Ikiri Ụwa
Nghọtahie Ndị Dị Ize Ndụ
Na 1977 otu nghọtahie nke metụtara ihe otu obere okwu pụtara tinyere aka n’ọdachi ụgbọelu kasị njọ n’ụwa, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The European na-akọ. Onye Netherlands na-anya ụgbọelu 747 ji redio zie ozi na ya nọ “n’ụzọ mfepụ,” nke onye nduzi ụgbọelu Tenerife, Àgwàetiti Canary, ghọtara ịpụta na ụgbọelu ahụ kwụ n’otu ebe. Otú ọ dị, onye ahụ na-anya ụgbọelu na-ekwu na ụgbọelu ya ji ọsọ na-agbada ebe ahụ ụgbọelu na-ada nke alụlụ gbachiri, na-achọkwa ifepụ. N’ihi ya, ụgbọelu ahụ dakwasịrị 747 ọzọ, na-egbu mmadụ 583. N’otu aka ahụ, nkà asụsụ na-adịchaghị mma so kpata nkụkọta n’elu na 1996 na nso Delhi, India, nke mmadụ 349 nwụrụ na ya. Ọ bụ ezie na a naghị enwekarị ihie ụzọ ndị siri ike, ndị ọrụ ụgbọelu na-anatakwa ọzụzụ siri ike n’ụkpụrụ asụsụ Bekee maka ọrụ ụgbọelu, ụfọdụ ndị ọrụ ụgbọelu maara nanị mkpụrụ okwu dị iche iche bụ́ nanị maka ọrụ ụgbọelu. Mgbe ọnọdụ mberede bilitere, nkà asụsụ ha pụrụ ifunahụ ha. Ndị ọkachamara na-atụ aro ka e nwee nkà na ụzụ kọmputa n’ebe ndị ọrụ ụgbọelu na-anọ iji hụ na e nwere ezi nkwurịta okwu maka ọrụ ụgbọelu.
È Mewo Ka Ụlọ Elu nke Pisa Dalagara Otu Akụkụ Kwụsie Ike?
Mgbe ọtụtụ narị afọ nke ịdalaga n’otu akụkụ nke yiri ọdịda a na-apụghị izere ezere gasịrị, n’ikpeazụ Ụlọ Elu nke Pisa dalagara otu akụkụ yiri ka e mewo ka ọ kwụsie ike—n’ihi ịdị arọ otu puku tọn ya na ya hà nke kọnkịrị a wụnyere òzé n’ime ya n’úkwù ya. Ọ bụ Prọfesọ Michele Jamialcowsky, bụ́ president nke òtù ọrụ zuru ụwa ọnụ maka nchebe ụlọ elu ahụ mara nke a n’ọkwa. “Otú ọ dị, nsogbu nkwụsi ike ka bụ ihe siri ike,” ka akwụkwọ akụkọ Itali bụ́ La Stampa na-ekwu, “ebe mgbagọ ahụ dị mita ise [amaụkwụ 16] site n’ịkwụrụ ọtọ ya nke ruworo otú a n’ime ihe gafere narị afọ asaa nke ịdị adị ya nọ n’ọnọdụ jọrọ njọ nke ukwuu.”
Iji Ọgwụ Eme Ihe n’Ụzọ Iwu Na-akwadoghị Gburugburu Ụwa
Ọgwụ ọjọọ mejupụtara ihe ruru 8 pasent nke azụmahịa mba nile na ego a na-enweta site n’ihe ubi nke ihe dị ka ijeri $400 n’otu afọ, ka otu akụkọ UN na-ekwu. Akụkọ ahụ dị peji 332 bụ ihe ọmụmụ mbụ zuru ezu banyere mmetụta zuru ụwa ọnụ nke ọgwụ ndị iwu na-akwadoghị. Ọ na-egosi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2.5 pasent nke ndị bi n’ụwa—ihe dị ka nde 140 mmadụ—na-ese wii wii ma ọ bụ hashish e si na ya emepụta. Nde 30 na-eji ọgwụ mkpali yiri amphetamine eme ihe, nde 13 na-eji ụdị ụfọdụ nke cocaine eme ihe, nde 8 na-ejikwa heroin eme ihe. Ọ bụ ezie na ndị ọrụ na-ahụ maka ndebe iwu ejichiwo ọtụtụ puku tọn wii wii, cocaine, heroin, na morphine, ihe karịrị nke ahụ nke ukwuu bụ nke a na-achọtaghị. Ọ̀tụ̀tụ̀ njichi nke cocaine bụ ihe dị ka 30 pasent, nke heroin bụkwa nanị 10 ruo 15 pasent, ka akụkọ ahụ kwuru. Usoro azụmahịa ọgwụ ọjọọ gburugburu ụwa dị mgbagwoju anya nke ukwuu. “Nsogbu ahụ ezuwo ụwa ọnụ nke na mba dị iche iche n’otu n’otu apụghị igbochi ya,” ka Giorgio Giacomelli, bụ́ onye ntụzi ukwu nke usoro ihe omume nke òtù UN maka nchịkwa ọgwụ ọjọọ na-ekwu.
