È Kwubigara Okwu Ókè Banyere Akụ̀ na Ụba Eze Solomọn?
“Ọ̀tụ̀tụ̀ ọlaedo nke bịakwutere Solomọn n’otu afọ dị [talent ọlaedo narị isii na iri isii na isii].”—1 Ndị Eze 10:14.
DỊ KA amaokwu Bible ahụ si kwuo, Eze Solomọn nwetara ihe karịrị tọn 25 ọlaedo n’otu afọ! Ọnụ ahịa nke a taa ga-abụ $240,000,000. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu abụọ nke ọlaedo e gwupụtara n’ụwa nile n’afọ 1800. Nke a ọ̀ pụrụ ikwe omume? Gịnị ka ihe àmà nke ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala na-egosi? Ọ na-atụ aro na a pụrụ ikweta n’ezie n’ihe ndekọ Bible ahụ nke akụ̀ na ụba Solomọn. Magazin bụ́ Biblical Archaeology Review na-ekwu, sị:
◻ Eze Thutmose nke Atọ nke Ijipt (narị afọ iri nke abụọ T.O.A.) wetara ihe dị ka tọn 13.5 nke arịa ọlaedo n’ụlọ nsọ nke Amọn-Ra dị na Karnak—nke a bụkwa nanị otu akụkụ nke onyinye ahụ.
◻ Ihe odide ndị Ijipt dekọrọ onyinye ndị ngụkọta ha bụ ihe dị ka tọn 383 ọlaedo na ọlaọcha nke Eze Osorkon nke Mbụ (mmalite narị afọ iri mbụ T.O.A.) nyere chi dị iche iche.
Ọzọkwa, mpịakọta bụ́ Classical Greece n’usoro mbipụta bụ́ Great Ages of Man na-akọ, sị:
◻ Ebe ndị a na-egwupụta ihe nke Pangaeum dị na Thrace nyere Eze Philip nke Abụọ (359-336 T.O.A.) ihe karịrị tọn 37 ọlaedo kwa afọ.
◻ Mgbe ọkpara Philip bụ́ Aleksanda Onye Ukwu (336-323 T.O.A.) meriri Susa, bụ́ isi obodo nke alaeze ukwu Peasia, a chọtara akụ̀ ruru ihe dị ka tọn 1,200 ọlaedo.
Ya mere nkọwa Bible banyere akụ̀ na ụba Eze Solomọn abụghị ihe na-emeghị eme. Chetakwa na Solomọn “dị ukwuu karịa eze nile nke ụwa n’akụ̀ na n’amamihe” n’oge ahụ.—1 Ndị Eze 10:23.
Olee otú Solomọn si jiri akụ̀ na ụba ya mee ihe? E ji “ọlaedo a nụchara anụcha” machite ocheeze ya, e ji “ọlaedo” mee ihe ndị o ji aṅụ ihe, o nwekwara ọta ukwu 200 na ọta 300 e ji “ọlaedo” mee. (1 Ndị Eze 10:16-21) Karịsịa, e ji ọlaedo Solomọn mee ihe n’ihe metụtara ụlọ nsọ Jehova dị na Jerusalem. E ji ọlaedo na ọlaọcha mee ihe ịdọba oriọna na ihe nile dị nsọ nke ụlọ nsọ ahụ, dị ka ndụdụ, ọkwá nta, iko, na ọkwá mwụsa. E ji ọlaedo machite cherubim ahụ dị mita 4.5 n’ịdị elu nke dị n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile, ebe ịchụàjà ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na ọbụna ime ụlọ ahụ dum.—1 Ndị Eze 6:20-22; 7:48-50; 1 Ihe Emere 28:17.
Gịnị banyere ụlọ nsọ e ji ọlaedo machite? N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ụdị iji ọlaedo mee ihe otú a abụghị ihe ọhụrụ ma ọlị n’ụwa oge ochie. Biblical Archaeology Review na-ekwu na Amenophis nke Atọ nke Ijipt “kwanyeere chi ukwu bụ́ Amun ùgwù site n’iwuru ya otu ụlọ nsọ dị na Thebes nke ‘e ji ọlaedo machitezuo, jiri ọlaọcha chọọ ala ụlọ ya mma, chọọ[kwa] ọnụ ụzọ ya nile mma site n’iji electrum’”—ngwakọta ọlaọcha na ọlaedo. Ọzọkwa, Esar-haddon nke Asiria (narị afọ nke asaa T.O.A.) jiri ọlaedo machite ibo ụzọ na mgbidi nile nke òkwù arụsị Ashur. Banyere ụlọ nsọ Sin dị na Harran, Nabonidus nke Babilọn (narị afọ nke isii T.O.A.) dekọrọ, sị: “Eji m ọlaedo na ọlaọcha chọọ mgbidi ya mma, meekwa ka ha na-egbukepụ ka anyanwụ.”
Ya mere, ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme na-atụ aro na ihe ndekọ Bible banyere akụ̀ na ụba Eze Solomọn abụghị nke e kwubigara okwu oké banyere ya.