkpụrụ esemokwu.)
“Mba ndị Scandinavia nyere ihe ka ukwuu n’ime ngwá ọrụ ahụ e ji ewu ihe, ndị kwere ekwe ibe ha wetakwara ihe dị ukwuu n’efu. E gosiri m otu bulldozer nke otu Onyeàmà Jehova bụ́ onye Sweden butere na Solnechnoye na 1993. Ọ rụrụ ọrụ na ya n’oge nile ọ nọrọ n’ebe ahụ, tupu ya alaakwa o nyere ya ụmụnna ya n’otu okwukwe. E nyere ndị ọrụ ihe owuwu ahụ ụlọ n’ụlọ ndị ọtụtụ ndị na-ebi na ụlọ nta ndị mara mma. Usoro ihe omume ha n’ụbọchị bụ: 7:00 ụtụtụ—nri ụtụtụ na ekpere; ha na-amalite ọrụ na 8:00 ụtụtụ ruo 5:00 mgbede na-ewere otu hour maka nri ehihie. Na Saturday ha na-arụ ọrụ ruo oge nri ehihie, ma Sunday bụ ụbọchị ezumike.
“Ha na-eriju afọ, mkpụrụ osisi na-eso mgbe nile ná nri ndị a na-ebupụta. Okpukpe a adịghị ebu ọnụ ọ bụla ma ọ bụ amachibido nri ọ bụla kpam kpam. Mgbe a rụsịrị ọrụ, ọtụtụ na-aga na sauna, ṅụọkwa biya wee nọdụ nnọọ ala na-egere egwú. E nweghị ndị aṅụrụma n’etiti Ndịàmà Jehova, ma e gbochighịkwa ịṅụ mmanya na-aba n’anya. A na-enye ndị kwere ekwe ohere ịṅụ mmanya, cognac, vodka na ndị ọzọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova adịghị ese siga.
***
“Ugbo atọ n’izu a na-enwe nnọkọ ọmụmụ Bible, bụ́ nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ na-abịa ya bụ ndị na-eto eto. Otú ọ dị, ọ bụghị ihe na-adịghị emekebe ịhụ ndị bụworo Ndịàmà Jehova ruo afọ 30-40. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị agadi nile ahụ anọwo n’ụlọ mkpọrọ, ogige ịta ahụhụ na ná mba ọzọ. Mgbe oge mmegbu ahụ gasịrị ọtụtụ ndị dọkịta, ndị ọkàiwu, ndị injinịa, ndị nkụzi, ndị ọchụ nta ego, na ụmụ akwụkwọ sonyeere Ndịàmà Jehova.
“Ọgbakọ dị iche iche na-agbalị ichekwa mmụọ nke ịha nhata n’etiti ndị òtù ha. Dị ka ihe atụ, ọbụna onye nchịkọta nke ebe nlekọta ọrụ ahụ na-asa efere ná mgbede mgbe o ruuru ya. Ndịàmà Jehova na-agwarịta ibe ha okwu n’ụzọ enyi na enyi, ha ga-etinyekwa ya ‘nwanna nwoke’ ma ọ bụ ‘nwanna nwanyị’ mgbe ha na-akpọ mmadụ n’aha ya.
“Mgbe Onyeàmà Jehova mebiri ozizi Bible ma jụ ichegharị, a na-enye ya ụdị ntaramahụhụ kasị sie ike—a na-achụpụ ya. Onye ahụ ka pụrụ ịga nzukọ, ma ndị kwere ekwe ibe ya adịghị ekelekwa ya. Nzọụkwụ nke na-esichaghị ike ga-abụ ịdọ aka ná ntị.
