Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 5/8 p. 5-8
  • Ihe Anyị Kwesịrị Ịma Banyere Ajọ Òtù

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Anyị Kwesịrị Ịma Banyere Ajọ Òtù
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Ha Ji Abanye n’Ajọ Òtù
  • O Siri Ike Isi na Ya Pụọ
  • Ndụ Ka Mma Kwere Omume
  • Ichebe Ụmụ Anyị Pụọ n’Ajọ Òtù
    Teta!—1998
  • Ihe Otiti ahụ Na-agbasa
    Teta!—1998
  • “M Ji Aka M Na-egwu Ili M”
    Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
  • “Abụbu M Onye Iwe Ọkụ”
    Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 5/8 p. 5-8

Ihe Anyị Kwesịrị Ịma Banyere Ajọ Òtù

Wade, onye nọbu n’otu ajọ òtù na California, sịrị: “Anyị bụ nanị ndị enyi bi n’otu ógbè. Anyị malitekọrọ ụlọ akwụkwọ elementrị. Anyị emeghị nnọọ ezi mkpebi.”

AJỌ òtù na-amalitekarị dị ka ìgwè ndị bi n’otu ógbè. Ndị nọ ná mmalite afọ iri na ụma ha ma ọ bụ ndị na-erubeghị gbakọtara n’akụkụ okporo ámá. Ha mekọrọ ihe ọnụ, mgbe ahụkwa jikọọ aka iji chebe onwe ha pụọ n’aka ìgwè gbanyere mkpọrọgwụ karị nke nọ ha nso. Ma n’oge na-adịghị anya ìgwè ha malitere ibi ndụ ọjọọ dị ka ndị òtù ya kasị eme ihe ike, ọ malitekwara ime mpụ ndị dị ize ndụ.

Ajọ òtù mmegide sitere okporo ámá ọzọ pụrụ iwerewo ìgwè ọhụrụ ahụ dị ka onye iro ya. Mgbe ahụ iwe na-eduga n’ime ihe ike. Ndị na-agba mgbere ọgwụ ọjọọ na-eji ajọ òtù ahụ na-ere ọgwụ ndị iwu megidere. Mpụ ndị ọzọ na-esochi.

Luis dị afọ 11 mgbe ndị enyi ya guzobere otu ajọ òtù. Mgbe ọ dị afọ 12 ọ malitere iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Mgbe ọ dị afọ 13 a nwụchiri ya na nke mbụ ya. O so ezu ohi ụgbọala, akpaka ụzọ ma zuo ohi, nakwa n’iji égbè ezu ohi. A tụkwara ya nga ugboro ugboro maka ịlụ ọgụ ndị ajọ òtù na ịkpata ọgba aghara.

Ndị nọ n’ajọ òtù pụrụ iju anyị anya mgbe ụfọdụ. Martha, nwa akwụkwọ na-ejizi ejiji, nke na-eme nnọọ nke ọma n’ụlọ akwụkwọ dị elu, na-enweta akara dị mma ma na-akpazi àgwà n’ụlọ akwụkwọ. Otú ọ dị, ọ bụ onye ndú nke otu ajọ òtù na-atụ mgbere wii wii, heroin, na cocaine. Ọ bụ nanị mgbe a gbara otu n’ime ndị enyi ya égbè ugboro ugboro o wee nwụọ ka ụjọ mere ka ọ gbanwee ndụ ya.

Ihe Mere Ha Ji Abanye n’Ajọ Òtù

N’ụzọ na-eju anya, ụfọdụ ndị nọ n’ajọ òtù na-ekwu na ha banyere maka ịhụnanya. Ha na-achọ ezi mkpakọrịta, mkpachi anya nke ha na-achọtaghị n’ebe obibi ha. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Die Zeit nke Hamburg, Germany, sịrị na n’ajọ òtù okporo ámá, ndị na-eto eto na-agbalị ịchọta ịnọ ná ntụkwasị obi ha na-apụghị ịchọta n’ebe ọzọ. Eric, onye nọbu n’ajọ òtù, sịrị na ọ bụrụ na ị chọtaghị ịhụnanya n’ebe obibi, “ị pụọ n’èzí iji chọta ihe ka mma.”

Otu nna nọbu n’ajọ òtù dere banyere ahụmahụ ndị o nwere na nwata, sị: “A tụrụ m nga ugboro ugboro n’ihi ịkpa aghara, ịlụ ọgụ ndị ajọ òtù, ịkpasu ọgba aghara na n’ikpeazụ n’ihi ịnwa isite n’ụgbọala na-agba agba gbagbuo mmadụ.” E mesịa, mgbe a mụrụ nwa ya nwoke bụ́ Ramiro, o nwechaghị oge maka nwa okoro ahụ. Mgbe Ramiro tolitekwuru, ọ banyekwara n’ajọ òtù, ndị uwe ojii nwụchikwara ya mgbe otu ọgụ ajọ òtù gasịrị. Mgbe nna ya siri ọnwụ ka ọ pụọ n’ajọ òtù, o tiri ná mkpu, sị: “Ha bụ ezinụlọ m ugbu a.”

Otu nọọsụ nọ n’otu ụlọ ọgwụ dị na Texas, bụ́ onye sowooro ndị na-eto eto 114 a gbara égbè kwurịta okwu n’ime ihe ji nke nta gafee otu afọ, sịrị: “Ọ na-eju anya. Echeghị m na anụtụwo m ka otu n’ime ha na-ajụ maka nne ha ma ọ bụ onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ha.”

N’ụzọ dị ịrịba ama, ọ bụghị nanị ụmụaka sitere n’akụkụ obodo dara ogbenye karị na-abanye n’ajọ òtù. Ọtụtụ afọ gara aga, magazin ndị Canada bụ́ Maclean’s hotara ndị uwe ojii dị ka ndị na-asị na ha ahụwo ndị na-eto eto sitere ma n’ebe ndị a kasị baa ọgaranya n’obodo ukwu ma n’ógbè ha ndị kasị daa ogbenye n’otu ajọ òtù ahụ. Ndị a na-eto eto sitere ná nzụlite dị iche iche na-ejikọ aka n’ihi otu ihe ahụ—ha na-achọ inwe echiche nke ịdị n’otu ezinụlọ nke ha na-adịghị achọta n’ebe obibi.

N’ebe ụfọdụ ndị na-eto eto na-etolite na-eche na ịnọ n’ajọ òtù bụ ụzọ ndụ dị otú o kwesịrị. Fernando dị afọ 16 kọwara, sị: “Ha na-eche na ịbanye n’ajọ òtù ga-enyere ha aka ịgwọta nsogbu ha. Ha na-eche, sị: ‘Ọ ga-eme ka m nweta ụfọdụ ndị enyi. Ha gbara agba ma na-ebu égbè. Ha ga-echebe m, ọ dịghịkwa onye ga-akpa m aka.’” Ma ndị banyere n’ajọ òtù ọhụrụ na-achọpụta n’oge na-adịghị anya na ịnọ n’ajọ òtù na-eme ka ha ghọọ ndị ndị iro nke ajọ òtù ahụ na-elekwasị anya.

Ọtụtụ mgbe a na-enwe ajọ òtù n’ógbè ebe e nwere ego dị nta na ọtụtụ égbè. Akụkọ na-akọ banyere ọnụ ụlọ ụlọ akwụkwọ ndị dị n’obodo ukwu ebe ụmụ akwụkwọ 2 n’ime 3 bi n’ebe obibi nwere nanị nne ma ọ bụ nna. Mgbe ụfọdụ, nne ma ọ bụ nna nwa akwụkwọ bụ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ nke nwere ike ghara ịlọta ụlọ n’abalị, nwa akwụkwọ ahụ aghaghịkwa ịkpọga nwa ya na-enweghị nna n’ebe nlekọta ụmụaka tupu ọ gawa akwụkwọ n’ụtụtụ.

Gọvanọ California, bụ́ Pete Wilson, sịrị: “Anyị nwere nsogbu dị egwu n’ihi na ọtụtụ ụmụaka na-etolite n’enweghị nna, n’enweghị nwoke ha ga-eṅomi nke ga-egosi ha ịhụnanya, nduzi, ọzụzụ na ụkpụrụ omume ọma—n’amaghị ihe mere ha kwesịrị iji kwanyere onwe ha ma ọ bụ ndị ọzọ ùgwù.” Ọ sịrị na enweghị ike a nke ndị na-eto eto ụfọdụ igosi ndị ọzọ ọmịiko bụ ihe mere ha “ji yie ka ha pụrụ ịgbagbu mmadụ n’akwaghị ụta ma ọlị.”

Ọ bụ ezie na enweghị ịdị n’otu ezinụlọ, ọzụzụ onwe onye, na ihe nlereanya ụkpụrụ omume siri ike bụ isi ihe ndị na-akpata mmụba nke ajọ òtù, e nwekwara ihe ndị ọzọ sonụ. Ndị a na-agụnye usoro ihe omume TV na ihe nkiri sinima ndị na-egosi ime ihe ike dị ka ihe ngwọta dị mfe nye nsogbu, ọha mmadụ nke na-akpọkarị ndị dara ogbenye ndị dara ada ma na-echetara ha mgbe nile na ha enweghị ike ime ihe ndị ọzọ na-eme, ọnụ ọgụgụ na-arịkwa elu nke ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna ebe nne na-emebeghị okenye nke na-arụgbu onwe ya n’ọrụ na-aghaghị ịgba mgba iji kwadoo otu nwa ya ma ọ bụ karị ndị na-enweghị nlekọta. Nchịkọta nke ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị a ma ọ bụ ha nile, na ma eleghị anya tinyere ndị ọzọ, emewo ka e nwee ihe otiti na-arị elu zuru ụwa ọnụ nke ajọ òtù okporo ámá.

O Siri Ike Isi na Ya Pụọ

N’eziokwu, ka oge na-aga ụfọdụ ndị nọ n’ajọ òtù na-eji nwayọọ pụọ n’ajọ òtù ha, na-eji oge ha eme ihe ndị ọzọ. Ndị ọzọ nwere ike ịga binyere ndị ikwu ha n’ebe ọzọ wee si otú ahụ gbanahụ ndụ a na-adị n’ajọ òtù. Ma ọtụtụ mgbe, isi n’ajọ òtù pụọ anaghị adị mfe otú ahụ.

Dị ka ọ na-adịkarị, ọtụtụ ndị nọ n’ajọ òtù aghaghị itirụsị ndị ha na ha nọ n’òtù ahụ tupu e kwe ka ha dịrị ndụ pụọ n’òtù ahụ. N’eziokwu, a gbawo ndị chọrọ isi n’ajọ òtù pụọ égbè n’ezie. Ọ bụrụ na ha alanarị, a na-ahapụ ha ka ha pụọ! Isi n’ajọ òtù pụọ ò ruru eru ịkpata mmeso ọjọọ dị otú ahụ?

Otu onye nọbu n’ajọ òtù kọwara ihe mere o ji chọọ ịpụ: “Ise n’ime ndị enyi m anwụworị.” N’ezie, ndụ onye nọ n’ajọ òtù pụrụ ịdị ize ndụ n’ụzọ fọrọ nke nta ka o sie ike nkweta. Magazin bụ́ Time kọrọ banyere onye nọbu n’otu ajọ òtù dị na Chicago, sị: “N’ime afọ asaa ọ nọrọ n’ajọ òtù, a gbawo ya égbè n’afọ, jiri iberibe ígwè nke ụzọ okporo ígwè kụọ ya n’isi, gbajie ya aka n’ọgụ, tụọkwa ya nga ugboro abụọ n’ihi izu ụgbọala . . . Ma ugbu a o wepụworo aka, ọbụna ndị bụbu ndị enyi ya ṅụrụ iyi imerụ ya ahụ.”

Ndụ Ka Mma Kwere Omume

Eleno, bụ́ onye Brazil, bụbu onye òtù nke ndị Ọkụwa Isi, bụ́ ajọ òtù nke na-eji mma na mgbe ụfọdụ égbè na-alụ ọgụ. N’iche na ọ bụ onye ihe ụwa na-adabachaghịrị, ọ chọtara afọ ojuju n’ịkụwasị ihe na ịwakpo ndị mmadụ. Onye ọrụ ibe ya sooro ya kwurịta banyere Bible. Ka oge na-aga Eleno gara otu mgbakọ nke Ndịàmà Jehova, ebe o zutere ndị enyi ya mbụ bụ́ ndị hapụworo ajọ òtù ya tinyekwara otu onye nọbu n’òtù na-emegide nke ya. Ha kelere onwe ha dị ka ụmụnna—nke dị nnọọ iche n’ihe gaara eme tupu mgbe ahụ.

Ihe a ọ̀ na-eme eme n’ezie? N’ezie ọ na-eme! N’oge na-adịbeghị anya onye nnọchiteanya Teta! so ndị nọbu n’ajọ òtù ndị bụ́ isi na Los Angeles, bụ́ ndị so ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na-eje ozi ugbu a nwee nnọkọ. Mgbe ha kwurịtasịrị okwu ruo ọtụtụ hour, otu n’ime ha kwụsịtụrụ, dalaa azụ, ma kwuo, sị: “Leedị! Ndị sobu n’òtù Ọbara na Ngwụrọ nọ n’ebe a na-egosirịta onwe ha ịhụnanya dị ka ụmụnne!” Ha kwekọrịtara na ihe mere ha ji gbanwee site n’ịbụ ndị ajọ òtù afọ tara mmiri gaa n’ịbụ ndị ikom nwere obiọma na ịhụnanya bụ n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na ha amụtawo ụkpụrụ Chineke site n’iji nlezianya mụọ Bible.

Nke a ọ̀ pụrụ ime n’ezie n’afọ ndị 1990? Ndị nọ n’ajọ òtù hà pụrụ n’ezie ime mgbanwe ndị dị otú ahụ ugbu a? Ha pụrụ ma ọ bụrụ na ha dị njikere inyocha agbamume dị ike e nyere n’ime Okwu Chineke, mgbe ahụkwa mee ka ndụ ha kwekọọ n’ụkpụrụ Bible. Ọ bụrụgodị na ị nọ n’ajọ òtù, gịnị ma ị tụlee ime mgbanwe dị otú ahụ?

Bible na-agba anyị ume ‘ịtụpụ mmadụ ochie anyị dị ka ibi obi anyị na mbụ si dị’ na ‘iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’ (Ndị Efesọs 4:22-24) Olee otú e si azụlite mmadụ ọhụrụ ahụ? ‘Site ná mmazu,’ ka Bible na-ekwu, a pụrụ ime ka ụdị onye mmadụ bụ ‘dị ọhụrụ dị ka onyinyo nke [Chineke] kere ya si dị.’—Ndị Kọlọsi 3:9-11.

Ime mgbanwe ò ruru mgbalị a na-emere ya? Ee, o ruru! Ọ bụrụ na ị nọ n’ajọ òtù, ikekwe enyemaka ga-adị gị mkpa iji mee mgbanwe dị otú ahụ. E nwere ndị nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka. Ma, ndị mụrụ ụmụ na-anọkarị n’ọnọdụ inwekarịsị mmetụta dị mma n’ahụ ụmụ ha. Ya mere anyị ga-atụle ugbu a ihe ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime iji chebe ụmụ ha pụọ n’ajọ òtù.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị sobu n’ajọ òtù ndị na-emegiderịta onwe ha ndị eziokwu Bible jikọtara ugbu a

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya