Gbaghara Ma Chezọọ—Ọ̀ Pụrụ Ikwe Mee?
IHE karịrị ọkara otu narị afọ agafewo kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, na 1945. Agha ahụ zuru ụwa ọnụ bụ nnọọ agha kasị njọ, nke kpatakwara mfu kasịnụ n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ.
Agha Ụwa nke Abụọ dịruru afọ isii ma taa isi ihe dị ka nde mmadụ 50, gụnyere ndị nkịtị. E nyere ọtụtụ ndị ọzọ nkwarụ anụ ahụ, nke uche, na n’ụzọ mmetụta uche. Nye ọtụtụ ndị hụrụ afọ ndị ahụ a lụrụ agha kpatara nhụjuanya, ncheta na-egbu mgbu nke arụ a kpara na nke ndị a hụrụ n’anya nwụrụnụ ka dị.
A na-echeta arụ ndị Nazi kpara n’Oké Mgbukpọ ahụ, ya na ọtụtụ nde ndị aka ha dị ọcha e gburu. Ma na Europe ma n’Esia, usuu ndị agha na-eme mwakpo, bụ́ ndị gburu ndị nkịtị, dinaa ha n’ike, kwakọrọ ngwongwo ha, ma yie ha egwu, kpara ọtụtụ arụ. Ọzọkwa, ime mwakpo site n’agha ụgbọelu metụtara ọtụtụ ndị mmadụ bụ́ nke kpataara ọtụtụ ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị aka ha dị ọcha mbibi, mmerụ ahụ, na ọnwụ. Ọtụtụ nde ndị agha nọ n’ọgbọ agha dị iche iche gburugburu ụwa nwere ahụmahụ ndị siri ike.
Mmerụ Ahụ Uche na nke Mmetụta Uche
Ọtụtụ n’ime mmerụ ahụ uche na nke mmetụta uche e nwere n’ihi ihe ndị dị egwu mere n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ka dịgidere n’uche ọtụtụ ndị mmadụ dịrị ndụ n’oge ahụ na ndị ka dịkwa ndụ taa. Ọ ga-amasị ha ichezọ ihe ncheta ndị ahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ, nke dị ilu. Ma ha enweghị ike ime otú ahụ. Nye ụfọdụ, ichetaghachi oké ihe ọjọọ ndị dị otú ahụ na-emekpa ha ahụ dị ka nrọ ọjọọ na-abịaghachi ugboro ugboro.
Otú ọ dị, ndị ọzọ achọghị ichezọ, n’ihi na ha chọrọ ịbọ ọ́bọ̀ ma ọ bụ n’ihi na ha chọrọ ịsọpụrụ ncheta nke ndị ahụ e gburu. Ọzọkwa, e nwere echiche zuru ebe nile nke bụ́ na ezinụlọ ụmụ mmadụ n’ozuzu ya kwesịrị ịnọgide na-echeta arụrụala ndị gara aga n’olileanya nke na a gaghị akpa arụ ndị dị otú ahụ ọzọ.
Afọ ole na ole gara aga, n’ime 1994-1995, ọnọdụ gbara ememe mgbaafọ 50 nke D day (mbata nke Mba Ndị Jikọrọ Aka batara na Normandy na June 1944) gburugburu na nke ngwụsị nke oge ndị Europe n’Agha Ụwa nke Abụọ (na May 1945) gosipụtara na nye ọtụtụ ndị hụrụ ihe ndị ahụ merenụ, ịgbaghara na ichezọ siri nnọọ ike. Ọtụtụ mgbe, a na-egbochi ihe ọ bụla a na-eme ka ndị bụbu ndị iro dịghachi n’otu. N’ihi ya, ndị aka ochie n’òtù ndị agha Britain jụrụ ịkpọ ndị nnọchiteanya Germany òkù ịbịa ememe ncheta nke mbata nke Mba Ndị Jikọrọ Aka batara na Normandy.
Banyere arụ ndị Nazi kpara n’Agha Ụwa nke Abụọ na ike o siri ịgbaghara na ichezọ, onye edemede bụ́ Vladimir Jankélévitch kwupụtara ihe bụ́ obi ya n’ụzọ dị otú a, sị: “Banyere ajọ mpụ dị otú ahụ, mkpali e bu pụta ụwa . . . bụ iwe iwe na ịlụsi ọgụ ike ịghara ichezọ ya na ịchụso ndị omempụ ahụ—dị ka ndị ọkàikpe nke Òtù Ikpe Nuremberg nke mba ndị jikọrọ aka guzobere kwere ná nkwa—ruo nsọtụ nile nke ụwa.” Otu onye edemede ahụ gakwara n’ihu na-ekwu, sị: “Anyị ga-eji obi ụtọ kwuo, n’ịsọgharị okwu ndị dị n’ekpere ahụ Jisọs kpegaara Chineke n’Oziọma nke Senti Luk isi, sị: Onyenwe anyị, agbagharala ha, n’ihi na ha maara ihe ha na-eme.”—Tụlee Luk 23:34.
Ọ dị mwute ikwu na malite na 1945 gaa n’ihu, ruo ugbu a, ọtụtụ arụ ndị ọzọ a kpara—na Cambodia, Rwanda, Bosnia, ịkpọtụ nanị ole na ole aha—anọgidewo jiri ọbara na-etetọ ụwa. Arụ ndị a a kpara akpatawo ọnwụ ọtụtụ nde, tinyekwara ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei dị ndụ, ndụ ndị e tisasịrị etisasị, na ihe ncheta ndị na-atụ ụjọ ha na-akpata.
N’enweghị obi abụọ, narị afọ nke 20 a abụwo oge obi ọjọọ a na-enwetụbeghị ụdị ya. Ọ bụ nnọọ dị ka amụma Bible kwuru n’ụzọ ziri ezi eri ogologo oge gara aga banyere oge a—ndị mmadụ aghọwo “ndị dị ka anụ ọhịa” na “ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.”—2 Timoti 3:1-5; Mkpughe 6:4-8.
Gịnị Ka Anyị Kwesịrị Ime?
N’ịbụ ndị omume obi ọjọọ dị otú ahụ chere ihu, ndị mmadụ na-emeghachi omume n’ụzọ dịgasị iche iche. Ma gịnị banyere anyị? Ànyị kwesịrị icheta? Ka ànyị kwesịrị ichezọ? Icheta ihe ọ̀ pụtara iburu ndị bụbu ndị iro mmadụ ajọ iwe n’obi, na-ajụ ịgbaghara? N’aka nke ọzọ, ịgbaghara ọ̀ pụtara na mmadụ pụrụ ichezọ n’echiche nke echetakwaghị ihe ndị jọrọ njọ kpam kpam?
Gịnị ka Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ Jehova Chineke, na-eche banyere ajọ mpụ ndị e meworo n’oge anyị na n’oge ndị gara aga? Ọ̀ ga-agbaghara ndị ahụ mere ha? Ọ̀ bụkwa na oge agafebeghị nke ukwuu maka Chineke ịkwụghachi ndị e gburu n’arụ dị iche iche a kpara ụgwọ? È nwere olileanya ọ bụla siri ike na ọ dị mgbe ịkpa arụ ga-akwụsị, ebe ọ bụ na ha anọwo na-eme eri ọtụtụ puku afọ? Olee nnọọ otú Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ga-esi dozie okwu ndị a dị mgbagwoju anya n’ikpeazụ?
[Foto dị na peeji nke 4]
Ụmụaka nke ndi e gburu ná mgbuchapụ ahụ agbakọta n’ogige ndị gbara ọzọ ndụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
UN PHOTO 186797/J. Isaac
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
U.S. Navy photo