Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 8/8 p. 25-28
  • Ọrịa Dengue—Ahụ Ọkụ Na-esite n’Ihe Ọtịta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrịa Dengue—Ahụ Ọkụ Na-esite n’Ihe Ọtịta
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Ọrịa Dengue?
  • “Ụzọ Abụọ n’Ime Ụzọ Ise nke Ndị Bi n’Ụwa” Nọ n’Ihe Ize Ndụ
  • Ihe Ize Ndụ Ndị Pụrụ Iche nke DHF
  • Ichebe Ezinụlọ Gị
  • Ụzọ Mgbochi Ya
  • N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Bịaghachi?
    Teta!—2003
  • Ọrịa Na-efe Efe na Narị Afọ nke 20
    Teta!—1997
  • Ọrịa Ụmụ Ahụhụ Na-ekesa—Nsogbu Na-arịwanye Elu
    Teta!—2003
  • Mgbe Ahụ́ Ọkụ Jidere Nwa Gị
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 8/8 p. 25-28

Ọrịa Dengue—Ahụ Ọkụ Na-esite n’Ihe Ọtịta

Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Philippines

N’AHỤGHỊ ya anya, anwụnta bekwasịrị n’ogwe aka a na-eyichighị ákwà nke otu nwatakịrị nwanyị. N’egbughị oge ahụhụ ahụ dụpuru akpụkpọ ahụ ya ma na-amị ya ọbara. Ka ntakịrị oge gasịrị, nne ya lere nwa ya nwanyị anya wee hụ anwụnta ahụ. Ọ kụrụ ya aka, kụgbuo ya. Okwu ọ̀ gwụla? Ikekwe ọ gwụbeghị. Anwụnta nwere ike nwụọ, ma mwakpo ya were ntakịrị oge n’ọbara nwatakịrị ahụ etinyewo n’ime ya ihe ndị a na-achọghị bụ́ ndị pụrụ ịkpata ọrịa.

N’ime izu abụọ nwatakịrị ahụ nwere oyi ọmụma, isi ọwụwa, ihe mgbu n’azụ anya ya, oké ihe mgbu na nkwonkwo ya, nakwa oké ahụ ọkụ. Ka ọrịa ahụ na-aka njọ, ọ malitere inwe ọkọ na-acha ọbara ọbara ma nwee oké ike ọgwụgwụ. O butewo ọrịa dengue, bụ́ ahụ ọkụ na-esite n’anwụnta ịta mmadụ.

Otú ọ dị, ọ pụrụ ịmalite ịrịa ụdị ọrịa ahụ nke ka njọ, bụ́ ahụ ọkụ ọrịa dengue nke na-akpata ọbara ọgbụgba (DHF), karịsịa ma ọ bụrụ na nwatakịrị ahụ arịawo ọrịa dengue na mbụ. N’ihi ya, aghịrịgha akwara na-ehi ehi, na-akpata ọbara ịpụta n’akpụkpọ ahụ. A pụrụ inwe ọbara ọgbụgba n’ime ahụ. Ma e nyeghị ya ọgwụgwọ kwesịrị ekwesị, onye ọrịa ahụ pụrụ inwe oké ntụbọ na nsogbu nrugharị ọbara, na-eduje n’ọnwụ ngwa ngwa.

Gịnị kpọmkwem bụ ọrịa dengue? Ọ̀ pụrụ imetụta gị? Olee otú ị pụrụ isi chebe onwe gị na ezinụlọ gị? Ka anyị lerukwuo ya anya.

Gịnị Bụ Ọrịa Dengue?

Ọrịa dengue, nke a na-akpọkwa ahụ ọkụ mgbaji ọkpụkpụ, bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ọrịa ndị pụrụ isite n’anwụnta ịta mmadụ. Ihe na-akpata ọrịa ahụ n’ezie bụ otu nje virus. Anwụnta bu ya (ya bụ, anwụnta taburu mmadụ bu ya) na-ebu nje virus ahụ n’akụkụ ahụ ya na-emepụta asọ mmiri. Mgbe ọ na-ata mmadụ ka ọ mịrị ọbara, ọ na-ebufe onye ahụ virus ahụ.

E nwere ụdị nje virus anọ nke ọrịa dengue. Ibute otu ụdị adịghị echebe mmadụ pụọ n’ụdị atọ ndị ọzọ. Mgbe e butesịrị ya otu ugboro, ọ bụrụ na anwụnta bu ụdị ọzọ ataa onye ahụ, ọ pụrụ ịkpata DHF.

“Ụzọ Abụọ n’Ime Ụzọ Ise nke Ndị Bi n’Ụwa” Nọ n’Ihe Ize Ndụ

Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) si kwuo, ọrịa dengue na-eyi ijeri mmadụ 2.5 egwu, bụ́ “ụzọ abụọ n’ime ụzọ ise nke ndị bi n’ụwa.” Magazin bụ́ Asiaweek kọrọ, sị: “Ihe karịrị mba 100 nke ebe okpomọkụ na ebe na-abụchaghị ebe okpomọkụ akọwo banyere ntiwapụ nke ọrịa dengue, a na-enwekwa ọtụtụ iri nde ndị a na-akọ na ọ na-arịa kwa afọ, nke 95% nke ndị na-ebute ya bụ ụmụaka.”

A maghị kpọmkwem mgbe mbụ a chọpụtara ọrịa dengue n’ụwa. Otu akụkọ banyere “ahụ ọkụ ikpere” na Cairo na 1779 pụrụ ịdị na-ezo aka n’ezie n’ọrịa dengue. Kemgbe ahụ, a kọwo akụkọ banyere ọrịa dengue n’ụwa nile. Karịsịa kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ, ọrịa dengue enwewo mmetụta dị ịrịba ama n’ahụ ike ụmụ mmadụ, na-amalite na Ndịda Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia. Ụdị dị iche iche nke nje virus ahụ malitere ịgbasa, nke a dujekwara n’ụdị ka ize ndụ na-akpata ọbara ọgbụgba. Otu akwụkwọ nke òtù WHO bipụtara na-ekwu, sị: “A matara ntiwapụ mbụ n’ezie nke ahụ ọkụ na-akpata ọbara ọgbụgba n’Esia na Manila na 1954.” Mba ndị ọzọ sochiri, karịsịa Thailand, Vietnam, Malaysia, na ógbè ndị dị nso. Ntiwapụ ndị mbụ a na Ndịda Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia nwere ọ̀tụ̀tụ̀ igbu mmadụ dị malite na pasent 10 ruo 50, ma ka a na-amụtakwu ihe banyere ọrịa ahụ, ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a dalatara.

Kemgbe afọ ndị 1960, nselata aka n’usoro ihe omume ịchịkwa anwụnta na-ebu nje virus ahụ atụnyewo ụtụ n’oké mmụba nke ọrịa dengue. Otú ọrịa dengue gbasaruworo, otú a ka DHF gbasaruru. Nanị mba 9 nwere ntiwapụ ọrịa tupu 1970, ma ka ọ na-erule 1995 ọnụ ọgụgụ a amụbaruwo 41. Òtù WHO na-eme atụmatụ na kwa afọ, mmadụ 500,000 nwere DHF na-achọ inye ha àkwà n’ụlọ ọgwụ.

Ọ bụ ezie na a makebeghị banyere ọrịa ahụ n’ebe ndị na-abụghị ebe okpomọkụ, n’ọnọdụ ụfọdụ ndị njem gara ógbè ebe ndị e nwere ihe ize ndụ nke ibute ya ebutewo ya ma buru ọrịa ahụ laa. Dị ka ihe atụ, ka ọ na-eru ngwụsị nke 1996, The New York Times kọrọ banyere ndị na-arịa ọrịa dengue na United States—na Massachusetts, New York, Oregon, na Texas.

