Ọlaedo—Ihe Omimi Dị na Ya
Ọlaedo—kemgbe oge ochie e jiriwo ọla a na-acha odo odo, nke na-esichaghị ike kpọrọ oké ihe n’ihi ọdịdị ya pụrụ iche. Ụcha ya, mgbukepụ ya, ịdị mfe mkpụgharị ya, na ikike ya iguzogide ịta nchara mere ya ka ọ pụọ iche n’ọla dị iche iche. N’ihi otú o si dị oké ọnụ ahịa n’anya ndị chọworo ya, ọlaedo nwere akụkọ na-adịghị ka nke ọla ọ bụla ọzọ.
“ỌLAEDO! Ọ bụ ọlaedo, ana m agwa gị! Ọlaedo!” Nchọpụta nke ọlaedo emewo ka obi ṅụrịa, ka obi na-eti eti, na ka nchepụta rịa elu. A chọwo ya n’elu ala, n’ime osimiri na n’iyi, nakwa ọbụna ọtụtụ puku mita banye n’ime ala.
Dị ka ọla na-ada oké ọnụ, e jiriwo ọlaedo chọọ ndị eze na ndị eze nwanyị mma. E jiriwo ya chọọ ocheeze na ahụ ájá nke obí eze mma. E fewo arụsị ndị e jiri ọlaedo mee n’oyiyi azụ̀, nnụnụ, anụmanụ na ihe ndị ọzọ ofufe dị ka chi. Ọchịchọ na-adịghị ebelata ebelata a na-achọ ọlaedo agbasawo, otú a ka ọ dịkwa mmetụta o nwere ná mmepeanya.
Ọlaedo na Akụkọ Ihe Mere Eme
N’Ijipt oge ochie fero dị iche iche zipụrụ ndị na-azụrụ ha ahịa na usuu ndị agha ha jee n’ala ndị dị anya ije chọọ ọlaedo, bụ́ nke e lere anya dị ka ihe onwunwe dịịrị nanị chi na fero dị iche iche nke ndị Ijipt. Ili Tutankhamen, nke a chọpụtara na 1922, jupụtara n’akụ́ dị oké ọnụ ahịa nke ọlaedo. Ọbụna e ji ezigbo ọlaedo rụọ igbe ozu ya.
Dị ka ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, ‘akụkọ banyere ụbara ọlaedo Peasia dọọrọ mmasị Aleksanda Onye Ukwu na mbụ ịbanye n’Esia.’ A kọrọ na usuu ndị agha ya jiri ọtụtụ puku anụ ndị na-ebu ibu buru ọlaedo o jichiri na Peasia laghachi Gris. N’ihi ya, Gris ghọrọ obodo nwere ọlaedo dị ukwuu.
Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme na-akọ na ‘ndị ọchịchị alaeze ukwu Rom jiri ọlaedo mee ihe n’ụzọ mmesapụ aka iji jigide iguzosi ike n’ihe nke ndị ọrụ ha nakwa iji nwee mmetụta n’ahụ ndị oké ozu nke ala ndị ọzọ. Ha na-eji ebube nke akụ̀ na ụba ha, bụ́ ndị a na-emekarị ka ọ pụta ìhè site ná ngosipụta nke ihe ịchọ mma mara oké mma e ji ọlaedo mee, eme ka ndị obodo ha nwee echiche dị elu banyere ha ma na-emenyekarị ha ụjọ.’ Ndị Rom nwetara ọlaedo buru ibu site ná mmeri ha meriri Spain na nnweta ha nwetara ebe ndị Spain na-egwupụta ọlaedo, ka otu akwụkwọ na-ekwu.
Otú ọ dị, akụkọ banyere ọlaedo agaghị ezu ezu ma a banyeghị n’akụkọ ya nke bụkarịrị nke mwụfu ọbara. Ọ bụ akụkọ nke mmeri, obi ọjọọ, ịgba ohu, na ọnwụ.
