Ikike Ịkpọrọ Nwa—Echiche Ziri Ezi
MGBE mgbe, nke bụ ihe ịma aka n’ezie na-abịa mgbe a gbasịrị alụkwaghịm, n’ọgụ maka mmetụta ịhụnanya na nchịkwa nke nwatakịrị. Okwu bụ́ “Ọ na-ewe mmadụ abụọ iji lụọ ọgụ” abụghị eziokwu mgbe nile. Ọ pụrụ iwe nanị otu nne ma ọ bụ nna bụ́ onye aka ike nke chọrọ ka e mee ihe dị ya mma. Otu ọkàiwu ezinụlọ na Toronto, Canada, kwuru, sị: “N’iwu ezinụlọ, ihe nile na-ejupụta ná mmetụta uche ma na-eru n’obi.”
Kama ichewe banyere ọdịmma kasịnụ nke nwatakịrị, nne na nna ụfọdụ na-eme ka esemokwu ahụ dịgide site n’ịgba akwụkwọ n’okwu ndị na-erijughị afọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ agbalịwo igosipụta na e kwesịrị ịgbanwe ikike ịkpọrọ nwa n’ihi na nne ma ọ bụ nna bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, na ọ ga-anapụ nwatakịrị ‘ụzọ ndụ kwesịrị ekwesị.’
Onye nke na-abụghị Onyeàmà pụrụ isere ime ememe ụbọchị ọmụmụ, Krismas, ma ọ bụ ọbụna Halloween okwu. Ụfọdụ pụrụ ime mkpesa na a ga-egbochi mkpakọrịta na mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke nwatakịrị ma ọ bụrụ na nwatakịrị ekpebie ịghara ikele ọkọlọtọ. Ma ọ bụ ụfọdụ pụrụ ịtụ aro na nwatakịrị ga-emebi n’ụzọ akparamàgwà site n’isonyere nne ma ọ bụ nna ya n’ịgwa ndị ọzọ okwu banyere Bible. Ụfọdụ nne na nna na-abụghị Ndịàmà kwudịrị na a ga-etinye ndụ nwatakịrị n’ihe ize ndụ n’ihi na nne ma ọ bụ nna nke bụ́ Onyeàmà agaghị ekwere ka nwa ya nata mmịnye ọbara.
Olee otú onye Kraịst ga-esi mee ihe banyere ihe ịma aka nke arụmụka dị otú a jupụtara ná mmetụta uche? Nzaghachi sitere ná mmetụta uche—“i mee m, m megwara”—agaghị aba uru. Ọ bụrụ na e wepụ okwu ahụ n’ihu ọkàikpe, a ga-enwe ohere ịnụrụ ihe nne ma ọ bụ nna ga-ekwu. Ọ kasị mkpa iburu ndụmọdụ Bible n’uche: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) Site n’ịtụgharị uche na nke a na site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ndị nne na nna, site n’enyemaka Jehova, pụrụ ịnagide ihe ndapụta ọ bụla na-emetụta ikike ịkpọrọ nwa.—Ilu 15:28.
Ezi Uche
Ọdịmma kasịnụ nke nwatakịrị bụ ihe iseokwu bụ isi. Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna na-achọ ihe gabiga ókè, ikike ịkpọrọ nwa pụrụ ifunahụ ya, ọbụnakwa e gbochie ihe ùgwù ime nleta ya. Nne ma ọ bụ nna maara ihe na-eduzi onwe ya n’ụzọ udo, na-eburu ndụmọdụ Bible n’uche: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. . . . Chaaranụ iwe ahụ ụzọ . . . Ekwela ihe ọjọọ merie gị, kama were ezi ihe merie ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:17-21) Ma ha nọ n’ụlọikpe, n’ọfịs ọkàiwu, ma ọ bụ na ha na onye na-enyocha ikike ịkpọrọ nwa nọ, ọ dị nne na nna mkpa ‘ime ka mmadụ nile mara [ezi uche, NW] ha.’—Ndị Filipaị 4:5.