Ihe Ize Ndụ Ndị Pụrụ Iche nke DHF

Dị ka e kwuru na mbụ, DHF bụ ụdị ọrịa dengue nke na-eyi ndụ egwu. Otu n’ime ihe ize ndụ nke DHF bụ na a na-aghọgbu ndị mmadụ iche na ọ dịchaghị ize ndụ. Ọtụtụ na-ewere ya na ọ bụ azụ̀zụ̀. Otú ọ dị, iyigharị ime ihe pụrụ inye ọrịa ahụ ohere iru n’ọnọdụ ka njọ mgbe ọnụ ọgụgụ platelet dị n’ọbara na-adalata nke ukwuu, ọbara ọgbụgba ewee malite (n’ime ahụ ma ọ bụ n’agbụ̀, imi, ma ọ bụ n’akpụkpọ ahụ), ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị adalatakwa. Onye ọrịa pụrụ ịda. Mgbe ndị òtù ezinụlọ ya ga-eji mara na ọnọdụ ahụ dị njọ, ọ malitelarị ịtụbọ. Ha na-eburu ya ngwa ngwa gawa ụlọ ọgwụ. N’ebe ahụ, ndị dọkịta na-achọpụta na ọ malitelarị inwe nsogbu nrugharị ọbara. N’ihi ọnọdụ ahụ dị oké njọ, a na-ekwu ka e si n’akwara tinyeghachiri ya mmiri n’ahụ.

Ichebe Ezinụlọ Gị

Gịnị ka a pụrụ ime iji belata ike ọrịa a na-akpa? Ọ bụrụ na ezinụlọ bi n’ebe e nwere ọrịa dengue, onye òtù ezinụlọ enweekwa oké ahụ ọkụ nke nọfere otu ụbọchị, ezinụlọ ahụ kwesịrị iji amamihe jee hụ dọkịta. Nke a dị mkpa karịsịa ma ọ bụrụ na onye ọrịa ahụ nwere ihe mgbaàmà ndị ọzọ nke ọrịa dengue, dị ka ọkọ ma ọ bụ ihe mgbu n’uru ahụ na nkwonkwo ma ọ bụ n’azụ anya.

Dọkịta ahụ pụrụ inyocha ọbara. Ọrịa dengue nke na-adịghị akpata ọbara ọgbụgba pụrụ ịchọ nanị ọgwụgwọ dị mfe. Ma ọ bụrụ na nnyocha egosi na ọ bụ DHF, ikekwe dọkịta ahụ ga-atụ aro iji nlezianya chịkwaa mmiri dị n’ahụ. Nke a pụrụ ịgụnye ngwakọta nke mmiri, nnu na shuga, dị ka ndị ahụ e ji eme ihe maka afọ ọsịsa, ma ọ bụ, n’ọnọdụ ndị ka njọ, isi n’akwara tinyeghachi mmiri n’ahụ na-eji Ringer’s solution, ụdị mmiri nnu dị iche iche, ma ọ bụ ndị ọzọ, na-eme ihe. N’ịgwọ ntụbọ, dọkịta pụrụ idepụta ọgwụ ụfọdụ iji nye aka welite ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị ma weghachi ọnụ ọgụgụ platelet.

Ọ bụrụ na e nwere ọbara ọgbụgba butụrụ ibu, ndị dọkịta pụrụ ịtụ aro mmịnye ọbara. Ụfọdụ pụrụ ịtụ aro a ngwa ngwa n’atụleghị ihe ndị ọzọ a pụrụ ime. Otú ọ dị, tinyere ịbụ nke iwu Chineke megidere, nke a anaghị adịkebe mkpa. (Ọrụ 15:29) Ahụmahụ egosiwo na iji nlezianya chịkwaa mmiri ndị na-erugharị n’ahụ site ná mmalite nke ọrịa ahụ bụ ihe kasị mkpa n’ịgwọ ya. Dọkịta na onye ọrịa imekọ ihe ọnụ na nke a pụrụ inye aka wepụ esemokwu n’okwu banyere mmịnye ọbara. Nke a na-emesi nnọọ ike mkpa ọ dị ime ihe ngwa ngwa mgbe mmadụ na-eche na ọ bụ DHF.—Lee igbe bụ́ “Gịnị Bụgasị Ihe Mgbaàmà Ya?”

