Ichebe Ụmụ Anyị Pụọ n’Ajọ Òtù
“Ihe dị ụmụaka mkpa bụ ndị na-eche banyere ha.”—Not My Kid—Gang Prevention for Parents.
E WEZỤGA mmekọrịta anyị na Chineke, ụmụ anyị so n’ihe onwunwe ndị kasị oké ọnụ ahịa anyị nwere. Anyị kwesịrị iso ha kparịta ụka, ige ha ntị, ịmakụ ha, na ijide n’aka na ha maara na ha dị anyị oké mkpa. Anyị aghaghị ịkụziri ha ezi ihe—ime ihe n’eziokwu na inyere ndị mmadụ aka, ụzọ isi bie ndụ ọma, na ụzọ e si egosi ndị ọzọ obiọma.
Onyeisi nlekọta nke ogige ụlọ mkpọrọ ụmụaka isi ike rụtụrụ aka n’oké nsogbu e nwere taa, na-asị: “A dịghị akụzi ụkpụrụ ọma n’ime ezinụlọ.” N’ezie ọ dị anyị mkpa ichebara ime nke a echiche. Anyị aghaghị ibi ndụ n’ụzọ anyị chọrọ ka ụmụ anyị si bie ma mee ka ha hụ ọṅụ nke a na-atụkwasị ná ndụ anyị. Ọ bụrụ na anyị akụzighịrị ha ezi ụkpụrụ, olee otú anyị pụrụ isi tụọ anya ka ha gbasoo ụkpụrụ ndị dị otú ahụ?
Today, bụ́ magazin a na-ebipụta maka ndị nkụzi n’America, kwuru na ajọ òtù na-aratakarị ndị ntorobịa ndị “na-ewere onwe ha dị ka ndị dara ada” na ndị “na-achọ nchebe, mmetụta nke ịbụ ndị a chọrọ, na nnakwere nke ọha na eze.” Ọ bụrụ na anyị n’ezie enye ụmụ anyị ihe ndị ahụ n’ebe obibi—nchebe na mmetụta siri ike nke inwe ihe ịga nke ọma ma n’ezinụlọ ma ná ndụ ha—o yighị ma ọlị ka nkwa ụgha ndị ajọ òtù na-ekwe ọ ga-arata ha.
Onye ndú ngalaba ndị uwe ojii California na-alụso ajọ òtù ọgụ na-akọ banyere ọdịdị inwe ihe ijuanya ọ na-ahụ n’ihu ndị mụrụ ụmụ mgbe ndị uwe ojii kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ha ma kwuo na nwa ha nọ ná nsogbu. Ha apụghị ikweta na onye ha chere na ha maara nnọọ nke ọma nwere ike imewo ihe ọjọọ. Ma nwa ha achọtawo ndị enyi ọhụrụ, gbanweekwa. Ọ bụ nanị na ndị mụrụ ya achọpụtabeghị.
Ịkpachara Anya Dị Mkpa
Ndị bi n’ógbè ebe ndị ajọ òtù na-akpa ike na-ekwu na ma ndị na-eto eto ma ndị meworo okenye karị kwesịrị iji ezi echiche na-eme ihe, gharakwa ịma ajọ òtù aka ma ọ bụ yie ha egwu. Zere ìgwè bara ụba nke ndị nọ n’ajọ òtù, eṅomikwala ọdịdị ma ọ bụ ụzọ ha si eme ihe, gụnyere ụdị na àgwà uwe ha na-eyi. Iṅomi ha pụrụ ime ka ị bụrụ onye ndị ajọ òtù na-emegide ya lekwasịrị anya.
Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ na-eyi ákwà ma ọ bụ na-eme omume dị ka a ga-asị na ọ chọrọ ịbanye n’ajọ òtù, ndị nọ na ya nwere ike ịrụgide ya ka ọ ghọọ otu n’ime ha. Otu nna mụrụ ụmụ atọ na Chicago kọwara ịdị mkpa nke ịmara otú ndị nọ n’ajọ òtù n’ógbè unu si akpa àgwà. O kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na m kpu okpu chee ya ihu n’ebe aka nri, ha na-eche na mụ adịghị akwanyere ha ùgwù.’ Nke ahụ pụkwara iduga n’ime ihe ike!
Mara Ihe Ụmụ Gị Na-eme
Otu nne kwuru, sị: “Anyị aghaghị ịma banyere ụmụ anyị—ihe ha na-eche na ihe ha na-eme. Anyị apụghị inyere ha aka ma ọ bụrụ na anyị egosighị mmasị onwe onye ná ndụ ha.” Nne ọzọ sịrị na nsogbu ajọ òtù agaghị akwụsị ruo mgbe ndị mụrụ ụmụ kwụsịrị ya. Ọ gbakwụnyere, sị: “Ka anyị gosi ha ịhụnanya. Ọ bụrụ na ha efuo, anyị efuola.”
Ànyị maara ndị enyi ụmụ anyị, ebe ụmụ anyị na-aga mgbe a gbasasịrị akwụkwọ, na ebe ha na-anọ n’uhuruchi mgbe chi jisịrị? N’eziokwu, ọ bụghị nne ọ bụla pụrụ ịnọ n’ụlọ mgbe ụmụ ya si akwụkwọ lọrute. Ma ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ bụ́ ndị na-agbasi mgba ike ịkwụ ụgwọ ụlọ na inye ụmụ ha ihe oriri nwere ike ime ndokwa ka ndị nne ndị ọzọ ma ọ bụ onye ha tụkwasịrị obi lekọta ụmụ ha n’oge ehihie.
A jụrụ otu nwoke bi n’ógbè nke ajọ òtù a ma ama ụzọ ọ ga-esi chebe ụmụ ya pụọ n’ajọ òtù. Ọ sịrị na ya ga-akpọgharị nwa ya nwoke na gburugburu ógbè ha iji gosi ya ihe na-esi n’ọrụ ndị ajọ òtù apụta. Na ya ga-atụ aka n’ihe nsekasị na ụlọ ndị mebisịrị emebi ma gosi ya “na ógbè ahụ eyighị ka ọ dị nchebe nakwa na ndị nọ n’ajọ òtù na-egbugharị nnọọ oge, na-enwechaghị ihe ha ji ndụ ha na-eme.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Mgbe ahụ m ga-akọwa na ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible ga-egbochi ya ịghọta mkpụrụ yiri nke ahụ.”
Ihe dị mfe dị ka ezi mmasị anyị na-egosi n’ọrụ ụlọ akwụkwọ ụmụ anyị pụrụ ịbụrụ ha nchebe. Ọ bụrụ na ụlọ akwụkwọ ha nwere ụbọchị nnọkọ ndị mụrụ ụmụ ma ọ bụ oge ọzọ mgbe a na-akpọ ndị mụrụ ụmụ òkù ileta klas ha ma soro ndị nkụzi kwurịta okwu, jide n’aka na ị gara. Mara ndị nkụzi ụmụ gị, meekwa ka ha mara banyere nchegbu ị na-enwe maka nwa gị na banyere mmasị i nwere n’ịga akwụkwọ ya. Ọ bụrụ na ụlọ akwụkwọ ahụ enweghị usoro nleta ụlọ akwụkwọ, gbalịa ịmata oge ị ga-esoro ndị nkụzi kwurịta banyere ọganihu nwa gị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ na banyere ụzọ i nwere ike isi nye aka.
Nnyocha e mere n’otu nnukwu obodo dị n’America gosiri na n’ime ụmụ akwụkwọ ndị ezinụlọ ha nyeere aka ma ọ bụ gbara ume ime ihe omume a na-arụ n’ụlọ, pasent 9 abanyewo n’ajọ òtù. Ma n’ezinụlọ ebe a na-enyeghị nlebara anya dị otú ahụ, okpukpu abụọ nke ụmụ akwụkwọ ahụ—pasent 18—abanyewo n’ajọ òtù. Ọ bụrụ na ezinụlọ anyị na-egosi ịhụnanya ma dị n’otu, ọ bụrụkwa na anyị na-emekọ ihe ndị dị mma ọnụ, ọ ga-ebelata ohere nke ụmụ anyị ịbụ ndị e ji nkwa ụgha nke ajọ òtù rata.