Mgbe ụfọdụ di ma ọ bụ nwunye e kewapụworo ga-agbalị iduhie ndị ọzọ site n’iwebata nsogbu ndị na-eduhie eduhie na nke e chepụtara echepụta. Ọ bụ ihe amamihe ịlụso àgwà mmadụ nke imeghachi omume gabiga ókè nye okwu ọjọọ ndị a ọgụ. Ahụ ike, okpukpe, na agụmakwụkwọ bụ isiokwu e nwere mmasị na ya nke ndị di ma ọ bụ nwunye e kewapụworo na-eji echepụta ihe ọjọọ n’oge a na-anụrụ ikpe ikike ịkpọrọ nwa.—Ilu 14:22.
Ezi uche na-agụnye ikike ịtụle ihe ndị bụ eziokwu na iru nkwekọrịta ziri ezi. Ọ dịghị nne ma ọ bụ nna kwesịrị ichefu na ọbụna mgbe a gbasịrị alụkwaghịm, nwatakịrị ka nwere nne na nna. Nne na nna agbarịtawo onwe ha alụkwaghịm ma ha agbabeghị nwatakịrị. Ya mere, e wezụga n’ọnọdụ ndị gabigara ókè, nne ma ọ bụ nna kwesịrị inwere onwe ya ime ihe dị ka nne ma ọ bụ nna mgbe ya na nwa ya nọ. Nke ọ bụla kwesịrị inwere onwe ya ikwupụta echiche na ụkpụrụ ya ma mee ka nwatakịrị kere òkè n’ihe omume ndị iwu kwadoro nke nne ma ọ bụ nna, nke okpukpe ma ọ bụ nke ọ bụla ọzọ.
Ka anyị tụlee ihe ndị pụrụ isi n’ikpe pụta: (1) Inwekọ ikike ịkpọrọ nwa, (2) otu onye inwe ikike ịkpọrọ nwa, na (3) ịkpa ókè n’ihe ùgwù ime nleta. Gịnị dị iche n’etiti inwekọ ikike ịkpọrọ nwa na otu onye inwe ikike ịkpọrọ nwa? Olee otú ị pụrụ isi nagide ya mgbe ikike ịkpọrọ nwa funahụrụ gị? Gịnị ma ọ bụrụ na a chụpụrụ nne ma ọ bụ nna achụpụ?
Inwekọ Ikike Ịkpọrọ Nwa
Ndị ọkàikpe ụfọdụ chere na ọ dị mkpa ịnọgide na-enwe mmekọrịta n’etiti nwatakịrị na ma nne ma nna ya. Echiche ha dabeere n’ihe ọmụmụ nnyocha na-egosi na ụmụaka pụrụ inwe nchekasị na mmerụ ahụ mmetụta uche dị ala mgbe a gbasịrị alụkwaghịm ma ọ bụrụ na nne na nna ha enwee ike ikerịta ikike ịkpọrọ nwa. Kama iche na nne ma ọ bụ nna gbahapụrụ ya, nwatakịrị ga-enwe echiche nke ịbụ onye ma nne ma nna ya hụrụ n’anya nakwa ịbụ onye na-esonye n’ezinụlọ abụọ ahụ. “Inwekọ ikike ịkpọrọ nwa bụ ụzọ isi mee ka ma nne ma nna sonye,” ka otu ọkàiwu banyere iwu ezinụlọ na-ekwu.
Otú ọ dị, Dr. Judith Wallerstein, onye ntụzi ukwu nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ezinụlọ Na-eme Mgbanwe, na Corte Madera, California, na-adọ aka ná ntị na iji mee ka inwekọ ikike ịkpọrọ nwa nwee isi, ọ dị mkpa inwe nne na nna ndị na-ekwenye ekwenye na nwatakịrị pụrụ ime mgbanwe, onye ya na ndị mmadụ na-adịkwa ná mma. Àgwà ndị a dị mkpa n’ihi na n’inwekọ ikike ịkpọrọ nwa ma nne ma nna ka nwere ikike iwu kwadoro ikere òkè n’ime mkpebi n’okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ na-emetụta ahụ ike, agụmakwụkwọ, nzụlite okpukpe, na mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke nwa ha. Ma nke a na-enwe isi nanị ma nne ma nna nọgide na-eji ezi uche atụle ọdịmma kasịnụ nke nwa ha kama ọdịmma nke onwe ha.
Otu Onye Inwe Ikike Ịkpọrọ Nwa
Ụlọikpe pụrụ inye nne ma ọ bụ nna ikike ịkpọrọ nwa onye, n’echiche ya, ka nwee ike igbo mkpa nwatakịrị. Ọkàikpe pụrụ ikpebi ka nne ma ọ bụ nna nwetara ikike ịkpọrọ nwa bụrụ nanị onye na-eme mkpebi banyere okwu ndị dị mkpa na-emetụta ọdịmma nke nwatakịrị. Mgbe mgbe, ụlọikpe na-eru ná mkpebi ahụ mgbe ha gesịrị ntị ná nchọpụta nke ndị ọrụ nchọpụta—ndị a na-abụkarị ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ, ndị dibịa ọrịa uche, ma ọ bụ ndị ọrụ ebere.
Ndị na-akwado otu onye inwe ikike ịkpọrọ nwa na-eche na ndokwa ahụ na-enyekwu nwatakịrị nkwụsi ike. Mgbe nne na nna na-enweghị ike ma ọ bụ na-eyighị ka ha ga-ekwurịta okwu n’ụzọ dị irè, ọtụtụ ndị ọkàikpe na-ahọrọ ndokwa ikike ịkpọrọ nwa nke a. Otú ọ dị, e kewapụghị nne ma ọ bụ nna na-enweghị ikike ịkpọrọ nwa ná ndụ nwatakịrị. A na-enyekarị nne ma ọ bụ nna na-enweghị ikike ịkpọrọ nwa ikike ime nleta, ma nne ma nna pụkwara ịnọgide na-enye nwatakịrị nduzi, ịhụnanya, na mmetụta ịhụnanya dị mkpa.
Ihe Ùgwù Ime Nleta
Ọ bụ ihe echiche na-adịghị na ya nne na nna ile ikike ịkpọrọ nwa anya dị ka inwe “onye meriri” na “onye e meriri.” Nne na nna na-enwe ihe ịga nke ọma ma “merie” mgbe ha na-ahụ ka ụmụ ha ghọrọ ndị dimkpa tozuru okè, ruru eru, a na-akwanyere ùgwù. Ihe ịga nke ọma n’ịzụ nwa enweghị njikọ kpọmkwem n’inweta ikike ịkpọrọ nwa nke iwu kwadoro. Site n’ige ntị n’ọnọdụ ndị ụlọikpe nyere iwu ha n’okwu banyere ikike ịkpọrọ nwa, ọbụna mgbe ndị a yiri ka ha ezighị ezi, onye Kraịst na-egosi “[ido] onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya.” (Ndị Rom 13:1) Ọ dịkwa mkpa icheta na nke a abụghị oge ịzọ mmetụta ịhụnanya ma ọ bụ iguzosi ike n’ihe nke ụmụ gị site n’iweda nne ma ọ bụ nna nke ọzọ ala ná mgbalị imebi mmekọrịta ya na ha.
E nwere ihe atụ Bible nke nne na nna ndị na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị e kewapụrụ ụmụ ha n’ebe ha nọ, n’ihi ihe dị iche iche. Dị ka ihe atụ, Amram na Jokebed, nne na nna Mosis, n’ime ihe n’ihi ọdịmma kasịnụ nke nwa ha, tinyere ya n’obere ụgbọ na-ese n’elu mmiri “n’etiti amị n’ụsọ osimiri Naịl.” Mgbe ada Fero zọpụtara nwa ọhụrụ ahụ, ha nọgidere na-atụkwasị Jehova obi. E ji ihe ùgwù a na-akparaghị ókè nke “ime nleta” kwụọ nne na nna ndị a maara ihe ma kwesị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ bụ́ ndị ha jiri mee ihe n’ụzọ bara uru ịzụ nwatakịrị ahụ n’ụzọ Jehova. Mosis tolitere ịbụ ohu pụtara ìhè nke ezi Chineke.—Ọpụpụ 2:1-10; 6:20.
