Gịnị Mere na Mụ Apụghị Itinye Uche n’Ihe?
“Mgbe ụfọdụ ọ na-eme ná ndapụta. M na-aṅa ntị ná nzukọ ọgbakọ, mgbe ahụkwa, na mberede, uche m amalite ịwagharị. Minit 10 mgbe e mesịrị m na-alọghachị.”—Jesse.
“ṄAA NTỊ!” Ị̀ na-anụkarị okwu ndị ahụ n’ọnụ ndị nkụzi gị ma ọ bụ ndị mụrụ gị? Ọ bụrụ na ị na-anụ, mgbe ahụ ma e leghị anya ị na-enwe nsogbu ịtụkwasị uche gị n’ihe. N’ihi ya, akara mmụta gị pụrụ ịdalata. Ị pụkwara ịchọpụta na ndị ọzọ na-ele gị anya ọjọọ, na-elefuru gị anya dị ka onye mmanya na-egbu, onye ọgwụ ọjọọ ji, ma ọ bụ nanị dị ka onye na-enweghị nsọpụrụ.
Nke ka mkpa, enweghị ike ịṅa ntị pụrụ inwe mmetụta na-adịghị mma n’ọnọdụ ime mmụọ gị. E kwuwerị, Bible n’onwe ya na-enye iwu, sị: “Lezienụ anya otú unu si anụ.” (Luk 8:18) N’eziokwu, e nyere ndị Kraịst iwu “ịṅabiga ntị ókè karị” n’ihe ime mmụọ. (Ndị Hibru 2:1) Ọ bụrụkwa na ọ na-esiri gị ike itinye uche n’ihe, ọ pụrụ isiri gị ike ịṅa ntị na ndụmọdụ a.
Gịnị pụrụ ịbụ nsogbu? N’ọnọdụ ụfọdụ etinyeghị uche n’ihe pụrụ ịbụ n’ihi ahụ nsogbu. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nnyocha kwere na Ọrịa Enweghị Ike Ịtụkwasị Uche n’Ihe bụ n’ihi arụzighị ọrụ nke usoro akwara mbufe ozi nke ụbụrụ.a Ụfọdụ ndị ntorobịa nwere nsogbu ndị a na-achọpụtaghị, dị ka enwekwaghị ike ịnụ ihe ma ọ bụ ịhụ ụzọ. Ihe ndị a kwa pụrụ ịdọla ikike mmadụ nwere ịṅa ntị azụ. Ndị nnyocha achọpụtawo na ọ na-esikwuru ndị ntorobịa ike n’ozuzu ha itinye uche n’ihe karịa ndị okenye. N’ihi ya aṅaghị ntị bụ ihe a na-ahụkarị n’etiti ndị ntorobịa, ọ bụ ezie na ọ naghị abụkarị n’ihi nsogbu ahụ ike.
Usoro Iche Echiche Gị nke Na-agbanwe Agbanwe
Ọ bụrụ na ị na-enwe nsogbu itinye uche n’ihe, o yikarịrị ka ị na-enwe ihe mgbu nke itolite etolite. Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe m bụrịị nwa ọhụrụ, ana m ekwu dị ka nwa ọhụrụ, ana m atụkwasị uche n’ihe dị ka nwa ọhụrụ, ana m agụ ihe dị ka nwa ọhụrụ: ugbu a mgbe m ghọworo okenye, emewo m ka omume nwa ọhụrụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 13:11) Ee, ka ị na-etoru ogo mmadụ, usoro iche echiche gị na-agbanwe. Dị ka akwụkwọ bụ́ Adolescent Development si kwuo, “ikike iche echiche ndị ọhụrụ . . . na-ebilite ná mmalite oge uto.” Ị na-azụlite ikike ịghọta na ịkọwa echiche na nchepụta efu. Ị na-amalite inwe nghọta miwanyere emi banyere omume, ụkpụrụ omume, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ị na-amalite iche echiche banyere ọdịnihu gị dị ka onye toworo eto.
Gịnị pụrụ ịbụ ihe na-akpata nsogbu a? Echiche, na nchepụta ọhụrụ ndị a nile ịdị na-enugharị n’ụbụrụ gị pụrụ nnọọ ịdị na-adọpụ uche. Ị dịkwaghị eche echiche n’ụzọ dị mfe, na-abamighị ime otú nwata si eche. Ugbu a ụbụrụ gị na-akwali gị ịtụle na ịjụ ajụjụ banyere ihe ị na-ahụ na nke ị na-anụ. Otu okwu onye nkụzi kwuru pụrụ ịkpali mkpapụ uche nke na-akpali akpali. Ma ọ gwụla ma ị mụtara ịchịkwa echiche gị na-akpafu akpafu, ihe ọmụma bara uru pụrụ ifunahụ gị. N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible na-ekwu na onye ezi omume ahụ bụ́ Aịsak tinyere oge n’ịtụgharị uche n’oge dị jụụ. (Jenesis 24:63) Ikekwe iwepụtatụ oge kwa ụbọchị iji nọruo ala, tụgharịa uche, ma mee ka ihe doo anya pụrụ inyere gị aka itinye uche n’ihe karị n’oge ndị ọzọ.
Mmetụta Uche na Mmiri Ọgwụ Ahụ Bụ́ Hormone
Mmetụta uche gị pụkwara ịbụ ihe na-akpata ndọpụ uche. Ị na-agbalị itinye uche n’ihe ị na-agụ ma ọ bụ ihe ị na-ege, ma ị na-ahụ onwe gị ka ị na-eche banyere ihe ndị ọzọ. Ị na-eme i nwetụ ịtụ ọ̀bọ̀ i nwetụ mkpali, i nwetụ ịda mbà n’obi i nwetụ oké obi ụtọ. Echegbula onwe gị! Ara anaghị achọ ịgba gị. Dị ka o yikarịrị ọ bụ nanị okwu nke mmiri ọgwụ ahụ gị bụ́ hormone inye gị nsogbu. Ị na-enwe mgbanwe nke oge ịgba ajị.
Kathy McCoy na Charles Wibbelsman na-ede, sị: “Mmetụta na-ejupụta n’oge uto . . . Mgbanwe mmetụta a bụ, ruo n’ókè ụfọdụ, akụkụ nke ịbụ onye nọ n’oge uto. Nke a bụtụ n’ihi nrụgide nke mgbanwe nile ị na-enwe ugbu a.” Ọzọkwa, ị na-eru “ntoju ntorobịa”—oge mgbe agụụ mmekọahụ nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha kasị elu. (1 Ndị Kọrint 7:36, NW) Onye edemede bụ́ Ruth Bell na-ekwu, sị: “Mgbanwe ahụ nile nke oge ịgba ajị na-akpatakarị mmetụta mmekọahụ ndị siri ike karị. Ị pụrụ ịhụ ka ị na-eche banyere mmekọahụ karị, na-abụ onye a na-akpali n’ụzọ mmekọahụ n’ụzọ dị mfe karị, ọbụna mgbe ụfọdụ ọ na-adị gị ka uche gị nile ọ dị ná mmekọahụ.”b
Jesse, onye e hotara ná mmalite, na-enwe mwagharị uche nke a na-ahụkarị nnọọ n’etiti ndị nọ n’afọ iri na ụma: “Mgbe ụfọdụ m na-eche banyere ụmụ agbọghọ ma ọ bụ ụfọdụ ihe na-enye m nsogbu ma ọ bụ ihe m ga-eme mgbe e mesịrị.” E mesịa, mkpaghasị mmetụta uche ahụ ga-adajụ. Ka ọ dịgodị, rụọ ọrụ n’ọzụzụ onwe onye. Pọl onyeozi dere, sị: “Ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m.” (1 Ndị Kọrint 9:27) Ka ị na-amụtakwu ịchịkwa mmetụta uche gị, otú a ka ị ga-enwekwu ike itinye uche n’ihe karị.
Àgwà Ihi Ụra Gị
Ahụ gị na-eto eto chọrọ ụra zuru ezu iji nyere gị aka ito eto n’ụzọ anụ ahụ na inye ụbụrụ gị ohere ime ka ọtụtụ echiche na mmetụta uche ndị ọhụrụ ị na-enwe kwa ụbọchị doo anya. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nọ n’afọ iri na ụma nwere usoro ihe omume nke na-enye ha ohere dị nta ihi ụra. Otu ọkà n’ọrịa akwara ahụ na-ekwu, sị: “Ahụ agaghị echezọ hour nke iji hie ụra ndị mmadụ ji ya n’ụgwọ. N’ụzọ dị iche, ọ ga na-echeta ya mgbe nile, ọ ga-agbakwa ụgwọ ya na mberede nke pụrụ ịbịa dị ka nchezọ ihe, nsogbu itinye uche n’ihe, na ikike iche echiche dị ala.”