Akụkọ Ihe Mere Eme nke Jupụtara n’Ọbara
Ka mmepeanya na-aga n’ihu, e jiri ụgbọ mmiri ndị buru ibu ma sie ike karị jee ịchọpụta ala ọhụrụ, ihiwe ókèala ọhụrụ, na ịchọ ọlaedo. Ịchọta ọlaedo ghọrọ ebe ọtụtụ ndị na-eme nchọpụta tinyere uche ha nile, gụnyere onye ahụ so ná ndị mbụ kwọrọ ụgbọ mmiri bụ́ Christopher Columbus (1451-1506).
Ndụ nke ndị obodo enweghị oké ihe ọ bụ nye Columbus mgbe ọ na-achọ ọlaedo. Ka ọ na-akọrọ eze na nwunye eze nke Spain, bụ́ ndị ji ego kwadoo njem nchọpụta ihe ya ahụmahụ ya n’otu àgwàetiti, Columbus dere n’ime akwụkwọ ndekọ njem ya, sị: “Iji chịa ebe a, nanị ihe dị mmadụ mkpa bụ ibiri ebiri ma nwee ike n’ebe ndị obodo nọ, bụ́ ndị ga-eme ihe ọ bụla e nyere ha iwu ka ha mee. . . . Ndị India . . . na-agba ọtọ, ha enweghịkwa ihe nchebe, n’ihi ya ha dị njikere ịbụ ndị a na-enye iwu na itinye ha n’ọrụ.” Columbus kwere na ya nwere ngọzi Chineke. Akụ̀ na ụba ọlaedo ahụ ga-enyere Spain aka iji ego kwadoo agha nsọ ha. ‘Ka Chineke were ebere ya nyere m aka ịchọta ọlaedo,’ ka o kwuru n’otu mgbe ọ natasịrị onyinye nke ihe mkpuchi ihu e ji ọlaedo mee.
Eze Ferdinand nke Spain nyere ndị Spain meriri n’agha, bụ́ ndị jiri ụgbọ mmiri mee njem osimiri ịchọ ọlaedo n’isochi ụzọ Columbus, iwu, sị: “Wetaranụ m ọlaedo! Weta ya n’ụzọ ọmịiko, ma o kwe omume. Ma wetaranụ m ya, n’agbanyeghị otú unu si nweta ya.” Ndị ahụ na-eme nchọpụta nwere obi ọjọọ gburu ọtụtụ puku ndị obodo ha zutere na Mexico na n’Ebe Etiti nakwa na Ndịda America. Ọlaedo ndị ndị ahụ meriri n’agha jiri ụgbọ mmiri buru laa Spain jupụtara n’ọbara n’ụzọ ihe atụ.
Ndị ohi oké osimiri sochiziri, bụ́ ndị na-efegharị ọkọlọtọ na-enweghị mba ọ bụ nke ya. N’oké osimiri, ha zuru ohi ná nnukwu ụgbọ mmiri ndị Spain bu ọlaedo na akụ̀ ndị ọzọ bara uru. Ike nke ndị nọ ná nnukwu ụgbọ mmiri ahụ bụ́ ndị égbè na ndị ọrụ ha na-adịkarị ala karị na nke ndị ohi oké osimiri na-eji ngwá ọgụ zuru ezu adịghị aha nhata. Na narị afọ nke 17 na nke 18, izu ohi n’oké osimiri bụ nsogbu nke njem oké osimiri, karịsịa na West Indies na n’ụsọ oké osimiri nke America.
Nchụso Ọlaedo na Narị Afọ nke 19
Na 1848 nchọpụta ọlaedo kasịnụ mere na Ndagwurugwu Sacramento, dị na California. N’oge na-adịghị anya akụkọ ya gbasazuru ebe nile, ndị nkwabata nọgidere na-ekwoga iji nweta ala nke ha. Ka ọ na-erule n’afọ nke na-esonụ, ọtụtụ iri puku “ndị nchụso ọlaedo”—ndị chọrọ ịba ọgaranya bụ́ ndị sitere n’akụkụ nile nke ụwa—wakporo California. Ụba mmadụ nke California rịrị elu site n’ihe dị ka 26,000 na 1848 ruo ihe dị ka 380,000 na 1860. Ndị ọrụ ugbo gbahapụrụ ala ha, ndị ọrụ ụgbọ mmiri gbahapụrụ ụgbọ mmiri, ndị soja hapụrụ ọrụ agha—nanị iji mee njem ịchọ ihe ndabara ha n’ọlaedo. A kọwara ụfọdụ dị ka “ndị aghụghọ akpịrị ọbara na-akpọ nkụ.” N’ihi mgbakọta a nke ụmụ mmadụ e nwere ntiwapụ nke mpụ na ime ihe ike. Ndị a matara n’ọnyà ndọrọ nke ọlaedo ma bụrụ ndị na-adịghị njikere ịrụ ọrụ maka ya tinyere isi n’izu ohi, na-apụnara ihe n’ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ na n’ụgbọ okporo ígwè.