***
“Etinyere m ogologo oge n’ikiri Ndịàmà Jehova na-agbalị ịchọpụta ihe kpọbatara nnọọ ọtụtụ ndị dị iche iche n’ime nzukọ okpukpe a. N’agbanyeghị ọdịiche ndị dị n’ụdị mmadụ ha bụ, ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ na ihe ndị na-amasị na ndị na-adịghị amasị mmadụ, [Ndịàmà Jehova adịghị ekere òkè n’ife ofufe ha na] okpukpe ndị na-ekwenyere ụwa mmehie a. Ahụ adịghị eru ha ala n’ebe [ndị mmadụ] na-aghaghị ikwenyere n’ọchịchị n’ajụghị ase, ebe e nwere ohere maka nkwenye n’ihe omimi, ebe e kewara ndị mmadụ gaa ná ndị nọ n’isi na n’ọha ndị na-erube isi.
“Ihe e jiri mara Ndịàmà Jehova bụ nkwenkwe ha siri ike n’ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ na Bible. Ha na-agbalị iji otu ụkpụrụ Bible nke a ma ọ bụ nke ọzọ akwado ihe ọ bụla ha na-eme, ma ọ bụ site n’ihota otu akụkụ ihe odide sitere n’Agba Ochie ma ọ bụ Agba Ọhụrụ. Ndịàmà Jehova kwere na nanị Bible nwere azịza nye ajụjụ nile. Nye Ndịàmà Jehova, Bible bụ ụkpụrụ iwu, usoro iwu obodo na nkwupụta kasị elu nke eziokwu.
“N’ihi nke a a maara Ndịàmà Jehova gbaa ụwa gburugburu dị ka ndị na-erube isi n’iwu n’ụzọ a na-apụghị ịta ụta ma karịsịa n’ihi àgwà ịkwụwa aka ọtọ ha n’ịtụ ụtụ isi. Ọfịs na-ahụ maka ụtụ isi na-enyocha ha mgbe nile, ọ na-ejukwa ya anya oge ọ bụla ịchọpụta na e nweghị ịda iwu ọ bụla. Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova pụrụ, dị ka ọtụtụ ndị ọzọ, ịgbalị ịchọta ihe mere ha na-agaghị eji tụọ ụtụ isi, ma Bible na-asị na mmadụ aghaghị ime ihe n’eziokwu n’ịtụ ụtụ isi, nyekwa Ndịàmà Jehova nke a bụ okwusịa obie.
“Otú ọ dị, àgwà ikwenyesi ike ha na Bible na-abụkarị ihe na-akpata oké esemokwu ụfọdụ n’etiti Ndịàmà Jehova na ọchịchị. Nguzo ha siri ike nke etinyeghị aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ọkpụrụkpụ ihe na-akpata esemokwu, ọ na-apụtakwa ìhè n’ọjụjụ ha jụrụ ịrụ ọrụ soja.
“Ndịàmà Jehova na-akọwa okwu Jisọs banyere otú ndị na-eso ụzọ ya na alaeze ya na-esighị bụrụ akụkụ nke ụwa a n’ụzọ nkịtị, n’ihi nke a kwa ha na-ajụ ikere òkè ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha, n’agbanyeghị ebe na ihe mere e ji na-ebu ya. N’ihi na Ndịàmà Jehova jụrụ iti ‘Heil Hitler’ na ije ozi n’usuu ndị agha Hitler, e zijere ọtụtụ puku ndị kwere ekwe n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi, ọtụtụ puku nwụkwara. Ndị Russia weere Onyeàmà Jehova ọ bụla bụ́ onye Germany nke jiri ndụ ya kwụọ ụgwọ n’ihi ịjụ ikere òkè ná mwakpo megide Soviet Union dị ka onye mere omume e kwesịrị ịja mma. Otú ọ dị, n’otu mgbe ahụ, a dịghị akpali ọtụtụ ndị Russia inwe ọmịiko maka Ndịàmà Jehova ahụ [bụ́ ndị Russia] e gburu n’ihi ịjụ ibuli ngwá agha na ikere òkè n’Agha Ụwa nke Abụọ, ma ọ bụ ndị a mara ikpe n’ihi ịjụ ịrụ ọrụ soja n’oge udo. Ma n’ọnọdụ abụọ ahụ Ndịàmà Jehova nọ na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ ná nkwenkwe okpukpe ha, ọ bụghịkwa nkweta ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
“N’oge na-adịghị anya gara aga nsogbu yiri nke ahụ bilitere na Japan, ebe ụfọdụ ụmụ akwụkwọ bụ́ Ndịàmà Jehova jụrụ ịmụ egwuregwu ọgụ aka na ụkwụ ma nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị a chụpụrụ na mahadum. Na 1996 Ụlọikpe Kasị Elu nke Japan mere mkpebi na-akwado ikike ụmụ akwụkwọ a nwere ma nye ha ohere iwere ihe ọmụmụ ndị ọzọ.