Ihe Dị Ụmụ Anyị Mkpa n’Ezie
Otu ihe ndị ahụ dị anyị mkpa dị ụmụ anyị mkpa—ịhụnanya, obiọma, na mmetụta ịhụnanya. E nwere ọtụtụ ụmụaka a na-emetụbeghị aka n’ụzọ ịhụnanya na mmetụta ma ọ bụ gwa na ha dị mkpa n’ezie. Ka ọ ghara ịdị otú ahụ ma ọlị n’ebe ụmụ anyị nọ! Ka anyị na-amakụ ha, na-agwa ha na anyị hụrụ ha n’anya, na-agbalịkwa ịhụ na ha na-ebi ndụ n’ụzọ ụkpụrụ omume ọma anyị kụziwooro ha ibi. Ha dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu nye anyị nke na anyị agaghị emeso ha n’ụzọ ọ bụla ọzọ.
Gerald, onye nọbu n’ajọ òtù, kọwara, sị: “Enweghị m nna m ga-elegara anya, ya mere m gakwuuru ajọ òtù iji mechie oghere ahụ ná ndụ m.” Ọ malitere iji ọgwụ ọjọọ eme ihe mgbe ọ dị afọ 12. Ma mgbe ọ dị afọ 17, nne ya malitere iso Ndịàmà Jehova enwechi ọmụmụ Bible ebe obibi anya. O tinyere ụkpụrụ ọma dị iche iche nke Bible n’ọrụ ná ndụ ya. Ọ na-ekwu, sị: “Ahụrụ m mgbanwe ahụ ná ndụ ya, echekwara m, sị, ‘Ọ ghaghị inwe ihe dị n’ihe a.’” Ihe nlereanya ọma ya kwaliri ya ịgbanwe ndụ ya.
Ụmụ anyị kwesịrị ịhụ ezi ihe nlereanya n’ime anyị—na anyị na-ebi ndụ n’ụzọ anyị na-agwa ha ka ha bie. Ha kwesịrị inwe ike iji ezinụlọ ha na-eme ọnụ, ọ bụghị n’ihi ihe o nwere, kama n’ihi ihe ọ na-eme. E kwesịkwara inyereworị ụmụaka ahụ aka n’ụzọ ga-eme ka ha jiri ezi akparamàgwà nke ha na-eme ọnụ. Onye bụbu ọkaikpe Ógbè Los Angeles bụ́ Ira Reiner si otú a kwuo ya: “Anyị aghaghị ịgakwuru ụmụaka tupu ha abanye n’ajọ òtù.”
Inye Ha Ihe Dị Ha Mkpa
Ọ bụghị ihe onwunwe ndị anyị na-enye ụmụ anyị kasị mkpa. Ihe dị mkpa n’ezie bụ na anyị nyeere ha aka ịghọ ndị toruru ogo mmadụ na-ahụ n’anya ma na-eche banyere ndị ọzọ, ndị nwere ụkpụrụ omume ndị dị mma. Bible na-ekwu na Jekọb bụ́ onye ezi omume kpọrọ ụmụ ya ndị ntakịrị “ụmụ nke Chineke nyeworo [m] n’amara.” (Jenesis 33:5) Ọ bụrụ na anyị si otú ahụ na-ele ụmụ anyị anya—dị ka onyinye ndị Chineke nyere anyị—anyị ga-achọ imeso ha omume n’ịhụnanya karị na ịkụziri ha ibi ndụ ime ihe n’eziokwu, ịkwụwa aka ọtọ, na nke omume ọma.
N’ụzọ dị otú a anyị ga-eme ihe nile anyị pụrụ ime ibi ndụ anyị n’ụzọ ga-eme ka anyị setịpụrụ ụmụ anyị ihe nlereanya ziri ezi. Anyị ga-eme ka ha jiri ezinụlọ ha na-eme ọnụ n’ụzọ dị mma ma kwesị ekwesị, ọ bụghị n’ihe onwunwe ezinụlọ, kama n’ụdị mmadụ anyị bụ. N’ụzọ dị otú a, o yikarịrị ka ha agaghị achọ nkwado site n’aka ndị nọ n’okporo ámá.
