Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 8/8 p. 5-7
  • Ànyị Kwesịrị Icheta Ihe Ndị Gara Aga?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ànyị Kwesịrị Icheta Ihe Ndị Gara Aga?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Bụ Ichezọ n’Ihi Iwu?
  • Ndị Ọ Ga-amasị Ichezọ
  • Ha Adịghị Echezọ
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Cheta?
  • Gbaghara Ma Chezọọ—Ọ̀ Pụrụ Ikwe Mee?
    Teta!—1998
  • Arụrụala—Gịnị Bụ Ihe Ngwọta Chineke Nwere?
    Teta!—1998
  • Ndịàmà Jehova na Mgbukpọ E Gbukpọrọ Ndị Mmadụ—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Gịnị Mere Chineke Ji Gba Nkịtị E Gbukpọọ Ndị Juu Bi na Yurop?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 8/8 p. 5-7

Ànyị Kwesịrị Icheta Ihe Ndị Gara Aga?

“NDỊ Juu hà pụrụ ichezọ Oké Mgbukpọ ahụ?” Ọ bụ Virgil Elizondo, bụ́ onyeisi Ụlọ Ọrụ Maka Ọdịbendị ndị Mexico Bi n’America dị na San Antonio, Texas welitere ajụjụ a. Ọ na-echetara anyị na arụrụala ndị a hụrụ na narị afọ a pụrụ inwe mmetụta na-adịgide adịgide n’ikike ncheta ihe nke ndị mmadụ n’ozuzu ha. A ghaghị ịgụnye mgbuchapụ ndị Armenia (1915-1923) na igbu ndị Cambobia n’ìgwè (1975-1979) n’arụrụala nke narị afọ nke 20. Otú ọ dị, ndepụta ahụ agwụbeghị.

Ná mgbalị ịkwalite ịdịghachi n’otu nke ndị o metụtara na ndị mekpọrọ ha ọnụ, ndị ndú okpukpe na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị arịọwo ndị mmadụ ọtụtụ mgbe ichezọ arụrụala ndị a rụsara ha. Dị ka ihe atụ, nke a mere n’Atens, Gris, na 403 T.O.A. Obodo ahụ ka hụsịrị ngwụsị nke ajọ ọchịchị aka ike nke Ndị Ọchịchị Aka Ike Iri Atọ, bụ́ ọchịchị dị n’aka mmadụ ole na ole nke gburu, ọbụna n’ụzọ nkịtị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị iro ya nile. Ndị gọvanọ ọhụrụ chọrọ iguzobeghachi ịdị n’otu obodo site n’inye iwu inwe mgbaghara (okwu pụtara “amakwaghị” ma ọ bụ “nchezọ”) maka ndị nkwado nke ọchịchị aka ike mbụ ahụ.

Ọ̀ Bụ Ichezọ n’Ihi Iwu?

Ọ pụrụ ịdịtụ mfe ịnwa iji iti iwu hichapụ ncheta nke arụrụala a rụsara ndị aka ha dị ọcha. Ndị ọchịchị pụrụ ikpebi ime nke a n’ihi uru ọ bara na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, dị ka o mere na Gris oge ochie na ná mba Europe dị iche iche ná ngwụsị nke Agha Ụwa nke Abụọ. Dị ka ihe atụ, n’Itali, na 1946 otu iwu kwupụtara mgbaghara nye ihe karịrị ụmụ amaala 200,000 “ikpe ikere ókè, n’ụzọ ụfọdụ, n’omume ọjọọ nke ọchịchị aka ike ndị Fascism mara,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ La Repubblica kwuru.

Otú ọ dị, mkpebi nke gọọmenti ma ọ bụ ụlọ ọrụ ọha na eze dị iche iche bụ otu ihe. Echiche nke ndị bi n’otu ógbè bụ nnọọ ihe ọzọ. Ọ pụghị ikwe mee iji iwu manye ụmụ amaala n’otu n’otu—ikekwe ndị na-apụghị ichebe onwe ha bụ́ ndị agha obi ọjọọ, mgbuchapụ, ma ọ bụ arụrụala ndị ọzọ metụtara—ichezọ ahụhụ ndị gara aga.