***
“Olee ihe a na-ahụ n’ebe Ndịàmà Jehova nọ nke na-atụ ndị na-eche echiche nke oge a n’anya? Karịsịa ọ bụ nnọgidesi ike ha n’ikwusa na ọgwụgwụ ụwa dị nso (ha na-arụ ọrụ ozi ala ọzọ n’okporo ámá na site n’ụlọ ruo n’ụlọ). Na nso nso a ndị okenye adụwo ndị na-ekwusa ozi ọma ọdụ ka ha ghara ikwubiga okwu ókè banyere ‘ọgwụgwụ ụwa’ na ọdachi dị mwute ga-abịakwasị ndị mmehie, kama nke ahụ ka ha na-akọwara ndị na-ege ntị na Jehova na-enye ha ohere inweta ‘ndụ ebighị ebi na paradaịs n’elu ala.’
“Ihe ọzọ na-akpata iwe bụ àgwà enweghị mmasị nke Ndịàmà Jehova n’ebe ngwakọrịta okpukpe dị, na ọjụjụ ha na-ajụ njikọ okpukpe. Ha kwere na ọha ndị Kraịst ajụwo Chineke na Bible, nakwa na okpukpe nile ọzọ bụ ajọ ihie ụzọ. Ndịàmà Jehova na-eji okpukpe ndị a atụnyere ‘nwanyị na-akwa iko nke Babilọn,’ ma na-ekwusi ike na otu ọdachi ahụ ga-adakwasị ha. Otu mbipụta na-adịbeghị anya nke ‘Teta!’ na-ekwu na ọgwụgwụ adịwo nso maka okpukpe dị iche iche, nakwa na nanị okpukpe ga-afọdụ bụ nke ahụ Ndịàmà Jehova na-ekwusa.
“Dị ka o si daba, Ndịàmà Jehova ghọtara ikike onye ọ bụla nwere n’ebe nnwere onwe akọ na uche dị.
***
“Ọtụtụ mba ekwupụtalarị nchegbu banyere ma ozizi Ndịàmà Jehova ọ̀ bụ ihe iyi egwu nye ọha mmadụ ka ọ̀ bụ na ọ bụghị. Ụlọikpe Kasị Elu nke steeti nke Connecticut, United States (1979) na New South Wales, Australia (1972), Ụlọikpe Ógbè nke British Columbia, Canada (1986) na ụlọikpe ndị ọzọ ekwupụtawo na e nweghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na Ndịàmà Jehova bụ ihe iyi egwu nye ọha mmadụ, ma ọ bụ na ha bụ ihe iyi egwu nye ahụ ike ma ọ bụ ọnọdụ mmetụta uche ndị mmadụ. Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe (1993) kwadoro ikike Ndịàmà Jehova nwere n’ebe nnwere onwe ikpe okpukpe dị, bụ́ nke a kpaara ókè na Gris na Austria. Taa a na-akpagbu Ndịàmà Jehova ná mba 25 . . .
