Otú M Si Anagide Ịsụ Nsụ
Dị ka Sven Sievers si kọọ
ANỌWO m na-asụ nsụ kemgbe m bụ nwata. Ileghachi anya azụ, enwere m obi ekele maka ụzọ ndị mụrụ m si mee ihe maka nsogbu ahụ. Mgbe m na-asụ nsụ, ha na-agbalị mgbe nile ige ntị n’ihe m chọrọ ikwu kama ịgbazi ụzọ m si ekwu okwu. Dị ka ndị dibịa nsogbu ikwu okwu na-ekwu, ndị nne na nna na-akpọtụkarị uche n’ịsụ nsụ nke nwa ha pụrụ ime ka nsogbu ahụ ka njọ.a
Nne m ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova mgbe m dị afọ atọ. Mgbe m dị afọ iri na ụma ekpebiri m iso ihe nlereanya ya, e nyekwaara m aka ịmụ Bible nke ọma. Na July 24, 1982, e mere m baptism n’otu mgbakọ e nwere na Neumünster, Germany, dị ka ohu Chineke raara onwe ya nye. E mesịa, akwagara m South Africa, ebe m nọgidere na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ihu ọha, nke e nyere ezi ndị Kraịst nile iwu ikere òkè na ya. (Matiu 28:19, 20) Olee otú, ka ị pụrụ iche, m si eme ya ebe m bụ onye nsụ?
Ụgwọ Ọrụ Maka Echiche Ziri Ezi
Aghaghị m ikwere na mgbe ụfọdụ ọ na-esiri m ike inwe echiche ziri ezi, ma achọpụtawo m na inwe echiche ziri ezi n’ezie na-arụpụta ọdịiche dị ukwuu. Eziokwu bụ na n’ụzọ ụfọdụ apụrụ m inwe nkwurịta okwu mgbe nile. Ọ bụrụ na ọ bụghị site n’ikwu okwu, ana m enwe nkwurịta okwu site n’idetu ozi n’akwụkwọ ma ọ bụ nanị igosi ndị ọzọ akwụkwọ e ji amụ Bible. Echiche ziri ezi na-enyere m aka imeri ihe isi ike nke ịmalite mkparịta ụka. Ana m agbalị ime ka okwu mmeghe m dị nnọọ mfe. Ná mbido mkparịta ụka, ana m ekwere ka onye nwe ụlọ kwuo okwu ruo ókè o kwere omume. Ndị mmadụ na-achọ ikwu okwu, nke a na-enyekwa m ohere ịmata ụzọ ha si eche echiche. Mgbe ahụ, ana m aga n’ihu ná mkparịta ụka ahụ n’ihe ndị na-amasị ha, na-eme ka ozi Bible pụta ìhè. Itinye uche n’ihe ha na-ekwu na-enyere m aka ichezọ nsogbu ikwu okwu m, ana m asụkwa nsụ nke nta karị.
Echiche ziri ezi na-enyekwara m aka ikwu okwu ná nzukọ ndị Kraịst. Achọpụtawo m na ka m na-ekerekwu òkè ná nkwurịta okwu Bible, otú ahụ ka ọ na-adịghị abụrụ ndị na-ege ntị na onye nduzi ihe ọhụrụ, ha ewee gee ntị n’ihe m na-ekwu kama ịbụ n’otú m si na-ekwu ya.
Iji nwee ọṅụ nke ihe ịga nke ọma, aghaghị m ịnọgide na-agbalị. Nke a na-egbochi m ịdaba n’imere onwe m ebere na ịghọ onye nanị ya na-anọ. Ịlụso imere onwe onye ebere ọgụ bụ agha na-aga n’ihu. E kwuwo ya na ọ bụrụ na mmadụ adapụ site n’elu ịnyịnya, ọ dị ya mkpa ịrịgoghachi n’elu ịnyịnya ahụ iji nọgide na-enwe obi ike. Ya mere ọ bụrụ na mụ akwụsị ikwu okwu mgbe m na-enye azịza n’ihi okwu ịgbadosi m ike, ana m agbalị ịrịgoghachi n’elu ịnyịnya ahụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, site n’ikwu okwu n’ohere nke ọzọ kpọmkwem.
Otú Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka
Mgbe m na-aghaghị ịkpọ òkù fon ma ọ bụ jụta ndị m na-amaghị ihe, ana m enwe obi ekele maka enyemaka e ji akọ nye. Ma ndị ụfọdụ na-agafe ókè n’ọchịchọ ha inye aka, ha na-emesokwa m dị ka nwatakịrị na-apụghị ime mkpebi.
Ana m enwekwa obi ekele maka enyemaka nwunye m hụrụ m n’anya, bụ́ Tracy. Tupu ọ rụọ ọrụ dị ka “ọnụ na-ekwuru” m, anyị na-akparịta ọnọdụ ahụ n’ozuzu ya, ọ na-amatakwa ihe m ga-achọ ka a rụzuo. (Tụlee Ọpụpụ 4:10, 14, 15.) N’ụzọ dị otú ahụ, ọ na-akwanyere m ùgwù dị ka di ya, ọ na-enyekwa m echiche na m ka na-eduzi ndụ nke m.
Nnukwu enyemaka ọzọ abụrụwo Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ná nzukọ kwa izu a, ndị mmụta na-ekere òkè n’ịgụ Bible n’ihu ọha na ikwu okwu ndị dị nkenke n’isiokwu dị iche iche nke Bible. O juru m anya ịchọpụta na apụrụ m ịgụ ihe, kwuokwa nnọọ okwu nke ọma n’ihu ndị na-ege ntị ọtụtụ mgbe. Ọ bụrụ na edebaghị m aha n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ikekwe agaraghị m ama maka ikike a ma ọlị.
Mgbe m nweworo ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ọ bụwo oké ihe agbamume mgbe onye nduzi lekwasịrị anya n’ihe m kwuru kama ịbụ n’otú m si kwuo ya. Eritewo m uru dị ukwuu site n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-Ozi Ọchichi-Chineke,b ọ bụ ezie na akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ a na-enye ndị na-asụ nsụ nnukwu ihe ịma aka karịa ndị na-ekwu okwu nke ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe ụfọdụ, n’ihi ịsụ nnukwu nsụ, adịghị m enwe ike ikwusị okwu m n’oge e kenyere. Otú ọ dị, ọ na-abụ nnọọ ihe agbamume nye m mgbe onye nduzi na-eme ka ebe ndị m nwere ike ịrụ ọrụ na ha pụta ìhè.
Ihe Ùgwù Ije Ozi Ndị Ka Ukwuu
N’oge gara aga, enwere m ihe ùgwù nke ịgụ ihe n’ihu ọha site ná mbipụta ndị Kraịst nke anyị na-amụ ná nzukọ anyị. Enwekwara m ihe ùgwù nke iduzi ọmụmụ ihe ahụ mgbe onye ozi ọzọ ruru eru na-anọghị ya, taakwa m na-emechi nke ahụ anya. Ọ bụ ezie na ahụ mara m jijiji na mbụ, enwetawo m enyemaka Chineke n’ime ụdị ihe omume ahụ.
Otú ọ dị, ruo ọtụtụ afọ, ohere m nwere ịgụ ihe ma ọ bụ ịkụzi ihe site n’ikpo okwu ọgbakọ dị obere. Nke a kwere nghọta, ebe ọ bụ na ọ dị mgbe ọ na-ewe m nnọọ ogologo oge iji mee ka a ghọta ihe m na-ekwu. N’ihi ya ana m eji ume m eme ihe n’ụzọ zuru ezu n’ime ihe omume ndị ọzọ. Na mbụ, ejere m ozi dị ka onye inyeaka n’ilekọta magazin Ụlọ Nche na Teta! a na-ebutere ọgbakọ. Mgbe ahụ, mgbe a họpụtasịrị m ịbụ ohu na-eje ozi, elekọtawara m Bible, akwụkwọ ukwu, na akwụkwọ ndị ọzọ a na-ebute. Ka e mesịrị, e nyere m ọrụ ilekọta kaadị ókèala ndị e ji eme ihe n’ọrụ ịgba àmà ihu ọha anyị. Ịtụkwasị uche n’ọrụ ndị a, ịgbalị ịrụ ọrụ dị mma, wetaara m nnukwu ọṅụ.
