Ogologo Njem Mụ Site ná Ndụ na Ọnwụ na Cambodia
DỊ KA WATHANA MEAS SI KỌỌ
Ọ BỤ na 1974, ana m alụsokwa òtù Khmer Rouge ọgụ na Cambodia. Abụ m onye isi n’usuu ndị agha Cambodia. N’otu ọgụ anyị jidere otu onye soja Khmer Rouge. Ihe ọ gwara m banyere atụmatụ Pol Pot maka ọdịnihu gbanwere ndụ m, meekwa ka m malite njem dị ogologo, ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ime mmụọ.a
Ma kwee ka m kọọrọ gị mmalite nke ogologo njem mụ. A mụrụ m na 1945, na Phnom Penh, n’ebe a maara n’asụsụ Khmer dị ka Kampuchea (Cambodia). Nne m mesịrị jide ọkwá dị mkpa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii nzuzo. Ọ bụ onye nledo pụrụ iche nke Eze Norodom Sihanouk, bụ́ onye na-achị mba ahụ. Ebe ọ bụ nanị mụ na ya nọ, ọ na-ejikwa ọrụ n’aka mgbe nile, o chere na o kwesịrị ịhapụ m n’ụlọ nsọ okpukpe Buddha ka e zie m ihe.
Nzụlite M Dị Ka Onye Buddha
Adị m afọ asatọ mgbe m gara iso onye isi ndị mọnk nke okpukpe Buddha biri. Site n’afọ ahụ ruo 1969, ebe m na-anọ bụ n’ụlọ nsọ na n’ebe obibi. Onye mọnk m jeere ozi bụ Chuon Nat, onye kasị n’ọkwá okpukpe Buddha na Cambodia n’oge ahụ. Ruo nwa oge, arụrụ m ọrụ dị ka odeakwụkwọ ya ma nyere ya aka ná nsụgharị nke akwụkwọ nsọ ndị Buddha bụ́ “Nkata Atọ” (Tipitaka, ma ọ bụ Sanskrit Tripitaka) site n’asụsụ India oge ochie gaa n’asụsụ Cambodian.
E chiri m mọnk na 1964, anọgidekwara m na ya ruo 1969. N’oge a e nwere ọtụtụ ajụjụ ndị nyere m nsogbu, dị ka, N’ihi gịnị ka e ji nwee nhụjuanya dị ukwuu n’ụwa, oleekwa otú o siri malite? Ahụrụ m ka ndị mmadụ na-anwa n’ọtụtụ ụzọ ime chi ha obi ụtọ, ma ha amaghị ụzọ chi ha ga-esi gwọta nsogbu ha. Apụghị m inweta azịza na-eju afọ n’ihe odide ndị Buddha, mọnk ndị ọzọ apụghịkwa. Enwere m nnọọ nkụda mmụọ nke na m kpebiri ịhapụ ụlọ nsọ ahụ, akwụsịkwara m ịbụ onye mọnk.
N’ikpeazụ, na 1971, esonyere m n’òtù ndị agha Cambodia. E zigara m na Vietnam n’ihe dị ka na 1971, n’ihi ịbụ onye gụrụ akwụkwọ, e buliri m gaa n’ọkwá second lieutenant ma kenye m ọrụ na ngalaba ndị agha pụrụ iche. Anyị na-alụ ọgụ megide ndị agha Kọmunist nke Khmer Rouge na Vietcong.
Agha na Mgbanwe na Cambodia
Aghọrọ m aka ochie nke agha mesiri obi ike. Ịhụ ọnwụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị maara m ahụ. Eso m lụọ ọgụ 157. N’otu oge, n’ime oké ọhịa, ndị Khmer Rouge gbara anyị gburugburu ruo ihe karịrị otu ọnwa. Ihe karịrị ndị ikom 700 nwụrụ. Ihe lanarịrị bụ ihe dị ka mmadụ 15—abụ m otu n’ime ha, e merụkwara m ahụ. Ma adị m ndụ pụta.
N’oge ọzọ, na 1974, anyị jidere otu onye soja Khmer Rouge. Ka m na-agba ya ajụjụ, ọ gwara m na Pol Pot mere atụmatụ imemila ndị nile nọbu n’ọkwá ọchịchị, gụnyere ndị agha. Ọ gwara m ka m hapụ ihe nile m na-eme ma gbafuo. O kwuru, sị: “Nọgide na-agbanwe aha gị. Ekwela ka onye ọ bụla mara onye ị bụ. Mee ka onye na-amaghị nke a na-akọ na onye na-agụghị akwụkwọ. Agwala onye ọ bụla banyere onye ị bụbu.” Mgbe m tọhapụsịrị ya ịlaghachi n’ụlọ ya, ịdọ aka ná ntị ahụ dịgidere n’uche m.
Agwawo anyị bụ ndị soja na anyị na-alụrụ mba anyị ọgụ, ma, anyị na-egbu ndị Cambodia. Khmer Rouge, bụ́ òtù ọchịchị Kọmunist na-achọ ike ọchịchị, bụ ndị be anyị. N’ezie, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu na nde itoolu bi na Cambodia bụ ndị Khmer, ọ bụ ezie na ihe ka ọtutụ n’ime ha esoghị na Khmer Rouge. Ọ gbasaghị m. Anyị na-egbu ndị ọrụ ugbo aka ha dị ọcha bụ́ ndị na-enweghị égbè, na-enwekwaghị mmasị n’agha ahụ.
Ịlọta n’agha na-abụkarị ahụmahụ na-agbawa obi. Ndị nwunye na ụmụaka ga-anọ ya, jiri nchegbu na-echere ịhụ ma di ma ọ bụ nna ha ọ̀ lọtara. Aghaghị m ịgwa ọtụtụ n’ime ha na e gbuwo onye òtù ezinụlọ ha. N’ime ihe a nile, nghọta m nwere n’okpukpe Buddha enyeghị m nkasi obi.
Ana m echeghachi echiche azụ ugbu a otú ihe si gbanwee na Cambodia. Tupu 1970, e nwetụrụ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ihe ka n’ọtụtụ mmadụ enweghị égbè; iwu megidere ya ọ gwụla ma i nwere akwụkwọ ikike. E nwere izu ohi ma ọ bụ ịtụtụ aka dị nta. Ma mgbe agha obodo ahụ malitesịrị n’ihi nnupụisi nke Pol Pot na ndị agha ya, ihe nile gbanwere. Égbè juru ebe nile. A na-azụ ọbụna ndị na-eto eto dị afọ 12 na 13 maka agha, ha na-amụ otú e si agbagbu mmadụ. Ndị òtù Pol Pot mere ka ụfọdụ ụmụaka kwenye igbu ndị mụrụ ha. Ndị soja ahụ ga-agwa ụmụaka, sị, “Ọ bụrụ na ị hụrụ mba gị n’anya, ị ghaghị ịkpọ ndị iro gị asị. Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị na-arụrụ gọọmentị ọrụ, ha bụ ndị iro anyị, ị ghaghịkwa igbu ha—ma ọ bụ e gbuo gị.”
Pol Pot na Mkpochapụ Ahụ
Na 1975, Pol Pot meriri n’agha ahụ, Cambodia ghọkwara mba ọchịchị Kọmunist. Pol Pot malitere mkpochapụ nke ụmụ akwụkwọ, ndị nkụzi, ndị ọrụ gọọmentị nile, na onye ọ bụla ọzọ gụrụ akwụkwọ. Ọ bụrụ na i kpuru ugegbe anya, a pụrụ igbu gị n’ihi na a ga-ewere ya na ị gụrụ akwụkwọ! Ọchịchị Pol Pot manyere ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ isi n’obodo ukwu kwapụ gaa n’ime ime obodo ịrụ ọrụ dị ka ndị ọrụ ugbo. Onye ọ bụla aghaghị iji ejiji n’otu ụdị. Anyị aghaghị ịrụ ọrụ hour 15 kwa ụbọchị, n’enweghị ihe oriri zuru ezu, n’enweghị ọgwụ, n’enweghị ákwà, na ihi ụra nanị hour 2 ma ọ bụ 3. Ekpebiri m ịhapụ obodo m tupu oge aganarị m.
Echetara m ndụmọdụ nke onye soja Khmer Rouge ahụ. Etufuru m foto nile, akwụkwọ, na ihe ọ bụla nke pụrụ ikotere m okwu. Egwuru m ala ma lie ụfọdụ n’ime akwụkwọ m. Mgbe ahụ emere m njem gaa ebe ọdịda anyanwụ na Thailand. Ọ dị ize ndụ. Aghaghị m izere ebe ndị a tụchiri ihe n’ụzọ ma kpachapụ anya n’oge e nwere iwu onye apụtala èzí, ebe ọ bụ nanị ndị soja Khmer Rouge pụrụ ime njem, site n’ikike ndị isi.
Agara m n’otu ógbè ma soro otu enyi m biri ruo nwa oge. Mgbe ahụ ndị Khmer Rouge chụpụrụ onye ọ bụla n’ebe ahụ gaa n’ebe ọhụrụ. Ha malitere igbu ndị nkụzi na ndị dọkịta. Mụ na ndị enyi m atọ gbanarịrị. Anyị zoro n’oké ọhịa ma rie mkpụrụ osisi ọ bụla anyị pụrụ ịhụ n’elu osisi. N’ikpeazụ, abịara m n’otu obodo nta n’ógbè Battambang, bụ́ ebe otu enyi m bi. N’ụzọ juru m anya, n’ebe ahụ ahụrụ m onye ahụ bụbu soja nke kọọrọ m ụzọ m ga-esi gbapụ! Ebe m tọhapụworo ya, o zoro m n’olulu ruo ọnwa atọ. Ọ gwara otu nwatakịrị ka ọ na-atụbara m ihe oriri ma ka ọ ghara ilenye anya n’olulu ahụ.
Ka oge na-aga, enwere m ike ịgbapụ, ahụrụ m mama m, nwanne nne m nke nwanyị, na nwanne m nwanyị, bụ́ ndị na-agbagakwa n’ókèala Thailand. Ọ bụ oge mwute nye m. Ahụ adịghị mama m, o mesịkwara nwụọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ n’ihi ọrịa na erighị nri. Otú ọ dị, ndụ m malitere inwe olileanya na nzube. Ezutere m Sopheap Um, bụ́ nwanyị ghọrọ nwunye m. Anyị gbapụrụ, tinyere nwanne nne m na nwanne m nwanyị, gabiga ókèala Thailand ma baa n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke Mba Ndị Dị n’Otu. Ezinụlọ anyị tara ahụhụ nke ukwuu n’agha obodo Cambodia. Mmadụ 18 nọ n’ezinụlọ anyị nwụrụ, gụnyere nwanne m nwoke na nwunye nwanne m.
Ndụ Ọhụrụ na United States
N’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, e nyochara nzụlite anyị, òtù UN gbalịkwara ịchọtara anyị onye nkwado ka anyị wee nwee ike ịga United States. N’ikpeazụ, ihe dabara! Na 1980, anyị bịarutere St. Paul, Minnesota. Amaara m na ọ dị m mkpa ịmụta Bekee ngwa ngwa dị ka o kwere omume ma ọ bụrụ na m gaje inwe ihe ịga nke ọma ná mba ọhụrụ m. Onye nkwado m zigara m ụlọ akwụkwọ nanị ruo ọnwa ole na ole, ọ bụ ezie na m kwesịrị ịmụ ihe ogologo oge karị. Kama nke ahụ, ọ chọtaara m ọrụ dị ka onye odozi ụlọ na họtel. Ma n’ihi Bekee m na-amachaghị, emejọrọ m ọtụtụ ihe n’ụzọ na-atọ ọchị. Onye nwe họtel ahụ ga-asị m weta ubube, m ga-ewetakwa ihe mkpofu!