Ma, gịnị ma ọ bụrụ na a chụpụrụ nne ma ọ bụ nna achụpụ? Ò kwesịrị ka nne ma ọ bụ nna bụ́ onye Kraịst kwere ka e leta nwa ya? Usoro nchụpụ nke ọgbakọ na-agbanwe nanị mmekọrịta ime mmụọ n’etiti onye ahụ na ọgbakọ ndị Kraịst. N’eziokwu, ọ na-egbubi nkekọ ime mmụọ. Ma mmekọrịta onye mụrụ nwa na nwa na-adịgide. Nne ma ọ bụ nna nke nwere ikike ịkpọrọ nwa aghaghị ịkwanyere ikike ime nleta nke nne ma ọ bụ nna a chụpụrụ achụpụ ùgwù. Otú ọ dị, ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna nke na-enweghị ikike ịkpọrọ nwa abụrụ ihe iyi egwu dị adị na nke gbara ọkpụrụkpụ nye ọdịmma anụ ahụ ma ọ bụ nke mmetụta uche nwatakịrị, mgbe ahụ ụlọikpe (ọ bụghị nne ma ọ bụ nna nwere ikike ịkpọrọ nwa) pụrụ idokwa onye nke atọ ileba anya ná nleta nwatakịrị.
Ọ Dịghị Mgbe Ị Nọ Nanị Gị
Ikpe ịgba alụkwaghịm na esemokwu ikike ịkpọrọ nwa nke na-esochi ya bụ ahụmahụ na-agwụ ike n’ụzọ mmetụta uche. Njikọ nke malitere nnọọ nke ọma tinyere nzube, atụmatụ, na atụmanya nke di na nwunye ahụ etisasịwo. Dị ka ihe atụ, ekwesịghị ntụkwasị obi ma ọ bụ mmetọ gabigara ókè pụrụ ịmanye nwunye na-eguzosi ike n’ihe ịchọrọ onwe ya na nwa ya nchebe iwu kwadoro. Ma, mmetụta nke obi amamikpe na erughị eru pụrụ ịdịgide ka ọ na-atụle ihe gahierenụ ma ọ bụ otú a gaara esi dozie okwu ahụ n’ụzọ dị irè karị. Ọtụtụ di na nwunye na-echegbu onwe ha banyere mmeghachi omume nke ụmụ ha nye ntisa ezinụlọ ahụ. Ọgụ ụlọikpe maka ikike ịkpọrọ nwa pụrụ ịghọ ihe na-agbanwe mmetụta uche nke na-ele ọ bụghị nanị iguzosi ike n’ezi ihe mmadụ dị ka nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya ule kamakwa nke na-ele okwukwe na ntụkwasị obi mmadụ n’ebe Jehova nọ ule.—Tụlee Abụ Ọma 34:15, 18, 19, 22.
Mgbe di ma ọ bụ nwunye aka ya dị ọcha họọrọ ime ihe n’ihi mmetọ nwatakịrị ma ọ bụ mmegbu gabigara ókè nke di ma ọ bụ nwunye ya ma ọ bụ iji chebe ahụ ike ya megide ihe ize ndụ nke ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ site n’aka di ma ọ bụ nwunye na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ọ dịghị mkpa ka di ma ọ bụ nwunye aka ya dị ọcha nwee obi amamikpe ma ọ bụ chee na Jehova agbahapụwo ya. (Abụ Ọma 37:28) Di ma ọ bụ nwunye nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi ma ọ bụ na-eme omume mmetọ bụ ya mebiri nkwekọrịta dị nsọ nke alụmdi na nwunye ma ‘ghọgbuo’ di ma ọ bụ nwunye ya.—Malakaị 2:14.
Nọgide ‘na-enwe ezi akọ na uche’ n’ihu mmadụ na Jehova site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, na-emeso di ma ọ bụ nwunye gị e kewapụworo ihe n’obi eziokwu, ma na-egosi ịdị nro ná nkwekọrịta ikike ịkpọrọ nwa unu. “Ọ ka mma, ma ọ bụrụ na ọchịchọ Chineke chọrọ ya, ka unu hụọ ahụhụ n’ihi na unu na-eme ezi ihe kama n’ihi na unu na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 3:16, 17.
Banyere ụmụaka, imesi ha obi ike na ntisa nke ezinụlọ esighị ha n’aka dị ha mkpa. Mgbe ụfọdụ ihe adịghị nnọọ aga otú e si mee atụmatụ ya. Ma itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ pụrụ ibelata mmetụta nke ịgba alụkwaghịm site n’ịgba ume inwe nkwurịta okwu ghere oghe na nke nghọta dị na ya n’etiti nne na nna na ụmụaka. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ime nke a site n’ikwe ka ụmụaka kere ezigbo òkè n’ime atụmatụ maka ndụ ezinụlọ ma a gbasịa alụkwaghịm. Site n’inwe ndidi na obiọma na site n’inwe mmasị ná mmetụta ụmụaka na-enwe na ige ntị n’okwu ha, ị ga-eme nnukwu ihe inyere ha aka ịgbanwe gaa n’usoro ime ihe na ndokwa obibi ọhụrụ.
Ndị Ọzọ Pụrụ Inye Aka
Ọ bụghị nanị nne na nna bụ ndị pụrụ inyere nwatakịrị ezinụlọ ya tisasịrị aka. Ndị òtù ezinụlọ, ndị nkụzi, na ndị enyi pụrụ ime ihe dị ukwuu iji kwadoo ma mesie ụmụ nke ndị gbara alụkwaghịm obi ike. Karịsịa, ndị nne na nna ochie pụrụ ime ihe dị ukwuu iji tụnye ụtụ ná nkwụsi ike na ọdịmma mmetụta uche nke ụmụaka.
Ndị nne na nna ochie bụ́ ndị Kraịst pụrụ inyefe ụmụaka ntụziaka ime mmụọ na ihe omume na-ewuli elu, ma ha aghaghị ịkwanyere mkpebi nke nne na nna banyere ọzụzụ okpukpe ùgwù, n’ihi na ọ bụ nne na nna, ọ bụghị ndị nne na nna ochie, nwere ikike nke omume na nke iwu kwadoro ime mkpebi ndị a.—Ndị Efesọs 6:2-4.
Site n’enyemaka dị otú ahụ, ụmụ nke ndị gbara alụkwaghịm pụrụ ịlanarị ntisa nke alụmdi na nwunye nne na nna ha. Ha pụkwara ịnọgide na-elepụ anya maka ngọzi nke ụwa ọhụrụ Chineke, ebe ezinụlọ nile ga-enwere onwe ha pụọ “n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:21; 2 Pita 3:13.
[Igbe dị na peeji nke 11]
Idozi Nghọtahie
“Ire ndị maara ihe na-eme ka ihe ọmụma dị mma,” nne ma ọ bụ nna bụ́ onye Kraịst nwekwara ohere dị mma idozi nghọtahie ma ọ bụ ihe ndị na-abụchaghị eziokwu. (Ilu 15:2) Dị ka ihe atụ, n’ihe banyere nlekọta ahụ ike nke ụmụ ha, “Ndịàmà Jehova na-anabata ọgwụgwọ nlekọta ahụ ike na nke ịwa ahụ,” ma mgbe a họpụtara ya dị ka nne ma ọ bụ nna nwere ikike ịkpọrọ nwa, Onyeàmà nwere ikike nke nkweta site n’ihe a maara maka usoro ọ bụla.a—The Journal of the American Medical Association.
Ndịàmà Jehova ji okpukpe ha, bụ́ nke dabeere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, kpọrọ ihe. Nke a na-eme ka e nwee ndị nna, ndị nne, ụmụaka, ndị enyi, ndị agbata obi, na ndị amaala ka mma. Nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-enye ọzụzụ n’ịhụnanya, na-ewulite nkwanye ùgwù maka ịchịisi ma na-enye ụmụ ha ụkpụrụ ndị dị mma maka ndụ.b—Ilu 13:18.
Agụmakwụkwọ ụwa bụ akụkụ dị mkpa nke nzụlite nwatakịrị, Ndịàmà Jehova chọkwara ka ụmụ ha nweta nke kasị mma dịnụ.c—Ilu 13:20.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee broshuọ bụ́ How Can Blood Save Your Life?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Lee akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, isi nke 5-7, 9, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
c Lee broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 10]
Nne ma ọ bụ nna nwere ikike ịkpọrọ nwa kwesịrị iji ndidi gee ntị mgbe nwatakịrị na-akọ banyere mkparịta ụka ya na nne ma ọ bụ nna nke na-enweghị ikike ịkpọrọ nwa