N’ileghachi anya azụ n’oge ntorobịa ya, otu nna ochie na-asị: “Agaraghị m anwa ime ihe ọ bụla iji menye ezinụlọ m ihere.” O kwetara na ya chere otú a n’ihi na ya matara ịhụnanya ndị mụrụ ya nwere n’ebe ọ nọ. N’ezie, o nwere ike ọ gaghị adịrị ụfọdụ ndị nne na nna mfe, bụ́ ndị nne na nna nke ha na-adịghị mgbe ha gosiri ịhụnanya, igosi ụmụ ha ịhụnanya. Ka o sina dị, ọ dị ndị mụrụ ụmụ mkpa ịgbalị ịhụ ụmụ ha n’anya.
N’ihi gịnị ka nke a ji dị oké mkpa? N’ihi na dị ka “What’s Up,” bụ́ magazin nke Òtù Na-eme Nchọpụta Banyere Ajọ Òtù na Utah na-ebipụta, kwuru na, “mgbe ndị ntorobịa nwere mmetụta nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya na ndị nọ ná nchebe—ọ bụghị ịnọ ná nchebe n’ụzọ ego, kama n’ụzọ mmetụta uche—mkpa ndị na-eme ka ha banye n’ajọ òtù na-apụkarị n’anya.”
Ụfọdụ ndị na-agụ ihe a nwere ike na-eche na o siri ike inwe ezinụlọ ndị ka na-egosi ịhụnanya otú ahụ. Ma e nwere ha. Ị pụrụ ịhụ ọtụtụ n’ime ha n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa. N’eziokwu, ezinụlọ ndị a ezughị okè, ma ha nwere otu ihe enyemaka dị ukwuu: Ha na-amụ ihe Bible kwuru banyere ịzụlite ụmụ, na-agbalịkwa itinye ụkpụrụ Chineke ndị dị na Bible n’ọrụ ná ndụ nke ha. Ọzọkwa, ha na-akụziri ụmụ ha ụkpụrụ ndị a.
Ndịàmà Jehova kwere n’okwu ahụ e kwuru na magazin bụ́ The Journal of the American Medical Association: “Mmadụ apụghị inwe olileanya ka . . . ndị nọ n’afọ iri na ụma ‘Sị nnọọ ee e,’ n’enyeghị ha ihe ha ga-eji ‘Sị ee.’” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ụmụ anyị sị ee banyere ihe ndị dị mma, anyị aghaghị iduzi ha gaa n’ụzọ ahụ.
Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-anwa anwa ikwu, dị ka otu nna kwuru: ‘N’ime ajọ òtù ya, nwa m nwoke chọtara mkpakọrịta na nkwanye ùgwù ọ na-enwetatụbeghị.’ Anyị agaghịkwa achọ ịnụ ka ụmụ anyị na-ekwu, dị ka otu onye na-eto eto kwuru: “Abanyere m n’ajọ òtù n’ihi na ezinụlọ dị m mkpa.”
Anyị, bụ́ ndị mụrụ ụmụ, aghaghị ịbụ ezinụlọ ahụ. Anyị aghaghịkwa ime ihe nile anyị pụrụ ime iji hụ na ụmụaka anyị dị oké ọnụ ahịa nọgidere na-abụ akụkụ ya na-ekpo ọkụ ma na-ahụ n’anya.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ihe Ndepụta Maka Nne na Nna Nwere Nchegbu
✔ Soro ụmụ gị na-anọkọ n’ebe obibi, na-emekọkwa ihe ọnụ dị ka ezinụlọ
✔ Mara ndị enyi ụmụ gị na ezinụlọ ha, na-elerukwa anya n’ebe ụmụ gị na-aga na ndị ha na ha so na-aga
✔ Mee ka ụmụ gị mara na ha pụrụ iji nsogbu ọ bụla bịakwute gị n’oge ọ bụla
✔ Kụziere ụmụaka ịkwanyere ndị ọzọ, ihe ndị ruuru ha, na echiche ha ùgwù
✔Kwadoo ụmụ gị site n’ịmata ndị nkụzi ha nke ọma, meekwa ka ndị nkụzi ha mara na i nwere mmasị n’ebe ha nọ, na-akwadokwa mgbalị ha
✔ Edozila nsogbu site n’iti mkpu ma ọ bụ site n’ime ihe ike
Ụmụ gị chọrọ mmetụta ịhụnanya gị na-ekpo ọkụ
[Foto dị na peeji nke 9]
Igosi mmasị n’ọrụ ụlọ akwụkwọ nwa gị pụrụ ịbụ ihe nchebe