Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
“Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Ọ Bụla Ọ Gụrụ Metụrụ M n’Obi”
PỌL onyeozi kwuru, sị, “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Nke a bụ eziokwu ná ndụ nke otu nwanyị onye si Vietnam, onye a zụlitere dị ka onye okpukpe Buddha. Nke a bụ akụkọ ya.
“Ndị mụrụ m, ndị ka nọ na Vietnam, na-aza ndị okpukpe Buddha n’aha, ya mere, a zụlitere m dị ka onye okpukpe Buddha ruo mgbe m lụrụ di mgbe m dị 22 afọ. Ezinụlọ di m nwara ịmanye m ka m mee baptism na Chọọchị Katọlik. Ha kwuru na a na-egbochi nne di m nke nwụworonụ ịbanye n’eluigwe n’ihi na abụ m onye okpukpe Buddha! Na mbụ, ajụrụ m ime otú ahụ, ma emesịrị m mee baptism ka obi wee dị ha mma. Otú ọ dị, n’ime ime obi m, ọnọdụ ahụ na-atọ m ọchị n’ihi na akpọrọ m omume ihu abụọ nke Chọọchị Katọlik asị. E nweghị ọdịiche dị n’etiti ya na okpukpe Buddha. O mikpukwara n’ibu agha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, okpukpe abụọ ahụ na-agbakwa ume ife ndị nna ochie nwụrụ anwụ ofufe.
“A sị na m nọgidere na Vietnam, agaraghị m enwecha ohere ịmata eziokwu ahụ. Etolitere m n’oge mgbe ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị tisasịrị Ebe Ndịda Vietnam, ebikwa m n’otu obodo nke dị anya nke ukwuu site na Saigon. Ya mere, ọ bụụrụ m ngọzi inwe ike ịgbaga Australia.
“Eso m ná ndị ihe gaara nke ọma karị n’ime ndị ahụ ji ụgbọ mmiri na-agba ọsọ ndụ. Mgbe m ku nwa m nke dị ọnwa abụọ n’aka, agbara m ọsọ n’ime ọchịchịrị iji gbanarị ndị uwe ojii wee banye n’otu obere ụgbọ epeepe e ji egbu azụ. Mgbe anyị nọsịrị ụbọchị asaa n’oké osimiri, anyị rutere Malaysia, bụ́ ebe anyị nọrọ ruo ọnwa ole na ole n’ogige ndị ọsọ ndụ tupu anyị bịa Australia.
“Mgbe m nọsịrị afọ abụọ na ọkara n’Australia, Ndịàmà Jehova bịakwutere m mgbe ha na-eje ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Na mgbe mbụ ha bịara, anakweere m ka mụ na ha na-amụ Bible mgbe mgbe n’ihi na ahụrụ m nke a dị ka ohere ọma iji mụta asụsụ Bekee. Ma àgwà nke nwanyị Onyeàmà ahụ nke chọtara m na eziokwu ahụ ọ kụziiri m kpaliri mmasị m nke ukwuu. Akụkụ akwụkwọ nsọ ọ bụla ọ gụrụ metụrụ m n’obi, enweghịkwa m ike ịhụ ihu abụọ ọ bụla ná nzukọ Jehova. Mgbe m mụsịrị Bible ruo otu afọ na ọkara, araara m ndụ m nye Jehova, meekwa baptism.
“Aghaghị m ikwu na eziokwu ahụ agbanwewo ụzọ nile m si ele ndụ anya. Di m bụ onye na-ekweghị ekwe, ma Jehova enyeworo m aka, kwadookwa m, mụ na obere ezinụlọ m. Ọ bụwo Onye Ozizi Ukwu m, ọ kụziwokwara m otú m ga-esi ghọọ onye bụ nwunye na nne nke na-eme nke ọma karị. Anọgidere m na-ekele Jehova na o nyeworo m aka ịpụta n’ọchịchịrị ime mmụọ wee bata n’ìhè nke eziokwu Bible.”
N’eziokwu, Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ arụsiwo ọrụ dị mma ike n’ọnọdụ nke a. Ịmụ Bible na itinye ihe a mụtara n’ọrụ na-eme ka ndụ nwee isi, nweekwa nzube, ọ na-edujekwa ná ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke. Dị ka Chineke kpaliri Mosis ikwu, “ọ bụghị ihe efu ka ọ bụ n’ebe unu nọ; n’ihi na nke a bụ ndụ unu.”—Deuterọnọmi 32:47.