Ọrịa Na-efe Efe Na-amụba
“N’ime afọ 20 gara aga, ọrịa 30 dị nnọọ ọhụrụ, ndị na-efekwa efe nke ukwuu apụtawo,” ka Nassauische Neue Presse na-akọ. Maka ihe ka ọtụtụ n’ọrịa ndị a—dị ka Ebola, AIDS, na ịba ọcha n’anya nke C—enweghị ọgwụgwọ. Ọzọkwa, ọrịa na-efe efe ndị dị ka ịba, ọgbụgbọ na ọnyụnyụ, na ụkwara nta, na-amụbakwa. N’ihi gịnị? Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) si kwuo, “ọtụtụ nrịanrịa na-apụtaghachi n’ihi na ọnụ ọgụgụ nje na-aka ukwuu na-eguzogide ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ọgwụ nje. A na-emepụta ọnụ ọgụgụ dị ala karị nke ọgwụ nje ndị ọhụrụ ebe usoro mmepụta ya dị nnọọ oké ọnụ.” Ná mgbalị iji gbanwee ọnọdụ a, òtù WHO arịọla gọọmenti na ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ ka ha “tinyekwuo ego ná mmepụta nke ọgwụ nje ndị ọhụrụ na ná mmeziwanye nke usoro ile ahụ maka ọrịa ndị na-efe efe.” Ọnụ ọgụgụ zuru ụwa ọnụ nke ndị nwụrụ n’ọrịa na-efe efe na 1996 bụ ihe dị ka nde mmadụ 55.
“Ịchịisi nke Ndị Na-eme Ihe Ike”
N’okpuru isiokwu a, Haim Shapiro, otu n’ime ndị ọrụ na-ede akwụkwọ akụkọ The Jerusalem Post, na-akọ banyere ihe ndị merenụ na March gara aga ebe e jiri okwute na blọk wakpoo Ndịàmà Jehova, a wabara n’ụlọ nzukọ ha ma tikasịa ya, a kpọkwara akwụkwọ ha ọkụ. O kwuru, sị: “Mgbe a wakporo otu Chọọchị Katọlik dị na Jaffa n’afọ gara aga, e nwere ntiwapụ nke mkpesa—nke zikwara ezi—ozugbo ma n’Israel ma ná mba ndị ọzọ. Mgbe a wakporo ụlọ nzụkọ ahụ dị na Lod, a nụghị mkpatụ.” Ọ bụ ezie na ya onwe ya ‘enweghị mmasị, ọ naghị akwadokwa’ Ndịàmà Jehova, Shapiro na-echeta na ha “bụ otu n’ime ìgwè ndị a kpagburu ma ziga n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche na Nazi ndị Germany.” Ọ na-ede, sị: “Iche na onye ọ bụla nwere ike ịwakpo ndị dị otú ahụ, bibie ebe ofufe ha, ma kpọọ akwụkwọ ha ọkụ n’anataghị ntaramahụhụ ọ bụla, na-atụ ụjọ, na-akpaliteghachikwa ihe ndị kasị awụ ibobo n’ahụ n’akụkọ ihe mere eme ndị yiri ya.”
Nsọpụrụ Na-ada Ada nke Otu “Obodo Nsọ”
Ọ bụ ezie na a na-akpọ ya obodo nsọ, o nweekwa onye isi nke Chọọchị Katọlik dị ka bishọp ya, Rom abụtụghị obodo ji okpukpe kpọrọ ihe otú ụfọdụ pụrụ iche. Dị ka otu nnyocha zuru mba ọnụ nke Mahadum nke Atọ nke Rom mere gosiri, ihe dị ka pasent 10 nke ndị Itali nile na-ekwu na ha “enwetụdịghị” mmasị n’Iso Ụzọ Kraịst, ma na Rom ọnụ ọgụgụ ahụ na-arị elu ruo 19 pasent. Pasent 21 ọzọ nke ndị Rom nwere mmasị “dị nta” na Chọọchị Katọlik, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ La Repubblica na-ekwu. N’aka nke ọzọ, nanị 10 pasent n’ime ha nwere ezi mmasị n’okpukpe. Dị ka ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Roberto Cipriani si kwuo, nanị 1 n’ime ndị Rom 4 na-agbasochi iwu chọọchị tiri banyere omume na akparamàgwà anya.
Ụkwara Nta Etie India Ihe Otiti
N’agbanyeghị mgbalị dị ukwuu iji chịkwaa nje ụkwara nta (TB), Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) na-azọrọ na 1 n’ime ndị toworo eto 2 n’India bụ ndị ọ na-arịa. N’ime ndị India karịrị nde 900, ihe karịrị nde 2 na-arịa ụkwara nta siri ike kwa afọ, ihe rukwara 500,000 na-anwụ n’ihi ya, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Asian Age na-akọ. Dị ka WHO si kwuo, ọnụ ọgụgụ nke ndị ọ na-arịa, nakwa ihe ize ndụ na-esite n’ibute ọrịa ahụ dị nnọọ ukwuu. Ndị na-ebute TB adịghị eche nanị nsogbu nke idi ọrịa ọ na-akpata ihu; ha aghaghịkwa ịnagide ihe ihere nke a na-ejikọtakarị ya na ọrịa ahụ. Nke a pụrụ iduje ná ndị agbata obi, ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ, nakwa ndị ọrụ ibe ha ịjụ ha. Ndị nwunye ọhụrụ a chọpụtara na ha bu TB bụ ndị a na-akpọghachikarịrị ndị mụrụ ha dị ka ndị na-ekwesịghị ịmụ ụmụ.
Ọ̀ Bụ Ezigbo Òké?
“Ihe a na-ekwu maka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ òké jọrọ njọ,” ka The Wall Street Journal na-ekwu. “Ha bụ ndị gị na ha nọ n’ụgbọ mmiri ndị ị na-apụghị ịtụkwasị obi, ndị na-ebi n’ikpo ahịhịa—ọbụna ndị na-azọ ọrụ obodo.” Ọ bụghị ma Rattie, òké e ji eme nnyocha nke onye ọkà mmụta biophyics bụ́ Judy Reavis. Rattie enyewo aka isetị waya kọmputa dị ọtụtụ narị mita n’ụlọ akwụkwọ ka e wee nwee ike itinye usoro njikọ kọmputa. “N’ịtagidesi ụdọ ike n’eze ya, Rattie na-afafe onwe ya n’agbata ogidi na oghere ndị dị n’ahụ ájá, n’okpuru ala ụlọ, nakwa n’elu uko ụlọ,” ka Journal ahụ na-akọwa. “A na-eji ụda ịkụ aka na nri nwamba na-atọ ụtọ adọrọ ya gaa n’ụzọ ọ ga-esi pụta. Mgbe ọ pụtara, a na-eji ụdọ ahụ ọ na-adọkpụ adọrọ waya kọmputa gaa n’ụzọ ya nke gbagọrọ agbagọ.” Rattie aghọwo nnọọ onye a ma ama, nweekwa ohere na abụ ọ “bụrụ” n’Internet. Ọ bụrụ na ọ nwụọ ọnwụ mberede, “anyị ga-azụ ọzọ,” ka Dr. Reavis na-ekwu. “E kwuwerị, ọ bụ nanị òké.”
Ụmụ Agbọghọ Ndị E Bekasịrị Ahụ, Ịmụ Nwa n’Afọ Iri na Ụma
“A na-ebekasị ihe dị ka nde ụmụ agbọghọ 2 ahụ kwa afọ,” ka mbipụta 1996 nke The Progress of Nations na-ekwu, bụ́ mbipụta nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu banyere ahụ ike, nri, na agụmakwụkwọ ụmụaka. “Ijipt, Etiopia, Kenya, Nigeria, Somalia, na Sudan mejupụtara 75% nke ndị nile e mere ya. Na Djibouti na Somalia, a na-ebekasị 98% nke ụmụ agbọghọ ahụ.” E wezụga ihe mgbu ya, usoro ya pụrụ ịkpata ọrịa, ọbara ọgbụgba ruo ogologo oge, enweghị ike ịmụ nwa, na ọnwụ. “Ọ dịghị okpukpe na-achọ ibekasị ahụ. Ọ bụ ọdịnala a haziri iji chebe ọnọdụ amaghị nwoke, iji mee ka e nwee ike ịlụ di, na iji chịkwaa omume mmekọahụ,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. Ìgwè na òtù ndị na-ahụ maka ihe ndị ruuru ndị inyom na ọdịmma ụmụaka na-arụgide gọọmenti dị iche iche ka ha mapụ omume a n’iwu.
Akụkọ nke abụọ na-egosi na n’ọtụtụ ala ịmụ nwa mgbe a nọ n’afọ iri na ụma bụ nsogbu na-adịghị ala ala. Dị ka ihe atụ, United States nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu ná mba ndị mepere anya: ọmụmụ nwa 64 kwa afọ maka 1,000 ụmụ agbọghọ ọ bụla dị afọ 15 ruo 19. Japan nwere ọnụ ọgụgụ kasị ala n’inwe ọmụmụ nwa anọ n’otu afọ. Ọ bụghị nanị na ịmụ nwa mgbe a nọ n’afọ iri na ụma na-emetụta uto nwa agbọghọ, agụmakwụkwọ ya, na ohere ndị o nwere, kama ha pụkwara iwetara ụmụ ọhụrụ ahụ nsogbu, dị ka enweghị ezi nlekọta anya, ịda ogbenye, na ọnọdụ ebe obibi a na-ejighị n’aka.