Ihe karịrị otu narị nde ndị mmadụ anwụwo n’agha dị iche iche nke narị afọ a nanị, ọtụtụ bụ mgbe ha tachara ahụhụ a na-apụghị iji ọnụ kọọ. Ọ bụrụ na anyị agụnye ndị nile e gbuworo ná mgbuchapụ nke oge udo, a gaghị agụta arụrụala ndị ahụ ọnụ. Ọtụtụ ndị na-agbalịsi ike ịhụ na e chezọghị nke ọ bụla n’ime ndị a.

Ndị Ọ Ga-amasị Ichezọ

Ndị na-agba ndị a rụsara arụrụala ma ọ bụ ụmụ ha ume ịgbaghara na ichezọ na-ekwukarị na icheta ihe ndị gara aga bụ nanị ihe na-akpata nkewa, karịsịa ma ọ bụrụ na ọtụtụ iri afọ agafewo. Ha na-ekwu na ichezọ ha na-eme ka a dị n’otu, ebe icheta ha apụghị imegharị ihe ndị merela eme, n’agbanyeghị otú ahụhụ ndị ahụ dịruru ná njọ.

Ma ná mgbalị ime ka ndị mmadụ chezọọ, ụfọdụ eruwo n’ókè nke ịgọnahụ ihe ka ukwuu na mpụ ndị kasị njọ e mesoro ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ ihe mere eme. N’ịbụ ndị ndị kpọrọ onwe ha ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-eme ntụleghachi kwadoro, ụfọdụ na-azọrọ, dị ka ihe atụ, na ọ dịghị mgbe e nwere Oké Mgbukpọ.a Ọbụna ha ahaziwo njem nleta ịga n’ebe ndị bụbu ogige mkpochapụ, dị ka Auschwitz ma ọ bụ Treblinka, ha agwawokwa ndị nleta na ọ dịghị mgbe e nwere ụlọ ebe e ji gas egbu mmadụ n’ebe ndị ahụ—nke a bụkwa n’agbanyeghị ọtụtụ ndị ji anya ha hụ ihe merenụ na ọtụtụ ihe àmà na ihe ndekọ e nwere.

Olee otú o si buru na echiche ụgha dị otú ahụ nke ndị na-eme ntụleghachi na-enwe ihe ịga nke ọma n’ógbè ụfọdụ? N’ihi na ụfọdụ na-ahọrọ ichezọ ibu ọrụ ha na nke ndị be ha. N’ihi gịnị? N’ihi ịhụ mba n’anya, nchepụta echiche nke ha, ma ọ bụ nke imegide ụmụ Shem ma ọ bụ ndị ọzọ yiri ha. Ozugbo e chezọrọ arụrụala, ka ndị na-eme ntụleghachi na-ekwu, ibu ọrụ na-apụ n’anya. Ma ọtụtụ ndị mmadụ na-eji ike ha nile eguzogide ndị a na-ejighị ihe kpọrọ ihe na-eme ntụleghachi, bụ́ ndị otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ onye France kpọrọ “ndị na-egbu ikike ncheta.”

Ha Adịghị Echezọ

N’ụzọ doro anya o siri nnọọ ike ndị dị ndụ ichezọ ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ n’agha ma ọ bụ n’arụrụala. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị ahụ na-achọ icheta mgbuchapụ na mgbukpọ nke agbụrụ na-eme otú ahụ n’ihi na ha nwere olileanya na ihe ndị a mụtara site n’ahụhụ ha na nke ndị ha hụrụ n’anya ga-aba uru n’izere omume obi ọjọọ dị otú ahụ imeghachi.

N’ihi ya gọọmenti Germany ekpebiwo ime ememe ncheta mgbaafọ nke nchọpụta nke arụ nile ndị Nazi kpara n’ogige ịta ahụhụ Auschwitz. Dị ka president Germany si kwuo, nzube ya bụ na “icheta ha ga-abụ ihe ịdọ aka ná ntị nye ọgbọ ndị na-abịa n’ihu.”