Na 1851, ozugbo nchụso ọlaedo na California gasịrị, e nwetara akụkọ na a na-achọpụta ebe ọlaedo jupụtara n’Australia. A kọrọ na “ihe e nwetara n’ebe ahụ buru oké ibu n’ezie.” Ruo nwa oge, Australia ghọrọ mba kasị emepụta ọlaedo n’ụwa nile. N’oge na-adịghị anya ụfọdụ ndị kwagara California kwaara gbadaa. Ụba mmadụ nke Australia rịrị elu nke ukwuu—site na 400,000 na 1850 ruo ihe karịrị 1,100,000 na 1860. Ịrụ ọrụ ugbo na ọrụ ọzọ fọrọ nke nta ka ha kwụsị ebe ọtụtụ na-agbapụ ịchọ ihe ndabara ha n’ọlaedo.
Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke narị afọ nke 19, ọgba aghara ahụ nke ịchọ ọlaedo cheziri ihu na Yukon na Alaska, mgbe a chọpụtara ọlaedo n’ebe ndị ahụ. Ọtụtụ puku ụmụ mmadụ kwagara n’Ime Ime Ebe Ugwu, n’ógbè Klondike na Alaska, na-agba mgba ịnagide oké oyi iji nweta ala ha nke jupụtara n’ọlaedo.
Akụ̀ nke Mikpuru n’Ime Mmiri
Na narị afọ nke 20, ná mpụta nke imikpu n’ime ime osimiri, ndị na-achọ ọlaedo chere ihu n’ala osimiri. N’ebe ahụ ha nyochara ụgbọ mmiri ndị kpuru ekpu maka akụ̀ ndị mikpuru n’ime mmiri—ọla e ji ọlaedo mee na arịa ndị ọzọ e mere ọtụtụ narị afọ gara aga.
Na September 20, 1638, nnukwu ụgbọ mmiri Spain bụ́ Concepcíon mikpuru n’Oké Osimiri Pacific, n’ụsọ oké osimiri nke Saipan, ka oké ikuku burusịịrị ya gaa kụọ ná nkume. O bu ọlaedo na akụ̀ ndị ọzọ ọnụ ego ha ruru ọtụtụ iri nde dollar taa. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime mmadụ 400 nọ n’ụgbọ mmiri ahụ nwụrụ. Ndị na-emikpu n’ime ime mmiri achọtawo ihe olu 32 e ji ọlaedo mee site n’ụgbọ ahụ kpuru ekpu, nke ọ bụla dị ihe dị ka mita 1.5 n’ịdị ogologo na ọtụtụ kilogram n’ịdị arọ. Ná ngụkọta, ndị na-emikpu n’ime ime mmiri ewepụtawo iberibe ọla 1,300 e ji ọlaedo mee—ihe olu, obe, baajị, brooch, mgbaaka, na mkpọchi.
A chọpụtawokwa ụgbọ ndị ọzọ kpuru ekpu. Na 1980, ndị na-emikpu n’ime ime mmiri ná mpụga nke ụsọ osimiri Florida, dị na United States, chọpụtara nnukwu ụgbọ mmiri ndị Spain kpuru ekpu bụ́ Santa Margarita na narị afọ nke 17. Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke afọ na-esonụ, ndị na-emikpu n’ime ime mmiri achọtaworị ihe karịrị kilogram 44 nke ọkpụrụkpụ ọlaedo, tinyere arịa ndị ọzọ e ji ọlaedo mee.
Ọlaedo Ndị E Nwetara n’Oge Agha
Mgbe gọọmenti Germany chilisiri aka elu na 1945, usuu Ndị Agha Jikọrọ Aka mere nchọpụta na-atụ n’anya n’ebe a na-egwupụta nnu dị na Kaiseroda dị na Thuringia, Germany. Dị ka magazin bụ́ The Atlanta Journal si kwuo, “e nwetara ọkpụrụkpụ ọlaedo, ọrụ nkà, ego na ihe ibe ọnụ ego ha ruru ijeri $2.1 n’ebe ahụ a na-egwupụta ihe.” A chọpụtakwara akpa ndị jupụtara n’ezé e ji ọlaedo na ọlaọcha mee, a gbazewo ụfọdụ n’ime ha, bụ́ ndị a kpakapụtara n’ọnụ ndị e gburu n’Oké Mgbukpọ ahụ. Ebe a e zobere ọlaedo buru oké ibu nyeere ndị ọchịagha Nazi aka inwe ego iji kwadoo otu agha nọtere aka. E nyeghachiwo ihe dị ka mba iri ndị Hitler chịburu ihe e mere atụmatụ ya ịbụ ọlaedo ọnụ ego ya ruru ijeri $2.5, ka Journal ahụ na-akọ. N’ihi nkweta zuru ebe nile na ọ bụghị ọlaedo nile ndị Nazi zobere ka a chọtaworo, a ka na-achọ ha.
N’ezie, ọlaedo bara uru. Otú ọ dị, Bible na-ekwu na ọlaedo, dị ka ihe onwunwe ndị ọzọ, enweghị ike inye ndị na-achọ ya ndụ. (Abụ Ọma 49:6-8; Zefanaịa 1:18) Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Inweta amamihe, lee ka o si dị mma nke ukwuu karịa ọlaedo ọma!” (Ilu 16:16) Ezi amamihe na-esite n’ebe Onye Okike, bụ́ Jehova Chineke nọ abịa, a ga-achọtakwa ya n’ime Okwu ya, bụ́ Bible. Site n’ịmụ Okwu Chineke, onye na-achọ amamihe dị otú ahụ pụrụ ịmụta iwu, ụkpụrụ, na ndụmọdụ Chineke, mgbe ahụ tinyekwa ihe ndị a n’ọrụ ná ndụ ya. Amamihe e si otú a nweta bụ ihe a na-achọsi ike karịa ọlaedo nile mmadụ chọpụtatụworo. Amamihe dị otú ahụ pụrụ ịrụpụta ndụ ka mma ugbu a na ndụ agwụghị agwụ n’ọdịnihu.—Ilu 3:13-18.
[Igbe dị na peeji nke 23]
Eziokwu Ụfọdụ Banyere Ọlaedo
• Ọlaedo bụ ọla kasị dị mfe mkpụgharị n’ime ọla nile. A pụrụ ịkụda ya ruo ịdị nde anọ nke 0.1 maịkromita n’ibu. A pụrụ ịkụsa ọlaedo dị gram 28 ịsachi ihe dị ka square mita 17. A pụrụ ịdọtị ọlaedo dị gram 28 iru kilomita 70.
• N’ihi na ọlaedo a na-agwaghị agwa adịghị esicha ike, a na-agwakọtakarị ya na ọla ndị ọzọ iji mee ka o sikwuo ike maka iji ya mepụta ọla na ihe ndị ọzọ e ji ọlaedo eme. A na-akọwa ọlaedo dị n’ọlaedo a gwara agwa n’usoro 24, bụ́ nke a na-akpọ karat; ya mere, ọlaedo a gwara agwa dị karat 12 nwere pasent 50 nke ọlaedo n’ime ya, ọlaedo dị karat 18 nwere pasent 75 nke ọlaedo n’ime ya, ọlaedo dịkwa karat 24 bụ nke a na-agwaghị agwa.
• Mba ndị kasị emepụta ọlaedo bụ South Africa na United States.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 21]
Aleksanda Onye Ukwu: The Walters Art Gallery, Baltimore
[Foto ndị dị na peeji nke 22]
Ihe osise na-egosi mbịarute nke Christopher Columbus na Bahamas na 1492 ịchọ akụ̀ ndị e ji ọlaedo mee
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’ikike nke Museo Naval, Madrid (Spain), nakwa n’ikike obiọma nke Don Manuel González López