“A pụrụ iwere Ndịàmà Jehova dị ka ihe nlereanya nye ndị amaala ibe ha n’ihi nrapagidesi ike ha n’eziokwu Bible na ịdị njikere ha ịgbachitere nkwenkwe ha n’achọghị nnọọ ọdịmma onwe ha. Ma ajụjụ na-ebilite: Ọha mmadụ anyị hà dị njikere iwepụta ụkpụrụ iwu na-akwado nnwere onwe akọ na uche nye nzukọ ndị na-agbadosi ụkwụ ike n’ụzọ ime ihe ha Bible kwadoro n’akụkụ nile nke ndụ n’ụzọ a siri ike, nke na-adịghị adakwa ada?”
N’ahịrịokwu ikpeazụ a, Maazị Ivanenko welitere ajụjụ dị mkpa. Na narị afọ mbụ, Pọl onyeozi, onye Kraịst họọrọ n’onwe ya ije ozi dị ka onye nnọchiteanya ya, tara ahụhụ na-ezighị ezi nke ịnọ ‘n’agbụ.’ N’ihi ya, Pọl degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ banyere mgbalị ya “n’ime ngọpụ nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.”—Ndị Filipaị 1:7; Ọrụ 9:3-16.
Ndịàmà Jehova taa na-anabata mmadụ nile inyocha ọrụ ha nke ọma, dị ka Maazị Ivanenko mere. Obi siri anyị ike na ọ bụrụ na ndị mmadụ emee ya, ha ga-achọpụta na akụkọ ndị na-adịghị mma a na-akọ banyere Ndịàmà abụghị eziokwu, dị nnọọ ka akụkọ ndị dị otú ahụ banyere ndị Kraịst oge mbụ na-abụghịkwa eziokwu. N’ụzọ dị ịrịba ama, Ndịàmà na-erube isi ‘n’iwu ọhụrụ’ nke Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya: “Hụrịta ibe unu n’anya; dị ka M hụrụ unu n’anya.”—Jọn 13:34, 35.
[Igbe dị na peeji nke 25]
Faịlụ MN
(E bipụtakọrọ ihe ọmụma na-esonụ sitere na faịlụ Moscow News ya na isiokwu a sitere n’aka Sergei Ivanenko.)
“Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Russia bụ akụkụ nke nzụkọ ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ na-arụ ọrụ ná mba 233 ma nwee nde 5.4 ndị òtù. Ndịàmà Jehova na-agbaso nduzi ime mmụọ nke Òtù Na-achị Isi nọ na Brooklyn, New York. Nzukọ Ndịàmà Jehova nke oge a malitere site na nnọkọ ọmụmụ Bible nke Charles Taze Russell hiwere na 1870 na Pittsburgh, Pennsylvania. Nzukọ ahụ bịara na Russia na 1887. A chụpụrụ otu n’ime Ndịàmà Jehova mbụ bụ́ onye Russia bụ́ Semyon Kozlitsky site na Moscow gaa Siberia na 1891. N’agbanyeghị mkpagbu nke nzukọ ahụ diri, na 1956 e nwere Ndịàmà Jehova 17,000 na Soviet Union. E nyeghị Ndịàmà Jehova nkwado na Russia ruokwa na March 1991, mgbe e tisịrị iwu ‘Banyere Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe.’ Taa e nwere ihe karịrị ìgwè 500 nwere ihe dị ka ndị òtù 70,000 na-anụ ọkụ n’obi na Russia. Nzukọ ahụ na-ekesa ‘Ụlọ Nche’ (nke a na-ebipụta n’asụsụ 125, nkesa nde 20) na ‘Teta!’ (n’asụsụ 81, nkesa nde 18).”
[Foto dị na peeji nke 25]
Otu akụkụ nke ihe owuwu alaka ụlọ ọrụ ahụ na Russia
[Foto dị na peeji nke 26]
Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe ezinụlọ nke alaka dị na Russia na-ezukọ maka ọmụmụ Bible
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Ezinụlọ Ndịàmà na-amụkọ ma na-enwekọ ntụrụndụ ọnụ
[Foto ndị dị na peeji nke 28]
Ha na-eso ndị ọzọ ekerịta ihe ọmụma Bible