Nnwere Onwe Pụọ n’Ịsụ Nsụ!
RUO ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ asatọ, Teta! enyeworo ndị na-agụ ya aka ịnagide nsogbu ndị a na-enwe kwa ụbọchị. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eme ka ha mara banyere nchọpụta na omume ọhụrụ n’ọrụ ahụ ike, bụ́ ndị pụrụ imetụta ndụ ha n’ụzọ dị omimi, dị ka akụkọ na-esonụ na-egosi.
A mụrụ Matthew na 1989 n’ebe ugwu England. Ruo mgbe ọ dị afọ abụọ, ọ bụ nwa okoro nta na-enweghị ihe na-eme ya. Mgbe ahụ, na mberede nnọọ, mgbe ọ nọ n’oge ezumike, ọ malitere ịsụ oké nsụ.
“Mụ na di m jere n’ụlọ ọgwụ na-ahụ maka ikwu okwu dị n’ógbè anyị,” ka Margaret, bụ́ nne ya na-akọwa, “a gwakwara anyị na ọ dịghị ihe a pụrụ imere ya ruo mgbe ọ gbara afọ asaa n’ihi na ruo n’afọ ndụ ahụ, ọ na-esiri ụmụntakịrị ike ịchịkwa akwara ụda olu ha. Ma mgbe Matthew jere ụlọ akwụkwọ, o siiri ya ike ịnagide mkpasu iwe sitere n’aka ụmụntakịrị ndị ọzọ, ịsụ nsụ ya kawanyere njọ. Ọ dịghị enwe mmasị ịnọ n’etiti ìgwè mmadụ ma ghọọ onye na-ekewapụ onwe ya iche. Ọbụna ije nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ghọrọ ihe ịma aka.
“Mgbe ahụ anyị hụrụ ‘Olileanya Maka Ndị Nsụ,’ nke dị n’ime ‘Ikiri Ụwa,’ ná mbipụta Teta! nke April 8, 1995 (Bekee). Ọ kọwara ná mkpirikpi ọrụ nke otu ìgwè ndị na-agwọ nsogbu ikwu okwu ndị nọ na Sydney, Australia, bụ́ ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’ịgwọta ịsụ nsụ ụmụntakịrị.
“Anyị degaara Mahadum nke Sydney akwụkwọ ma nata nzaghachi obiọma site n’aka Dr. Mark Onslow, na-atụ aro ka anyị kpọtụrụ ya na telifon. Ebe ọ bụ na anyị bi n’akụkụ nke ọzọ nke ụwa, ndị òtù ya na-agwọ nsogbu ikwu okwu kpebiri ịnwale ‘usoro ọgwụgwọ site n’ebe dị anya.’ E sitere na telifon, igwe nzirịta ozi fax, na kaseti a na-egere egere nye anyị, bụ́ ndị mụrụ Matthew ntụziaka, banyere usoro nke ìgwè ahụ. E mere ka usoro ọgwụgwọ ahụ kwekọọ ná mkpa Matthew. Ana m esoro ya nọdụ ala, n’ụzọ ntụsara ahụ, nke a na-emeghịkwa nkwadebe ya m na-enyere ya aka n’onwe m ikwuzi okwu ndị na-esiri ya ike. Etoro m ya nke ukwuu ma nye ya ụgwọ ọrụ dị nta maka okwu ndị gara ‘were were.’
“Mgbe ọnwa isii gasịrị Matthew abụghịzi onye na-anọ nanị ya, na-ekewapụ onwe ya iche, kama ọ bụ onye ntorobịa na-enweghị nsogbu, nke nwere obi ụtọ, na omume enyi. Ugbu a, ọ na-aza ajụjụ ná nzukọ ọgbakọ ma na-enwe oké ọṅụ ịgụ Bible n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ na-ekerekwa òkè buru ibu n’ozi ụlọ n’ụlọ. Okwu ya dị otú o kwesịrị!
“Lee ekele anyị nwere maka ihe ọmụma ahụ dị mkpirimkpi nke akụkọ dị na Teta!, bụ́ nke gbanweworo ndụ nke nwa anyị nwoke!”—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.