N’otu aka ahụ, n’ememe mgbaafọ 50 nke njedebe nke Agha Ụwa nke Abụọ, Popu John Paul nke Abụọ kwuru, sị: “Ka afọ na-agafe, ncheta nke Agha ahụ ekwesịghị ịdị inyoghị inyoghị; kama, ha kwesịrị ịghọ ihe mmụta siri ike maka ọgbọ anyị na ọgbọ ndị ka ga-abịa.” Ka o sina dị, a ghaghị ikwu na Chọọchị Katọlik adịghị eme otu ihe ahụ mgbe nile n’icheta arụrụala ndị ahụ na ndị o metụtara n’oge ahụ.

Ka ọgbọ ndị ọhụrụ wee nweekwa ike inweta ihe mmụta na ịdọ aka ná ntị site ná mgbukpọ agbụrụ nke narị afọ a na ndị ọzọ, e wuwo ọtụtụ ebe ngosi ihe mgbe ochie—dị ka Ebe Ndebe Ihe Ncheta Oké Mgbukpọ dị na Washington, D.C., na Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Ikwe Ibe Nọrọ nke Beit Hashoah dị na Los Angeles. N’ihi otu ihe ahụ, e mepụtawo ntụle na ihe nkiri ndị ọzọ na-enye ihe ọmụma nke na-akpali akpali n’isiokwu a. Ihe a nile bụ mgbalị iji gbochie ihe a kpọrọ mmadụ ichezọ na ndị mmadụ tara ahụhụ n’aka ndị ọzọ.

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Cheta?

“A na-amanye ndị na-apụghị icheta ihe gara aga imeghachi ya,” ka onye ọkà ihe ọmụma bụ́ onye America bụ́ onye Spain site n’ọmụmụ bụ́ George Santayana dere. N’ụzọ dị mwute, o yiri ka ọtụtụ narị afọ iri na-agafe, ihe a kpọrọ mmadụ na-echezọ ihe ndị ha mere n’oge gara aga ngwa ngwa, si otú a na-amanye onwe ha imeghachi otu mmehie ihe ahụ dị oké njọ ugboro ugboro.

Usoro dị ogologo na nke arụrụala nke ndị mmadụ igbu ibe ha n’ìgwè na-eme ka ọ pụta ìhè na ụmụ mmadụ ịchị ndị mmadụ ọzọ akụwo nnọọ afọ n’ala. N’ihi gịnị ka nke a jiworo dị otú ahụ? N’ihi na ụmụ mmadụ emeghachiwo otu mmehie ihe ahụ bụ́ isi mgbe nile—ha ajụwo Chineke na iwu ya. (Jenesis 3:1-6; Eklisiastis 8:9) Taakwa, dị nnọọ ka e buru n’amụma na Bible, “ọgbọ gbagọrọ agbagọ” na-emekwa otu ihe ahụ, ọ na-enwetakwa ihe ndị si na ya apụta.—Ndị Filipaị 2:15; Abụ Ọma 92:7; 2 Timoti 3:1-5, 13.

Ebe ọ bụ na anyị ewebatawo Onye Okike, bụ́ Jehova, ná nkwurịta okwu anyị, gịnị bụ echiche ya? Gịnị ka ọ na-echezọ, gịnịkwa ka ọ na-echeta? À pụrụ imeri ihe nketa na-akpata mwute nke arụ ụmụ mmadụ kpara? “Ihe ọjọọ nke ndị na-emebi iwu [ọ̀ ga-agwụsị]”?—Abụ Ọma 7:9.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nweta ihe ọmụma banyere ụgha dị n’arụmụka nke ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-eme ntụleghachi, biko lee isiokwu bụ́ “Oké Mgbukpọ Ahụ—Ee, O Mere Eme n’Ezie!,” nke e bipụtara na Teta! nke April 8, 1989 (Bekee), peji nke 4-8.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo/Foto ndị dị na peeji nke 7]

“A na-amanye ndị na-apụghị icheta ihe gara aga imeghachi ya.”—George Santayana

Ebe a na-agba ozu ọkụ na ovun dị n’ogige ịta ahụhụ Auschwitz

[Ebe E Si Nweta Foto]

Oświęcim Museum

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya