Òtù Ikpe Russia Ewepụ Ndịàmà Jehova n’Ụta
NDỊÀMÀ JEHOVA na-anabata akụkọ ndị a na-akọ banyere ha n’usoro mgbasa ozi mgbe e dere akụkọ ndị dị otú ahụ n’ụzọ ezi uche dị na ya. Ọzọkwa, Ndịàmà Jehova dị njikere inye ihe ọmụma bụ́ eziokwu banyere onwe ha na nkwenkwe na ọrụ okpukpe ha. Otú ọ dị, mgbe e dere ihe ndị na-ekwu ihe na-abụghị eziokwu banyere ha ma ọ bụ ndị na-ekwutọ ha, mgbe ụfọdụ Ndịàmà na-ekpesara ndị gọọmenti iji chebe ihe ndị ruuru ha n’ụzọ okpukpe na dị ka ụmụ amaala. Tụlee otu ihe atụ mere na nso nso a.
N’August 1, 1997, Komsomolskaya pravda, bụ́ akwụkwọ akụkọ Russia a ma ama, bipụtara otu isiokwu nke kwuru ihe na-abụtụghị eziokwu banyere Ndịàmà Jehova n’ihe ntinye na-abụ maka ógbè na St. Petersburg. N’isiokwu ahụ, bụ́ nke a kpọrọ “Ịrọ Òtù Petersburg. A Ga-enwe Ụlọukwu Dị n’Obodo Ukwu n’Ebe A,” onye dere ya, bụ́ Oleg Zasorin, zọọrọ na Ndịàmà Jehova na-akpata nsogbu site na nkwenkwe ha nakwa na ọrụ ha na-emebi Ụkpụrụ Iwu Russia. Ihe ka ukwuu n’okwu ọjọọ ahụ bụ nhịgharị nke nkwenkwe Ndịàmà bụ́ ndị dabeere na Bible banyere, dị ka ihe atụ, mmịnye ọbara na mmekọrịta ezinụlọ. Ọzọkwa, isiokwu ahụ kpọrọ Ndịàmà Jehova “ịrọ òtù,” na-azọrọ na ha bụ, n’anya ụfọdụ ndị, “nke kasị dị ize ndụ n’ime ịrọ òtù nile.”
Ebe Nlekọta Ọrụ Maka Òtù Okpukpe Ógbè nke Ndịàmà Jehova na Russia rịọrọ Òtù Ikpe President Na-ahụ Maka Esemokwu Ndị Metụtara Usoro Mgbasa Ozi ná Mba Russia ka ha tụleghachi ihe ndị e kwuru n’isiokwu ahụ, bụ́ nke Ndịàmà Jehova lere anya dị ka ụgha. Ndị nnọchiteanya nke Ndịàmà Jehova nọ ná nzukọ Òtù Ikpe ahụ na February 12, 1998, ma zaa ọtụtụ ajụjụ ndị so n’òtù ahụ, nakwa ndị odeakụkọ na ndị ọkàiwu jụrụ. Iji chọpụta ihe Ndịàmà Jehova kwere ma na-ezi n’ezie, ndị so n’Òtù Ikpe ahụ jiri nlezianya nyochaa akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara, nke ka nke akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.
V. V. Borshchyov, bụ́ osote onyeisi Ndị Ome Iwu Obodo ná Mba Russia, kwuru na okwu bụ́ “ịrọ òtù” na-enye nnọọ echiche na-adịghị mma. Maazị Borshchyov kwuru, sị: “Ime otú masịrị mmadụ [dị otú ahụ] na inye aha ọjọọ dị oké ize ndụ. Eziokwu ahụ bụ́ na Òtù Ikpe ahụ kwetara ịtụle akwụkwọ Ndịàmà Jehova gbara dị nnọọ mkpa. A ghaghị ịkwụsị oké ịkpọasị na mkparị dị otú ahụ a na-akparị òtù okpukpe ndị e debanyere aha ha n’akwụkwọ.”
Mgbe ha nụsịrị akaebe ahụ nile, Òtù Ikpe ahụ kwubiri na isiokwu ahụ dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Komsomolskaya pravda megidere iwu na ụkpụrụ omume; ọ chọpụtakwara na isiokwu ahụ jupụtara n’ụgha ma bụrụ nke na-enweghị ebe ọ gbadoro ụkwụ. “Onye dere ya akọwapụtaghị otu ihe ọ bụla bụ eziokwu . . . Onye dere akwụkwọ akụkọ ahụ gbasara asịrị dị ka akụkọ bụ eziokwu, jiri ikike ndị odeakụkọ nwere na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi,” ka Òtù Ikpe ahụ kwuru. N’adịghị ka ihe isiokwu akwụkwọ akụkọ ahụ kọrọ, Òtù Ikpe ahụ chọpụtara na Ndịàmà Jehova bụ ndị na-erube isi n’iwu nakwa na ha na-ezi ndị òtù ha isoro ezinụlọ na ndị ọzọ, bụ́ ndị na-ekwenyeghị na nkwenkwe okpukpe ha, na-ebi n’udo.
Otu awa ka a nụsịrị akaebe ikpeazụ, Òtù Ikpe ahụ kwupụtara mkpebi ya:
“1. Iwere mbipụta nke e bipụtara isiokwu ahụ bụ́ ‘Ịrọ Òtù Petersburg. A Ga-enwe Ụlọukwu Dị n’Obodo Ukwu n’Ebe A’ dị ka imebi ihe Akụkụ Iwu nke 4, 49, na 51 nke Iwu Mba Russia na-achọ n’aka ‘Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi.’
“2. Ịtụ aro ka Kọmitii Obodo nke Mba Russia nke Na-ahụ Maka Ihe E Bipụtara Ebipụta tụleghachi okwu banyere ịdọ òtù bọọdụ na-ahụ maka ihe a na-ebipụta n’akwụkwọ akụkọ ahụ bụ́ Komsomolskaya pravda aka ná ntị.
“3. Ịbara odeakụkọ bụ́ O. Zasorin mba.
“4. Ịtụ aro ka òtù bọọdụ na-ahụ maka ihe a na-ebipụta n’akwụkwọ akụkọ ahụ bụ́ Komsomolskaya pravda rịọ mgbaghara maka mbipụta o bipụtara akụkọ na-abụghị eziokwu nke na-ekwutọ òtù okpukpe nke Ndịàmà Jehova n’enweghị ebe ha gbadoro ụkwụ.”
Mkpebi a nke Òtù Ikpe ahụ kwekọrọ ná nkwubi okwu nke onye ọkà mmụta okpukpe na ọkà mmụta nkà ihe ọmụma bụ́ Sergei Ivanenko. Mgbe o jisịrị nlezianya nyochaa nkwenkwe Ndịàmà Jehova ma soro ha kpakọrịta, Maazị Ivanenko, bụ́ onye na-abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova, dere otu isiokwu nke pụtara ná mbipụta nke February 20-26, 1997, nke akwụkwọ akụkọ bụ́ Moscow News.a Maazị Ivanenko kwubiri, sị: “Ihe e jiri mara Ndịàmà Jehova bụ nkwenkwe ha siri ike n’ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ na Bible. . . . Nye Ndịàmà Jehova, Bible bụ ụkpụrụ iwu, usoro iwu obodo na nkwupụta kasị elu nke eziokwu. . . . A pụrụ iwere Ndịàmà Jehova dị ka ihe nlereanya nye ndị amaala ibe ha n’ihi nrapagidesi ike ha n’eziokwu Bible na ịdị njikere ha ịgbachitere nkwenkwe ha n’achọghị nnọọ ọdịmma onwe ha.”
Mkpebi nke Òtù Ikpe ahụ na okwu Maazị Ivanenko kwadoro na okpukpe ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova abụghị ihe ize ndụ nye ọha mmadụ, kama nke ahụ, ọ bụ maka abamuru nke ndị nile nwere obi eziokwu. Ndịàmà Jehova nọgidere ‘na-abụ ndị e doziworo ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ ha ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime ha, ma jiri nwayọọ na egwu na-eme otú ahụ.’—1 Pita 3:15.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Site n’ike a natara, e bipụtaghachiri ihe ka ukwuu n’isiokwu Maazị Ivanenko dere, bụ́ nke a kpọrọ “Ànyị Kwesịrị Ịdị Na-atụ Ndịàmà Jehova Ụjọ?” ná mbipụta Teta! nke September 8, 1997, peji nke 24-29.