Ụfọdụ ndị nnyocha kwere na nanị ihikwu ụra otu hour ma ọ bụ karịa kwa abalị pụrụ ime ka ikike mmadụ nwere itinye uche n’ihe ka mma nke ukwuu. N’eziokwu, Bible na-akatọ umengwụ na ịhụ ihi ụra n’anya. (Ilu 20:13) Otú ọ dị, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya izu ike nke ọma iji na-arụ ọrụ nke ọma.—Eklisiastis 4:6.
Ihe Oriri na Itinye Uche n’Ihe
Nsogbu ọzọ pụrụ ịbụ ihe oriri. Ihe oriri ndị jupụtara n’abụba na shuga na-amasị ndị nọ n’afọ iri na ụma. Ndị nnyocha na-ekwu na ọ bụ ezie na nri ratụ ratụ pụrụ ịtọ ezigbo ụtọ, ha yiri ka ha na-ebelata ịdị nkọ nke uche. Nnyocha na-egosikwa na ịrụ ọrụ nke uche na-ebelata mgbe e risịrị nri nwere carbohydrate, dị ka bred, mkpụrụ akụ́kụ́, osikapa, ma ọ bụ pasta. Nke a pụrụ ịbụ n’ihi na carbohydrate na-amụba ọ̀tụ̀tụ̀ nke mmiri ọgwụ a na-akpọ serotonin n’ụbụrụ, na-emekwa ka mmadụ na-ero ụra. N’ihi ya, ụfọdụ ndị ọkachamara banyere iri ihe na-atụ aro iri ihe oriri ndị jupụtara na protein tupu ihe omume ọ bụla nke chọrọ ịdị nkọ n’uche.
Ọgbọ TV na Kọmputa
Ruo ọtụtụ afọ ndị ọkà nkụzi echewo na TV na onyinyo ya ndị na-aga zam zam na-eme ka ogologo oge ịṅa ntị nke ndị ntorobịa dị nkenke, ugbu a ụfọdụ na-arụkwa aka n’ebe ígwè kọmputa dị. Ọ bụ ezie na e nwere oké arụmụka n’etiti ndị ọkachamara banyere kpọmkwem otú nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ ndị a si emetụta ndị na-eto eto, itinyebiga oge ókè n’ikiri TV ma ọ bụ ime egwuregwu kọmputa adịghị mma. Otu onye ntorobịa na-ekweta, sị: “N’iji ihe ndị dị ka egwuregwu vidio, kọmputa, na Internet eme ihe, a na-akpụzigharị anyị bụ́ ụmụaka inweta ihe ndị anyị chọrọ ngwa ngwa.”
Nsogbu bụ na a na-enweta ọtụtụ ihe ná ndụ nanị site ná mgbalị, nnọgidesi ike, na ụdị ndidi nke mgbe gboo. (Tụlee Ndị Hibru 6:12; Jemes 5:7.) Ya mere echetụdịla na ihe nile aghaghị ịdị na-eme ngwa ngwa na ịbụ ihe ntụrụndụ iji baa uru. Ọ bụ ezie na ikiri TV na ime egwuregwu kọmputa pụrụ ịbụ ihe ntụrụndụ, gịnị ma i tee ihe ágbá, see ihe, ma ọ bụ mụọ ịkpọ ngwá egwú? Nkà ndị dị otú ahụ pụrụ ịkwali ikike gị nke itinye uche n’ihe.
È nwere ụzọ ndị ọzọ ị pụrụ isi zụlite ikike gị nke itinye uche n’ihe? N’ezie, e nwere, otu isiokwu nke ga-abịa n’ọdịnihu ga-enyochakwa ụfọdụ n’ime ha.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee mbipụta Teta! nke November 22, 1994 (Bekee), peji nke 3-12; July 8, 1996, peji nke 23-25; na February 22, 1997 (Bekee), peji nke 5-10.
b Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Olee Otú M Pụrụ Isi Wepụ Uche M n’Ebe Onye Na-abụghị Nwoke ma ọ bụ Nwanyị Ibe M Nọ?” ná mbipụta anyị nke November 8, 1994.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]
Ndị nnyocha na-ekwu na nri ratụ ratụ yiri ka ha na-ebelata ịdị nkọ nke uche
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]
“Mgbe ụfọdụ m na-eche banyere ụmụ agbọghọ ma ọ bụ ụfọdụ ihe na-enye m nsogbu”
[Foto dị na peeji nke 23]
Ọ̀ na-esikarịrị gị ike ịṅa ntị na klas?