Nleta Na-atụ Ụjọ
Na 1984, ana m arụ ọrụ anyasị ma na-ehi ụra n’oge ehihie. Anyi bi n’ógbè e nwere ọtụtụ esemokwu n’etiti ndị Esia na ndị isi ojii. Mpụ na ọgwụ ọjọọ juru ebe nile. N’otu ụtụtụ, nwunye m kpọtere m n’elekere anya iri ịgwa m na e nwere nwoke onye isi ojii nọ n’ọnụ ụzọ. Ụjọ ji ya n’ihi na o chere na ọ bịara izu anyị ohi. Enyopụrụ m anya n’ọnụ ụzọ, e nwekwara nwoke onye isi ojii jiri ejiji nke ọma bu akpa kwụ n’ọnụ ụzọ, otu onye ọcha sokwa ya. Ọ dị m ka o nweghị nsogbu dịnụ.
Ajụrụ m ya ihe ọ na-ere. O gosiri m magazin Ụlọ Nche na Teta! O nweghị ihe m ghọtara. Agbalịrị m ịjụ ha n’ihi na n’ọnwa ole na ole gara aga, a rafuwo m ịkwụ $165 maka akwụkwọ ise sitere n’aka onye ahịa bụ́ onye Protestant. Otú ọ dị, onye isi ojii ahụ gosiri m ihe osise ndị dị na magazin ahụ. Ihe osise ndị ahụ mara nnọọ mma! Nwoke ahụ na-achịkwa ọchị enyi. Ya mere enyere m onyinye $1 ma were ha.
Ihe dị ka izu abụọ n’ihu, ọ lọghachiri ma jụọ m ma m nwere Bible n’asụsụ Cambodian. N’ezie, enwere m otu nke m nwetara na chọọchị Nazarene, ọ bụ ezie na aghọtaghị m ya. Ma o metụrụ m n’ahụ na ndị ikom abụọ si n’agbụrụ dị iche iche abịawo n’ọnụ ụzọ m. Mgbe ahụ ọ jụrụ m, sị, “Ị̀ chọrọ ịmụta Bekee?” N’ezie achọrọ m, ma akọwaara m ya na enweghị m ego iji kwụọ ụgwọ maka ịmụ ihe. Ọ gwara m na ọ ga-akụziri m ya n’efu, na-eji akwụkwọ dabeere na Bible. Ọ bụ ezie na amaghị m okpukpe o si, echere m, sị, ‘Ma ọ dịghị ihe ọzọ agaghị m akwụ ụgwọ, m ga-amụtakwa ịgụ na ide Bekee.’
Ịmụta Bekee na Bible
Ọ bụ usoro gara nwayọọ nwayọọ. Ọ ga-egosi m akwụkwọ mbụ nke Bible, bụ́ Jenesis, mgbe ahụkwa m ga-ekwu ya n’asụsụ Cambodian, “Lo ca bat.” Ọ ga-asị, “Bible,” m ga-asịkwa, “Compee.” Amalitere m inwe ọganihu, a kwalikwara m. Ana m eji ọkọwa okwu mụ e dere n’asụsụ Bekee na Cambodian, magazin Ụlọ Nche, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bible, na Bible m dị n’asụsụ Cambodian aga ọrụ. N’oge nzurutụ ike, amụrụ m ma mụta Bekee, otu okwu n’otu oge, site n’ịtụle mbipụta ndị ahụ. Usoro a gara nwayọọ nwayọọ, tinyere ihe ọmụmụ kwa izu, were ihe karịrị afọ atọ. Ma, n’ikpeazụ, apụrụ m ịgụ Bekee!
