Ikike Ịkpọrọ Nwa—Okpukpe na Iwu
N’OKWU ịgba alụkwaghịm na ikike ịkpọrọ nwa, okpukpe pụrụ ịbụ ihe dị mkpa—na nke dị mgbagwoju anya. Dị ka ihe atụ, ajụjụ ndị dị ka ndị na-esonụ pụrụ ibilite.
Ọkàikpe ò kwesịrị ịtụle ihe akaebe na-azọrọ na otu nne ma ọ bụ nna ekwesịghị inwe ikike ịkpọrọ nwa n’ihi na nne ma ọ bụ nna ahụ bụ onye òtù nke otu okpukpe, karịsịa okpukpe nke ọnụ ọgụgụ ka ala na-aga? Ọkàikpe ò kwesịrị ịtụle ihe akaebe banyere nkwenkwe na omume okpukpe nke nne na nna ka o wee nwee ike ikpebi, n’echiche nke ya, okpukpe ga-akasị mma maka nwatakịrị? Ò kwesịziri inye iwu ka a zụlite nwatakịrị n’okpukpe ahụ ma machibido ikpughe nwatakịrị nye okpukpe ndị ọzọ?
Taa, ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-arị elu na-alụ di na nwunye n’okpukpe na agbụrụ na-abụghị nke ha. Ya mere mgbe di na nwunye ndị a gbara alụkwaghịm, ụmụaka ha pụrụ inweworị nkekọ n’okpukpe abụọ. Mgbe ụfọdụ, nne ma ọ bụ nna nọ n’ikpe ịgba alụkwaghịm pụrụ n’oge na-adịbeghị anya ịnabatawo otu okpukpe nke dị iche na nke nne ma ọ bụ nna ahụ nọ na mbụ. Mmekọrịta okpukpe ọhụrụ ahụ pụrụ ịbụ ihe na-eme ka a kwụsie ike ná ndụ nke nne ma ọ bụ nna ahụ, dịkwa ya oké mkpa ma bụrụ nke ụmụaka ya na-amaghị. Ya mere ajụjụ ọzọ na-ebilite, Ụlọikpe ọ̀ pụrụ ịmachibido nne ma ọ bụ nna iwu ịkpọrọ ụmụaka ya gaa ihe omume okpukpe a nanị n’ihi na ọ dị iche n’okpukpe nke nne na nna ahụ na-ekpebu?
Ndị a bụ ajụjụ siri ike. Ha chọrọ ka ọkàikpe tụlee ọ bụghị nanị mkpa nke nwatakịrị kamakwa mmasị na ihe ndị ruuru nne na nna.
Ihe Ndị Bụ Isi Ruuru Nne na Nna na Ụmụaka
Ọ bụ eziokwu na echiche okpukpe ha pụrụ imetụta ndị ọkàikpe. Ma n’ọtụtụ ala o yighị ka a ga-eleghara ihe ndị ruuru nne na nna ma ọ bụ nwatakịrị n’ụzọ okpukpe anya. Ala ndị a pụrụ inwe ụkpụrụ iwu ndị na-amachibido ọkàikpe igbochi ihe ndị bụ isi ruuru nne na nna nke ịtụzi nzụlite nke nwatakịrị, gụnyere ntụziaka agụmakwụkwọ na nke okpukpe nke nwatakịrị.
N’aka nke ya, o ruuru nwatakịrị ịnata ọzụzụ dị otú ahụ site n’aka nne na nna ya. Tupu ọkàikpe enwee ike itinye aka dị ka iwu kwadoro n’ọzụzụ okpukpe nke nwata, ụlọikpe aghaghị ịnụ ihe àmà rijuru afọ na “omume otu okpukpe bụ ihe iyi egwu dị adị na nke gbara ọkpụrụkpụ nye ọdịmma anụ ahụ nke nwatakịrị.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ndịrịta iche nkịtị banyere okpukpe ma ọ bụ ọbụna ibu iro n’etiti nne na nna banyere okpukpe ezughị ezu ịgọpụ ntinye aka nke Ọchịchị.
Na Nebraska, U.S.A., ọnọdụ ezi uche dị na ya nke otu nne bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova weere n’otu esemokwu ikike ịkpọrọ nwa na-enye ihe atụ otú ihe ndị a iwu kwuru si echebe ma nne ma nna ma ụmụaka. Nna ahụ nke na-abụghị Onyeàmà achọghị ka ada ha gaa ihe omume okpukpe nke Ndịàmà Jehova n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụlọikpe ka ala kwenyeere nna ahụ.
Nne ahụ tinyeziri akwụkwọ ikpegharị ikpe n’Ụlọikpe Kasị Elu nke Nebraska. Nne ahụ rụrụ ụka na e nweghị ihe àmà nke iyi egwu dị adị ma ọ bụ nke gbara ọkpụrụkpụ nye ọdịmma nke nwa ahụ n’ihe omume ọ bụla nke Ndịàmà Jehova. Nne ahụ gbara akaebe “na ịga na ikere òkè n’ihe omume okpukpe nke ma nne ma nna ahụ ga-enye . . . ihe ndabere maka nwa ahụ ikpebi okpukpe nke ọ ga-ahọrọ mgbe o ruru afọ ndụ zuru ezu nke nghọta.”
Ụlọikpe ahụ ka elu gbanwere mkpebi nke ụlọikpe ahụ ka ala ma kwupụta na “ụlọikpe ahụ [ka ala] ji ikike ime mkpebi ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi n’itinye ihe mgbochi n’ihe ruuru nne ahụ nke nwere ikike ịkpọrọ nwa ịchịkwa nzụlite okpukpe nke obere nwa ya.” E nweghị ihe àmà ọ bụla ma ọlị na a na-emerụ nwa ahụ ahụ site n’ịga ihe omume okpukpe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova.
Ihe Ndị Ruuru Nne na Nna Na-enweghị Ikike Ịkpọrọ Nwa
Mgbe ụfọdụ, nne na nna gbara alụkwaghịm na-agbalị iji esemokwu banyere ọzụzụ okpukpe eme ihe dị ka ụzọ isi nweta nchịkwa nke ụmụaka. Dị ka ihe atụ, n’ikpe nke Khalsa megide Khalsa, okwu ikpe e nwere na steeti New Mexico, U.S.A., ma nne ma nna ahụ ekpewo okpukpe Sikh n’oge alụmdi na nwunye ha. Ma nwa oge ka ha gbasịrị alụkwaghịm, nne ahụ nakweere okpukpe Katọlik ma malite ịkụda ụmụaka ahụ obi pụọ n’ikpe okpukpe Sikh.
Nna ahụ were iwe ma wepụ okwu ahụ n’ụlọikpe ná mgbalị inwetakwu ikike iduzi ọzụzụ okpukpe nke ụmụaka ahụ gaa n’okpukpe Sikh ya. Olee otú ụlọikpe nnwale ikpe ahụ si zaghachi arịrịọ nna ahụ? Ọ jụrụ arịrịọ ya. Ụlọikpe nnwale ikpe ahụ nyere iwu na “mgbe [ya] na ụmụaka ahụ nọ, ha apụghị ikere òkè n’ihe omume ọ bụla nke ndị Sikh n’ọchịchọ onwe ha ma ọ bụ ná mmanye, gụnyere ihe omume chọọchị ọ bụla, ọmụma ụlọikwuu ndị Sikh ma ọ bụ ebe nlekọta ụmụaka nke ndị Sikh.”
Nna ahụ tinyere akwụkwọ ikpegharị ikpe maka mkpebi a n’Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe nke New Mexico. Ụlọikpe a ka elu kwenyeere nna ahụ ma gbanwee mkpebi nke ụlọikpe nnwale ikpe ahụ. Ụlọikpe mkpegharị ikpe ahụ kwuru, sị: “Ụlọikpe kwesịrị ịgbaso ụkpụrụ nke eleghị mmadụ anya n’ihu n’etiti okpukpe, ma kwesị itinye aka n’akụkụ a chọrọ nlezianya na nke ụkpụrụ iwu chebere nanị ebe e nwere ihe àmà doro anya na nke pụtara ìhè nke mmerụ ahụ nye ụmụaka. Ihe mgbochi n’akụkụ a na-eweta ihe ize ndụ bụ na ịkpa ókè ndị ụlọikpe tinyere ga-emegide nnwere onwe okpukpe nke onye bụ nne ma ọ bụ nna n’ụzọ iwu na-akwadoghị ma ọ bụ bụrụ nke a ghọtara na ọ na-enwe mmetụta ahụ.”
Mkpebi dị otú ahụ na-agbaso ogologo ahịrị nke ụkpụrụ ndị e guzobeworo nke ọma n’ọtụtụ ala. Nne ma ọ bụ nna nwere ezi uche ga-atụle ụkpụrụ ndị a. Ọzọkwa, nne ma ọ bụ nna bụ́ onye Kraịst ga-eji nlezianya tụgharịa uche ná mkpa nwatakịrị maka mkpakọrịta n’ebe ma nne ma nna nọ, tinyekwara ibu ọrụ nke nwatakịrị ịsọpụrụ ma nne ma nna ya.—Ndị Efesọs 6:1-3.
Ndozi Na-abụghị n’Ụlọikpe
Ọ bụ ezie na ndozi na-abụghị n’ụlọikpe pụrụ ịdịtụ ka nke enyi na enyi karịa ịnụrụ okwu n’ihu ọkàikpe, nne ma ọ bụ nna ekwesịghị iwere ya dị ka ihe na-adịghị mkpa. Iwu ụlọikpe ndị ga-esochi pụrụ ime ka nkwekọrịta ọ bụla ndị e nwekọrịtara ma ọ bụ ụkpụrụ ndị a tụrụ n’usoro ikike ịkpọrọ nwa a dị irè. Ya mere, ọ ga-abụ ihe kwesịrị ekwesị nne ma ọ bụ nna ijekwuru ọkàiwu nweworo ahụmahụ banyere iwu ezinụlọ iji jide n’aka na e doziri okwu nile metụtara ikike ịkpọrọ nwa n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma zie ezi.
Nne ma ọ bụ nna kwesịrị iji nwayọọ kwadoo maka usoro ndozi ahụ. Omume na àgwà nne ma ọ bụ nna mgbe usoro ndozi ahụ na-aga n’ihu pụrụ imetụta ihe ga-esi na ya pụta n’ụzọ dị ukwuu. Ọtụtụ mgbe, nne na nna na-agba alụkwaghịm na-enwe oké mmetụta uche n’ihe omume ịgba alụkwaghịm ahụ nke na ha na-elefuru okwu ndị dị mkpa anya: Gịnị bụ ọdịmma kasịnụ nke nwatakịrị? Gịnị dị nwatakịrị mkpa ka o wee nwee ike itolite n’uche, n’ụzọ mmetụta uche, na n’ụzọ anụ ahụ?
Cheta na site n’ụzọ iwu si ele ihe anya, okwu bụ isi ná ndozi abụghị ndịrịta iche okpukpe ma ọ bụ nke onwe onye ndị ọzọ, kama otú nne na nna pụrụ isi chọta ihe ga-adị onye ọ bụla mma ma ruo otu nkwekọrịta maka ọdịmma nke ụmụaka. Ikekwe nne ma ọ bụ nna ga-echebiri ajọ mbunobi okpukpe ma ọ bụ ajọ mbunobi ndị ọzọ, ajụjụ ndị a na-atụghị anya ha, ma ọ bụ aghụghọ ndị a haziri iji kpalie ma kpasuo iwe. A pụrụ ikpughe ma ọ bụ ọbụna kwubiga okwu ókè banyere adịghị ike nke nne ma ọ bụ nna. Otú ọ dị, mgbe ndị o metụtara nọgidere na-egosi ezi uche, a pụrụ iru ná nkwekọrịta.
Mgbe ụfọdụ, usoro ndozi ahụ pụrụ iyi nke e setịrị ogologo ma na-akụda mmụọ. Nhọrọ ọzọ bụ usoro ikpe ikpe dị ogologo nke ụlọikpe tinyere nkọsa ya na-eme ihere, ibu arọ ego ya, na mmetụta na-emerụ ahụ n’ebe nwatakịrị nọ. N’ezie nke ahụ adịghị atọ ụtọ. Dị ka ọ dị banyere oké nsogbu nile ná ndụ, nne ma ọ bụ nna bụ́ onye Kraịst kwesịrị iji ekpere mee ihe banyere usoro ndozi ahụ, na-echeta ọkpụkpọ òkù ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ “kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ; tụkwasịkwa Ya obi, Ya onwe ya ga-emekwa ya.”—Abụ Ọma 37:5.
Ma gịnị ma ọ bụrụ na a pụghị idozi ya, ọkàikpe ewee nye nne ma ọ bụ nna nke ọzọ ikike ịkpọrọ nwa? Ma ọ bụ gịnị ma ọ bụrụ na a chụpụrụ otu n’ime nne na nna na-agba alụkwaghịm n’ọgbakọ ndị Kraịst? Ọzọkwa, olee otú mmadụ kwesịrị isi lee inwekọ ikike ịkpọrọ nwa na otu onye inwe ikike ịkpọrọ nwa anya? A ga-atụle ajụjụ ndị a na ụkpụrụ Bible ndị metụtara ha n’isiokwu na-esonụ.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Àgwà Atọ Ndị Dị Mkpa
Otu ọkàikpe nke ụlọikpe ezinụlọ nke Teta! gbara ajụjụ ọnụ kwuru na n’ime àgwà ndị dị mkpa ọ na-atụ anya ha n’aka nne ma ọ bụ nna bụ atọ na-esonụ:
Ezi uche—ịdị njikere inye nne ma ọ bụ nna ohere kasị ukwuu ịhụ nwatakịrị (n’ebe a na-enweghị iyi egwu anụ ahụ ma ọ bụ nke omume ọma nye nwatakịrị)
Mmetụta—mmata nke mkpa mmetụta uche nke nwatakịrị
Njide onwe onye—ndụ ebe obibi guzoziri eguzozi nke ga-atụnye ụtụ n’inwe gburugburu ebe obibi dị jụụ nke nwatakịrị pụrụ ime nke ọma na ya
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ụkpụrụ Nduzi Ikpe
Site n’isetịpụ ụkpụrụ nduzi, ndị ọkàikpe ụfọdụ agbalịwo igbochi esemokwu na-enweghị isi n’ihe banyere ụkpụrụ okpukpe nke nne ma ọ bụ nna. Dị ka ihe atụ:
1. E kwesịrị ịkwalite mmekọrịta bara uru n’etiti nwatakịrị na ma nne ma nna ya. Ọkàikpe nke Ụlọikpe Kasị Elu nke Canada bụ́ John Sopinka kwuru na e kwesịrị inye nne ma ọ bụ nna ohere “ikere òkè n’ihe omume ndị ga-atụnye ụtụ n’ime ka a mata nne ma ọ bụ nna maka ihe ọ bụ n’ezie [gụnyere ikpe okpukpe ya]. A dịghị atụ anya n’aka nne ma ọ bụ nna na-eme nleta igosi ihe ọ na-abụghị ma ọ bụ dịwa ụzọ ndụ aghụghọ n’oge ndị ọ na-eme nleta.”
2. Igbochi nne ma ọ bụ nna na-eme nleta ịkụziri nwatakịrị nkwenkwe okpukpe ya bụ imebi nnwere onwe ikpe okpukpe nke nne ma ọ bụ nna, e wezụga ebe e nwere ihe àmà doro anya nke mmerụ ahụ dị adị na nke gbara ọkpụrụkpụ nye nwatakịrị.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị ọkàikpe nwere oké ibu ọrụ n’okwu ikike ịkpọrọ nwa
[Foto dị na peeji nke 8]
Onye ndozi pụrụ inyere nne na nna aka idozi esemokwu n’enweghị ogologo usoro ikpe ikpe ụlọikpe