Eri afọ asatọ gara aga, esowokwa m Tracy jee ozi dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile. O doro anya na Jehova agọziwo m n’akụkụ nke a kwa. N’ezie, mgbe ụfọdụ m na-adị na-eche ma Jehova ò ji adịghị ike m nke ịsụ nsụ eme ihe. N’ime mmadụ ise m nweworo ihe ùgwù inyere aka ịghọ ndị Kraịst raara onwe ha nye, abụọ bụ ndị nsụ.
Aka m ji ọṅụ na-echeta ụbọchị a họpụtara m ije ozi dị ka okenye ọgbakọ. Ọ bụ ezie na ikike izi ihe m site n’ikpo okwu bụ nke a kpaara ókè, ana m agbalị ịtụkwasị uche n’inyere ndị ọzọ aka ihu na ihu. Ịsụ nsụ adịghị akpara ikike m nwere ime nchọpụta n’Akwụkwọ Nsọ ókè iji nyere ndị òtù ọgbakọ na-eche oké nsogbu ihu aka.
N’ime afọ ise gara aga, a kpọwo m òkù ime ọtụtụ ihe omume nke ikwu okwu karị. E wezụga ikwu okwu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, enwewom ike ịma ọkwa ndị dị nkenke ná nzukọ ndị ọzọ. Nke nta nke nta okwu gawara m were were n’ọnụ karị. Ma mgbe ahụ enwere m nnukwu ndaghachi azụ. N’inwe nchegbu, echere m, sị, ‘a gaghị enyekwa m ihe omume ọzọ,’ ma n’ụzọ juru m anya, aha m gbara n’usoro ihe omume sonụ! Onye isi oche ndị nlekọta ọgbakọ anyị kwuru na ọ bụrụ na ọ gbado m nke na apụghị m ịga n’ihu, na apụrụ m ile ya anya nanị, na ya ga-agbagotekwa n’ikpo okwu ma weghara okwu ahụ. Eji m aro ịhụnanya a mee ihe otu ugbo ma ọ bụ ugbo abụọ, ma ọ dịbeghị mkpa mụ ime otú ahụ n’ọnwa ndị na-adịbeghị anya. Ka ikwu okwu m na-aka mma, e nyewere m akụkụ ndị dị ogologo karị tinyere okwu ihu ọha. Amatazuru m ọganihu m nweworo nanị na nso nso a mgbe a gwara m ka m kere òkè n’ihe ngosi abụọ ná mgbakọ sekit nke Ndịàmà Jehova.
N’ikwu eziokwu, amachaghị m ihe mere ikwu okwu m ji kawanye mma. Ọzọkwa, ọ pụrụ ịdalata ọzọ n’ọdịnihu. N’ezie, n’agbanyeghị na o yiri ka enwewo m ọganihu doro anya n’ikwu okwu site n’ikpo okwu, enwewo m ọtụtụ ajọ ndaghachi azụ mgbe m na-agwa ndị mmadụ okwu ihu na ihu. Ya mere nke a abụghị akụkọ nke ihe ịga nke ọma n’echiche nke na mụ emeriwo ịsụ nsụ. Mgbe m daghachiri azụ, ana m agbalị ichetara onwe m na ọ dị m mkpa ịnakwere adịghị ike m na ‘iji obi umeala soro Chineke na-eje ije.’—Maịka 6:8.
N’agbanyeghị ihe ọ bụla ọdịnihu ga-eweta, aga m anọgide na-agbalị, na-amara na n’ụwa ọhụrụ Chineke na-abịarute nso, na a ga-emeri ịsụ nsụ kpam kpam. “Ire nke ndị nsụ,” ka Bible na-ekwu, “ga-ekwuwakwa okwu ngwa ngwa.” Enwere m obi ike na nke a ga-abụ eziokwu n’echiche nkịtị na n’echiche ime mmụọ nakwa na ọbụna “ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 32:4; 35:6.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ịghọta Egwu nke Ịsụ Nsụ,” ná mbipụta a.
b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 21]
Mụ na nwunye m, bụ́ Tracy