Nwunye m ka na-aga n’ụlọ nsọ okpukpe Buddha, ọ na-edebekwara ndị nna nna ihe oriri n’èzí. N’ezie, nanị ndị ritere uru bụ ijiji! Enwere m ọtụtụ àgwà ọjọọ riri m ahụ ndị malitere n’oge m nọ n’òtù agha na n’okpukpe Buddha. Mgbe m bụ onye mọnk, ndị mmadụ na-eweta onyinye, tinyere siga. Ha kwetara na ọ bụrụ na onye mọnk esee siga ndị ahụ, ọ ga-adị ka ọ bụ ndị nna nna ha na-ese ha. N’ụzọ dị otú a, aghọrọ m onye nicotine riri ahụ. Mgbe ahụkwa, n’oge m bụ onye agha aṅụrụ m oké mmanya, seekwa opium iji nye m obi ike maka ọgụ ndị ahụ. N’ihi ya, mgbe m malitere ịmụ Bible, aghaghị m ime ọtụtụ mgbanwe. Mgbe ahụ ka m chọpụtara na ekpere bụ ihe enyemaka dị ukwuu. Nanị n’ime ọnwa ole na ole, emeriri m àgwà ọjọọ m. Lee ka nke ahụ si tọọ ndị fọdụrụ n’ezinụlọ anyị ụtọ!
E mere m baptism dị ka Onyeàmà na 1989, na Minnesota. N’oge ahụ achọpụtara m na e nwere otu ìgwè Ndịàmà na-asụ asụsụ Cambodian nakwa ọtụtụ ndị Cambodia bi na Long Beach, California. Mgbe mụ na nwunye m kwurịtasịrị ya, anyị kpebiri ịkwaga Long Beach. Ọ bụ mgbanwe nke kpatara ọdịiche nile ahụ! E buru ụzọ mee nwanne m nwanyị baptism, e mesịa nwanne nne m (bụ́ onye dị afọ 85 ugbu a) na nwunye m. Ụmụ m atọ sochiri. N’ikpeazụ, nwanne m nwanyị lụrụ Onyeàmà, bụ́ onye na-eje ozi ugbu a dị ka okenye n’ọgbakọ.
Na United States ebe a, anyị agabigawo ọtụtụ ọnwụnwa. Anyị enwewo oké ihe isi ike akụ̀ na ụba na ụfọdụ nsogbu ahụ ike, ma site n’ịgbaso ụkpụrụ Bible, anyị ejigidewo ntụkwasị obi anyị na Jehova. Ọ gọziwo mgbalị m n’ubi ime mmụọ. Na 1992, a họpụtara m ije ozi dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ, na 1995 kwa, aghọrọ m okenye na Long Beach ebe a.
Ka ọ dị ugbu a, ogologo njem ahụ nke malitere mgbe m bụ onye mọnk nke okpukpe Buddha ma mesịa bụrụ onye isi n’ọgbọ agha nke Cambodia agha tisasịrị agwụwo n’udo na n’obi ụtọ n’ebe obibi na ná mba ọhụrụ anyị. Anyị nwekwara okwukwe anyị nwetara ọhụrụ n’ebe Jehova Chineke na Kraịst Jisọs nọ. Ọ na-ewute m ịmara na ndị mmadụ ka na-egburịta ibe ha na Cambodia. O sokwu n’ihe mere mụ na ezinụlọ m ji echere ma na-akpọsa ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ ebe agha nile ga-akwụsị, mmadụ nile ga-ahụkwa ndị agbata obi ha n’anya n’ezie dị ka onwe ha!—Aịsaịa 2:2-4; Matiu 22:37-39; Mkpughe 21:1-4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Pol Pot bụ onye ndú ọchịchị Kọmunist nke usuu ndị agha Khmer Rouge n’oge ahụ, nke meriri n’agha ahụ ma weghara Cambodia.
[Map/Foto dị na peeji nke 28]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
VIETNAM
THAILAND
CAMBODIA
Battambang
Phnom Penh
LAOS
N’oge m bụ onye mọnk n’okpukpe Buddha
[Ebe E Si Nweta Foto]
Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.
[Foto dị na peeji nke 30]
Mụ na ezinụlọ m, n’Ụlọ Nzukọ Alaeze