Ụzọ Mgbochi Ya

Otu n’ime ihe ndị na-ebukarịsị nje virus nke ọrịa dengue bụ anwụnta bụ́ Aedes aegypti. Ụdị a jupụtara n’ebe okpomọkụ na ebe ndị na-abụchaghị ebe okpomọkụ n’ụwa nile. (Lee map so nke a.) Anwụnta bụ́ Aedes aegypti na-amụba n’ógbè ndị mmadụ bijupụtara. Ibelata ọnụ ọgụgụ anwụnta bụ otu n’ime isi ihe dị mkpa n’ibelata ọrịa ahụ.

Ibelata ọnụ ọgụgụ anwụnta n’ụwa nile adịghị mfe. Otú ọ dị, e nwere ihe ndị ị pụrụ ime iji nye aka belata ihe ize ndụ ahụ na gburugburu ebe obibi gị. Anwụnta nke nne na-eyi àkwá n’ime mmiri. Erùrù ya pụrụ itolite n’ime arịa ọ bụla mmiri pụrụ ịdịru otu izu ma ọ bụ karị n’ime ya, dị ka taya ndị a na-ejikwaghị eme ihe, kom kom ndị a tụfuru atụfu, karama, ma ọ bụ mkpo akị oyibo ghere oghe. Ịtụfusị arịa ndị dị otú ahụ ga-eme ka a ghara inwe ebe anwụnta ga-amụba. Ọzọkwa, a na-atụ aro ka ị na-ekpudo bọket ma ọ bụ ụgbọ epeepe ihu n’ala. Ịkwọpụ mmiri dọrọ otu ebe n’ime ọwara mmiri ga-enyekwa aka. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ná mmalite afọ agụmakwụkwọ nke 1997/98, ngalaba ahụ ike na Philippines kwuru okwu megide idebe ite okooko osisi n’ime klas ụlọ akwụkwọ n’ihi nke a.

Ọ bụrụ na onye òtù ezinụlọ ebute ọrịa dengue, mee ihe iji zere anwụnta ndị ọzọ ịta ya bụ́ ndị pụrụ, n’aka nke ha, ibunye ndị ọzọ ọrịa ahụ. Ụlọ nwere ntụ oyi ma ọ bụ nke nwere ezigbo ihe ngebichi pụrụ ịbụ ebe nchebe.

Gịnị banyere ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa? E nweghị ọgwụ mgbochi ọrịa kwesịrị ekwesị ugbu a. A na-eme nchọpụta iji mepụta otu, ma eziokwu ahụ bụ́ na inwe nchebe zuru ezu ga-achọ ịgba ọgwụ nchebe pụọ n’ụdị ọrịa dengue anọ ahụ nile na-eme ka nke a sie ike. Ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa maka otu nanị pụrụ n’ezie ịmụba ihe ize ndụ nke inwe DHF. Ndị nnyocha nwere olileanya na a pụrụ inwe ọgwụ mgbochi ọrịa dị irè n’ime afọ ise ruo iri.

Ndị nnyocha ụfọdụ anọwo na-anwale ụzọ ọzọ. Site n’iji nkà mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa na-eme ihe, ha na-atụ anya igbochi nje virus nke ọrịa dengue ịmụba n’ime asọ mmiri nke anwụnta. Ọ bụrụ na nke a gaa dị ka e mere atụmatụ ya, ụdị anwụnta ndị ahụ a gbanweworo mkpụrụ ndụ ihe nketa ha ga-ebufere ụmụ ha ikike iguzogide ọrịa dengue. Ọ bụ ezie na e nwewo ọganihu ụfọdụ, a mabeghị otú nke a ga-enweru ihe ịga nke ọma.

Ka ọ dịgodị ugbu a, ikpochapụ ọrịa dengue kpam kpam eyighị ka ọ ga-ekwe omume. Ma ime ihe ndị ezi uche dị na ha pụrụ inyere gị na ndị ị hụrụ n’anya aka izere nsogbu ndị na-eyi ndụ egwu na-esite n’ọrịa dengue—ahụ ọkụ na-esite n’ihe ọtịta.

[Igbe dị na peeji nke 26]

Gịnị Bụgasị Ihe Mgbaàmà Ya?

Ihe mgbaàmà nke ma ahụ ọkụ ọrịa dengue ma ahụ ọkụ ọrịa dengue nke na-akpata ọbara ọgbụgba (DHF)

• Oké ahụ ọkụ mberede

• Oké isi ọwụwaa

• Ihe mgbu n’azụ anya

• Ihe mgbu na nkwonkwo na uru ahụ

• Ọzịza nke isi akwara na-ebu mmiri ahụ

• Ọkọ

• Ike ọgwụgwụ

Ihe mgbaàmà ndị bụkarị kpọmkwem maka DHF

• Ịda na mberede

• Ọbara ịgba n’akpụkpọ ahụ

• Ọbara ọgbụgba nile

• Akpụkpọ ahụ jụrụ oyi, nke na-anya anya

• Ahụ erughị ala

• Ntụbọ na akụsighị ike nke obi (mgbaàmà nke ntụbọ n’ihi ọrịa dengue)

Egbula oge ije hụ dọkịta ma ọ bụrụ na a hụ ihe mgbaàmà. Ụmụaka kasị nọrọ n’ihe ize ndụ

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ndị ma nke a na-akọ banyere ahụ ike na-ekwu na e kwesịrị izere ịṅụ aspirin n’ihi na ọ pụrụ ime ka ọbara ọgbụgba ka njọ.

[Igbe dị na peeji nke 27]

Aro Maka Ndị Njem

Mgbe ụfọdụ, ndị na-aga n’ebe okpomọkụ na-ebute ọrịa dengue, ma a dịghị ebutekebe ahụ ọkụ ọrịa dengue nke na-akpata ọbara ọgbụgba n’ihi na a na-ebutekarị ụdị a ka njọ mgbe e butesịrị ọrịa dengue nke ugboro abụọ ya. Lee ụfọdụ aro nchebe maka ndị njem:

• Yiri uwe nwere aka ogologo na traụza

• Jiri ihe na-achụ anwụnta mee ihe

• Anọla n’ógbè ndị mmadụ bijupụtara

• Nọrọ n’ụlọ ebe ị pụrụ imechi window ma gbochie anwụnta ịbata

• Ọ bụrụ na ị malite inwe ahụ ọkụ mgbe ị lọtasịrị, gwa dọkịta ebe ị jere

[Map/Foto dị na peeji nke 27]

Ógbè ndị e nwere ọrịa “dengue” na nso nso a

Ógbè ndị nọ n’ihe ize ndụ inwe ntiwapụ ọrịa “dengue”

Ebe ndị “Aedes aegypti,” bụ́ anwụnta na-ebu ọrịa “dengue” na-adị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa, 1997

© Dr. Leonard E. Munstermann/Fran Heyl Associates, NYC

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Ebe ndị ha pụrụ ịnọ mụbaa bụ (1) taya ndị a na-ejikwaghị eme ihe (2) ọwara mmiri, (3) ite okooko osisi, (4) bọket ma ọ bụ arịa ndị ọzọ, (5) kom kom ndị a tụfuru atụfu, (6) drọn

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]

© Dr. Leonard E. Munstermann/Fran Heyl Associates, NYC

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya